OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Ịdọ Aka ná Ntị Na-egosi na Jehova Hụrụ Anyị n’Anya
Ihe ịdọ aka ná ntị pụtara karịchaa bụ inye ntụziaka na ịkụzi ihe. Ma, ịgbazi mmadụ na inye mmadụ ntaramahụhụ sokwa na ya. Jehova na-adọ anyị aka ná ntị ka anyị nwee ike ịna-efe ya otú ọ chọrọ. (Rom 12:1; Hib. 12:10, 11) Mgbe ụfọdụ, o nwere ike isiri mmadụ ike ịnabata ịdọ aka ná ntị, ma ọ na-eme ka mmadụ na-eme ezi omume, na-emekwa ka onye ahụ nweta ngọzi. (Ilu 10:7) Ma, olee ihe ndị na-adọ aka ná ntị na ndị a na-adọ aka ná ntị kwesịrị iburu n’obi?
Onye na-adọ aka ná ntị. Ndị okenye, ndị nne na nna, na ndị ọzọ gbalịanụ jiri obiọma na ịhụnanya na-adọ aka ná ntị otú ahụ Jehova na-eme. (Jere. 46:28) Ọ bụrụgodị mgbe ọ dị mkpa ka a dọsie mmadụ aka ná ntị ike, e kwesịrị iji ịhụnanya mee ya, o kwesịghịkwa ịgafe ókè.—Taị. 1:13.
Ndị a na-adọ aka ná ntị. N’agbanyeghị otú ọ bụla e si dọọ anyị aka ná ntị, anyị ekwesịghị ịjụ ya. Kama, anyị kwesịrị ijisi ike nabata ya ma mee ihe a gwara anyị ozugbo. (Ilu 3:11, 12) Ebe anyị bụ ndị na-ezughị okè, ịdọ aka ná ntị dị anyị niile mkpa. E nwekwara ike isi n’ụzọ dị iche iche dọọ anyị ya. Ihe anyị gụtara na Baịbụl ma ọ bụ ihe anyị nụrụ n’ọmụmụ ihe nwere ike ịbụrụ anyị ịdọ aka ná ntị. Mgbe ụfọdụ, o nwekwara ike ịdị mkpa ka ọ bụrụ kọmitii ikpe ga-adọ ụfọdụ ndị aka ná ntị. Ịnabata ịdọ aka ná ntị ga-eme ka anyị dị ndụ.—Ilu 10:17.
LEENỤ VIDIO BỤ́ “ONYE JEHOVA HỤRỤ N’ANYA KA Ọ NA-ADỌ AKA NÁ NTỊ,” ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:
Olee otú Canon si eme mgbe ọ na-etolite, oleekwa otú o si gbanwee?
Olee otú Jehova si jiri ịhụnanya dọọ ya aka ná ntị?
Mụta ịna-anabata ịdọ aka ná ntị si n’aka Jehova
Gịnị ka ihe mere ya na-akụziri anyị?