AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 2 NDỊ KỌRỊNT 11-13
‘Ogwu Pọl Nwere n’Anụ Ahụ́ Ya’
Na Baịbụl, a na-ejikarị ogwu eme ihe atụ mmadụ ma ọ bụ ihe ọzọ na-akpata nsogbu. (Ọnụ Ọgụ. 33:55; Ilu 22:5; Ezik. 28:24) Mgbe Pọl kwuru banyere ‘ogwu dị n’anụ ahụ́’ ya, ọ ga-abụ na ọ na-ekwu banyere ndịozi ụgha na ndị ọzọ na-akatọ ya na ozi ya. Olee otú amaokwu ndị a dị n’okpuru si gosi ihe ndị ọzọ ‘ogwu dị Pọl n’anụ ahụ́’ nwere ike ịpụta?
Olee ihe bụ́ ‘ogwu dị n’anụ ahụ́’ nke gị?
Olee otú ị ga-esi tụkwasị Jehova obi na ọ ga-enyere gị aka idi ya?