Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w24 Eprel p. 31
  • Ị̀ Maara?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Maara?
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Na-eguzosi Ike n’Ihe Ka Ịtaị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • “Kụziere M Ime Uche Gị”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Dabere Na Mmụọ Chineke N’ime Ihe Banyere Mgbanwe Ndị A Na-enwe Ná Ndụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • Jehova—‘Onye Na-emere Ndị Ya Ụzọ Mgbapụ’ n’Oge Baịbụl
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
w24 Eprel p. 31

Ị̀ Maara?

Gịnị mere ndị na-abụghị ndị Izrel ji soro ná ndị agha Eze Devid?

E NWERE ụmụ nwoke na-abụghị ndị Izrel so ná ndị agha Devid, dị ka Zilek onye Amọn, Yuraya onye Het, na Itma onye Moab.a (1 Ihe 11:39, 41, 46) Ndị ọzọ so ná ndị agha Devid bụ ‘ndị Keretaịt, ndị Peletaịt, na ndị Gat.’ (2 Sam. 15:18) O yiri ka ndị Keretaịt na ndị Peletaịt hà bụ ụmụnne ndị Filistia. (Ezik. 25:16) Ọ ga-abụkwa na ndị Gat bụ ndị bibu n’obodo ndị Filistia a na-akpọ Gat.​—Josh. 13:2, 3; 1 Sam. 6:17, 18.

Gịnị mere Devid ji kwe ka ndị a na-abụghị ndị Izrel soro ná ndị agha ya? Ọ bụ n’ihi na obi siri ya ike na ha na-akwado ya. Nke kadị mkpa bụ na ha na-akwado Jehova. Dị ka ihe atụ, otu akwụkwọ na-akọwa Baịbụl kwuru gbasara ndị Keretaịt na ndị Peletaịt, sị: “Ha kwadoro Devid mgbe ihe kacha siere ya ike n’oge ọ bụ eze.” Olee otú ha si kwado ya? Mgbe “ndị Izrel niile” hapụrụ Eze Devid kwadowe “onye isi ike, aha ya bụ Shiba,” ndị Keretaịt na ndị Peletaịt ji obi ha niile kwado Devid ma nyere ya aka ịkwụsị nnupụisi ahụ Shiba nọ na-enupụrụ ya. (2 Sam. 20:1, 2, 7) N’oge ọzọ, nwa Eze Devid aha ya bụ Adọnaịja gbalịrị ịnara ọchịchị nna ya n’ike. Ma, ndị Keretaịt na ndị Peletaịt kwadosiri Devid ike, nyekwara ya aka ichi Solomọn eze, ebe ọ bụ ya ka Jehova họọrọ ka ọ nọchie nna ya.​—1 Eze 1:24-27, 38, 39.

Onye ọzọ na-abụghị onye Izrel, nke kwadosiri Devid ike, bụ Ịtaị onye Gat. Ịtaị na narị ndị dike ya isii kwadoro Eze Devid mgbe nwa ya bụ́ Absalọm nupụụrụ ya isi ma mee ka ndị Izrel megidewe eze. Na mbụ, Devid gwara Ịtaị ka ọ ghara iso lụọ agha n’ihi na ọ bụ onye mba ọzọ. Ma, Ịtaị sịrị ya: “Eji m Jehova, bụ́ Chineke dị ndụ, aṅụrụ gịnwa bụ́ onyenwe m eze iyi na ma n’ọnwụ ma ná ndụ, ohu gị ga-anọ ebe ọ bụla onyenwe m eze nọ.”​—2 Sam. 15:6, 18-21.

Ebe obi dị Ịtaị na Eze Devid ụtọ ka ha na-akparịta ụka.

Ịtaị ji obi ya niile kwado Devid maka na ọ bụ eze Jehova tere mmanụ

N’agbanyeghị na ndị Keretaịt, ndị Peletaịt, na ndị Gat bụ ndị mba ọzọ, ha na-akwanyere Jehova ùgwù maka na ọ bụ ezi Chineke, na-akwanyekwara Devid ùgwù maka na ọ bụ onye Jehova tere mmanụ. Ọ ga-abụrịrị na obi dị Devid ezigbo ụtọ na o nwere ụmụ nwoke ndị a kwadoro ya.

a Iwu Chineke e dere na Diuterọnọmi 23:3-6 kwuru na ndị Amọn na ndị Moab agaghị eso n’ọgbakọ ụmụ Izrel. Ma, o yiri ka ihe iwu ahụ na-ekwu ọ̀ bụ na a gaghị ekwe ka ha bụrụ ụmụ amaala Izrel. Mana, ọ pụtaghị na ha agaghị ebi n’Izrel ma ọ bụkwanụ na ha na ndị Chineke agaghị emekọ ihe. Gụọ akwụkwọ bụ́ Insight on the Scriptures, Mpịakọta 1, peeji nke 95.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya