Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 11/10 p. 4
  • Igbe Ajụjụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Igbe Ajụjụ
  • Ozi Alaeze Anyi—2010
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ngọzi nke Ozi Ọsụ Ụzọ
    Ozi Alaeze Anyi—2003
  • Ha Esetịpụla Ihe Nlereanya Ma A Bịa n’Ikwesị Ntụkwasị Obi
    Ozi Alaeze Anyi—2006
  • Mgbanwe n’Awa Ole A Chọrọ n’Aka Ndị Ọsụ Ụzọ
    Ozi Alaeze Anyi—1999
  • Na-echeta Ndị Nọ n’Ozi Oge Niile
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2010
km 11/10 p. 4

Igbe Ajụjụ

◼ Olee ụzọ ndị anyị nwere ike isi na-enyere ndị ọsụ ụzọ aka?

N’afọ ije ozi 2009, ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị dị narị puku asatọ rụrụ ọrụ ọsụ oge niile na ọsụ ụzọ pụrụ iche n’ụwa niile. Ụmụnna ndị a na-eje ozi oge niile na-ahapụ mkpa ndị nke ha, ma jiri oge ha, ume ha na ego ha na-ekwusa ozi ọma Alaeze ahụ. (Ilu 3:9) Obi dị nnọọ Jehova ụtọ maka otú ha si agbasi mbọ ike! Olee ihe ndị anyị nwere ike ime iji gosi na anyị na-ele ha anya otú Jehova si ele ha anya, ma mee ka ha na-ejikwu ọṅụ na ntachi obi na-eje ozi ha?

O doro anya na ọ bụrụ na anyị ana-agwa ndị ọsụ ụzọ okwu ndị ga-agba ha ume, nke ahụ ga-enyere ha aka ịnọgide n’ozi ha. (Ilu 25:11) Ànyị nwere ike ịhazigharị ihe ndị anyị na-eme n’izu ka anyị nwee ike soro ha gaa ozi ọma? Ọ bụrụ na anyị achọpụta na ego ụgbọ njem dị ha mkpa, ànyị nwere ike ịkwụrụ ha ụgwọ ụgbọ njem ha, ma ọ bụkwanụ jiri ụgbọala ma ọ bụ ọgba tum tum anyị kwọga ha ebe ha ga-eje ozi ọma? (1 Kọr. 13:5; Fil. 2:4) Anyị nwekwara ike igosi na anyị ji ozi ha kpọrọ ihe ma anyị na-ele ha ọbịa nke ọma ma na-akpọ ha n’ụlọ anyị mgbe ụfọdụ ka anyị na ha rikọọ nri.—1 Pita 4:8, 9.

Akwụkwọ Nsọ kwuru na Jehova ga-enye ndị bu ụzọ achọ Alaeze ya ihe ndị dị ha mkpa ná ndụ. (Ọma 37:25; Mat. 6:33) Otu ụzọ o si eme nke a bụ site n’aka ụmụnna hụrụ anyị n’anya. (1 Jọn 3:16-18) N’eziokwu, ndị ọsụ ụzọ anaghị atụ anya ka ndị ọzọ na-egboro ha mkpa ego ndị ha nwere. E nwegodị ihe na-akpa ha, o nwere ike ha agaghị anọkata gaa kọwara ya ndị ọzọ. N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị na-eleru anya ala, anyị nwere ike ịchọpụta ụzọ ndị anyị nwere ike isi nyere ndị ọsụ ụzọ na-ekwesị ntụkwasị obi aka ‘imeju ihe kọrọ ha.’—2 Kọr. 8:14, 15.

Mgbe Fibi, onye ji ịnụ ọkụ n’obi na-eje ozi n’ọgbakọ dị na Senkrea na narị afọ mbụ, gara Rom, Pọl gwara ụmụnna ndị nọ na Rom, sị: “Nabata ya n’ime Onyenwe anyị dị ka e kwesịrị ịnabata ndị nsọ, . . . nyekwara ya aka n’ihe ọ bụla enyemaka unu pụrụ ịdị ya mkpa.” (Rom 16:1, 2) Anyị nwere ohere imere ndị ọsụ ụzọ oge niile na ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche nọ n’ọgbakọ anyị otu ihe ahụ, bụ́ ndị na-ekwusa ozi ọma n’akwụsịghị akwụsị.—Ọrụ 5:42.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya