Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 7/10 p. 2
  • Àna M Eme Ike M Niile?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Àna M Eme Ike M Niile?
  • Ozi Alaeze Anyi—2010
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ị̀ Hụrụ Ihe Ncheta Jehova n’Anya nke Ukwuu?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Anyị Kwesịrị Ịtụkwasị Ihe Jehova Na-echetara Anyị Obi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Mee Ka Ihe Jehova Na-echetara Anyị Na-eme Gị Obi Ụtọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Ị̀ Na-ejezu Ozi Gị?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2019
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2010
km 7/10 p. 2

Àna M Eme Ike M Niile?

1. Olee ihe nwere ike ịna-echegbu Onye Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi?

1 Ị̀ jụtụla onwe gị ajụjụ ahụ? O nwere ike ị naghịzi aga ozi ọma otú i si agabu n’ihi nká, ọrịa, ma ọ bụ ibu ọrụ ezinụlọ ndị i nwekwuru, ya ana-emekwa gị obi ọjọọ. Otu nwanna nwaanyị nke nwere ụmụ atọ dere na mgbe ụfọdụ, obi ya na-ama ya ikpe n’ihi na ilekọta ezinụlọ ya anaghị ekwe ya gaa ozi ọma otú ọ gaara achọ ịga. Gịnị ga-enyere anyị aka ile ihe anya otú kwesịrị ekwesị?

2. Gịnị ka Jehova na-achọ n’aka anyị?

2 Ihe Jehova Na-achọ n’Aka Anyị: O doro anya na anyị niile ga-achọ ịga ozi ọma karịa otú anyị si aga. Ma a na-enwekarị ezigbo ihe dị iche n’ihe anyị ga-achọ ime na ihe anyị ga-emeli. Na anyị ga-achọ ịga ozi ọma karịa otú anyị si aga gosiri na anyị ejighị ozi ọma egwu egwu. Anyị kwesịrị icheta na Jehova maara ókè anyị ga-emeli, ọ naghịkwa achọ ka anyị mee karịa ókè anyị ga-emeli. (Ọma 103:13, 14) Gịnị ka ọ na-achọ n’aka anyị? Ọ chọrọ ka anyị jiri mkpụrụ obi anyị dum na-ejere ya ozi, ya bụ, ka anyị na-enye ya ihe kacha mma anyị nwere.—Kọl. 3:23.

3. Olee otú anyị nwere ike isi ghọta otú anyị na-agbaru mbọ n’ozi ọma?

3 Gịnị ga-enyere anyị aka ịma ihe anyị ga-emeli? Anyị nwere ike ịrịọ Jehova ka o nyere anyị aka ịghọta ọnọdụ anyị nke ọma. (Ọma 26:2) Onye ọzọ nwekwara ike inyere anyị aka bụ ezigbo enyi anyị, bụ́ Onye Kraịst maara nke a na-akọ n’ọgbakọ, onye maara anyị nke ọma, na onye na-agaghị ezoro anyị ọnụ ma ọ gwawa anyị ebe anyị kwesịrị ịrụ ọrụ. (Ilu 27:9) Chetakwa na otú ihe dịịrị anyị taa nwere ike ịgbanwe echi, n’ihi ya, ọ ga-adị mma ma anyị nọtụ anyị elebagharịa anya n’ihe ndị anyị na-eme iji mara ma ànyị enwekwuola ohere maka ozi ọma.—Efe. 5:10.

4. Olee otú anyị kwesịrị isi were ihe ndị e si na Baịbụl na-echetara anyị banyere ozi ọma?

4 Otú Anyị Kwesịrị Isi Na-ele Ihe Ndị A Na-echetara Anyị Anya: N’ámá egwuregwu ebe a na-agba ọsọ, ndị enyi na ndị ikwu nke ndị na-agba ọsọ na-agwa ha gbasiwe ike. Ihe mere ha ji agwa ha ya bụ iji nyere ndị ahụ na-agba ọsọ aka ịgbata ihe, ọ bụghị ka ike gwụ ha. N’otu aka ahụ, agbamume ndị e ji Baịbụl na-enye anyị na ihe ndị a na-echetara anyị n’ọmụmụ ihe nakwa n’akwụkwọ anyị, ka anyị jiri ‘ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa okwu Chineke,’ na-abara anyị uru, ọ bụghị iji gwa anyị na anyị anaghị agbasi mbọ ike. (2 Tim. 4:⁠2) Obi kwesịrị isi anyị ike na ọ bụrụhaala na anyị na-eme ike anyị niile, Jehova ga-echeta ‘ọrụ anyị na ịhụnanya anyị gosiri’ ma gọzie anyị.—Hib. 6:10.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya