Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w22 Ọktoba p. 24-28
  • Mee Ka Olileanya Gị Na-esikwu Ike

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mee Ka Olileanya Gị Na-esikwu Ike
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • OLILEANYA ANYỊ YIRI NKO E JI EJIDE ỤGBỌ MMIRI
  • OLILEANYA ANYỊ YIRI OKPU AGHA
  • MEE KA OLILEANYA GỊ NA-ESIKWU IKE
  • NA-AṄỤRỊ ỌṄỤ N’OLILEANYA I NWERE
  • Olee Ebe Ị Pụrụ Inweta Olileanya Bụ́ Ezigbo Ya?
    Teta!—2004
  • Olileanya—Ihe Nchebe Dị Mkpa N’ime Ụwa Nke Dị Egwu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Na-ele Anya Jehova Ma Nwee Obi Ike
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Olileanya I Nwere Maka Ọdịnihu Agaghị Emenye Gị Ihere
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2023
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
w22 Ọktoba p. 24-28

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 44

Mee Ka Olileanya Gị Na-esikwu Ike

“Nwee olileanya n’ebe Jehova nọ.”​—ỌMA 27:14.

ABỤ NKE 144 Lekwasị Anya n’Ụgwọ Ọrụ

IHE ISIOKWU A NA-EKWUa

1. Olee olileanya Jehova mere ka anyị nwee?

JEHOVA emeela ka anyị nwee ezigbo olileanya na anyị ga-adị ndụ ebighị ebi. Ụfọdụ ndị nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’eluigwe. Ha ga-abụ mmụọ na-enweghị ike ịnwụ anwụ. (1 Kọr. 15:​50, 53) Ma, ọtụtụ ndị nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa n’obi ụtọ, n’arịaghịkwa ọrịa ọ bụla. (Mkpu. 21:​3, 4) Ma ànyị nwere olileanya ịdị ndụ ebighị n’eluigwe ma ọ bụ n’ụwa, anyị anaghị eji olileanya anyị egwu egwu.

2. Gịnị mere anyị ji nwee olileanya, gịnịkwa mere anyị ji kwuo otú ahụ?

2 Na Baịbụl, okwu ahụ bụ́ “olileanya” nwere ike ịpụta “ịtụ anya na ihe ọma ga-eme.” Obi kwesịrị isi anyị ike na ihe ndị anyị na-atụ anya ha n’ọdịnihu ga-emezu n’ihi na ọ bụ Jehova kwere nkwa ihe ndị ahụ. (Rom 15:13) Anyị ma nkwa o kwere, marakwa na ọ na-emezu nkwa ya mgbe niile. (Ọnụ Ọgụ. 23:19) Obi siri anyị ike na Jehova chọrọ imezu ihe niile o kwuru na ọ ga-eme, nweekwa ike ọ ga-eji emezu ha. N’ihi ya, ihe mere anyị ji nwee olileanya abụghị ihe anyị chepụtara ma ọ bụ ịmụ anya arọ nrọ. Kama, ọ bụ ihe doro anyị anya na ọ bụ eziokwu.

3. Olee ihe anyị ga-amụ n’isiokwu a? (Abụ Ọma 27:14)

3 Nna anyị nke eluigwe hụrụ anyị n’anya. Ọ chọkwara ka anyị tụkwasị ya obi. (Gụọ Abụ Ọma 27:14.) Ọ bụrụ na olileanya anyị nwere na Jehova esie ike, anyị ga-enwe ike idi ọnwụnwa ndị na-abịara anyị ma nwee obi ike na ọṅụ n’agbanyeghị ihe ọ bụla merenụ. Ka anyị leba anya n’otú olileanya anyị si echebe anyị. Anyị ga-ebugodị ụzọ mata otú olileanya si yie okpu agha na nko e ji ejide ụgbọ mmiri. Anyị ga-ekwuzi otú anyị nwere ike isi mee ka olileanya anyị na-esikwu ike.

