Ihe mere e ji na-eme Ememme Ngabiga n’oge ochie abụghị ka e jiri ya gosi na a ga-emecha mewe Ncheta Ọnwụ Jizọs. Ma, e nwere ebe ụfọdụ ha abụọ si yie. Dị ka ihe atụ, Pọl onyeozi kpọrọ Jizọs “nwa atụrụ ememme ngabiga anyị.” (1 Kọr. 5:7) Otú ahụ ọbara nwa atụrụ ahụ e tere n’awara ụzọ ndị Juu si zọpụta ha, ka ọbara Jizọs Kraịst sikwa na-azọpụta ndị mmadụ. (Ọpụ. 12:12, 13) Ihe ọzọ bụkwa na otú ahụ ọ na-enweghị ọkpụkpụ nwa atụrụ Ememme Ngabiga ahụ a gbajiri, ka a na-agbajighịkwa ọkpụkpụ ọ bụla n’ahụ́ Jizọs, n’agbanyeghị na ọ bụ ihe a na-emekarị onye ọ bụla a kpọgidere n’osisi n’oge ahụ.—Ọpụ. 12:46; Jọn 19:31-33, 36.