Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wp21 nke 1 p. 3-4
  • Ihe Ndị Mmadụ Na-ekwu Gbasara Ekpere

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Ndị Mmadụ Na-ekwu Gbasara Ekpere
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2021
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Bịaruo Chineke Nso n’Ekpere
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Ikpe Ekpere Ọ̀ Na-arụpụta Ezi Ihe Ọ Bụla?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Chineke Meere Anyị Ihe Ọma Kwe Ka Anyị Na-ekpegara Ya Ekpere
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
  • Ekpere Ga-enyere Gị Aka Ịbịaru Chineke Nso
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2021
wp21 nke 1 p. 3-4
Ebe ndị mmadụ nọ n’ebe dị iche iche n’ụwa na-ekpe ekpere, na-achọ ka Chineke duzie ha.

Ihe Ndị Mmadụ Na-ekwu Gbasara Ekpere

“Ọ na-abụ m na-ekpe ekpere, ọ na-adị m ka Chineke ọ̀ nọ m n’akụkụ, jide m n’aka ma na-eduzi m mgbe m na-amaghị ihe m ga-eme.”​—MARÍA.

“Nwunye m rịara ọrịa kansa afọ iri na atọ, mechaa nwụọ. M chetara n’oge ahụ na m na-ekpe ekpere kwa ụbọchị, amakwa m na Chineke nọ na-anụ arịrịọ m na-arịọ ya n’ihi nsogbu m nọ na ya. O mere ka obi ruo m ala.”​—RAÚL.

“Ekpere bụ ezigbo onyinye Chineke nyere ụmụ mmadụ.”​—ARNE.

Ị jụọ María, Raúl, Arne, na ọtụtụ ndị ọzọ, ha ga-agwa gị na ekpere bụ onyinye pụrụ iche. Ha weere ekpere ka otú ha ga-esi agwa Chineke okwu, kelee ya ma rịọ ya maka enyemaka. Ha ji obi ha niile kweta na ihe Baịbụl kwuru gbasara ikpegara Chineke ekpere bụ eziokwu. Baịbụl sịrị: “Obi ike anyị nwere n’ebe ọ nọ bụ na ihe ọ bụla anyị rịọrọ ya nke dabara n’uche ya, ọ na-anụ olu anyị.”​—1 Jọn 5:14.

Ma, ọ na-esiri ọtụtụ ndị ike ikweta ihe Baịbụl kwuru gbasara ekpere. Otu nwoke aha ya bụ Steve kwuru otú yanwa si ele ekpere anya. Ọ sịrị: “Mgbe m dị afọ iri na asaa, ndị enyi m atọ nwụrụ n’ihe mberede. Onye nke mbụ nwụrụ n’ihe mberede okporo ụzọ, mmiri erie abụọ ndị nke ọzọ.” Gịnị ka Steve mere? Ọ sịrị: “M jụrụ Chineke n’ekpere ihe mere ihe ndị a ji mee, ma ọ zaghị m ihe ọ bụla. N’ihi ya, m jụrụ onwe m, sị: ‘È nwekwaranụ uru ekpere bara?’” Ọtụtụ ndị chere na ọ baghị uru ịna-ekpe ekpere ebe ọ bụ na ọ dị ha ka a zaghị ndị nke ha kpere ekpe.

E nwekwara ihe ndị ọzọ mere ụfọdụ ndị ji eche na ikpe ekpere abaghị uru. Ha na-asị na ebe ọ bụ na Chineke ma ihe niile, ọ pụtara na ọ ma ihe ndị dị anyị mkpa na nsogbu anyị. N’ihi ya, ọ baghị uru ikpewe ekpere.

Ndị ọzọ chere na Chineke achọghị ịnụ ekpere ha n’ihi ihe ọjọọ ndị ha mere n’oge gara aga. Otu nwaanyị aha ya bụ Jenny kwuru, sị: “Nsogbu kachanụ m nwere bụ na m na-eche na e nweghị uru m bara. Ihe ọjọọ ndị m mere n’oge gara aga na-ewute m. N’ihi ya, m gwara onwe m na erughị m eru Chineke ịza ekpere m.”

Ebe otu nwaanyị nọ na chọọchị na-eleli anya elu mgbe ọ na-ekpe ekpere, ndị ọzọ ekpudo ihu n’ala na-ekpe nke ha.

Olee otú gịnwa si were ikpe ekpere? Ọ bụrụ na e nwetụla mgbe ọ dị gị ka e nweghị uru ikpe ekpere bara, ka obi sie gị ike na Baịbụl ga-azali ajụjụ ọ bụla i nwere gbasara ekpere. Obi kwesịrị isi anyị ike na ihe ọ bụla Baịbụl kwuru gbasara ekperea bụ eziokwu. Baịbụl nwekwara ike inyere gị aka ịmata azịza ajụjụ ndị a:

  • Chineke ọ̀ na-anụ ekpere anyị n’eziokwu?

  • Gịnị mere Chineke anaghị aza ekpere ụfọdụ?

  • Olee otú ị ga-esi ekpe ekpere ka Chineke nụ ya?

  • Olee uru ekpere ga-abara gị?

a E dere ekpere ọtụtụ ndị ohu Chineke kpere na Baịbụl, ma ndị nke Jizọs Kraịst kpere. E nwere ekpere karịrị otu narị na iri ise (150) n’Akwụkwọ Nsọ Hibru, nke a na-akpọkarị Agba Ochie.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya