Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w21 Jun p. 20-24
  • Emekwala Ka “Ndị A Dị Nta” Sụọ Ngọngọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Emekwala Ka “Ndị A Dị Nta” Sụọ Ngọngọ
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • OLE NDỊ BỤ “NDỊ A DỊ NTA”?
  • NA-EWERE YA NA NDỊ ỌZỌ KA GỊ
  • NA-EJI ‘OBI GỊ NIILE’ AGBAGHARA
  • EKWELA KA E MEE KA Ị SỤỌ NGỌNGỌ
  • ‘Werenụ Amara Na-agbaghara Onwe Unu’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Na-agbagharanụ Ibe Unu Kpamkpam
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Nye Aka Mee Ka Ọgbakọ Dịrị n’Otu
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Na-ahụkwu Jehova na Ụmụnna Gị n’Anya
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
w21 Jun p. 20-24

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 25

Emekwala Ka “Ndị A Dị Nta” Sụọ Ngọngọ

“Ya enwekwala ihe ga-eme ka unu ledaa otu n’ime ndị a dị nta anya.”​—MAT. 18:10.

ABỤ NKE 113 Udo Anyị Nwere

IHE ISIOKWU A NA-EKWUa

1. Gịnị ka Jehova meere onye nke ọ bụla n’ime anyị?

JEHOVA adọtala onye ọ bụla n’ime anyị n’ebe ọ nọ. (Jọn 6:44) Chegodị ihe nke ahụ pụtara. Ka Jehova na-enyocha ọtụtụ ijeri mmadụ bi n’ụwa, ọ hụrụ ihe dị mma n’ime gị. Jehova hụrụ na ị chọrọ ife ya nakwa na ị ga-ahụli ya n’anya. (1 Ihe 28:9) Jehova maara gị. Ọ na-aghọta gị, hụkwa gị n’anya. Ihe a na-akasi anyị obi.

2. Olee ihe atụ Jizọs mere iji kọwaa otú Jehova si were onye nke ọ bụla n’ime atụrụ ya?

2 Jehova ji gị kpọrọ ihe, jirikwa ụmụnna gị kpọrọ ihe. Iji mee ka nke a doo anya, Jizọs ji Jehova tụnyere onye na-azụ atụrụ. Ọ bụrụ na otu n’ime otu narị atụrụ onye na-azụ atụrụ nwere akpafuo, gịnị ka ọ ga-eme? Ọ ga-ahapụ “iri itoolu na itoolu fọrọ afọ n’elu ugwu gaa chọwa nke ahụ kpafuru akpafu.” Ọ bụrụ na ọ chọta nke ahụ furu efu, ọ naghị abara ya mba na ọ kpafuru. Kama, ọ na-aṅụrị ọṅụ. Ihe ọ pụtara bụ na atụrụ nke ọ bụla bara uru n’anya Jehova. Jizọs kwuru, sị: “Otú ahụ kwa ka ọ na-adịghị Nna m nke bi n’eluigwe mma ka otu n’ime ndị a dị nta laa n’iyi.”​—Mat. 18:​12-14.

3. Gịnị ka anyị ga-eleba anya na ya n’isiokwu a?

3 Anyị agaghị achọ ime ihe ọ bụla ga-eme ka nwanna anyị daa mbà. Olee otú anyị ga-esi zere ime ka ndị ọzọ sụọ ngọngọ? Olee ihe anyị ga-eme ma ọ bụrụ na mmadụ emee anyị ihe ọjọọ? Anyị ga-aza ajụjụ ndị a n’isiokwu a. Ma, ka anyị buru ụzọ mụtakwuo banyere “ndị a dị nta” e kwuru okwu ha na Matiu isi iri na asatọ.

OLE NDỊ BỤ “NDỊ A DỊ NTA”?

4. Ole ndị bụ “ndị a dị nta”?

4 “Ndị a dị nta” bụ ndị na-eso ụzọ Jizọs, ma nwata ma okenye. N’agbanyeghị afọ ole ha dị, ha dị ka “ụmụntakịrị” n’ihi na ha dị njikere ige ntị n’ihe ọ bụla Jizọs ga-akụziri ha. (Mat. 18:3) N’agbanyeghị na ha si n’ebe dị iche iche, omenala ha, echiche ha, na àgwà ha adịrịkwa iche iche, ha niile kweere na Jizọs, yanwa hụkwara ha n’anya.​—Mat. 18:6; Jọn 1:12.

5. Olee otú obi na-adị Jehova ma ọ bụrụ na mmadụ emee ka ndị na-efe ya sụọ ngọngọ ma ọ bụ mee ha ihe ọjọọ?

5 ‘Ndị a niile dị nta’ bara uru n’anya Jehova. Iji ghọta otú Jehova si were ha, chegodịnụ otú anyịnwa si ewere ụmụaka. Anyị ji ha kpọrọ ihe. Anyị chọrọ ichebe ha n’ihi na anyị ma na ha adịghị ike, ha enwechaghịkwa amamihe dị ka ndị okenye. Ọ bụ eziokwu na anyị achọghị ka e mee onye ọ bụla ihe ọjọọ, ma ọ na-ewe anyị iwe karịchaa ma mmadụ mee ụmụaka ihe ọjọọ. Jehova chọkwara ichebe anyị. Ọ na-ewe ya ezigbo iwe ma ọ bụrụ na onye ọ bụla emee ka ndị na-efe ya sụọ ngọngọ ma ọ bụ mee ha ihe ọjọọ.​—Aịza. 63:9; Mak 9:42.

6. Dị ka e kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt 1:​26-29, olee otú ụwa si ele ndị na-eso ụzọ Jizọs anya?

6 Olee ụzọ ọzọ ndị na-eso ụzọ Jizọs si dị ka ‘ndị dị nta’? Olee ndị ụwa ji kpọrọ ihe taa? Ọ bụ ndị bara ọgaranya, ndị a ma ama, na ndị dị ike. N’anya ha, ndị na-eso ụzọ Jizọs enweghị ihe ha bụ. Ha bụ ‘ndị dị nta’ ọ na-enweghị ihe e ji ha kpọrọ. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 1:​26-29.) Ma, Jehova esighị otú ahụ na-ele ha anya.

7. Olee otú Jehova chọrọ ka anyị si na-emeso ụmụnna anyị ihe?

7 Jehova hụrụ ndị ohu ya niile n’anya n’agbanyeghị ma hà efeela ya ọtụtụ afọ ma ọ bụkwanụ na ha ka bidoro ife ya ọhụrụ. Ụmụnna anyị niile bara uru n’anya Jehova. Anyị kwesịkwara iwere ha ka ndị bara uru. Anyị kwesịrị ịhụ “ụmụnna niile n’anya,” ọ bụghị naanị ụfọdụ n’ime ha. (1 Pita 2:17) Anyị kwesịrị ime ka ha mata na anyị hụrụ ha n’anya ma gbalịa ka anyị ghara imejọ ha. Ọ bụrụ na anyị amata na anyị mejọrọ nwanna anyị ma ọ bụkwanụ kpasuo ya iwe, anyị ekwesịghị ime ka à ga-asị na o nweghị ihe ọ bụ. Anyị ekwesịghị ịsị na ọ bụ onye iwe ọkụ nakwa na o kwesịrị ịkwụsị ya. Olee ihe mere ihe anyị mere nwere ike iji wute ụfọdụ ụmụnna anyị? Ụfọdụ ụmụnna anyị na-eche na o nweghị uru ha bara n’ihi otú e si zụlite ha. Ụfọdụ bụkwa ndị ka batara n’ọgbakọ ọhụrụ. N’ihi ya, ha amụtabeghị otú ha ga-esi na-emeso ụmụnna ha na-ezughị okè ihe. Nke ọ bụla ọ bụ, anyị kwesịrị ịgbalị na-eme ihe anyị kwesịrị ime iji hụ na anyị na ụmụnna anyị na-adị ná mma. Ihe ọzọ bụkwa na ọ bụrụ na mmadụ bụ onye obere ihe na-ewe ezigbo iwe, o kwesịrị ịgbalị gbanwee àgwà ahụ. Ọ ga-eme ka obi na-eru ya ala, meekwa ka ya na ndị mmadụ na-adị ná mma.

NA-EWERE YA NA NDỊ ỌZỌ KA GỊ

8. Olee ihe ndị mmadụ weere ka ihe dị ezigbo mkpa n’oge Jizọs, oleekwa otú o si kpaa ndị na-eso ụzọ Jizọs aka?

8 Gịnị mere Jizọs ji kwuo gbasara “ndị a dị nta”? Ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya, sị: “Ònye n’eziokwu bụ onye kacha ukwuu n’Alaeze eluigwe?” (Mat. 18:1) Ọtụtụ ndị Juu n’oge ahụ weere ịnọ n’ọkwá ukwu na ịbụ onye a ma ama ka ihe dị ezigbo mkpa. Otu ọkà mmụta sịrị: “Ihe kacha ha mkpa ná ndụ bụ ndị ọzọ ịkwanyere ha ùgwù na hanwa ịbụ ndị a ma ama.”

9. Gịnị ka ndị na-eso ụzọ Jizọs kwesịrị ime?

9 Jizọs ma na ndị na-eso ụzọ ya ga-agba ezigbo mbọ ka ha kwụsị iche na ha ka ndị ọzọ otú ahụ ndị Juu na-eme. Ọ gwara ha, sị: “Ka onye kacha ukwuu n’etiti unu dịrị ka onye kacha nta, ka onye na-edu unu bụrụkwa onye na-eje ozi.” (Luk 22:26) Anyị na-ewere onwe anyị ka ndị “kacha nta” ma ọ bụrụ na anyị na-ewere “na ndị ọzọ ka” anyị. (Fil. 2:3) Anyị na-eme otú ahụ, anyị agaghị na-eme ka ndị ọzọ sụọ ngọngọ.

10. Olee ndụmọdụ Pọl anyị kwesịrị iburu n’obi?

10 Ụmụnna anyị niile nwere otu ihe ma ọ bụ ihe ọzọ ha ji ka anyị mma. Anyị ga-achọpụta nke a ma ọ bụrụ na anyị elekwasị anya n’àgwà ọma ndị ha nwere. Anyị kwesịrị iburu n’obi ihe Pọl kwuru n’akwụkwọ ozi o degaara ndị Kọrịnt. Ọ sịrị: “Gịnị ka i nwere mere ị ga-eji chewe na ị ka onye ọzọ mma? Ọ́ bụghị Chineke nyere gị ihe niile i nwere? Ọ bụrụ na o nyere gị ihe niile, gịnị mere i ji na-anya isi ka à ga-asị na i ji ike gị nweta ha?” (1 Kọr. 4:7) Anyị ekwesịghị ịna-eme ihe ọ bụla ga-eme ka ndị ọzọ were anyị ka ndị dị ezigbo mkpa ma ọ bụkwanụ kwe ka ihe ọ bụla mee ka anyị chewe na anyị ka ndị ọzọ mma. Ọ bụrụ na nwanna nwoke ekwuo okwu nke ọma ma ọ bụkwanụ nwanna nwaanyị enwee nkà n’ịmalite ọmụmụ Baịbụl, ha kwesịrị inye Jehova otuto maka ihe ndị ahụ ha na-eme.

NA-EJI ‘OBI GỊ NIILE’ AGBAGHARA

11. Olee ihe Jizọs ji ihe atụ gbasara otu eze na ohu ya kụzie?

11 Obere oge Jizọs gwachara ndị na-eso ụzọ ya ka ha ghara ime ka ndị ọzọ sụọ ngọngọ, o meere ha ihe atụ gbasara otu eze na ohu ya. Eze ahụ kagburu ụgwọ ohu ya ahụ ji ya nke ọ na-enweghị ike ịkwụghachi. Mgbe e mechara, ohu ahụ gara hụ ohu ọzọ ji ya ụgwọ ma jụ ịgbaghara ya obere ego o ji ya. N’ikpeazụ, eze ahụ jidere ohu ahụ na-ekweghị agbaghara ohu ibe ya ma tụba ya n’ụlọ mkpọrọ. Gịnị ka anyị na-amụta na ya? Jizọs sịrị: “Otú ahụ ka Nna m nke eluigwe ga-emesokwa unu ma ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ime unu anaghị eji obi ya niile agbaghara nwanna ya.”​—Mat. 18:​21-35.

12. Olee otú obi na-adị ndị ọzọ ma anyị jụ ịgbaghara mmadụ?

12 Ohu ahụ mejọrọ onwe ya, mejọọkwa ndị ọzọ. Nke mbụ, o ji obi ọjọọ mee ka a tụba ohu ibe ya “n’ụlọ mkpọrọ ruo mgbe ọ ga-akwụ ụgwọ o ji.” Nke abụọ, ihe o mere wutere ndị ohu ndị ọzọ. Baịbụl sịrị: “Mgbe ndị ohu ibe ya hụrụ ihe merenụ, o wutere ha nke ukwuu.” Otu ahụ ka ọ dịkwa anyịnwa. Ihe anyị mere nwere ike iwute ndị ọzọ. Ọ bụrụ na mmadụ emejọọ anyị, anyị ajụ ịgbaghara ya, gịnị ka o nwere ike ịkpata? Nke mbụ, ọ ga-ewute ya n’ihi na anyị jụrụ ịgbaghara ya ma ọ bụ igosi ya ịhụnanya. Nke abụọ, ọ ga-ewutekwa ndị ọzọ anyị na ha nọ n’ọgbakọ ma ọ bụrụ na ha achọpụta na anyị na nwanna na-ese okwu.

Ebe otu nwanna nwaanyị na nwanna nwaanyị ọzọ na-ewere ya iwe nọ naanị ha n’Ụlọ Nzukọ Alaeze na-ekwurịta okwu. Foto ndị na-egosi: 1. Ebe nwanna na-ahazi ozi ọma n’Ụlọ Nzukọ kenyere ụmụnna nwaanyị abụọ ka ha rụọ n’ozi ọma, otu onye n’ime ha agbarụọ ihu. 2. Ebe ha abụọ ji obi ụtọ na-arụ n’ozi ọma.

Ị̀ ga-anọgide na-ebu iwe n’obi ka ị̀ ga-eji obi gị niile gbaghara? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13 na nke 14)b

13. Olee ihe ị mụtara n’aka otu ọsụ ụzọ?

13 Ọ bụrụ na anyị agbaghara ụmụnna anyị, ọ ga-abara anyị uru, baakwara ndị ọzọ. Ọ bụ ihe a mere otu onye ọsụ ụzọ anyị ga-akpọ Crystal. Otu nwanna nwaanyị n’ọgbakọ ha mejọrọ ya. Crystal sịrị: “Okwu ọjọọ ndị ọ gwara m dị m ka à mara m mma. Anyị nọrọ n’ozi ọma, anaghị m achọ ka mụ na ya rụọ. O mere ka ozi ọma kwụsị ịna-atọ m ụtọ, meekwa ka m ghara ịna-anụ ọkụ n’obi.” Crystal chere na e nwere ezigbo ihe mere o ji na-ewe iwe. Ma, ọ nọgideghị na-ewere nwanna nwaanyị ahụ iwe. O mere ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ nke dị n’otu isiokwu gbara n’Ụlọ Nche October 15, 1999. Isiokwu ahụ bụ “Gbaghara Site n’Obi Gị.” Ọ gbaghaara nwanna nwaanyị ahụ. Crystal sịrị: “M ghọtara na anyị niile na-agbalị iyiri mmadụ ọhụrụ ahụ nakwa na Jehova na-agbaghara anyị kwa ụbọchị. O mere ka ọ dị m ka è bupụụrụ m ezigbo ibu dị arọ, mụ ana-enwekwa obi ụtọ.”

14. Dị ka e kwuru na Matiu 18:​21, 22, olee nsogbu ọ ga-abụ na Pita onyeozi nwere? Oleekwa ihe anyị na-amụta n’ihe Jizọs gwara ya?

14 Anyị ma na anyị kwesịrị ịna-agbaghara. Ọ bụ ihe anyị kwesịrị ime. Ma, o nwere ike ịna-esiri anyị ike. Ọ ga-abụ otú ahụ ka ọ dị Pita onyeozi. (Gụọ Matiu 18:​21, 22.) Ma, olee ihe ga-enyere anyị aka? Nke mbụ, ịtụgharị uche n’otú Jehova si agbaghara anyị. (Mat. 18:​32, 33) Anyị erughị eru ka Jehova gbaghara anyị. Ma ọ na-agbaghara anyị. (Ọma 103:​8-10) “Anyị kwesịkwara ịna-ahụ ibe anyị n’anya.” Nke ahụ pụtara na ịgbaghara mmadụ abụghị ihe anyị ga-eme ma anyị chọọ. Ọ bụ ihe anyị kwesịrị imere nwanna anyị ọ bụla. (1 Jọn 4:11) Nke abụọ, ịtụgharị uche n’ihe na-eme ma ị gbaghara mmadụ. O nwere ike inyere onye ahụ anyị gbaghaara aka, mee ka ọgbakọ dị n’otu, mee ka anyị na Jehova dịrị ná mma, meekwa ka anyị nweta onwe anyị. (2 Kọr. 2:7; Kọl. 3:14) N’ikpeazụ, rịọ Onye ahụ nke gwara anyị ka anyị gbaghara ka o nyere gị aka. Ekwela ka Ekwensu mee ka gị na ụmụnna gị gharazie ịdị n’udo. (Efe. 4:​26, 27) Enyemaka Jehova dị anyị mkpa ka anyị ghara ịma n’ọnyà Ekwensu.

EKWELA KA E MEE KA Ị SỤỌ NGỌNGỌ

15. Dị ka e kwuru ná Ndị Kọlọsi 3:​13, olee ihe anyị ga-eme ma ọ bụrụ na nwanna emee ihe wutere anyị?

15 Ọ bụrụkwanụ na nwanna emee gị ihe wutere gị, gịnị ka i kwesịrị ime? Mee ihe niile i nwere ike ime ka gị na ya mee udo. Rịọ Jehova ka o nyere gị aka. Rịọ ya ka ọ gọzie onye ahụ mejọrọ gị nakwa ka o nyere gị aka ịhụ àgwà ọma ndị o nwere, ya bụ, àgwà ndị ahụ mere o ji hụ onye ahụ n’anya. (Luk 6:28) Ọ bụrụ na ị gaghị enwe ike ileghara ihe ahụ nwanna gị mere gị anya, lee ma ị̀ ga-agakwuru ya ka gị na ya kwurịta ya. Ọ na-akacha mma iwere ya na nwanna ahụ ebughị n’obi imejọ gị. (Mat. 5:​23, 24; 1 Kọr. 13:7) Mgbe gị na ya na-ekwurịta ihe ahụ, were ya na o bu ihe ọma n’obi mee ihe o mere. Ma ọ bụrụkwanụ na ọ chọghị ka gị na ya mee udo? ‘Na-ediri ya ihe.’ Ike ya agwụkwala gị. (Gụọ Ndị Kọlọsi 3:13.) Nke kacha nke, anọgidela na-eburu ya iwe n’obi n’ihi na o nwere ike imebi adịm ná mma gị na Jehova. Ekwela ka ihe ọ bụla mee ka ị sụọ ngọngọ. Ọ bụrụ na i mee otú ahụ, ị na-egosi na ị hụrụ Jehova n’anya karịa ihe ọ bụla ọzọ.​—Ọma 119:165.

16. Olee ọrụ onye ọ bụla n’ime anyị nwere?

16 Obi dị anyị ezigbo ụtọ na anyị na-efe Jehova ka “otu ìgwè atụrụ” nke nwere “otu onye ọzụzụ atụrụ.” (Jọn 10:16) N’akwụkwọ bụ́ Ndị A Haziri Ime Uche Jehova, peeji nke 165, e kwuru, sị: “I kwesịrị ịgba mbọ hụ na o nweghị ihe ga-etisa ịdị n’otu a, ebe ọ bụ na ọ na-abara gị uru.” N’ihi ya, anyị kwesịrị ịgba mbọ ka anyị “na-ele ụmụnna anyị anya otú Jehova si ele ha.” N’anya Jehova, anyị niile bụ ‘ndị dị nta’ bara uru. Ọ̀ bụ otú ahụ ka i si ewere ụmụnna gị? Jehova na-ahụ ihe niile anyị na-eme iji nyere ha aka na iji lekọta ha.​—Mat. 10:42.

17. Gịnị ka anyị kpebisiri ike ịna-eme?

17 Anyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya. N’ihi ya, anyị kpebiri na “anyị agaghị edowe ihe mkpọbi ụkwụ n’ihu nwanna ma ọ bụ mee ihe ga-eme ka o mehie.” (Rom 14:13) Anyị na-ewere ụmụnna anyị ka ndị ka anyị ukwuu. Anyị chọkwara iji obi anyị niile na-agbaghara ha. Ka anyị ghara ikwe ka ndị ọzọ mee ka anyị sụọ ngọngọ. Kama, “ka anyị na-eme ihe ọ bụla anyị nwere ike ime ka anyị na ndị ọzọ na-adị n’udo, ka anyị na-emekwa ihe ndị ga-agba ibe anyị ume.”​—Rom 14:19.

GỊNỊ KA Ị GA-AZA?

  • Ole ndị bụ “ndị a dị nta” e kwuru okwu ha na Matiu isi iri na asatọ?

  • Olee otú anyị ga-esi na-ewere ndị ọzọ ka ndị ka anyị?

  • Ọ bụrụ na o siere anyị ike ịgbaghara mmadụ ihe o mere anyị, gịnị ka anyị nwere ike ime?

ABỤ NKE 130 Na-agbaghara Ndị Ọzọ

a N’ihi ezughị okè, anyị nwere ike kwuo ma ọ bụ mee ihe wutere ụmụnna anyị. Olee ihe anyị kwesịrị ime ma ụdị ihe a mee? Ànyị na-agbalị ime ka anyị na ha dozie okwu ahụ? Ànyị na-eme ngwa ngwa rịọ ha maka ya? Ka ànyị na-asị na ọ bụrụ na o wutere ha, nke ahụ gbasara ha, ọ gbasaghị anyị? Oleekwanụ ihe anyị ga-eme ma ọ bụrụ na ihe ndị ọzọ kwuru ma ọ bụ mee na-ewekarị anyị iwe? Ànyị na-asịkarị na ọ bụ ebumpụta ụwa, ya emee ka anyị ghara ịgbanwe? Ka ànyị na-aghọta na ọ dị mkpa ka anyị gbanwee àgwà anyị?

b NKỌWA FOTO3: Ebe otu nwanna nwaanyị na-ewesara nwanna nwaanyị ọzọ nọ n’ọgbakọ ha iwe. Mgbe ha mechara dozie okwu ahụ, ha abụọ bịara dị ná mma, jirikwa obi ụtọ na-efekọ Jehova ọnụ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya