Ihe Ndị A Ga-echeta Banyere Ihe Omume E Ji Echeta Ọnwụ Jizọs
Ihe omume e ji echeta ọnwụ Jizọs, nke afọ a, dabara na Wednesday, April 12. Ndị okenye kwesịrị ilebara ihe ndị na-esonụ anya.
◼ Mgbe unu na-eyi oge maka nzukọ a, jidenụ n’aka na a gaghị ebugharị achịcha na mmanya ma ọ bụrụ na anyanwụ adaghị.
◼ E kwesịrị ịgwa mmadụ nile, tinyere onye ọkà okwu, kpọmkwem oge na ebe a ga-eme ihe omume a.
◼ E kwesịrị inweta ụdị achịcha na mmanya kwesịrị ekwesị, kwadebekwa ha.—Lee Ụlọ Nche February 15, 2003, peeji nke 14-15.
◼ E kwesịrị iweta efere, iko, na tebụl nakwa ákwà tebụl kwesịrị ekwesị n’ụlọ nzukọ a ga-anọ mee ya ma hazie ha tupu oge eruo.
◼ E kwesịrị ihichasị Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ ebe ọ bụla ọzọ a ga-enwe nzukọ a nke ọma tupu oge eruo.
◼ E kwesịrị ịhọpụta ndị atendantị na ndị ga-ebugharị achịcha na mmanya ahụ ma gwa ha tupu oge eruo ihe bụ́ ọrụ ha, usoro kwesịrị ekwesị ha ga-agbaso, na mkpa ọ dị iyi uwe na iji ejiji ndị dị ùgwù.
◼ E kwesịrị ime ndokwa ibujere onye ọ bụla so ná ndị e tere mmanụ na-adịkwaghị ike, nke na-enweghị ike ịbịa, ihe nnọchianya ndị ahụ.
◼ Mgbe e mere ndokwa ka ihe karịrị otu ọgbakọ jiri otu Ụlọ Nzukọ Alaeze mee ihe, ọgbakọ ndị a kwesịrị ịrụkọ ọrụ ọnụ iji hụ na ndị mmadụ akwụchighị n’ụzọ e si abata, na paseeji, nakwa n’ebe a na-adọba ụgbọala.