Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wp21 nke 1 p. 10-13
  • Olee Otú Ị Ga-esi Ekpe Ekpere Chineke Anụ Ya?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Otú Ị Ga-esi Ekpe Ekpere Chineke Anụ Ya?
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2021
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • NA-EKPEGARA JEHOVA CHINEKE EKPERE N’AHA JIZỌS
  • SI N’OBI GỊ NA-AGWA CHINEKE OKWU
  • NA-EKPE EKPERE OTÚ DABARA N’UCHE CHINEKE
  • OLEE IHE ANYỊ NWERE IKE IKPE N’EKPERE?
  • NA-ENWE NDIDI, NỌGIDEKWA NA-EKPE EKPERE
  • Ekpere Ga-enyere Gị Aka Ịbịaru Chineke Nso
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Chineke Meere Anyị Ihe Ọma Kwe Ka Anyị Na-ekpegara Ya Ekpere
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
  • Ịbịaru Chineke Nso n’Ekpere
    Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị?
  • Bịaruo Chineke Nso n’Ekpere
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2021
wp21 nke 1 p. 10-13

Olee Otú Ị Ga-esi Ekpe Ekpere Chineke Anụ Ya?

Jehova Chineke bụ “Onye na-anụ ekpere.” (Abụ Ọma 65:2) Anyị nwere ike ịgwa ya okwu n’ebe ọ bụla nakwa n’oge ọ bụla. Anyị nwekwara ike ịgwa ya okwu n’ime obi anyị ma ọ bụ kwupụta ya ekwupụta. Jehova chọrọ ka anyị na-akpọ ya “Nna.” Ọ bụkwa ya bụ Nna kacha mma anyị nwere ike inwe. (Matiu 6:9) Jehova na-akụziri anyị otú anyị ga-esi na-ekpe ekpere ka ọ nụ ya maka na ọ hụrụ anyị n’anya.

NA-EKPEGARA JEHOVA CHINEKE EKPERE N’AHA JIZỌS

“Ọ bụrụ na unu arịọ Nna m ihe ọ bụla, ọ ga-enye ya unu n’aha m.”​—Jọn 16:23.

Ihe a Jizọs kwuru gosiri na Jehova achọghị ka anyị si n’aka ndị sent, ndị mmụọ ozi, ma ọ bụ ndị nna ochie nwụrụ anwụ na-ekpegara ya ekpere ma ọ bụkwanụ jiri ihe oyiyi na-ekpe ya. Kama, ọ chọrọ ka anyị na-ekpe ekpere n’aha Jizọs Kraịst. Anyị kpegara Chineke ekpere n’aha Jizọs, anyị na-egosi na anyị ghọtara na ihe mere Chineke ji anụ ekpere anyị bụ maka ihe Jizọs meere anyị. Jizọs kwuru, sị: “E nweghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ bụrụ na o sighị na m.”​—Jọn 14:6.

SI N’OBI GỊ NA-AGWA CHINEKE OKWU

“Gwanụ ya ihe niile dị unu n’obi.”​—Abụ Ọma 62:8.

Anyị gwawa Jehova okwu n’ekpere, anyị kwesịrị ịgwa ya okwu otú anyị si agwa nna anyị hụrụ anyị n’anya. Kama ịgụwara ya ihe e dere n’akwụkwọ ma ọ bụ gwawa ya ihe anyị bu n’isi, anyị kwesịrị iji nkwanye ùgwù gwa ya okwu, gwakwa ya ihe dị anyị n’obi.

NA-EKPE EKPERE OTÚ DABARA N’UCHE CHINEKE

“Ihe ọ bụla anyị rịọrọ ya nke dabara n’uche ya, ọ na-anụ olu anyị.”​—1 Jọn 5:14.

Na Baịbụl, Jehova Chineke gwara anyị ihe ọ ga-emere anyị na ihe ọ chọrọ ka anyị meere ya. Anyị chọọ ka Chineke nụ ekpere anyị, anyị kwesịrị ikpe ya otú “dabara n’uche ya.” Ka anyị nwee ike ime ya, anyị kwesịrị ịmụ Baịbụl ka anyị mata Chineke nke ọma. Anyị mee ya, ekpere anyị ga na-eme ya obi ụtọ.

OLEE IHE ANYỊ NWERE IKE IKPE N’EKPERE?

Ebe otu ezinụlọ na-ekpe ekpere tupu ha amalite iri nri.

Na-arịọ Maka Ihe Ndị Dị Gị Mkpa. Anyị nwere ike ịrịọ Chineke maka ihe ndị dị anyị mkpa kwa ụbọchị, dị ka nri, uwe, na ebe obibi. Anyị nwekwara ike ịrịọ Chineke maka amamihe ka anyị nwee ike ịna-eme mkpebi dị mma, rịọkwa ya ka o nye anyị ike anyị ga-eji na-edi nsogbu ndị na-abịara anyị. Anyị nwere ike ịrịọ ya ka o mee ka anyị nwee okwukwe, ka ọ gbaghara anyị mmehie anyị, nyekwara anyị aka.​—Luk 11:3, 4, 13; Jems 1:5, 17.

Ebe otu nwoke na-ekpere nwunye ya na-arịa ọrịa ekpere.

Na-ekpe Ekpere Maka Ndị Ọzọ. Obi na-atọ ndị nne na nna hụrụ ụmụ ha n’anya ụtọ ma ụmụ ha hụ ibe ha n’anya. Jehova chọkwara ka ụmụ ya nọ n’ụwa na-eche banyere ibe ha. Ọ dị mma anyị ikpe ekpere maka di ma ọ bụ nwunye anyị, ụmụ anyị na ikwu na ibe anyị. Jems onye na-eso ụzọ Jizọs kwuru, sị: “Na-ekpekwaranụ ibe unu ekpere.”​—Jems 5:16.

Ebe otu nwoke na-aga ije n’ọhịa n’oge mgbede.

Na-ekele Chineke. Baịbụl kwuru gbasara Onye kere anyị, sị: “Ọ na-eme ka mmiri si n’eluigwe zooro unu, na-eme ka mkpụrụ unu kụrụ na-amị n’oge ya n’uju, na-enye unu nri hiri nne, na-emekwa ka unu na-enwe obi ụtọ.” (Ọrụ Ndịozi 14:17) Anyị chee banyere ihe niile Chineke meere anyị, ọ ga-eme ka anyị na-ekele ya n’ekpere anyị. Ụzọ ọzọ anyị ga-esi na-ekele Chineke bụ irubere ya isi.​—Ndị Kọlọsi 3:15.

NA-ENWE NDIDI, NỌGIDEKWA NA-EKPE EKPERE

Mgbe ụfọdụ, anyị si n’obi anyị kpee ekpere ma Chineke azaghị ya ngwa ngwa, o nwere ike iwute anyị. Ànyị ga-eji maka ya sị na Chineke anaghị eche banyere anyị? Mbanụ! Ka anyị leba anya n’ihe atụ ndị gosiri na o nwere ike ịdị mkpa ka anyị nọgide na-ekpe ekpere.

Steve anyị kwuru okwu ya n’isiokwu mbụ dị n’Ụlọ Nche a sịrị: “A sị na ọ bụghị na m nọgidere na-ekpe ekpere, ọ gaara abụ na nke m na-eme agwụla kemgbe.” Gịnị nyeere ya aka ịgbanwe otú o si ele ekpere anya? Ọ malitere ịmụ Baịbụl ma mụta na ọ dị mkpa ikpe ekpere na ịnọgide na-ekpe ya. Ọ sịrị: “M kpere ekpere kelee Chineke maka otú ndị enyi m si nyere m aka. Obi dị m ezigbo ụtọ ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ.”

Oleekwanụ maka Jenny, onye chere na ya erughị eru ka Chineke nụ ekpere ya? Ọ sịrị: “N’oge ọ kacha dị m ka abaghị m uru, m rịọrọ Chineke ka o nyere m aka ịghọta ihe mere o ji adị m otú ahụ.” Olee otú ihe a Jenny mere si nyere ya aka? Ọ sịrị: “Ịgwa Chineke okwu emeela ka m na-ele onwe m anya otú Chineke si ele m anya. O meela ka m mata na ọ bụrụgodị na obi m na-ama m ikpe, Chineke anaghị ama m ikpe. O meekwala ka ike ụwa ghara ịgwụ m.” Olee uru ọ baara ya? Ọ sịrị: “Ekpere emeela ka m mata na Jehova dị adị, na ọ hụrụ m n’anya, na-eche banyere m, bụrụ Nna m, Enyi m, nakwa Onye na-enyere m aka mgbe ọ bụla m kpọrọ ya ma ọ bụrụhaala na mụ anọgide na-eme ihe ọ chọrọ.”

Isabel, di ya, na nwa ha nwoke.

Isabel sịrị na ọ hụ Gerard nwa ya nwoke ka ọ na-enwe obi ụtọ n’agbanyeghị na o nwere nkwarụ, ‘ọ na-aghọta n’eziokwu na Jehova ji ya za ya ekpere’

Ka anyị lebakwa anya n’ihe mere Isabel. Mgbe ọ dị ime, dọkịta ya gwara ya na nwa ya ga-ebu nkwarụ pụta ụwa. Obi gbawara ya. Ụfọdụ ndị gwadịrị ya ka o tee ime ahụ. Ọ sịrị: “Ọ dị m nnọọ ka m̀ na-aga ịnwụ n’ihi otú obi si gbawaa m.” Gịnị ka o mere? Ọ sịrị: “M kpere ekpere ọtụtụ ugboro ka Chineke nyere m aka.” O mechara mụọ nwa nwoke aha ya bụ Gerard, o nwekwara nkwarụ. Isabel ò chere na Chineke zara ekpere ya? Ee. Gịnị mere o ji chee otú ahụ? Ọ sịrị: “Ọ na-abụ m na-ele nwa m nwoke a dị afọ iri na anọ ugbu a anya ka ọ na-enwe obi ụtọ n’agbanyeghị na o nwere nkwarụ, m na-aghọta n’eziokwu na Jehova ji ya za m ekpere, ọ bụkwa ya bụ ngọzi kachanụ Jehova Chineke gọziri m.”

Okwu a o si n’ala ala obi ya kwuo na-echetara anyị ihe otu ọbụ abụ kwuru. Ọ sịrị: “Jehova, ị ga-anụ arịrịọ ndị dị umeala n’obi na-arịọ gị. Ị ga-eme ka obi sie ha ike ma gee ha ntị.” (Abụ Ọma 10:17) Ihe ndị a bụ ezigbo ihe ndị kwesịrị ime ka anyị nọgide na-ekpe ekpere.

E dere ọtụtụ ekpere ndị Jizọs kpere na Baịbụl. Nke a kacha mara bụ nke ahụ ọ kụziiri ndị na-eso ụzọ ya. È nwere ihe anyị nwere ike ịmụta na ya?

Jizọs Kụziiri Anyị Otú Anyị Ga-esi Na-ekpe Ekpere

Ebe ìgwè mmadụ na-ege Jizọs ntị mgbe ọ na-akụzi ihe n’elu ugwu.

N’oge Jizọs na-akụzi ihe n’elu ugwu, o ji otu ekpere kụziere ndị na-eso ụzọ ya otú e si ekpe ekpere. A na-akpọkarị ekpere ahụ Ekpere Onyenwe Anyị. (Matiu 6:9-13; i nwere ike ịgụ Luk 11:2-4.) Kemgbe ahụ, ekpere a aghọọla ekpere a ma ama nke na ọtụtụ ndị eburula ya n’isi ma na-ekwughachi ya otú ahụ e si dee ya. Jizọs ò bu n’obi ka ndị mmadụ buru ya n’isi? Mba, n’ihi na Jizọs ebula ụzọ gwa ndị na-eso ụzọ ya ka ha ghara ikwughachi otu ihe ugboro ugboro n’ekpere. (Matiu 6:7) Kama, Jizọs nọ na-akụziri ndị na-eso ụzọ ya otú ha ga-esi na-ekpe ekpere na ihe ndị ha ga-ekpe n’ekpere. Ka anyị lee ihe anyị nwere ike ịmụta n’ekpere Onyenwe Anyị ahụ.

“Nna anyị nke bi n’eluigwe”

  • Ọ bụ naanị Chineke ka anyị kwesịrị ikpegara ekpere.

“Ka e doo aha gị nsọ”

  • E kwesịrị ịkwanyere aha Chineke bụ́ Jehova ùgwù, werekwa ya ka aha dị nsọ.

“Ka Alaeze gị bịa”

  • Alaeze Chineke bụ ọchịchị dị n’eluigwe, nke Jizọs bụ Eze ya. Ọ ga-achịkwa ụwa niile n’oge na-adịghị anya.

“Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe”

  • Uche Chineke bụ ka ụmụ mmadụ dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi n’ụwa, ha anọrọ n’udo, obi eruokwa ha ala.

“Nye anyị nri taa maka ụbọchị taa”

  • Ọ bụ Jehova na-enye anyị ihe ndị dị anyị mkpa iji dị ndụ.

“Gbaghara anyị ụgwọ anyị ji”

  • Anyị niile na-emejọ ọtụtụ ihe, na-achọkwa ka a na-agbaghara anyị.

Iburu ihe ndị a n’obi ga-enyere anyị aka ịna-ekpe ekpere otú kwesịrị ekwesị.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya