Ihe Anyị Ga-amụta n’Aka Hosia Onye Amụma
1. Olee ajụjụ o nwere ike ịbụ na ị jụtụla onwe gị?
1 ‘Olee ihe ndị m nwere ike ịhapụ ka m nwee ike ijekwuru Jehova ozi?’ O nwere ike ịbụ na ị jụtụla onwe gị ajụjụ a mgbe i chetara ihe ọma Jehova na-emere gị nakwa otú o si emere gị ebere. (Ọma 103:2-4; 116:12) N’agbanyeghị na e nwere ihe ndị Hosia ga-ahapụ iji mee ihe ndị Jehova gwara ya, o ji obi ya niile rubere ya isi. Olee otú anyị ga-esi na-eme ka Hosia?
2. Olee otú anyị ga-esi jiri obi anyị niile na-ekwusa ozi ọma otú ahụ Hosia mere?
2 Na-ekwusa Ozi Ọma n’Oge Nsogbu: Hosia kacha buo amụma gbasara alaeze ebo iri nke Izrel n’ihi na ọ fọrọ obere ka ndị bi ebe ahụ kwụsị ife Jehova. Mgbe Jeroboam nwa Jehoash bụ eze, o mere ihe jọrọ njọ n’anya Jehova. O mekwara ka ndị mmadụ na-efe chi nwa ehi ahụ Jeroboam nwa Nibat kpụrụ. (2 Eze 14:23, 24) Eze ndị ọzọ chịrị alaeze ebo iri ahụ mekwara ihe ọjọọ otú ahụ Jeroboam mere ruokwa mgbe e bibiri ebe ahụ n’afọ 740 Tupu Oge Ndị Kraịst. Ma, Hosia ji obi ya niile buo amụma iri afọ ise na itoolu n’agbanyeghị na ndị obodo ahụ nọ na-efe chị ụgha. Anyị kwesịrị iji obi anyị niile na-ekwusa ozi ọma a sịgodị na a na-akpagbu anyị ma ọ bụ na ndị mmadụ anaghị ege anyị ntị.—2 Tim. 4:2.
3. Olee ihe Hosia mere nke gosiri otú Jehova si eme ebere?
3 Echefula na Jehova Na-eme Ebere: Jehova gwara Hosia ka ọ lụọ “nwaanyị nke ga-akwa iko.” (Hos. 1:2) Aha nwunye ya bụ Goma. Ọ mụụrụ ya otu nwa nwoke. Ma, ọ dị ka o mechara kwata ụmụ abụọ n’iko. Otú Hosia si gbaghara ya ma mechaa kpọghachi ya gosiri otú Jehova si meere ụmụ Izrel ebere mgbe ha chegharịrị. (Hos. 3:1; Rom 9:22-26) Anyị kwesịrị ịhapụ ihe ụfọdụ na-amasị anyị ka anyị nwee ike ịna-eme ka ndị ọzọ mata na Jehova na-emere ụdị mmadụ niile ebere.—1 Kọr. 9:19-23.
4. Olee ihe ụfọdụ anyị nwere ike ịhapụ ka anyị nwee ike ijekwuru Jehova ozi?
4 Ụfọdụ ụmụnna anyị na-ahapụ ezigbo ọrụ ha na-arụ ka ha nwee ike inwekwu oge ha ga-eji na-aga ozi ọma. E nwekwara ndị nke kpebiri na ha agaghị alụ di ma ọ bụ nwunye ka ha nwee ike ije ozi oge niile. Nweekwa ndị lụrụ di na nwunye ma kpebie na ha agaghị amụ nwa. O nwere ike ịbụ na anyị cheta ihe Hosia mere, anyị asị na anyị agaghị emeli ụdị ihe ahụ. Ma, ọ bụrụ na anyị echeta ihe ọma Jehova na-emere anyị, kwekwa ka mmụọ nsọ ya na-edu anyị, o nwere ike iji anyị rụọ ihe ndị anyị chere na anyị agaghị arụli otú o si jiri Hosia rụọ ihe ndị o chere na ọ gaghị arụli.—Mat. 19:26; Fil. 2:13.