Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w21 Septemba p. 8-13
  • Jirinụ Ndị Na-eto Eto Nọ n’Ọgbakọ Kpọrọ Ihe

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jirinụ Ndị Na-eto Eto Nọ n’Ọgbakọ Kpọrọ Ihe
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • DỊ UMEALA N’OBI
  • MARA EBE IKE GỊ RURU
  • NA-EGOSI NA OBI DỊ GỊ ỤTỌ
  • NA-EMESAPỤ AKA
  • “Nyefee Ya n’Aka Ndị Kwesịrị Ntụkwasị Obi”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2017
  • Ndị Kraịst Merala Agadi Jehova Ji Ozi Unu Na-ejere Ya Kpọrọ Ihe
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
  • Jiri Ụmụnna Anyị Ndị Agadi Kpọrọ Ihe
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
  • Ịma Mma Nke Isi awọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
w21 Septemba p. 8-13

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 36

Jirinụ Ndị Na-eto Eto Nọ n’Ọgbakọ Kpọrọ Ihe

“Mma ụmụ okorobịa bụ ike ha.”​—ILU 20:29.

ABỤ NKE 88 Mee Ka M Mara Ụzọ Gị

IHE ISIOKWU A NA-EKWUa

1. Olee ihe anyị nwere ike ime ma anyị mewe agadi?

ANYỊ katawa ahụ́, ụjọ nwere ike ịbịa anyị na anyị agaghịzi abara Jehova uru otú anyị bara n’oge gara aga. Ọ bụ eziokwu na e nwere ike anyị esighịzi ike otú anyị siri na mbụ, anyị nwere ike iji amamihe anyị nwere nyere ndị na-eto eto aka ka ha jiri ike ha niile jeere Jehova ozi ma wepụtakwuo onwe ha ịrụ ọrụ ndị ọzọ. Otu nwanna bụ okenye kemgbe ọtụtụ afọ sịrị: “Mgbe m mewere agadi, obi tọrọ m ụtọ na e nwere ụmụ okorobịa ruru eru ịrụ ọrụ ndị e nwere n’ọgbakọ.”

2. Gịnị ka anyị ga-eleba anya na ya n’isiokwu a?

2 N’isiokwu bu nke a ụzọ, anyị lebara anya n’otú ndị na-eto eto nwere ike isi rite uru ma ha na-eru ndị agadi nso. N’isiokwu a, anyị ga-ahụ otú àgwà ndị dị ka ịdị umeala n’obi, mmadụ ịma ebe ike ya ruru na inwe obi ụtọ maka ihe e meere ya, na imesapụ aka ga-esi nyere ndị agadi aka ka ha na ndị na-eto eto na-arụkọ ọrụ, meekwa ka ihe na-aga nke ọma n’ọgbakọ.

DỊ UMEALA N’OBI

3. Dị ka e kwuru ná Ndị Filipaị 2:​3, 4, gịnị bụ ịdị umeala n’obi, oleekwa otú o nwere ike isi nyere Ndị Kraịst aka?

3 Ndị agadi kwesịrị ịdị umeala n’obi ma ọ bụrụ na ha chọrọ inyere ndị na-eto eto aka. Onye dị umeala n’obi na-ewere ndị ọzọ ka ndị ka ya. (Gụọ Ndị Filipaị 2:​3, 4.) Ndị agadi dị umeala n’obi na-echeta na e nwere ụzọ dị iche iche Akwụkwọ Nsọ kwadoro e nwere ike isi mee ihe n’ọgbakọ. N’ihi ya, ha anaghị atụ anya ka a na-eme ihe otú e sibu na-eme ya n’oge gara aga. (Ekli. 7:10) Ọ bụ eziokwu na ha nwere ihe ndị ha ga-akụziri ndị na-eto eto, ma, ha kwesịrị icheta na “ihe ndị na-eme n’ụwa a na-agbanwe agbanwe” nakwa na ha kwesịrị ịmụta otú e si eme ihe ugbu a.​—1 Kọr. 7:31.

Foto ndị na-egosi: 1. Ebe onye nlekọta sekit na-akatabeghị ahụ́ na-akụzi ihe n’Ụlọ Akwụkwọ Ndị Ọsụ Ụzọ. 2. Ebe ya na nwunye ya na-agụ akwụkwọ e ji gbanweere ha ọrụ mgbe ha katarala ahụ́. 3. Ebe nwanna ahụ bụbu onye nlekọta sekit na-azụ otu nwanna nwoke na-akatabeghị ahụ́, nwunye ya ana-agba nwanna nwaanyị na-akatabeghị ahụ́ ume.

Ndị mere agadi na-akọrọ ndị ọzọ ihe ndị merela ná ndụ ha (A ga-akọwa ya na paragraf nke 4 na nke 5)b

4. Olee otú ndị nlekọta sekit si na-eme ihe yiri ihe ndị Livaị mere?

4 Ndị agadi dị umeala n’obi ghọtara na ka ha na-eme agadi ka ike ha na-agbada. Dị ka ihe atụ, chegodị banyere ndị nlekọta sekit. Ọ bụrụ na ha eruo afọ iri asaa, a na-agbanwere ha ọrụ. Ọ bụ eziokwu na o nwere ike isitụrụ ha ike, ma obi na-adị ha ụtọ na ha na-ejere ụmụnna ha ozi. Ọrụ mbụ ahụ masịrị ha. Ha chọkwara ịnọ na-arụ ya. Ma ha ghọtara na ọ kacha mma ka ụmụnna na-akatabeghị ahụ́ rụwazie ya. N’ihi ya, ha na-eme ihe yiri ihe ndị Livaị mere n’Izrel oge ochie. Ọ na-abụ onye Livaị ruo afọ iri ise, ya akwụsị ije ozi n’ụlọikwuu. Ihe na-eme ka ndị Livaị ahụ na-enwe obi ụtọ abụghị ụdị ozi ha na-ejere Jehova. Ha ji obi ha niile rụọ ọrụ ha, meekwa ike ha niile inyere ndị na-akatabeghị ahụ́ aka. (Ọnụ Ọgụ. 8:​25, 26) Taa, ọ bụ eziokwu na ndị bụbu ndị nlekọta sekit anaghịzi aga eleta ọgbakọ dị iche iche, ma ha na-enwe obi ụtọ iso ọgbakọ ọ bụla e zigara ha na-eje ozi.

5. Gịnị ka ị mụtara n’ihe a kọrọ gbasara Nwanna Dan na nwunye ya?

5 Chegodị gbasara otu nwanna aha ya bụ Dan bụ́ onye nlekọta sekit ruo afọ iri abụọ na atọ. Mgbe o ruru afọ iri asaa, a gwara ya na Katie nwunye ya ka ha bụrụzie ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche. Gịnị ka ha mere ka ozi ọhụrụ a na-atọ ha ụtọ? Nwanna Dan sịrị na ọrụ na-eju ya aka ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Ọ na-arụ ọrụ ọgbakọ, na-enyere ụmụnna aka iru eru ịbụ ndị ohu na-eje ozi, na-azụkwa ndị ọzọ ka ha nwee ike ịna-ezi ozi ọma n’ebe na-ekwo ekwo nakwa n’ụlọ mkpọrọ. Ndị agadi, ma ùnu nọ n’ozi oge niile ma ọ bụ na unu anọghị, unu nwere ike ime ọtụtụ ihe iji nyere ndị ọzọ aka. Olee otú unu ga-esi eme ya? Gbalịanụ ka ọrụ ọhụrụ unu na-atọ unu ụtọ. Kpebienụ ihe ndị unu ga-eme, lekwasịkwanụ anya n’ihe ndị unu ga-emeli kama ilekwasị anya n’ihe ndị unu na-agaghị emeli.

MARA EBE IKE GỊ RURU

6. Gịnị mere o ji dị mma mmadụ ịmara ebe ike ya ruru? Nye ihe atụ.

6 Onye ma ebe ike ya ruru ma ihe ndị ọ ga-emeli na ihe ndị ọ na-agaghị emeli. (Ilu 11:2) Mmadụ ịma ebe ike ya ruru ga-eme ka ọ ghara ịtụ anya ime ihe ndị ọ na-agaghị emeli. Nke ahụ ga-eme ka ọ na-enwe obi ụtọ ma na-arụsi ọrụ ike. Anyị nwere ike iji onye ma ebe ike ya ruru tụnyere onye ji ụgbọala na-arị ugwu. Onye na-anya ụgbọala ahụ ga-etinye ya na gịa ga-arịli ugwu ahụ. Ọ bụ eziokwu na o nwere ike ime ka ụgbọala ahụ na-aga nwayọọ nwayọọ, ma, ọ ga na-aga ruo mgbe ọ rịchara ugwu ahụ. Otú ahụ ka ọ dịkwa onye ma ebe ike ya ruru. Ọ ma mgbe ọ ga-adị mkpa ka o jiri nwayọọ nwayọọ na-eme ihe ka o nwee ike ịnọgide na-ejere Jehova ozi ma na-enyere ndị ọzọ aka.​—Fil. 4:5.

7. Olee otú Bazilaị si gosi na ọ ma ebe ike ya ruru?

7 Chegodị gbasara Bazilaị. Ọ dị afọ iri asatọ mgbe Eze Devid gwara ya ka ọ bịa bụrụ otu n’ime ndị ndụmọdụ ya. Ebe Bazilaị ma ebe ike ya ruru, ọ jụrụ ime ihe eze gwara ya. Ọ ma na e nwere ọtụtụ ihe ndị ọ na-agaghịzi emeli n’ihi na ọ gbadala n’afọ ndụ. O kwuziri ka Kimham, bụ́ nwa okorobịa, nọchite anya ya. (2 Sam. 19:​35-37) Dịkwa ka Bazilaị, obi na-atọ ndị mere agadi ụtọ ịhapụrụ ụmụ okorobịa ọrụ ndị ha na-arụbu ka ha rụwa.

Ebe Eze Devid na-egosi Solomon ụfọdụ ihe a ga-eji arụ ụlọ nsọ ahụ..

Mgbe Jehova gwara Devid na ọ bụghị ya ga-ewuru ya ụlọ, Devid nabatara ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8)

8. Olee otú Eze Devid si gosi na ọ ma ebe ike ya ruru n’ihe gbasara ịrụ ụlọ nsọ ahụ?

8 Eze Devid mekwara ihe ọzọ magburu onwe ya iji gosi na ọ ma ebe ike ya ruru. O ji obi ya niile chọọ iwuru Jehova ụlọ. Ma, mgbe Jehova gwara ya na ọ bụ nwa ya bụ́ Solomọn ga-arụ ụlọ ahụ, ọ nabatara ihe Jehova kwuru ma jiri obi ya niile kwadoo ọrụ ahụ. (1 Ihe 17:4; 22:5) Devid echeghị na ọ ga-aka mma ka yanwa rụọ ụlọ ahụ n’ihi na Solomọn “bụ obere nwa, o nwebeghịkwa ihe ọ ma.” (1 Ihe 29:1) Devid ma na ihe ga-eme ka ọrụ ahụ gaa nke ọma bụ ma Jehova gọzie ya, ọ bụghị afọ ole onye ga-ebute ụzọ n’ọrụ ahụ dị ma ọ bụ ihe ọ ma. Dịkwa ka Devid, ndị agadi ka na-arụsikwu ọrụ ike n’ozi Jehova ma mgbe ọrụ ha gbanwere. Ha makwa na Jehova ga-agọzi ụmụ okorobịa ndị na-arụ ọrụ hanwa rụburu.

9. Olee otú otu onye so na Kọmitii Alaka si gosi na ọ ma ebe ike ya ruru?

9 N’oge anyị a, otu nwanna aha ya bụ Shigeo gosiri na ọ ma ebe ike ya ruru. N’afọ 1976, mgbe ọ dị afọ iri atọ, a họpụtara ya ka o soro na Kọmitii Alaka. N’afọ 2004, ọ ghọrọ Onye Na-ahaziri Kọmitii Alaka Ọrụ. Mgbe e mechara, ọ matara na ahụ́ ya agaghị ekwe ya ịrụ ọrụ ya nke ọma. O kpere ekpere ma chee uru ọ ga-aba ma ọ bụrụ na nwanna na-akatachabeghị ahụ́ arụwa ọrụ ahụ ọ na-arụ. N’agbanyeghị na ọ bụghịzi ya na-ahaziri Kọmitii Alaka ọrụ, ọ ka sokwa na Kọmitii Alaka, ya na ha na-arụkọkwa ọrụ nke ọma. Dị ka anyị hụrụ n’akụkọ Bazilaị, Eze Devid, na Shigeo, onye dị umeala n’obi ma mara ebe ike ya ruru na-elekwasị anya n’ihe ndị na-eto eto ma kama ilekwasị anya n’ihe ndị ha na-amaghị. Ọ ga-ewere ha ka ndị ha na ya na-arụkọ ọrụ, ọ bụghị ndị ya na ha na-ama aka.​—Ilu 20:29.

NA-EGOSI NA OBI DỊ GỊ ỤTỌ

10. Olee otú ndị agadi kwesịrị isi were ndị na-eto eto n’ọgbakọ?

10 Ndị agadi kwesịrị iwere ndị na-eto eto ka ngọzi Jehova. Ha kwesịrị igosi na obi dị ha ụtọ maka ya. Ka ike ha na-agbada, obi na-atọ ha ụtọ na e nwere ndị na-eto eto ike dị n’ahụ́, dịkwa njikere ịrụ ọrụ n’ọgbakọ.

11. Olee otú Rut 4:​13-16 si gosi uru ọ ga-abara onye agadi ma ọ nabata aka ndị na-eto eto na-enyere ya?

11 Naomi a kọrọ akụkọ ya na Baịbụl gosiri otú ndị agadi kwesịrị isi gosi na obi dị ha ụtọ n’otú ndị na-eto eto si enyere ha aka. Na mbụ, Naomi gwara nwunye nwa ya di ya nwụrụ aha ya bụ Rut ka ọ laghachikwuru ndị ya. Ma, Rut ekweghị ahapụ Naomi, kama, o so ya laghachi Betlehem. Obi dị Naomi ezigbo ụtọ na Rut so ya. Ọ nabatakwara aka o nyeere ya. (Rut 1:​7, 8, 18) Ihe a baakwara ha abụọ uru. (Gụọ Rut 4:​13-16.) Ịdị umeala n’obi ga-enyere ndị agadi aka ime ka Naomi.

12. Olee otú Pọl si gosi na obi dị ya ụtọ maka ihe ọma ndị e meere ya?

12 Obi dị Pọl onyeozi ụtọ maka aka e nyeere ya. Dị ka ihe atụ, o kelere Ndị Kraịst nọ na Filipaị maka onyinye ndị ha ziteere ya. (Fil. 4:16) O gosikwara na obi dị ya ụtọ maka aka Timoti nyeere ya. (Fil. 2:​19-22) Pọl kelekwara Chineke maka ndị bịara gbaa ya ume mgbe a kpọ ya na-aga Rom. (Ọrụ 28:15) Pọl dị ezigbo ike. Ọ gara ọtụtụ kilomita iji zie ozi ọma nakwa iji mee ka ọtụtụ ọgbakọ dị ike. Ma, ọ dị umeala n’obi, nabatakwa aka ụmụnna ya nyeere ya.

13. Olee otú ndị agadi ga-esi gosi na obi dị ha ụtọ maka ndị na-eto eto?

13 Ndị agadi, unu nwere ike isi n’ọtụtụ ụzọ gosi na obi dị unu ụtọ maka ndị na-eto eto nọ n’ọgbakọ unu. Ọ bụrụ na ha chọrọ iburu gị n’ụgbọala, inyere gị aka zụta ihe, ma ọ bụkwanụ imere gị ihe ndị ọzọ, nabata enyemaka ha. Were ya ka otú Jehova si egosi gị na ọ hụrụ gị n’anya. O nwere ike iju gị anya na ihe a nwere ike ime ka gị na ha ghọọ ezigbo enyi. Gbalịa na-enyere ndị na-eto eto aka ka ha na Jehova dịrị ná mma. Na-agwakwa ha otú obi si adị gị ụtọ ma ị na-ahụ ka ndị na-eto eto na-agbalị ime ọtụtụ ihe n’ọgbakọ. Wepụtakwa oge na-akọrọ ha ihe ụfọdụ merela ná ndụ gị. Ọ bụrụ na i mee otú ahụ, ọ ga-egosi na ‘ị na-ekele Chineke’ maka ndị na-eto eto nọ n’ọgbakọ.​—Kọl. 3:15; Jọn 6:44; 1 Tesa. 5:18.

NA-EMESAPỤ AKA

14. Olee otú Devid si gosi na ọ na-emesapụ aka?

14 Eze Devid mekwara ihe ọzọ dị ezigbo mkpa ndị agadi kwesịrị ịna-eme, ya bụ, ịna-emesapụ aka. O nyere ego na ihe ndị ọzọ iji kwadoo ụlọ nsọ a ga-arụ. (1 Ihe 22:​11-16; 29:​3, 4) O mere ihe a n’agbanyeghị na ihe a ga-akpọ ụlọ nsọ ahụ bụ ụlọ nsọ Solomọn. Ọ bụrụ na ike adịghịzi anyị iso na-arụ ụlọ ndị a na-arụ ná nzukọ Jehova, anyị nwere ike ịna-enye onyinye otú akpa anyị hà iji na-akwado ya. Anyị nwekwara ike iji ihe ndị anyị mụtara n’ozi anyị jeere Jehova ọtụtụ afọ nyere ndị ka na-eto eto aka.

15. Olee ihe dị ezigbo mkpa Pọl kụziiri Timoti?

15 Ka anyị leekwa otú Pọl onyeozi si mesapụ aka. Ọ kpọrọ Timoti ka o soro ya n’ozi ala ọzọ ọ na-eje, kụziekwara ya otú o si akụzi ihe na otú o si ezi ozi ọma. (Ọrụ 16:​1-3) Ihe ọ kụziiri ya mere ka ọ na-ekwusa ozi ọma nke ọma, na-akụzikwa ihe nke ọma. (1 Kọr. 4:17) Timoti jikwa ihe ndị a ọ mụtara n’aka Pọl zụọ ndị ọzọ.

16. Gịnị mere Shigeo ji zụọ ndị ọzọ?

16 Taa, ụjọ anaghị atụ ndị agadi na ha agaghịzi aba uru n’ọgbakọ ma ọ bụrụ na ha azụọ ndị na-eto eto n’ọrụ ndị ha na-arụ. Dị ka ihe atụ, kemgbe ọtụtụ afọ, Shigeo anyị kwuburu okwu ya zụrụ ụmụnna nwoke na-eto eto so na Kọmitii Alaka. O mere ihe a ka ọrụ a na-arụ iji kwadoo Alaeze Chineke n’obodo ya na-aga nke ọma. Ihe a mere ka e nwee nwanna a zụrụ nke ọma nọchiri ya mgbe oge ruru ka ọ kwụsị ịbụ onye na-ahaziri Kọmitii Alaka ọrụ. Shigeo esorola na Kọmitii Alaka ihe karịrị afọ iri anọ na ise. Ọ na-ejikwa ihe ndị ọ mụtara na-enyere ndị na-eto eto aka. Ụdị ụmụnna ndị a na-abụrụ ndị Jehova ezigbo ngọzi.

17. Dị ka e kwuru na Luk 6:​38, olee ihe ndị agadi nwere ike inye ndị ọzọ?

17 Ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị merela agadi, unu bụ ihe àmà na-egosi na mmadụ iji ndụ ya na-ejere Jehova ozi bụ otú kacha mma isi bie ndụ. Ihe ndị unu na-eme na-egosi na mmadụ ịmụta ihe dị na Baịbụl na ime ya na-aba ezigbo uru ná ndụ. Unu ma otú e si mee ihe n’oge gara aga. Ma, unu makwa na unu kwesịrị ịmụta ụzọ ọhụrụ ndị e si eme ihe ugbu a. Unu ndị agadi ka mere baptizim n’oge na-adịbeghị anya nwekwara ọtụtụ uru unu ga-aba. Unu nwere ike ịkọrọ ndị ọzọ otú obi dị unu na Jehova mere ka unu mata ya mgbe unu katarala ahụ́. Obi ga-adị ndị na-eto eto ụtọ ịnụ gbasara ihe ndị mere unu nakwa ihe ndị unu mụtara n’ozi Jehova. Ọ bụrụ na unu ‘ana-enye ihe,’ ya bụ, iji ihe ndị unu mụtarala na-azụ ndị ọzọ, Jehova ga-agọzi unu nke ukwuu.​—Gụọ Luk 6:38.

18. Olee otú ndị na-eto eto na ndị agadi ga-esi na-abara ibe ha uru?

18 Ọ bụrụ na unu bụ́ ndị agadi ana-emetakwu ndị na-eto eto enyi, unu ga-enwe ike ịna-enyere ibe unu aka. (Rom 1:12) Ndị nke ọ bụla nwere ihe bara uru ndị nke ọzọ na-enweghị. Ndị agadi nwere amamihe na ihe ndị ha mụtara kemgbe ndụ ha. Ndị na-eto eto nwere ume. Ọ bụrụ na ndị na-eto eto na ndị agadi ana-emekọ ihe ka enyi, ọ ga-eme ka e too Nna anyị nke eluigwe, baakwara mmadụ niile nọ n’ọgbakọ uru.

OLEE OTÚ ÀGWÀ NDỊ A NWERE IKE ISI NYERE NDỊ AGADI AKA ỊZỤ NDỊ NA-ETO ETO NỌ N’ỌGBAKỌ NA ỊGBA HA UME?

  • Ịdị umeala n’obi na mmadụ ịma ebe ike ya ruru

  • Mmadụ inwe obi ụtọ maka ihe e meere ya

  • Imesapụ aka

ABỤ NKE 90 Ka Anyị Na-agbarịta Ibe Anyị Ume

a E nwere ọtụtụ ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọ na-ejere Jehova ozi n’ọgbakọ ya. Ndị agadi nọ n’ọgbakọ Jehova, n’agbanyeghị ebe ha si ma ọ bụ obodo ha, nwere ike inyere ndị na-eto eto aka ime ike ha niile n’ozi Jehova.

b NKỌWA FOTO: Mgbe otu onye nlekọta sekit ruru afọ iri asaa, a gbanweere ya na nwunye ya ọrụ. Ihe ndị ha mụtarala kemgbe ọtụtụ afọ mere ka ha nyere ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ ha na-eje ozi ugbu a aka.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya