ISIOKWU ỌNWA A: “KWUSAA OKWU CHINEKE, JIRI ỊNỤ ỌKỤ N’OBI NA-EKWUSA YA.”—2 TIM. 4:2.
Ịkọwa Ihe Anyị Kweere Gbasara Afọ 1914
Baịbụl gbara anyị ume ka anyị ‘dịrị njikere mgbe niile iji obi dị nwayọọ na nkwanye ùgwù’ na-akọwara ndị mmadụ ihe anyị kweere. (1 Pita 3:15) N’eziokwu, o nwere ike ịna-esiri anyị ike ịkọwa ụfọdụ eziokwu miri emi dị na Baịbụl, dị ka ịkọwara mmadụ otú anyị si mara na Alaeze Chineke malitere ịchị n’afọ 1914. Iji mee ka ọ dịrị anyị mfe ịkọwara ya ndị mmadụ, e bipụtala isiokwu bụ́ “Ihe Onyeàmà Jehova na Onye Agbata Obi Ya Kparịtara—Olee Mgbe Alaeze Chineke Malitere Ịchị?” Isiokwu a dị n’Ụlọ Nche anyị ga-enye ndị mmadụ n’ọnwa Ọktoba nakwa na Nọvemba. Ị tụlewe isiokwu ahụ n’Ụlọ Nche ndị ahụ, chebara ajụjụ ndị a echiche banyere otú nwanna nwoke aha bụ Kelvin si gwa onye agbata obi okwu.
Olee otú o si . . .
jaa ya mma ma kwuo ihe ha abụọ kweere?—Ọrụ 17:22.
jiri obi umeala kọwaara ya ihe anyị kweere?—Ọrụ 14:15.
Gịnị mere o ji dị mma na ọ . . .
na-ekwughachi ihe ndị ọ kọwaara ya tupu ya aga n’ihu?
na-akwụsịtụ, jụọ Jon ma ọ̀ na-aghọtakwa ihe ọ na-akọwara ya?
kọwaraghị ya ọtụtụ ihe n’otu mgbe?—Jọn 16:12.
Obi dị anyị ezigbo ụtọ na Jehova bụ́ “Onye Ozizi Ukwu” anyị na-akụziri anyị otú anyị ga-esi na-enyere ndị agụụ eziokwu na-agụ aka.—Aịza. 30:20.