Ihe Anyị Ga-amụta n’Aka Habakọk Onye Amụma
1. Olee otú oge a si yie oge Habakọk?
1 N’ihi otú ihe si dị n’oge Habakọk, ọ jụrụ Jehova, sị: “Gịnị mere i ji mee ka m na-ahụ ihe ọjọọ, gịnịkwa mere i ji na-ele nsogbu n’anya n’anya?” Anyị lewe otú ihe ọjọọ si ju n’ụwa taa, o doro anya na ọ ga na-ewute anyị otú ahụ o wutere Habakọk. (Hab. 1:3; 2 Tim. 3:1, 13) Ma, ọ bụrụ na anyị eleba anya n’amụma ndị Habakọk buru nakwa n’otú o si jisie ike jeere Chineke ozi, ọ ga-enyere anyị aka ịna-edi nsogbu ọ bụla bịaara anyị ruo mgbe Jehova ga-ebibi ndị ọjọọ.—2 Pita 3:7.
2. Olee otú anyị ga-esi na-egosi na anyị kwesịrị ntụkwasị obi?
2 Kwesị Ntụkwasị Obi: Habakọk ekweghị ka ihe ọjọọ ndị na-eme n’oge ahụ mee ka ọ daa mbà n’ozi ya, kama ọ gbasiri mbọ ike na-efe Jehova. (Hab. 2:1) Jehova mere ka obi sie ya ike na ihe ndị o si n’ọnụ ya kwuo ga-emezu n’oge o kwuru na ha ga-emezu nakwa na “onye ezi omume ga-esi n’ikwesị ntụkwasị obi ya dị ndụ.” (Hab. 2:2-4) Gịnị ka anyị kwesịrị ịmụta n’ihe a Jehova gwara Habakọk? Ihe ka mkpa bụ obi isi anyị ike na ọgwụgwụ ga-abịa kama anyị ịnọ na-echegbu onwe anyị gbasara mgbe ọ ga-abịa. Okwukwe ga-enyere anyị aka ịna-agbasi mbọ ike n’ozi anyị, gharakwa ịda mbà.—Hib. 10:38, 39.
3. Gịnị mere anyị ji kwesị iji ọṅụ na-ejere Jehova ozi?
3 Na-aṅụrị Ọṅụ n’Ime Jehova: Mgbe Gọg nke ala Megọg ga-alụso anyị ọgụ, a ga-ama ma okwukwe anyị ò siri ike. (Ezik. 38:2, 10-12) Agha daa, ahụ́ anaghị afọ ma ndị mechara merie ma ndị e meriri. O nwere ike ịkpata ụkọ nri. Ihe niile ndị mmadụ nwere nwekwara ike ịla n’iyi, ha amalitezie ịta ahụhụ. Gịnị ga-enyere anyị aka ma nsogbu bịara anyị? Habakọk tụrụ anya na ihe agaghị adịcha mfe. N’ihi ya, o kpebisiri ike na o nweghị ihe ga-eme ka ọ ghara ịna-enwe ọṅụ n’ozi Jehova. (Hab. 3:16-19) “Ọṅụ Jehova” ga-enyere anyị aka idi nsogbu ọ bụla ga-abịara anyị n’ọdịnihu.—Nehe. 8:10; Hib. 12:2.
4. Olee ihe kwesịrị ịna-eme anyị obi ụtọ ugbu a? Oleekwa ihe ga-eme anyị obi ụtọ n’ọdịnihu?
4 Jehova bibichaa ndị ajọ omume, ọ ga na-akụziri ndị ezi omume fọrọnụ ihe ga-abara ha uru. (Hab. 2:14) A ga-akụzikwara ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ gbasara Jehova. Ka ọ dị ugbu a, anyị kwesịrị iji oge a anyị ka nwere na-akụziri ndị mmadụ gbasara Jehova.—Ọma 34:1; 71:17.