Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 1/09 p. 3
  • “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke”
  • Ozi Alaeze Anyi—2009
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Akwụkwọ Ozi Si n’Aka Òtù Na-achị Isi
    “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke”
  • “Nke a Bụ Ihe Ịhụ Chineke n’Anya Pụtara”
    “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke”
  • “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Nọgide n’Ịhụnanya Chineke
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2009
km 1/09 p. 3

“Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke”

1. Gịnị mere e ji bipụta akwụkwọ bụ́ “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke”?

1 Ọ na-agụsi anyị agụụ ike ịmụ akwụkwọ ọhụrụ anyị bụ́ “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke” n’Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ malite n’izu nke February 23! Ná ngwụcha nke akwụkwọ ozi Òtù Na-achị Isi degaara onye ọ bụla hụrụ Jehova n’anya, ha kwuru, sị: “Anyị nwere ezigbo olileanya na akwụkwọ a ga-enyere gị aka ịnọgide na-eme ihe eziokwu ahụ na-ekwu eme ná ndụ gị, si otú ahụ nọrọ ‘n’ịhụnanya Chineke . . . nke na-eduga ná ndụ ebighị ebi.’—Jud 21.”

2. Olee ebe ndị akwụkwọ ọhụrụ a ga-enyere anyị aka ná ndụ anyị?

2 Ihe Ndị Anyị Ga-atụ Anya Ha: Olee otú ihe ndị e kwuru na Baịbụl ga-esi nyere anyị aka ịhọrọ ndị anyị na ha ga na-akpa, ịhọrọ ntụrụndụ dị mma, ịdị na-asọpụrụ ndị isi, inwe àgwà dị mma, ime ka anyị na di ma ọ bụ nwunye anyị na-ebi n’udo, ịdị na-ekwu okwu ọma, nakwa izere ememme na omenala ndị na-adịghị mma? A ga-eme ka akọ na uche anyị kwekọọ n’ụkpụrụ ezi omume ndị dị n’Okwu Chineke. (Ọma 19:7, 8) Ka anyị na-aghọtakwu otú Jehova si eche echiche, ọ ga na-agụkwu anyị agụụ ime ihe na-atọ ya ụtọ, kpaliekwa anyị irubere ya isi n’akụkụ niile nke ndụ anyị.—Ilu 27:11; 1 Jọn 5:3.

3. Olee ihe mere anyị kwesịrị iji gbalịsie ike hụ na anyị sonyere n’ọmụmụ ihe nke izu ọ bụla?

3 Kpebisie Ike Iso Mụọ Akwụkwọ A: Ka ị na-akwadebe, buru n’uche ito Chineke mgbe gị na ndị ya zukọtara. (Hib. 13:15) Mmadụ niile nọ n’ọgbakọ ga-amụkọ akwụkwọ ọhụrụ a ọnụ. Ebe ọ bụ na ebe ndị anyị ga na-amụ ebuchaghị ibu, anyị ga-enwe ohere ịkwadebe nke ọma, obi esiekwa anyị ike ikwu ihe ndị anyị mụtara. Ọ bụrụ na anyị akwadebe azịza anyị nke ọma ma mee ka ọ dị nkenke, ọ ga-akpali ndị ọzọ inwe ịhụnanya na ịrụ ezi ọrụ, mee ka ọmụmụ ihe ahụ tọọ ụtọ, meekwa ka a mụta ihe na ya. (Hib. 10:24) Ọzọkwa, anyị ga-enwe nnọọ ọṅụ n’otu n’otu ka anyị na-ekwupụta ihe ndị anyị kweere.

4. Gịnị mere o ji dị ezigbo mkpa ka anyị na-edebe ihe ndị Jehova nyere n’iwu?

4 N’abalị ikpeazụ Jizọs dịrị ndụ n’ụwa dị ka mmadụ, o kwuru na e nwere ihe jikọrọ idebe ihe ndị Jehova nyere n’iwu na ịnọgide n’ịhụnanya Chineke. (Jọn 15:10) Akwụkwọ “Ịhụnanya Chineke” ga-enyere anyị aka ikpebisikwu ike ime ihe ndị anyị na-agụta na Baịbụl eme ná ndụ anyị kwa ụbọchị na ‘ịnọgide n’ịhụnanya Chineke.’—Jud 21.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya