Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wp21 nke 1 p. 14-15
  • Uru Ekpere Nwere Ike Ịbara Gị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Uru Ekpere Nwere Ike Ịbara Gị
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2021
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Uru Ekpere Ga-abara Gị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Bịaruo Chineke Nso n’Ekpere
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Chineke Meere Anyị Ihe Ọma Kwe Ka Anyị Na-ekpegara Ya Ekpere
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
  • Ekpere Ga-enyere Gị Aka Ịbịaru Chineke Nso
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2021
wp21 nke 1 p. 14-15

Uru Ekpere Nwere Ike Ịbara Gị

Otu nwaanyị aha ya bụ Pamela gara ụlọ ọgwụ n’ihi ọrịa kansa ọ na-arịa. Ọ rịọrọ Chineke ka o nye ya ike ọ ga-eji na-edi nsogbu a ya na ya na-alụ. È nwere uru ekpere a o kpere baara ya?

Pamela sịrị: “Ezigbo ụjọ tụrụ m mgbe a na-agwọ m ọrịa kansa a. Ma mgbe m kpegaara Jehova Chineke ekpere, ahụ́ bịara ruo m ala, mụ akwụsịkwa ụjọ m na-atụ. Ahụ́ ka na-egbu m ezigbo mgbu, ma ekpere na-enyere m aka ịna-edi nsogbu m. Ndị mmadụ jụọ m otú m mere, m na-agwa ha, sị: ‘Ahụ́ adịghị m, ma obi dị m ụtọ.’”

Ma, anyị ekwesịghị ichere ka ezigbo nsogbu bịara anyị tupu anyị ekpee ekpere. Nsogbu na-abịara anyị niile, ma nnukwu nsogbu ma obere nsogbu, anyị makwa na anyị chọrọ enyemaka iji merie ha. Ekpere ò nwere ike inyere anyị aka?

Baịbụl sịrị: “Bunye Jehova ibu na-anyịgbu gị. Ọ ga-enyere gị aka. E nweghị mgbe ọ ga-ahapụ onye ezi omume ka ọ daa.” (Abụ Ọma 55:22) Ihe a Baịbụl kwuru na-akasi anyị obi. Oleekwanụ otú ekpere ga-esi nyere gị aka? Ọ bụrụ na i kpegara Chineke ekpere otú kwesịrị ekwesị, ọ ga-enye gị ihe ndị dị gị mkpa iji die nsogbu gị.​—Gụọ igbe isiokwu ya bụ “Ihe Ekpere Ga-emere Gị.”

Ihe Ekpere Ga-emere Gị

Ọ ga-eme ka obi ruo gị ala

Ebe ọchụnta ego a chụburu n’ọrụ na-amụmụ ọnụ ọchị, obi sikwara ya ike.

“Ọ bụ otú unu ga-esi mee ka ọ mara ihe unu na-arịọ. Udo Chineke na-enye, nke karịrị nghọta mmadụ, ga-esi n’aka Kraịst Jizọs chee obi unu na echiche unu nche.” (Ndị Filipaị 4:6, 7) Ọ bụrụ na ị kọọrọ Chineke nsogbu gị, ọ ga-eme ka obi ruo gị ala, meekwa ka ị mara ihe ị ga-eme n’oge nsogbu.

Ọ ga-eme ka i nweta amamihe si n’aka Chineke

Ebe nwaanyị na-agụpụtabu ekpere e dere n’akwụkwọ ekpere na-agụ Baịbụl n’ụlọ ya.

“Ọ bụrụkwa na e nwere onye n’ime unu chọrọ amamihe, ya na-arịọ Chineke n’ihi na Chineke na-emesapụrụ mmadụ niile aka. Ọ gaghị ewesa ya iwe, kama ọ ga-emere ya ihe ọ rịọrọ.” (Jems 1:5) E nwee ihe na-echegbu anyị, anyị anaghị emekarị ezigbo mkpebi. Ma, ọ bụrụ na i kpee ekpere rịọ Chineke ka o nye gị amamihe, o nwere ike ime ka i cheta ihe ndị dị n’Okwu ya bụ́ Baịbụl ga-enyere gị aka.

Ọ ga-eme ka ị dị ike, kasiekwa gị obi

Ebe di na nwunye nọbu n’ụlọ ọgwụ na-agagharị n’ogige ebe a na-atụrụ ndụ. Nwoke ahụ ji nwayọọ na-enyere nwunye ya aka ka o jiri mkpara na-aga ije.

“N’ihe niile, onye ahụ nke na-eme ka m dị ike na-enye m ike.” (Ndị Filipaị 4:13) Ebe Jehova bụ Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, o nwere ike inye gị ike ị ga-eji emeri ọnwụnwa ndị na-abịara gị nakwa ike ị ga-eji edi nsogbu gị. (Aịzaya 40:29) Baịbụl kpọkwara Jehova “Chineke nke na-akasi ndị mmadụ obi n’ụdị ọnọdụ niile ha nọ.” O nwere ike ịkasi anyị obi “n’ọnwụnwa niile na-abịara anyị.”​—2 Ndị Kọrịnt 1:3, 4.

EKPERE Ọ̀ GA-ABARA GỊ URU?

Nke bụ́ eziokwu bụ na Jehova anaghị amanye gị amanye ka ị na-ekpegara ya ekpere. Kama, ọ na-agwa gị ka i mee otú ahụ maka na ọ hụrụ gị n’anya. (Jeremaya 29:11, 12) Ọ bụrụkwanụ na ọ dị gị ka Chineke azaghị ekpere gị n’oge gara aga? Adala mbà. Ndị nne na nna hụrụ ụmụ ha n’anya nwere ike hapụ imere ụmụ ha ihe otú ụmụ ha chọrọ ma ọ bụkwanụ ghara imere ha ihe ahụ ozugbo. O nwere ike ịbụ na ha nwere ụzọ ọzọ ka mma ha chọrọ isi meere ụmụ ha ihe ahụ. Ma, otu ihe doro anya bụ na ndị nne na nna hụrụ ụmụ ha n’anya na-enyere ha aka.

Jehova Chineke, bụ́ Nna kacha hụ anyị n’anya, chọrọ inyere gị aka. Ọ bụrụ na i wetuo obi chebara ihe ndị anyị lebarala anya echiche, gbalịakwa na-eme ha eme, Chineke ga-esi n’ụzọ kacha mma za ekpere gị.​—Abụ Ọma 34:15; Matiu 7:7-11.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya