Igbe Ajụjụ
◼ Olee ihe ize ndụ ndị dị n’iso onye anyị na-amaghị na-akparịta ụka n’Intanet?
N’ọtụtụ ebe a na-edebe ihe ọmụma n’Intanet, e mere ha otú mmadụ ga-enwe ike iso mmadụ ibe ya na-akparịta ụka n’Intanet. N’ọtụtụ n’ime ebe ndị a, ndị mmadụ pụrụ idebe ihe ndị metụtara onwe ha, tinyere foto ha, na ihe ọmụma ndị ọzọ banyere onwe ha. Ndị hụrụ ihe ndị ahụ pụziri iso onye ahụ malite mkparịta ụka. Ọtụtụ ndị na-eto eto na-agakarị n’ebe ndị dị otú ahụ a na-edebe ihe ọmụma n’Intanet, ụfọdụ ndị ntorobịa nọ n’ọgbakọ esiwokwa na ha soro ndị sị na ha bụ Ndịàmà Jehova kparịta ụka n’Intanet.
Ọ dịịrị onye anyị na ya na-akparịta ụka n’Intanet mfe ịgha ụgha banyere onye ọ bụ, otú o jiruru ofufe Jehova kpọrọ ihe, ma ọ bụ ihe o ji maka ya kpanyewere anyị ụka. (Ọma 26:4) Onye sị na ya bụ Onyeàmà Jehova nwedịrị ike ịbụ onye ụwa, onye a chụpụrụ n’ọgbakọ, ma ọ bụkwanụ ya abụrụdị onye si n’ezi ofufe dapụ nke na-emegide Ndịàmà Jehova. (Gal. 2:4) A nụwokwa ọtụtụ akụkọ na ndị na-edina ụmụaka na-esi n’ebe ndị dị otú a a na-edebe ihe ọmụma n’Intanet enweta ụmụaka ha na-edina.
A sịgodị na obi siri anyị ike na ndị anyị na ha na-akparịta ụka n’Intanet na-eme nke ọma n’ọgbakọ, ọ pụrụ ịdị mfe na ezigbo mkparịta ụka anyị na ndị ahụ si n’Intanet na-enwe ga-emesị si na nke ezigbo ya banye na nke na-adịghị mma. Nke a bụ n’ihi na mgbe mmadụ so onye ọ na-ahụtụbeghị na-akparịta ụka, ọ pụrụ ikwu ihe ndị ọ na-agaghị ekwuli ma ọ bụrụ na ya na onye ahụ ahụtụla. Ha pụkwara ile mkparịta ụka ha si n’Intanet enwe anya dị ka ihe dị n’etiti nanị ha abụọ, ma na-eche na ndị ọzọ, dị ka ndị mụrụ ha ma ọ bụ ndị okenye ọgbakọ, agaghị ama banyere ya. Ọ dị mwute ikwu na ọtụtụ ndị na-eto eto si n’ezinụlọ Ndị Kraịst adabala n’ọnwụnwa a, ha etinyewokwa ọnụ ná mkparịta ụka ndị rụrụ arụ. (Efe. 5:3, 4; Kọl. 3:8) N’ebe ndị a e mere ka ndị mmadụ na-edebe ihe ndị metụtara onwe ha n’Intanet, ụfọdụ ndị na-eto eto etinyela foto ha ndị na-akpali agụụ mmekọahụ, utu aha ha ndị rụrụ arụ, ma ọ bụ ebe a ga-esi nweta vidio egwu ndị e gosiri ndị gba ọtọ na ha.
N’ihi ihe ndị a e kwurula, ndị nne na nna kwesịrị ịdị na-eleru anya ala iji mara ihe ụmụ ha na-eme na kọmputa. (Ilu 29:15) Ọ ga-abụ ihe ize ndụ ịkpọbata onye anyị na-amaghị n’ụlọ anyị ma ọ bụ ikwe ka nanị ya na ụmụ anyị nọrọ. N’otu aka ahụ, ọ ga-abụ ihe ize ndụ ma ọ bụrụ na anyị ma ọ bụ ụmụ anyị emete ndị anyị na-amaghị enyi n’Intanet, ọ sọkwa ha ha sị na ha bụ Ndịàmà Jehova.—Ilu 22:3.