OLILEANYA ANYỊ YIRI NKO E JI EJIDE ỤGBỌ MMIRI

4. Olee otú olileanya si yie nko e ji ejide ụgbọ mmiri? (Ndị Hibru 6:19)

4 N’akwụkwọ ozi Pọl onyeozi degaara ndị Hibru, o kwuru na olileanya anyị dị ka nko e ji ejide ụgbọ mmiri. (Gụọ Ndị Hibru 6:19.) Pọl nọ n’ụgbọ mmiri gaa ebe dị iche iche. N’ihi ya, ọ ma otú e si eji nko ejide ụgbọ mmiri ka mmiri ghara iburu ya. E nwere otu mgbe ọ nọ n’ụgbọ mmiri, oké ifufe amalite ife. N’oge ahụ, ọ hụrụ ka ndị na-akwọ ụgbọ mmiri tụbara nko ndị e ji ejide ụgbọ mmiri n’ime mmiri ka ifufe ghara iburu ụgbọ ha gaa kụọ n’elu nkume nwere ike ime ka o kpuo. (Ọrụ 27:​29, 39-41) Otú ahụ nko si ejide ụgbọ mmiri ka olileanya anyị na-eme ka anyị kwụrụ chịm n’ebe Jehova nọ ka nsogbu ndị yiri oké ifufe ghara ime ka anyị daa mbà. Olileanya anyị na-eme ka obi ruo anyị ala ma nsogbu bịara anyị n’ihi na obi siri anyị ike na ihe ga-adị mma n’oge na-adịghị anya. Cheta na Jizọs ebula ụzọ gwa anyị na a ga-akpagbu anyị. (Jọn 15:20) N’ihi ya, ịtụgharị uche ná nkwa Jehova kwere anyị ga-eme ka anyị nọsie ike n’ozi anyị na-ejere ya.

5. Olee otú olileanya si nyere Jizọs aka mgbe ọ ma na a ga-egbu ya?

5 Chegodị otú olileanya si mee ka Jizọs rubere Jehova isi n’agbanyeghị na ọ ma na a ga-ata ya ahụhụ ma gbuo ya. N’ụbọchị Pentikọst nke afọ 33 Oge Ndị Kraịst, Pita onyeozi kwughachiri amụma e buru n’Abụ Ọma, nke kọwara otú Jizọs si nwee obi ike, ahụ́ eruokwa ya ala. Amụma ahụ sịrị: “M ga-enwekwa olileanya, n’ihi na ị gaghị ahapụ m n’ili, ị gaghịkwa ekwe ka onye jisiri gị aka ike ree ure. . . . Ị ga-emekwa ka ọṅụ ju m obi n’ihu gị.” (Ọrụ 2:​25-28; Ọma 16:​8-11) Ọ bụ eziokwu na Jizọs ma na ya ga-anwụ, ma o nwere olileanya siri ike na Chineke ga-akpọlite ya n’ọnwụ nakwa na obi ga-adị ya ụtọ mgbe ọ ga-alakwuru Nna ya n’eluigwe.​—Hib. 12:​2, 3.

6. Gịnị ka otu nwanna kwuru banyere olileanya?

6 Olileanya anyị bụ́ Ndị Kraịst nwere enyerela ọtụtụ ụmụnna anyị aka ịtachi obi. Chegodị banyere otu ezigbo nwanna biri n’Ịngland. Aha ya bụ Leonard Chinn. Mgbe a na-alụ Agha Ụwa Mbụ, a tụrụ ya mkpọrọ maka na o kweghị abụ onye amị. Ruo ọnwa abụọ, e tinyere ya n’ụlọ mkpọrọ ebe naanị ya nọ. E mechara manye ya ịna-arụ ọrụ siri ezigbo ike. O dere, sị: “Ihe mere m mere ka m ghọta otú olileanya si enyere anyị aka ịtachi obi. Baịbụl na-akọrọ anyị otú Jizọs, ndịozi ya, na ndị amụma si tachie obi, nakwa ọmarịcha nkwa ndị Chineke kwere anyị. Ihe a niile na-eme ka anyị nwee ezigbo olileanya na ọdịnihu ga-aka mma. Ọ na-emekwa ka anyị nwee ike ịna-atachi obi.” Otú ahụ e si eji nko ejide ụgbọ mmiri ka olileanya mere ka Nwanna Leonard kwụrụ chịm. Olileanya nwekwara ike imere anyị otu ihe ahụ.

7. Olee otú ọnwụnwa si eme ka olileanya anyị sikwuo ike? (Ndị Rom 5:​3-5; Jems 1:12)

7 Olileanya anyị na-esikwu ike ma anyị dichaa ọnwụnwa bịaara anyị ma hụ otú Jehova si nyere anyị aka, matakwa na anyị na ya dị ná mma. (Gụọ Ndị Rom 5:​3-5; Jems 1:12.) Olileanya anyị na-esi otú ahụ sie ike karịa mgbe mbụ anyị nabatara ozi ọma e ziri anyị. Setan chọrọ ka ọnwụnwa ndị na-abịara anyị mee ka ike gwụ anyị. Ma, anyị ga-emerili nke ọ bụla n’ime ha ma anyị kwe ka Jehova nyere anyị aka.

OLILEANYA ANYỊ YIRI OKPU AGHA

8. Olee otú olileanya anyị si yie okpu agha? (1 Ndị Tesalonaịka 5:8)

8 Baịbụl kwukwara na olileanya anyị dị ka okpu agha. (Guọ 1 Ndị Tesalonaịka 5:8.) Onye agha na-ekpu okpu agha iji chebe isi ya ka ndị iro ghara ime ya ihe ọ bụla. N’ọgụ anyị na-alụso Setan, anyị kwesịrị ichebe onwe anyị ka Setan ghara ime ka anyị chewe ihe na-ezighị ezi. Ọ na-eji ihe dị iche iche anwa anyị ọnwụnwa, na-agbalịkwa imebi echiche anyị. Otú ahụ okpu agha si echebe isi onye agha ka olileanya anyị na-eme ka anyị ghara ichewe ihe na-ezighị ezi ka anyị nwee ike ịna-erubere Jehova isi.

9. Olee nsogbu enweghị olileanya na-akpatara ndị mmadụ?

9 Olileanya anyị nwere ịdị ndụ ebighị ebi ga-enyere anyị aka iji amamihe na nghọta na-ekpebi ihe ndị anyị na-eme. Ma, ọ bụrụ na olileanya anyị esighịzi ike, anyị echewezie naanị gbasara ihe na-agụ ahụ́ anyị, anyị nwere ike ichefu olileanya anyị nwere ịdị ndụ ebighị ebi. Cheta ihe mere ụfọdụ Ndị Kraịst bi na Kọrịnt oge ochie. Ha kwụsịrị inwe okwukwe n’otu n’ime nkwa ndị dị mkpa Chineke kwere, ya bụ, mbilite n’ọnwụ. (1 Kọr. 15:12) Pọl kwuru na ihe bụ́ mkpa ndị na-ekweghị na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ na-abụ naanị ime ihe ọ bụla na-agụ ahụ́ ha. (1 Kọr. 15:32) Taa, ọtụtụ ndị na-enweghị olileanya ná nkwa Chineke na-eme ihe ọ bụla ha ga-emeli ka ha nwee ike ikpori ndụ ugbu a. Ma, anyị tụkwasịrị obi n’ihe ọma ndị Chineke kwere nkwa imere anyị n’ọdịnihu. Olileanya anyị dị ka okpu agha na-echebe anyị ka anyị ghara ichewe ihe na-ezighị ezi. Ọ na-enyekwara anyị aka ka anyị ghara ịna-eche naanị banyere onwe anyị maka na ọ ga-eme ka anyị na Jehova gharazie ịdị ná mma.​—1 Kọr. 15:​33, 34.

