AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | EZRA 6-10
Jehova Chọrọ Ka Anyị Jiri Obi Anyị Niile Na-efe Ya
Ezra kwadebere ịlaghachi Jeruselem
Ezra natara Eze Atazaksis ikike ka ọ laa Jeruselem iji mee ka ndị Izrel maliteghachi ife Jehova n’ebe ahụ
Eze Atazaksis nyere Ezra “ihe niile ọ rịọrọ” ya maka ịrụzi ụlọ Jehova. Ihe ndị o nyere ya bụ: ọlaedo, ọlaọcha, ọka wit, mmanya, mmanụ, na nnu. A gbanwee ihe a niile n’ego, ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ ijeri naịra iri abụọ
Ezra nwere obi ike na Jehova ga-echebe ndị ohu ya
Ịlaghachi Jeruselem adịrịghị ha mfe
Isi Babịlọn rute Jeruselem fọrọ obere ka o ruo otu puku kilomita na narị isii. Ụzọ ha si lọta jọrọ njọ, ndị omekome na anụ ọjọọ jukwara ya
Ịlọrute Jeruselem wekwara ha ihe dị ka ọnwa anọ
Ndị ahụ na-alaghachi Jeruselem kwesịrị inwe okwukwe na obi ike, feekwa Jehova nke ọma
IHE NDỊ EZRA BU LAGHACHI BỤ:
Ọlaọcha na ọlaedo na-anyị ihe karịrị narị talent asaa na iri ise. Ihe dị ka arọ enyi atọ gbara agba
NSOGBU NDỊ HA NWERE MGBE HA NA-ALAGHACHI BỤ:
Ndị omekome, ụzọ ọjọọ, anụ ọjọọ