Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • mwb22 Mee p. 11
  • Na-achịkwa Ọchịchọ Gị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Na-achịkwa Ọchịchọ Gị
  • Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2022
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Ka M Kwesịrị Ịma Gbasara Ịṅụ Sịga Nkịtị na nke Ọgbara Ọhụrụ?
    Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
  • Gịnị ka m kwesịrị ịma banyere ịṅụ sịga?
    Teta!—2011
  • Mmadụ Ịṅụ Sịga Ọ̀ Dị Chineke Mma?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Olee Otú Ị Pụrụ Isi Guzogide Ọchịchọ Na-ezighị Ezi?
    Teta!—2003
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2022
mwb22 Mee p. 11

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Na-achịkwa Ọchịchọ Gị

Ebe anyị bụ ndị na-ezughị okè, anyị ga na-agba mbọ mgbe niile na-achịkwa ọchịchọ anyị. Ọ bụrụ na anyị ahapụ ịchịkwa ya, o nwere ike ime ka anyị na Jehova ghara ịdị ná mma. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ na-ekwe ka ọchịchọ inweta ihe oriri, uwe, na ebe obibi mee ka ịhụnanya ha nwere n’ebe Chineke nọ belata. Ndị ọzọ na-enwe mmekọahụ rụrụ arụ n’agbanyeghị na o megidere iwu Chineke. (Rom 1:​26, 27) E nwekwara ndị nke na-eme ihe ọjọọ ndị ọgbọ ha na-agwa ha mee n’ihi na ha achọghị ka ndị ọgbọ ha na-akpapụ ha iche.​—Ọpụ. 23:2.

Gịnị ga-enyere anyị aka ịna-achịkwa ọchịchọ anyị? Anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ka uche anyị na-adị n’ihe gbasara ofufe Chineke. (Mat. 4:4) Anyị kwesịkwara ịrịọ Jehova ka o nyere anyị aka ịna-achịkwa ọchịchọ anyị. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ọ ma ihe ga-akacha abara anyị uru. Ọ makwa otú ọ ga-esi enye anyị ihe ndị dị mma na-agụ anyị agụụ.​—Ọma 145:16.

LEENỤ VIDIO BỤ́ EKWELA KA SỊGA LAA NDỤ GỊ N’IYI, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Foto si na vidio bụ́ “Ekwela Ka Sịga Laa Ndụ Gị n’Iyi.” Ebe ụmụ bebi kwụ n’ahịrị na-abanye n’ígwè ọrụ na-eme ka ha bido ịṅụ sịga.

    Olee ihe mere ụfọdụ ndị ji aṅụ sịga?

  • Foto si na vidio bụ́ “Ekwela Ka Sịga Laa Ndụ Gị n’Iyi.” Ebe akpa ume onye na-aṅụ sịga na-akwasi ụkwara ike.

    Olee nsogbu ịṅụ sịga nwere ike ịkpatara gị?

  • Foto si na vidio bụ́ “Ekwela Ka Sịga Laa Ndụ Gị n’Iyi.” Ebe otu nwoke buru ezigbo ibu ji ihe e ji egbu azụ̀ o tinyere sịga elektrọnik na ya na-achọ ịrata otu nwa agbọghọ.

    Gịnị mere ịṅụ sịga ji dị njọ, ma nke nkịtị ma nke elektrọnik?​—2 Kọr. 7:1

  • Foto si na vidio bụ́ “Ekwela Ka Sịga Laa Ndụ Gị n’Iyi.” Ebe otu nwa agbọghọ nọ n’elu ụlọ na-ele anya n’eluigwe mgbe anwụ na-acha.

    Ị ga-emerili agụụ ịṅụ sịga

    Gịnị ga-enyere gị aka ịjụ ịṅụ sịga ma ọ bụ ịkwụsị ịṅụ ya?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya