Mgbe Chineke na-achị ụmụ mmadụ, ihe niile o kere dị n’otu ma dịrị n’udo
Gịnị Mere Alaeze Chineke Ji Dị Anyị Mkpa?
Mgbe e kere mmadụ abụọ mbụ n’ụwa, ọ bụ naanị Onye kere anyị, aha ya bụ Jehova, na-achị ha. Ihe niile o meere ụmụ mmadụ bụ n’ihi na ọ hụrụ ha n’anya. Ọ kwadebeere ha ebe obibi mara mma a kpọrọ ogige Iden ha ga-ebi. O nyekwara ha ọtụtụ nri ha ga na-eri. Ihe ọzọ bụ na o nyere ụmụ mmadụ ezigbo ọrụ ha ga na-arụ. (Jenesis 1:28, 29; 2:8, 15) Ụmụ mmadụ gaara na-enwe udo ma a sị na ha kwere ka Chineke nọgide na-achị ha.
Mmadụ abụọ mbụ Chineke kere jụrụ ọchịchị Chineke
Baịbụl kwuru na otu mmụọ ozi nupụụrụ Chineke isi. Mmụọ ozi ahụ kwuru na ọ bụghị Chineke kwesịrị ịna-achị ụmụ mmadụ. E mechara kpọwa mmụọ ozi ahụ Setan bụ́ Ekwensu. O kwukwara na ụmụ mmadụ ga-aka enwe obi ụtọ ma ha na-achị onwe ha, kama Chineke ịna-achị ha. Ọ dị mwute ikwu na nne na nna anyị mbụ, bụ́ Adam na Iv, sooro Setan nupụrụ Chineke isi.—Jenesis 3:1-6; Mkpughe 12:9.
Ebe ọ bụ na Adam na Iv jụrụ ọchịchị Chineke, Chineke chụpụrụ ha na Paradaịs ahụ ha bi. Ha enweghịzi olileanya ịdị ndụ ebighị ebi na inwe ezigbo ahụ́ ike. (Jenesis 3:17-19) Ihe ahụ ha mere kpara ụmụ ndị ha mechara mụta aka ọjọọ. Baịbụl kwuru na n’ihi mmehie ahụ Adam mere, ‘mmehie batara n’ụwa, ọnwụ esikwa ná mmehie bata.’ (Ndị Rom 5:12) Mmehie kpataara ụmụ mmadụ nsogbu ọzọ. Nsogbu ahụ bụ na ‘mmadụ na-achị mmadụ ibe ya ọchịchị nchịgbu.’ (Ekliziastis 8:9) Nke bụ́ eziokwu bụ na ụmụ mmadụ ga na-enwe nsogbu ma ha na-achị onwe ha.
OTÚ ỌCHỊCHỊ ỤMỤ MMADỤ SI MALITE
Nimrọd nupụụrụ Jehova isi
Onye mbụ chịrị ụmụ mmadụ a kpọrọ aha na Baịbụl bụ Nimrọd. O nupụụrụ Jehova isi. Isi a o nupụụrụ Jehova gosiri na ọ chọghị ka Jehova na-achị ụmụ mmadụ. Kemgbe oge Nimrọd ruo ugbu a, ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n’okwu ejirila ikike ha nwere megbuo ndị ọzọ. Ihe dị ka puku afọ atọ (3,000) gara aga, Eze Solomọn kwuru, sị: “M hụrụ ka anya mmiri na-agba ndị a na-emegbu emegbu, ma e nweghị onye na-akasi ha obi. Ọ bụkwa ndị nọ n’isi na-emegbu ha.”—Ekliziastis 4:1.
Taa, ihe na-ebe n’ọchịchị ka na-ebekwa. N’afọ 2009, otu akwụkwọ Òtù Mba Ụwa bipụtara kwuru na ọtụtụ ndị weere ọchịchị ọjọọ ka “otu n’ime ihe ndị kacha eme ka ihe ọjọọ ju n’ụwa anyị a.”
OGE CHINEKE GA-EME IHE ERUOLA
Ụwa chọrọ ezigbo onye ọchịchị na ezigbo ọchịchị. Ọ bụkwa ya ka Onye kere anyị kwere nkwa inye anyị.
Ndị ọchịchị yiri ka hà na-achị nke ọma enwebeghị ike ịkwụsị nsogbu ndị tara akpụ na-echi ndị mmadụ ọnụ n’ala
Chineke ehiwela otu Alaeze ma ọ bụ ọchịchị n’eluigwe. Ọchịchị a ga-anọchi ọchịchị ụmụ mmadụ, ma “naanị ya ga-adịru mgbe ebighị ebi.” (Daniel 2:44) Ọ bụ Alaeze a ka ọtụtụ nde mmadụ na-ekpe ekpere ya kemgbe. (Matiu 6:9, 10) Ma, ọ bụghị Chineke ga-abụ eze nke Alaeze a. Kama, ọ họpụtala otu onye dịrịla ndụ n’ụwa a ka ọ chịa Alaeze a. Ònye ka Chineke họpụtara?