Okwu mmalite
Ihe ndị na-eme n’ụwa hà na-egosi na ọgwụgwụ ụwa dị nso? Ọ bụrụ na ọ bụ ihe ha na-egosi, ò nwere ihe anyị ga-eme ka a ghara ibibi anyị? Gịnị ga-eme ma ụwa gwụ? Isiokwu ndị gbara n’Ụlọ Nche a ga-akọwa ihe Baịbụl zara n’ajụjụ ndị a. Ha ga-akasikwa anyị obi.