Nyere Ndị Mmadụ Aka Ịghọ Ndị Enyi Chineke
1 Taa, a na-akụziri ndị si ná mba nile ụzọ Jehova. (Aịsa. 2:2, 3) Otú ọ dị, ka ndị dị otú ahụ wee nwee ike ịdị ‘na-eji ntachi obi amị mkpụrụ,’ ha ga-ahụrịrị Jehova n’anya. (Luk 8:15; Mak 12:30) Ọ bụrụ na ha enweghị ịhụnanya dị otú ahụ, ha agaghị enwe ike iguzogide mmetụta ndị na-adịghị mma ma ọ bụ kata obi ime ihe ọma. Otu ụzọ isi nyere ndị mmadụ aka iso Jehova dị ná mma bụ site n’ime ka ha nwekwuo mmasị n’àgwà ya. Gbaa ha ume ichebara ihe ndị dị n’akwụkwọ bụ́ Bịaruo Jehova Nso echiche nke ọma.
2 Ihe Nlereanya Gị: Omume gị pụrụ inwe mmetụta dị ukwuu n’obi ndị ị na-amụrụ Bible. Mgbe ha hụrụ na i ji ọbụbụenyi gị na Jehova kpọrọ ihe, hụkwa otú o si emetụta ndụ gị, nke a nwere ike ịkpali ha onwe ha ịchọ ịbụ ndị enyi Chineke. (Luk 6:40) N’ezie, omume anyị na-enwekarị mmetụta n’ebe ndị mmadụ nọ karịa ihe anyị kwuru n’ọnụ.
3 Otu ụzọ gbara ọkpụrụkpụ ndị nne na nna si akụziri ụmụ ha ịhụ Jehova n’anya bụ site n’isetịpụrụ ha ihe nlereanya. (Deut. 6:4-9) Otu di na nwunye nke chọrọ nnọọ ịzụlite ụmụ ha n’eziokwu a rịọrọ ndị nne na nna merela otú ahụ ka ha kọọrọ ha ihe ha ga-eme. Nke nwoke kwuru, sị: “Ihe onye nke ọ bụla n’ime ndị mụ na ha kwurịtara gwara m bụ na ụzọ kasị mma isi mee ya bụ site n’isetịpụ ihe nlereanya.” Ya mere, site n’ụzọ ndị mụrụ ụmụ si ebi ndụ, ha pụrụ ime ka ụmụ ha ghọta ihe mmadụ ịbụ “enyi Jehova” pụtara.—Jems 2:23.
4 Ekpere Sitere n’Obi: Ị pụkwara inyere ndị mmadụ aka ịghọ ndị enyi Jehova site n’ịkụziri ha ka ha jiri obi ha nile na-ekpe ekpere. I nwere ike igosi ha ekpere nlereanya Jizọs nakwa ọtụtụ ekpere ndị ọzọ e ji ezi obi kpee, bụ́ ndị e dekọrọ n’Akwụkwọ Nsọ. (Mat. 6:9, 10) Ị pụrụ iji ekpere nke gị kụziere ụmụ gị na ndị ị na-eduziri ọmụmụ Bible otú e si ekpe ekpere. Mgbe ha na-anụ otú i si eji obi gị nile ekpe ekpere, ha ga-achọpụta otú i si were Jehova. Gbaa ha ume ‘ịnọgidesi ike n’ekpere’ ma ọnwụnwa bịara ha. (Rom 12:12) Mgbe ha chọpụtara na Jehova na-enyere ha aka n’oge ha nọ ná mkpa, ha ga-amalite ịtụkwasị ya obi na ịhụ ya n’anya dị ka ezigbo enyi ha.—Ọma 34:8; Fil. 4:6, 7.