10. Olee otú olileanya si eme ka anyị ghara ichewe echiche na-ezighị ezi?

10 Olileanya anyị nwekwara ike ichebe anyị ka anyị ghara ịna-eche na ịgbalịwa ime ihe dị Jehova mma abaghị uru. Dị ka ihe atụ, mmadụ nwere ike ịna-eche, sị: ‘Emekataghị m soro ná ndị ga-adị ndụ ebighị ebi. O nweghị ihe m dị mma ya. Agaghị m emeli ihe Chineke chọrọ ka m mee.’ Cheta na Elifaz bụ́ onye so ná ndị ahụ sị na ha bịara ịkasi Job obi gwara Job ụdị ihe a. Ọ sịrị: “Gịnị ka mmadụ efu bụ nke mere aka ya ga-eji dị ọcha?” O kwukwara banyere Chineke, sị: “Lee, ọ tụkwasịghị ndị nsọ ya obi, eluigwe adịghịdị ọcha n’anya ya.” (Job 15:​14, 15) Ihe ndị ahụ o kwuru bụ ụgha chara acha. Cheta na ọ bụ Setan chọrọ ka i chewe otú ahụ. Ọ ma na ị nọrọ na-eche ụdị ihe ahụ, ị ga-eji nwayọọ nwayọọ kwụsị inwe olileanya. Kama ige Setan ntị, jụ ụgha ndị ahụ ma lekwasị anya ná nkwa ndị Jehova kwere. Ya emela gị obi abụọ na ọ chọrọ ka ị dị ndụ ebighị ebi nakwa na ọ ga-enyere gị aka inweta ndụ ebighị ebi.​—1 Tim. 2:​3, 4.

MEE KA OLILEANYA GỊ NA-ESIKWU IKE

11. Gịnị mere anyị ji kwesị inwe ndidi ka anyị na-echere ka Chineke mezuo nkwa ndị o kwere?

11 Ọ naghị adị mfe mgbe niile ime ka olileanya anyị na-esikwu ike. Ahụ́ nwere ike ịna-agbakasị anyị ka anyị na-eche ka Chineke mezuo nkwa ya. Ma, ebe ọ bụ na Jehova na-adịru mgbe ebighị ebi, otú o si ele oge anya dị iche n’otú anyị si ele ya. (2 Pita 3:​8, 9) Ọ ga-emezu nkwa ya otú kacha mma. Ma, e nwere ike ọ gaghị abụ mgbe anyị tụrụ anya ya. Olee ihe ga-enyere anyị aka ka olileanya anyị sikwuo ike ka anyị na-enwe ndidi ma na-echere ka Chineke mezuo nkwa ndị o kwere?​—Jems 5:​7, 8.

12. Dị ka e kwuru ná Ndị Hibru 11:​1, 6, olee ihe jikọrọ inwe olileanya na inwe okwukwe?

12 Anyị ga na-eme ka olileanya anyị na-esikwu ike ma ọ bụrụ na anyị anọrọ Jehova nso n’ihi na ọ bụ ya ga-emeliri anyị ihe ndị anyị na-ele anya ha. N’eziokwu, ihe Baịbụl kwuru gosiri na onye chọrọ inwe olileanya kwesịrị inwe okwukwe na Jehova dị adị nakwa na “ọ na-akwụ ndị na-achọsi ya ike ụgwọ ọrụ.” (Gụọ Ndị Hibru 11:​1, 6.) Anyị kwetasie ike na Jehova dị adị, obi ga-esikwu anyị ike na ọ ga-emezu nkwa niile o kwere. Ka anyị hụ ihe ndị anyị ga-eme ka anyị nwee ike ime ka anyị na Jehova na-adịkwu ná mma, sikwa otú ahụ mee ka olileanya anyị na-esikwu ike.

Ekpere na ịtụgharị uche ga-eme ka olileanya anyị na-esikwu ike (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13 ruo na nke 15)b

13. Olee otú anyị ga-esi bịaruo Chineke nso?

13 Na-ekpe ekpere, na-agụkwa Okwu Chineke. Ọ bụ eziokwu na anyị agaghị ahụli Jehova anya, ma anyị ga-abịaruli ya nso. Anyị ga-ekpeli ekpere gwa ya obi anyị, obi esiekwa anyị ike na ọ ga-ege anyị ntị. (Jere. 29:​11, 12) Otú anyị ga-esi ege Chineke ntị bụ ịgụ Okwu ya ma na-atụgharị uche na ya. Ka anyị na-agụ otú Jehova si lekọta ndị rubeere ya isi n’oge ochie, olileanya anyị ga na-esikwu ike. E dere ihe niile e dere na Baịbụl “ka e jiri ha kụziere anyị ihe, ka obi anyị na-atachi na nkasi obi anyị na-enweta n’Akwụkwọ Nsọ wee mee ka anyị nwee olileanya.”​—Rom 15:4.

14. Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-atụgharị uche n’ihe Jehova meere ndị ọzọ?

14 Na-atụgharị uche n’otú Jehova sirila mezuo nkwa ndị o kwere. Cheta ihe Chineke meere Ebreham na Sera. Ha akaala nká, tofee ịmụ nwa. Ma, Chineke kwere ha nkwa na ha ga-amụta nwa. (Jen. 18:10) Gịnị ka Ebreham mere? Baịbụl sịrị: “O nwere okwukwe na ya ga-abụ nna ọtụtụ mba.” (Rom 4:18) Obi siri Ebreham ike na Jehova ga-emezu nkwa ya n’agbanyeghị na o yiri ihe na-agaghị ekwe omume n’anya mmadụ. Jehova agharịpụghị Ebreham bụ́ nwoke nwere okwukwe. (Rom 4:​19-21) Ụdị akụkọ ahụ na-akụziri anyị na anyị ga-atụkwasịli Jehova obi mgbe niile na ọ ga-emezu nkwa ya, ọ bụrụgodị na ọ dị anyị ka ihe na-agaghị eme eme.

15. Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-atụgharị uche n’ihe Chineke meere anyị?

15 Chee banyere ihe Jehova meere gị. Chegodị uru ndị i riterela n’otú Jehova si na-emezu ụfọdụ nkwa ndị o kwere na Baịbụl. Dị ka ihe atụ, Jizọs kwere anyị nkwa na Nna ya ga na-enye anyị ihe ndị dị mkpa ná ndụ. (Mat. 6:​32, 33) Jizọs emesiekwala gị obi ike na Jehova ga-enye gị mmụọ nsọ ya ma ị rịọ ya ka o nye gị ya. (Luk 11:13) Jehova na-emezu nkwa ndị ahụ. I nwere ike icheta nkwa ndị ọzọ o mezuuru gị. Dị ka ihe atụ, o kwere nkwa na ọ ga-agbaghara gị, na-akasi gị obi, jirikwa Okwu ya na-enyeju gị afọ. (Mat. 6:14; 24:45; 2 Kọr. 1:3) Ị tụgharịa uche n’ihe ndị Chineke meerela gị, obi ga-esikwu gị ike na ọ ga-emere gị ihe ndị ị na-atụ anya ha n’ọdịnihu.

NA-AṄỤRỊ ỌṄỤ N’OLILEANYA I NWERE

16. Gịnị mere olileanya anyị ji bụrụ onyinye bara ezigbo uru?

16 Olileanya ndụ ebighị ebi anyị nwere bụ onyinye bara ezigbo uru Chineke nyere anyị. Anyị na-atụ anya ihe ndị magburu onwe ha ọ ga-emere anyị n’ọdịnihu. Obi sikwara anyị ike na ha ga-eme. Olileanya a dị ka nko e ji ejide ụgbọ mmiri. Ọ na-eme ka anyị kwụrụ chịm ka anyị nwee ike ịtachi obi n’ọnwụnwa, imeri ndị mmegide, na inwe obi ike ma anyị nọrọgodị n’ọnụ ọnwụ. Ọ dịkwa ka okpu agha n’ihi na ọ na-echebe anyị ka anyị ghara ichewe ihe na-ezighị ezi ka anyị nwee ike ịjụ ihe ọjọọ ma na-eme ihe dị mma. Olileanya anyị si na Baịbụl na-eme ka anyị na Chineke na-adịkwu ná mma, na-emekwa ka anyị mata otú ọ hụruru anyị n’anya. Ọ bụrụ na anyị ana-eme ka olileanya anyị na-esikwu ike, ọ ga-abara anyị ezigbo uru.

17. Gịnị mere olileanya anyị ji eme ka anyị na-aṅụrị ọṅụ?

17 N’akwụkwọ ozi Pọl onyeozi degaara ndị Rom, ọ gbara ha ume ka ha ‘na-aṅụrị ọṅụ n’ihi olileanya ha nwere.’ (Rom 12:12) Ihe mere Pọl ji nwee ike ịna-aṅụrị ọṅụ bụ na obi siri ya ike na ọ ga-enweta ndụ ebighị ebi n’eluigwe ma o rubere Jehova isi ruo n’ọnwụ. Olileanya anyị kwesịkwara ime ka anyị na-aṅụrị ọṅụ n’ihi na obi siri anyị ike na Jehova ga-emezu nkwa ndị o kwere. Dị ka otu ọbụ abụ dere, onye na-enwe obi ụtọ bụ ‘onye nwere olileanya n’ebe Chineke ya, bụ́ Onye e kwesịrị ịtụkwasị obi mgbe niile, nọ.’​—Ọma 146:​5, 6.

GỊNỊ KA Ị GA-AZA?

  • Gịnị mere obi ji kwesị isi anyị ike na olileanya anyị ga-emezu?

  • Olee otú olileanya anyị si yie okpu agha na nko e ji ejide ụgbọ mmiri?

  • Olee ihe ga-enyere anyị aka ime ka olileanya anyị na-esikwu ike?

ABỤ NKE 139 Hụ Onwe Gị n’Ụwa Ọhụrụ

a Jehova emeela ka anyị nwee olileanya magburu onwe ya na ọdịnihu ga-aka mma. Olileanya a na-eme anyị obi ụtọ, na-emekwa ka anyị ghara ịna-echegbu onwe anyị banyere nsogbu ndị na-abịara anyị ugbu a. Ọ na-eme ka anyị nwee ike ịna-erubere Jehova isi n’agbanyeghị nsogbu ọ bụla bịaara anyị. O nwekwara ike ime ka a ghara iji echiche na-ezighị ezi ghọgbuo anyị. N’isiokwu a, anyị ga-amụta na ihe a niile bụ ezigbo ihe mere anyị ji kwesị ime ka olileanya anyị na-esi ike.

b NKỌWA FOTO: Otú okpu agha si echebe isi onye agha nakwa otú e si eji nko ejide ụgbọ mmiri ka olileanya anyị na-eme ka anyị ghara ichewe ihe na-ezighị ezi, anyị akwụrụkwa chịm ma ọnwụnwa bịara anyị. Ebe obi siri otu nwanna nwaanyị ike mgbe ọ na-ekpe ekpere. Ebe otu nwanna na-atụgharị uche n’otú Chineke si mezuo nkwa ndị o kwere Ebreham. Ebe nwanna ọzọ na-eche gbasara otú Chineke sirila gọzie ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya