Mmadụ Iwepụta Onwe Ya Ịrụ Ọrụ Na-eweta Ngọzi
1. Olee otú Devid na Nehemaịa si wepụta onwe ha ịrụ ọrụ?
1 Mgbe Golaịat kwara ndị agha Izrel emo, onye ọ bụla n’ime ndị agha ahụ nweere onwe ya iwepụta onwe ya ịlụso ya agha. Ma, onye wepụtara onwe ya ịlụso Golaịat agha bụ otu nwatakịrị na-azụ atụrụ, nke a na-akụzighịrị otú e si alụ agha. (1 Sam. 17:32) Mgbe ndị Juu a dọọrọ n’agha laghachiri Jeruselem ma hapụ iwughachi mgbidi ha, ọ bụ obu ihe ọṅụṅụ eze Peshia kwetara iwepụta onwe ya ịhapụ ọkwá ya dị elu n’obí eze ma gaa Jeruselem iji hazie ọrụ ahụ. (Neh. 2:5) Jehova gọziri Devid na Nehemaịa maka iwepụta onwe ha ịrụ ọrụ.—1 Sam. 17:45, 50; Neh. 6:15, 16.
2. Gịnị mere Ndị Kraịst kwesịrị iji na-ewepụta onwe ha ịrụ ọrụ?
2 Taa, ọtụtụ mmadụ adịghị achọ iwepụta onwe ha ịrụrụ ndị ọzọ ọrụ. “N’ụbọchị ikpeazụ” a, ndị mmadụ na-ejikarị ọrụ n’aka, ọtụtụ mmadụ bụkwa “ndị hụrụ onwe ha n’anya.” (2 Tim. 3:1, 2) Ọ na-adịkarị mfe mmadụ ịdị na-emere nanị onwe ya ihe, nke na ọ gaghị ahụ ohere o nwere iji nyere ndị nọ ná mkpa aka. Ma, dị ka Ndị Kraịst, ọ na-agụ anyị agụụ iṅomi Jizọs, bụ́ onye nyeere ndị mmadụ aka n’echeghị ka a gwa ya agwa. (Jọn 5:5-9; 13:12-15; 1 Pita 2:21) Olee ụzọ ndị anyị nwere ike isi wepụta onwe anyị ịrụ ọrụ, oleekwa ngọzi ndị anyị ga-enweta?
3. Olee otú mmadụ iwepụta onwe ya ịrụ ọrụ si eme ka nzukọ ọgbakọ tọkwuo ụtọ?
3 Iwepụta Onwe Anyị Ịrụrụ Ụmụnna Anyị Ọrụ: Anyị nwere ike inye ndị ọzọ “onyinye ime mmụọ” site n’iwepụta onwe anyị ịza ajụjụ ná nzukọ ọgbakọ mgbe ọ dị mkpa ka ndị na-ege ntị tinye ọnụ. (Rom 1:11) Ịza ajụjụ ná nzukọ ọgbakọ na-ewetara Jehova otuto, na-eme ka eziokwu ahụ bamikwuo n’ime obi anyị, ọ na-emekwa ka nzukọ ọgbakọ na-atọkwu ụtọ. (Ọma 26:12) Anyị nwekwara ike iwepụta onwe anyị ime ihe omume n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke mgbe onye e kenyere ya na-abịaghị. Nke a ga-enyere anyị aka ime ka nkà izi ihe anyị kakwuo mma.
4. Olee ụzọ ndị ọzọ anyị pụrụ isi wepụta onwe anyị ịrụrụ ndị ọzọ ọrụ?
4 Ụmụnna nwoke pụrụ iwepụta onwe ha site n’ịgbalị iru eru iji rụọ ọrụ ndị e nwere n’ọgbakọ. (Aịsa. 32:2; 1 Tim. 3:1) Mmadụ nile pụrụ inye aka mee ka mgbakọ ukwu na nke nta gaa nke ọma site n’iwepụta onwe ha ịrụ ọrụ ná ngalaba dị iche iche. Ọ bụrụ na anyị ewepụta onwe anyị soro onye nlekọta na-ejegharị ejegharị jee ozi ọma, ma ọ bụ nye ya nri, nke a ga-eme ka anyị nwee ohere ‘ịgbarịta onwe anyị ume.’ (Rom 1:12) Ọ bụrụ na anyị ewepụta onwe anyị inyere ndị na-enweghị nna, ndị inyom di ha nwụrụ, ndị nọ n’ọrịa, ndị na-adịghịzi ike, ndị nne ụmụ ha ka dị obere, na ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ anyị aka, obi ga-adị anyị ụtọ, anyị ga-enwetakwa ihu ọma Jehova.—Ilu 19:17; Ọrụ 20:35.
5. Olee ihe ndị metụtara Ụlọ Nzukọ Alaeze bụ́ ndị ọ dị mkpa ka anyị wepụta onwe anyị maka ha?
5 Ụzọ ọzọ anyị ga-esi ewepụta onwe anyị ịrụ ọrụ bụ site n’iso na-edebe Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị ọcha. Ọzọkwa, ebe ọ bụ na e nwere ọtụtụ ndị na-abata n’ọgbakọ, anyị nwere mkpa dị ukwuu nke iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị ọhụrụ, a chọkwara ndị ga-ewepụta onwe ha iso wuo ha. Otu di na nwunye wepụtara onwe ha iso ìgwè na-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze rụọ ọrụ, n’agbanyeghị na ha amaghị ewu ụlọ. Ka oge na-aga, e nyere di na nwunye ahụ ọzụzụ. Ka ọ dị ugbu a, ha na-enyezi aka n’ido blọk. Nke nwanyị kwuru, sị: “Iso ndị ọzọ rụkọọ ọrụ emeela ka anyị na ha ghọọ ezigbo ndị enyi. Ọ bụ eziokwu na ike na-agwụ anyị ma anyị rụchaa ọrụ n’ụbọchị, anyị na-enwe ume ọhụrụ n’ụzọ ime mmụọ.”
6. Gịnị mere ọrụ ikwusa ozi ọma ji bụrụ ọrụ kasị mkpa anyị nwere ike iwepụta onwe anyị ịrụ?
6 Site n’Ikwusa Ozi Ọma: Ọrụ kasị mkpa anyị nwere ike iwepụta onwe anyị ịrụ taa bụ ọrụ ikwusa ozi ọma Alaeze. Ka anyị na-enyere ndị mmadụ aka ịghọta ihe Bible na-ekwu ma tinye ya n’ọrụ, ndụ ha na-enwe nzube, ha na-enwetakwa ike ịkwụsị àgwà ndị na-adịghị mma ha na-akpabu. Ha na-amata banyere olileanya na-ewuli elu Bible na-eme ka e nwee banyere ọdịnihu. Site n’ịkụziri ndị mmadụ Bible, anyị na-arụ ọrụ obi ụtọ nke ga-abara ha uru ruo ogologo oge. (Jọn 17:3; 1 Tim. 4:16) Ikekwe, ọnọdụ anyị nwere ike inye anyị ohere ikere òkè ka ukwuu n’ọrụ a site n’ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka ma ọ bụ nke oge nile, site n’ịkwaga n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu, ma ọ bụ site n’ịmụ asụsụ ọzọ.
7. Gịnị mere iwepụta onwe anyị ịrụ ọrụ ji dị oké mkpa karịsịa n’oge a?
7 Eze Devid buru amụma na n’oge Mezaịa ga-amalite ọchịchị ya, ndị Chineke ‘ga-enye onwe ha n’afọ ofufo.’ (Ọma 110:3) Ebe ọ bụ na Jehova ga-eme ka ọrụ owuwe ihe ubi ime mmụọ ikpeazụ a gaa ọsọ ọsọ, e nwere ọtụtụ ọrụ anyị nwere ike iwepụta onwe anyị ịrụ. (Aịsa. 60:22) Ì kwuola, sị: “Lee m; ziga m”? (Aịsa. 6:8) N’eziokwu, ọ bụrụ na anyị na-ewepụta onwe anyị ịrụ ọrụ, anyị na-eme ka obi na-atọ Jehova ụtọ, anyị ga-enwetakwa nnukwu ụgwọ ọrụ.