Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • mwb21 Mee p. 13
  • Hụ Ndị Ezinụlọ Gị n’Anya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Hụ Ndị Ezinụlọ Gị n’Anya
  • Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2021
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ezinụlọ Unu Ga-enweli Obi Ụtọ
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
  • Ụzọ Isi Mee Ka Ndụ Ezinụlọ Gị Na-enye Obi Ụtọ
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Ndụ Ezinụlọ nke Na-atọ Chineke Ụtọ
    Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị?
  • Mkpịsị Ugodi Abụọ Na-eduga n’Alụmdi na Nwunye Na-adịgide Adịgide
    Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2021
mwb21 Mee p. 13
Ebe otu ezinụlọ na-abụ abụ n’ọmụmụ ihe.

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Hụ Ndị Ezinụlọ Gị n’Anya

Ịhụnanya na-ejikọta ezinụlọ ọnụ. Ọ bụrụ na ịhụnanya adịghị n’ezinụlọ, ọ ga-esiri ha ike ịdị n’otu ma na-emekọ ihe ọnụ. Olee otú ndị bụ́ di, ndị bụ́ nwunye, na ndị mụrụ ụmụ ga-esi na-egosi ndị ezinụlọ ha na ha hụrụ ha n’anya?

Di hụrụ nwunye ya n’anya ga na-eche banyere mkpa nwunye ya, ihe o chere, na otú obi dị ya. (Efe. 5:28, 29) Ọ ga na-egboro ezinụlọ ya mkpa ha, na-enyekwara ha aka ịbịaru Chineke nso. Ọ ga-ejidekwa n’aka na ha na-enwechi ofufe ezinụlọ anya. (1 Tim. 5:8) Nwaanyị hụrụ di ya n’anya ga-edo onwe ya n’okpuru di ya, ‘na-akwanyekwara di ya ùgwù nke ukwuu.’ (Efe. 5:22, 33; 1 Pita 3:1-6) Di na nwunye kwesịrị ịdị njikere ịna-agbaghara ibe ha kpamkpam. (Efe. 4:32) Ndị nne na nna hụrụ ụmụ ha n’anya kwesịrị igosi na ha ji onye nke ọ bụla n’ime ha kpọrọ ihe. Ha kwesịkwara ịna-akụziri ha ka ha hụ Jehova n’anya. (Diut. 6:6, 7; Efe. 6:4) Olee nsogbu ndị ụmụ ha na-enwe n’ụlọ akwụkwọ? Gịnị ka ha na-eme iji zere ime ihe ọjọọ ndị ọgbọ ha na-achọ ka ha mee? Ọ bụrụ na ịhụnanya adị n’ezinụlọ, obi ga-eru mmadụ niile nọ na ya ala.

LEENỤ VIDIO BỤ́ NỌGIDE NA-AHỤ NDỊ EZINỤLỌ GỊ N’ANYA, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Foto si na vidio bụ́, ‘Nọgide Na-ahụ Ndị Ezinụlọ Gị n’Anya.’ Ebe otu di na nwunye nọ na-ekwurịta banyere otu amaokwu Baịbụl mgbe ha lọtara ọmụmụ ihe.

    Olee otú di hụrụ nwunye ya n’anya si elekọta ya ma jiri ya kpọrọ ihe?

  • Foto si na vidio bụ́, ‘Nọgide Na-ahụ Ndị Ezinụlọ Gị n’Anya.’ Ebe otu nwanna nwaanyị nke si ọmụmụ ihe lọta medara obi na-agwa di ya na-abụghị Onyeàmà Jehova okwu.

    Olee otú nwaanyị hụrụ di ya n’anya si egosi na ọ na-akwanyere di ya ùgwù nke ukwuu?

  • Foto si na vidio bụ́, ‘Nọgide Na-ahụ Ndị Ezinụlọ Gị n’Anya.’ Ebe otu ezinụlọ si ọmụmụ ihe lọta na-ekwurịta ihe ndị ha mụtara ma na-atatụ biskit.

    Olee otú nne na nna hụrụ ụmụ ha n’anya si akụnye Okwu Chineke n’ime ụmụ ha?

KPACHARA ANYA MAKA EKWENTỊ NA IHE NDỊ YIRI YA

Ọ bụrụ na ezinụlọ akpacharaghị anya, ha nwere ike iji oge ha kwesịrị iji na-abịarukwu ibe ha nso na-apị ekwentị na ihe ndị yiri ya. Ndị nne na nna nwere ike ile ma hà ga-ekwu oge ọ ga-abụ o ruo, onye ọ bụla akwụsị ịpị ekwentị ya, ma hanwa ma ụmụ ha. Ọ dịkwa mkpa ka ndị nne na nna kpebie ma ụmụ ha ndị na-eto eto hà ga na-eso ndị ọzọ akparịta ụka n’Ịntanet nakwa ndị ha na ha ga na-akparịta ụka n’ebe ahụ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya