Ị̀ Maara?
Olee ụdị ụtụ isi ndị mmadụ na-atụ n’oge Jizọs?
MALITE n’oge ochie, ndị Izrel na-atụ ụtụ iji kwado ofufe Jehova. Ma, n’oge Jizọs, ụtụ isi ha na-atụ bịara dị ọtụtụ nke mere ka ndụ siere ha ike.
Nwoke ọ bụla bụ́ onye Juu na-akwụ ọkara shekel ma ọ bụ mkpụrụ ego drakma abụọ. A na-eji ego ndị ahụ azụta ihe ndị e ji achụ àjà, jirikwa ha na-elekọta ụlọ nsọ ahụ Herọd rụrụ. Ụfọdụ ndị Juu jụrụ Pita ihe Jizọs chere gbasara ịtụ ụtụ isi. Jizọs ekwughị na ọ dị njọ ịtụ ụtụ isi. Ọ gwadịrị Pita ebe ọ ga-aga weta ego ọ ga-eji tụọ ụtụ isi.—Mat. 17:24-27.
Ndị Chineke n’oge ahụ na-ewetakwa otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe ha wetara n’ubi ma ọ bụ ihe ọ bụla ha nwetara. (Lev. 27:30-32; Ọnụ Ọgụ. 18:26-28) Ndị isi okpukpe nọ na-ekwu na ndị mmadụ ga-ewetarịrị otu ụzọ n’ụzọ iri nke akwụkwọ nri ọ bụla, ma “mkpá akwụkwọ mint nakwa mkpá akwụkwọ dil nakwa mkpụrụ kọmin.” Jizọs akatọghị mmadụ iweta otu ụzọ n’ụzọ iri. Ma, ọ gbara ihu abụọ ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii n’anwụ.—Mat. 23:23.
N’oge ndị Rom na-achị ndị Juu, e nwere ụtụ dị iche iche ndị Rom kwuru ka ndị Juu na-atụrụ ha. Otu n’ime ha bụ ụtụ ha chọrọ ka ndị nwere ala na-atụ. Ha nwere ike iji ego ma ọ bụ ihe ndị ọzọ tụọ ụtụ ahụ. E kwuru na ihe ha ga-atụ nwere ike iru otu ụzọ n’ụzọ anọ ma ọ bụ otu ụzọ n’ụzọ ise nke ihe ala ahụ mepụtara. E nwekwara ụtụ isi onye Juu ọ bụla na-atụ. Ọ bụ ụtụ isi a ka ndị Farisii jụrụ Jizọs ma è kwesịrị ịna-atụ. Ihe o kwuru gosiri ha otú anyị kwesịrị isi na-ele ụtụ isi ahụ anya. Ọ sịrị: “Kwụọnụ Siza ihe Siza, ma kwụọnụ Chineke ihe Chineke.”—Mat. 22:15-22.
E nwekwara ụtụ a na-atụ maka ngwá ahịa ọ bụla na-abata ma ọ bụ na-apụ n’obodo. A na-anata ụtụ ahụ n’ọdụ ụgbọ mmiri, n’àkwà mmiri, n’ebe ụzọ wara ngalaba, n’ebe e si abata n’obodo ma ọ bụkwanụ n’ahịa.
Ụtụ a dị iche iche ndị Rom mere ka ndị Juu na-atụ mere ka ndụ na-esiri ha ike. Otu ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ onye Rom aha ya bụ Tasitọs kwuru na n’oge Jizọs nọ n’ụwa, mgbe Eze Ukwu Taịbiriọs na-achị, “ndị Siria na ndị Juu nọ na-arịọsi arịrịọ ike ka e belatara ha ụtụ ha na-atụ.”
Ihe ọzọ mere ka ụtụ ndị ahụ na-esiri ndị Juu ike bụ otú e si anakọta ya. Onye a na-enye ọrụ ịnakọta ụtụ ndị a bụ onye kacha kwụta ndị ọchịchị ụgwọ. Ọ na-esi na ya enweta uru. Onye ahụ na-agazi kpọrọ ndị ọzọ ka ha na-anakọtara ya ụtụ ndị ahụ. Hanwa na-esikwa na ya enweta uru. O yiri ka Zakịọs ò nwere ndị na-anakọtara ya ụtụ. (Luk 19:1, 2) Ka a sịkwa ihe mere na ihe a adịghị ndị mmadụ mma. Ha kpọkwara ndị ahụ na-anakọta ụtụ ndị ahụ asị.