AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ỌPỤPỤ 39-40
Mozis Mere Ihe Niile E Nyere Ya n’Iwu
Mozis ji obi ya niile mee ihe niile Jehova gwara ya gbasara ịrụ ụlọikwuu ahụ. Anyịnwa kwesịkwara ige ntị n’ihe ọ bụla nzukọ Jehova gwara anyị mee, jirikwa obi anyị niile na-eme ya n’egbughị oge ọ bụla. Anyị kwesịrị ịna-eme ya ọ bụrụgodi na anyị echee na ọ dịghị mkpa ma ọ bụ na anyị aghọtaghị ihe mere e ji sị ka anyị mee ya.—Luk 16:10.
Gịnị mere anyị ji kwesị ige ntị nke ọma ma na-eme ihe a gwara anyị . . .
mgbe a na-eme nzukọ ozi ubi?
gbasara ịkwadebe maka ihe mberede ma ọ bụ ọrịa?
gbasara ịkwadebe maka ọdachi?