Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 4/08 p. 1
  • ‘Gosinụ na Unu Bụ Ndị Nwere Ekele’

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • ‘Gosinụ na Unu Bụ Ndị Nwere Ekele’
  • Ozi Alaeze Anyi—2008
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Gosikwanụ Onwe Unu Ịbụ Ndị Nwere Ekele”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • “Bụrụkwanụ Ndị Na-ekele Ekele”
    Ozi Alaeze Anyi—1997
  • Ị̀ Bụ Onye Nwere Ekele?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Gịnị Mere Anyị Ji Kwesị Ikele Ndị Meere Anyị Ihe Ọma?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2019
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2008
km 4/08 p. 1

‘Gosinụ na Unu Bụ Ndị Nwere Ekele’

1 Mgbe Jizọs gwọrọ ndị ekpenta iri, ọ bụ naanị otu n’ime ha lọghachiri iji kelee ya. Jizọs jụrụ, sị: “Ọ́ bụghị mmadụ iri ka e mere ka ha dị ọcha? Oleekwanụ mmadụ itoolu ndị ọzọ?” (Luk 17:11-19) Ọ dị nnọọ mkpa ka anyị na-enwe ekele, na-egosikwa na anyị ji ezi onyinye ọ bụla na onyinye ọ bụla zuru okè Nna anyị nke eluigwe na-ahụ n’anya ma na-emesapụ aka, bụ́ Jehova Chineke, nyere anyị, kpọrọ ihe!—Kọl. 3:15; Jems 1:17.

2 Olee ụfọdụ n’ime ihe ndị anyị kwesịrị ikele Chineke maka ha? Anyị ji ihe mgbapụta ahụ, bụ́ onyinye kasịnụ Chineke nyere ụmụ mmadụ, kpọrọ ihe. (Jọn 3:16) Anyị na-ekelekwa Jehova maka ịdọta anyị n’ebe ọ nọ. (Jọn 6:44) Ihe ọzọ anyị kwesịrị ikele Chineke maka ya bụ ịdị n’otu anyị dị ka Ndị Kraịst. (Ọma 133:1-3) O doro anya na i nwere ike icheta ọtụtụ onyinye ndị ọzọ Jehova nyerela anyị. Anyị agatụghị achọ ịdị ka ndị Izrel na-enweghị ekele bụ́ ndị chefuru ọrụ ndị Jehova rụụrụ ha!—Ọma 106:12, 13.

3 Gosi Ekele Gị: Ọ bụ ezie na o nwere ike ịbụ na ndị ekpenta iri ahụ nwechara ekele maka ihe Jizọs meere ha, ọ bụ naanị otu n’ime ha gosiri na o nwere ekele. (Luk 17:15) N’otu aka ahụ, anyị na-egosi ekele anyị site n’ịnụ ọkụ n’obi n’ozi. Ọ bụrụ na anyị nwere ekele n’ezie maka ihe niile Nna anyị na-ahụ n’anya meerela anyị, ọ ga-akpali anyị igosi ndị ọzọ ụdị ịhụnanya ahụ ọ na-egosi anyị na imesapụrụ ha aka otú o si emesapụrụ anyị site n’ịgwa ha banyere Chineke. (Luk 6:45) Ka anyị na-agwakwa ndị ọzọ banyere ‘ọrụ ndị dị ebube Jehova na-arụrụ anyị na ihe ndị ọ na-eche banyere anyị,’ ịhụnanya na ekele anyị nwere n’ebe Jehova nọ ga-amụba.—Ọma 40:5.

4 Mee Ka Ndị Ọzọ Nwee Ekele: Anyị kwesịrị ịdị na-achọ ụzọ ndị anyị ga-esi nyere ụmụ anyị na ndị anyị na-amụrụ Baịbụl aka ịdị na-ekele Chineke. Ndị nne na nna nwere ọtụtụ ohere iji mee nke a, dị ka mgbe ha na ụmụ ha na-ekiri ihe ndị Jehova kere. (Rom 1:20) Mgbe anyị na-eduzi ọmụmụ Baịbụl, anyị nwere ike ịjụ onye anyị na-amụrụ ihe, sị, “Gịnị ka ihe a anyị na-amụ na-akụziri anyị banyere ụdị onye Jehova bụ?” Ka onye ahụ ị na-amụrụ ihe na-enwekwu ekele, otú ahụ ka ọ ga na-ahụkwu Chineke n’anya ma na-enwekwu mmasị ime ihe na-atọ ya ụtọ.

5 N’oge ikpeazụ a, ọtụtụ ndị anaghị eji ihe ọma e meere ha akpọrọ ihe, ha enwekwaghị ekele. (2 Tim. 3:1, 2) Obi na-adị nnọọ Jehova ụtọ ma ọ hụ ka ndị ji obi ha niile na-ejere ya ozi na-egosi ekele ha site n’iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma!—Jems 1:22-25.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya