ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 30
ABỤ NKE 36 Anyị Na-echebe Obi Anyị
Ihe Ndị Dị Mkpa Anyị Ga-amụta n’Akụkọ Ndị Eze Izrel
“Unu ga-ahụkwa ọzọ ihe dị iche n’onye ezi omume na onye ajọ omume, n’onye na-ejere Chineke ozi na onye na-anaghị ejere ya ozi.”—MAL. 3:18.
IHE A GA-AMỤ
Ịmụta otú Jehova si were ndị eze chịrị Izrel ga-enyere anyị aka ịmata ihe ọ chọrọ ka ndị na-efe ya na-eme taa.
1-2. Gịnị ka Baịbụl kwuru banyere ụfọdụ ndị eze Izrel?
BAỊBỤL kwuru gbasara ihe karịrị ụmụ nwoke iri anọ chịrị Izrel.a Ọ gwakwara anyị hoo haa ihe ụfọdụ n’ime ha mere. Dị ka ihe atụ, ndị bụ́dị ezigbo ndị eze mere ụfọdụ ihe na-adịghị mma. Chegodị gbasara Devid bụ́ ezigbo eze. Jehova kwuru banyere ya, sị: ‘Devid ohu m ji obi ya niile soro m, meekwa naanị ihe ziri ezi n’anya m.’ (1 Eze 14:8) N’agbanyeghị ya, e nwere mgbe Devid na nwunye nwoke ọzọ kwara iko, ya agbaakwa izu ka e gbuo di nwaanyị ahụ n’agha.—2 Sam. 11:4, 14, 15.
2 Ma e nwekwara ụfọdụ ndị eze ọjọọ mere ụfọdụ ihe dị mma. Chegodị gbasara Rehoboam. N’anya Jehova, ọ “nọ na-eme ihe ọjọọ.” (2 Ihe 12:14) N’agbanyeghị ya, Rehoboam gere Jehova ntị mgbe ọ gwara ya ka ọ hapụ ebo iri nke Izrel ka ha nọrọ nke ha. Ọ rụsikwara ọtụtụ obodo ọ na-achị ike ka ndị iro ghara ịbịa lụso ndị Chineke ọgụ.—1 Eze 12:21-24; 2 Ihe 11:5-12.
3. Olee ajụjụ dị mkpa anyị kwesịrị ịza? Gịnị ka anyị ga-amụ n’isiokwu a?
3 Mana, e nwere ezigbo ajụjụ e kwesịrị ịza. Ọ bụrụ na eze Izrel mere ihe ọma, meekwa ihe ọjọọ, oleezi ihe Jehova na-eji ekpebi ma ọ̀ bụ ezigbo eze? Ịmata azịza ajụjụ a ga-enyere anyị aka ịghọta ihe Jehova chọrọ ka anyị na-eme. Anyị ga-eleba anya n’ụzọ ihe atọ Jehova na-echebara echiche ma o kpebiwe ma eze Izrel ọ̀ bụ eze ọma ka ọ̀ bụ eze ọjọọ. Nke mbụ bụ otú obi onye ahụ dị. Nke abụọ bụ otú o si chegharịa mgbe o mere ihe ọjọọ. Nke atọ bụ ma ò fere Jehova otú ọ chọrọ.
HA JI OBI HA NIILE FEE JEHOVA
4. Olee otu ihe dị iche ná ndị eze ji obi ha niile fee Jehova na ndị eze ọjọọ?
4 Ndị eze ndị mere ihe dị Jehova mma ji obib ha niile fee Jehova. Jehoshafat bụ́ ezigbo eze “ji obi ya niile chọọ Jehova.” (2 Ihe 22:9) Mgbe Baịbụl na-ekwu gbasara Josaya, ọ sịrị: “O nweghị eze dị ka ya ná ndị eze niile bu ya ụzọ. O ji obi ya niile . . . lọghachikwute Jehova.” (2 Eze 23:25) Solomọn kwanụ? O mere ihe dị njọ mgbe o mere agadi. “O jighị obi ya niile fee Jehova.” (1 Eze 11:4) Baịbụl kwukwara gbasara eze ọzọ na-erubereghị Jehova isi aha ya bụ Abaịja. Ọ sịrị: “O jighị obi ya niile fee Jehova.”—1 Eze 15:3.
5. Kọwaa ihe mmadụ iji obi ya niile fee Jehova pụtara.
5 Gịnịzi ka mmadụ iji obi ya niile fee Jehova pụtara? Onye ji obi ya niile na-efe Jehova anaghị efe ya naanị n’ihi na ọ ma na ọ bụ ihe o kwesịrị ime. Kama, ọ na-efe ya n’ihi na ọ hụrụ ya n’anya, na-akwanyekwara ya ùgwù. Ọ na-emekwa otú ahụ ná ndụ ya niile.
6. Olee otú anyị nwere ike isi jiri obi anyị niile na-efe Jehova? (Ilu 4:23; Matiu 5:29, 30)
6 Olee otú anyị nwere ike isi na-eme ka ndị eze ahụ rubeere Jehova isi ma jiri obi ha niile fee ya? Ọ bụ ịna-ezere ihe ndị na-adịghị mma. Dị ka ihe atụ, iji ihe ndị na-adịghị mma atụrụ ndụ nwere ike ime ka anyị ghara iji obi anyị niile na-efe Jehova. Mkpakọrịta ọjọọ na ịchụ ego ọnwụ ọnwụ nwekwara ike ime ka anyị ghara iji obi anyị niile na-efe Jehova. Ọ bụrụ na anyị achọpụta na e nweela ihe chọrọ ime ka anyị ghara iji obi anyị niile hụ Jehova n’anya, ka anyị gbaa ezigbo mbọ ozugbo wepụ ya n’obi anyị.—Gụọ Ilu 4:23; Matiu 5:29, 30.
7. Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị zere ihe ndị nwere ike ime ka anyị gharazie ịhụ Jehova n’anya?
7 Anyị ekwesịghị ikwe ka ihe ọ bụla mee ka anyị gharazie iji obi anyị niile na-efe Jehova. Ọ bụrụ na anyị akpacharaghị anya, anyị nwere ike ịna-aghọgbu onwe anyị, na-eche na ọ bụrụ na anyị ewepụtakwuo oge na-eme ihe gbasara ofufe Jehova, anyị ekwesịghịzi ịna-ezere ihe ndị ahụ na-adịghị mma. Dị ka ihe atụ, ka e were ya na ị pụrụ apụ mgbe ezigbo ụgụrụ na-atụ. Mgbe ị lọtara, gị abanye n’ụlọ gị ozugbo, yiri uwe e ji achụ oyi. Ma, è nwere ezigbo uru ọ ga-abara gị ma ị ka hapụ ọnụ ụzọ gị na windo gị ka ha ghere oghe? Mba, n’ihi na oyi ka ga na-abata n’ụlọ gị. Gịnị ka ihe a na-akụziri anyị? Ihe anyị kwesịrị ime abụghị naanị ịna-eme ihe ndị ga-eme ka anyị na Jehova na-adị ná mma. Anyị kwesịkwara imechi ụzọ ka ihe ndị na-adịghị mma ma ọ bụ echiche ụwa ghara ịbata n’obi anyị ma mee ka anyị ghara iji obi anyị niile na-efe Jehova.—Efe. 2:2.
HA CHEGHARỊRỊ NÁ MMEHIE HA
8-9. Gịnị ka Eze Devid na Eze Hezekaya mere mgbe a dọrọ ha aka ná ntị? (Kọwaa foto.)
8 Dị ka anyị kwuburu, Eze Devid mere ihe jọgburu onwe ya. Ma mgbe onye amụma bụ́ Netan gwara Devid otú obi dị Jehova gbasara mmehie ahụ, o wedara onwe ya ala ma chegharịa. (2 Sam. 12:13) Ihe Devid kwuru n’Abụ Ọma nke 51 gosiri na o ji obi ya niile chegharịa. Ihe Devid mere abụghị ime ka à ga-asị na ihe o mere wutere ya ka o jiri ya ghọgbuo Netan ma ọ bụ ka a ghara ịta ya ahụhụ ihe o mere.—Ọma 51:3, 4, 17, okwu mmeghe ya.
9 Eze Hezekaya mehiekwara Jehova. Baịbụl sịrị: “Ọ bịara dị mpako, nke mere ka Chineke wesa ya iwe, wesakwa Juda na Jeruselem.” (2 Ihe 32:25) Gịnị mere Hezekaya ji dịwa mpako? O nwere ike ịbụ na akụnụba ya, otú o si merie ndị Asiria ma ọ bụ otú Chineke si gwọọ ya ọrịa buwere ya isi. O nwekwara ike ịbụ mpako mere ka o gosi ndị Babịlọn akụ̀ ya, nke mere ka Aịzaya onye amụma baara ya mba. (2 Eze 20:12-18) Ma Hezekaya mekwara ka Devid, jiri obi ya niile chegharịa. (2 Ihe 32:26) Jehova mechara were ya ka eze ji obi ya niile fee ya, onye “nọ na-eme ihe ziri ezi.”—2 Eze 18:3.
Eze Devid na Eze Hezekaya ji obi ha niile chegharịa mgbe a gwara ha mmehie ha mere (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8 na nke 9)
10. Gịnị ka Eze Amazaya mere mgbe a dọrọ ya aka ná ntị?
10 Ma, eze Juda aha ya bụ Amazaya emeghị ka Devid na Hezekaya. O mere ihe ọma, “ma o jighị obi ya niile na-eme ya.” (2 Ihe 25:2) Gịnị bụ ihe na-adịghị mma o mere? Mgbe Jehova nyechaara ya aka ya emerie ndị Ịdọm, ọ malitere ife chi ha.c Mgbe onye amụma Jehova bịara gwawa ya okwu maka ya, o geghị ya ntị. Ọ chụpụrụ ya.—2 Ihe 25:14-16.
11. Dị ka e kwuru ná 2 Ndị Kọrịnt 7:9, 11, gịnị ka anyị kwesịrị ime ka Jehova nwee ike ịgbaghara anyị? (Kọwaakwa ihe e sere na foto ndị e ji kọwaa paragraf a.)
11 Gịnị ka anyị na-amụta n’akụkọ ndị a? Anyị kwesịrị ichegharị ná mmehie anyị ma mee ihe niile anyị nwere ike ime ka anyị ghara ime ya ọzọ. Ọ bụrụ na ndị okenye enye anyị ndụmọdụ, ọ bụrụgodị n’ihe yiri obere ihe, gịnị ka anyị kwesịrị ime? Anyị ekwesịghị iwere ya na Jehova ma ọ bụ ndị okenye ajụla anyị. E nwedịrị mgbe a dọrọ ndị bụ́ ezigbo ndị eze Izrel aka ná ntị ma nye ha ndụmọdụ. (Hib. 12:6) Ọ bụrụ na a gbazie anyị, anyị kwesịrị (1) iwetu obi ala nabata ndụmọdụ ahụ, (2) ịgbanwe ihe ndị anyị kwesịrị ịgbanwe, na (3) iji obi anyị niile fere Jehova na-aga. Ọ bụrụ na anyị echegharịa ná mmehie anyị, Jehova ga-agbaghara anyị.—Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 7:9, 11.
Ọ bụrụ na a gbazie anyị, anyị kwesịrị (1) iwetu obi ala nabata ndụmọdụ ahụ, (2) ịgbanwe ihe ndị anyị kwesịrị ịgbanwe, na (3) iji obi anyị niile fere Jehova na-aga (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11)f
HA FERE JEHOVA OTÚ Ọ CHỌRỌ
12. Olee ihe mere ka ndị eze ji obi ha niile fee Jehova dị iche ná ndị eze ọjọọ?
12 Ndị eze Jehova weere ka ndị ji obi ha niile fee ya fere ya otú ọ chọrọ. Ha gbakwara ndị ha na-achị ume ka ha mee otú ahụ. Nke bụ́ eziokwu bụ na e nwekwara mgbe ha mejọrọ ihe dị ka anyị chọpụtarala. Ma, ha fere naanị Jehova, gbasiekwa mbọ ike iwepụ arụsị n’obodo ha.d
13. Gịnị mere Jehova ji kwuo na Eze Ehab bụ eze ọjọọ?
13 Gịnịkwanụ mere Jehova ji were ndị eze ụfọdụ ka ndị ọjọọ? O doro anya na ọ bụghị ihe niile ha mere dị njọ. E nwedịrị mgbe Ehab bụ́ eze ọjọọ gositụrụ na ọ dị umeala n’obi ma kwaa mmakwaara n’otú o si tinye aka n’ọnwụ Nebọt. (1 Eze 21:27-29) Ọ rụkwara ọtụtụ obodo ma merie n’agha ndị ọ lụụrụ ndị Izrel. (1 Eze 20:21, 29; 22:39) Ma, e nwere ihe Ehab mere dị ezigbo njọ. Nwunye ya mere ka ọ kwado ife arụsị. E nweghị mgbe ọ bụla o chegharịrị hapụ ife arụsị.—1 Eze 21:25, 26.
14. (a) Gịnị mere Jehova ji were Eze Rehoboam ka eze ọjọọ? (b) Olee ihe ndị na-emekarị n’oge ndị eze ọjọọ na-achị?
14 Chegodị banyere eze ọjọọ ọzọ bụ́ Rehoboam. Dị ka anyị bu ụzọ kwuo, o mere ọtụtụ ihe ọma n’oge ọ na-achị. Ma, mgbe ọchịchị ya bịara sie ezigbo ike, ọ hapụrụ iwu Jehova ma fewe arụsị. (2 Ihe 12:1) Mgbe e mechara, ihe ọ na-emezi bụ o fetụ Jehova, ya efetụ arụsị. (1 Eze 14:21-24) Ọ bụghị naanị Rehoboam na Ehab bụ ndị eze hapụrụ Jehova fewe arụsị. N’eziokwu, ọtụtụ ndị eze ọjọọ fere arụsị ma gbaa ndị ha na-achị ume ime otú ahụ. O doro anya na n’anya Jehova, ife ya otú ọ chọrọ bụ otu ihe dị ezigbo mkpa na-egosi ma eze ọ̀ bụ eze ọma ka ọ̀ bụ eze ọjọọ.
15. Gịnị mere mmadụ ife Jehova otú ọ chọrọ ji adị Jehova mkpa?
15 Gịnị mere ihe gbasara ofufe ji dịrị Jehova ezigbo mkpa? Otu ihe kpatara ya bụ na ọ bụ ndị eze ka ọ dị n’aka inyere ndị ha na-achị aka ife Jehova otú ọ chọrọ. Ihe ọzọ bụ na ọ bụrụ na ndị mmadụ efewe chi ọzọ, ọ na-eme ka ha mewe ihe ọjọọ ndị ọzọ ma na-emegbu ndị ọzọ. (Hos. 4:1, 2) Ihe ọzọkwa bụ na ndị eze Izrel na ndị Izrel niile nyefere Jehova onwe ha. N’ihi ya, ọ bụrụ na ha etinye aka n’ife arụsị, ọ na-ewere ha ka ndị kwara iko. (Jere. 3:8, 9) Mmadụ kwaa iko, ọ na-agbawa di ya ma ọ bụ nwunye ya obi. Otú ahụ ka ọ dịkwa ma ọ bụrụ na onye nyefere Jehova onwe ya ahapụ ya fewe chi ọzọ. Ọ na-agbawa Jehova obi.e—Diut. 4:23, 24.
16. N’anya Jehova, olee ihe dị iche n’onye ezi omume na onye ajọ omume?
16 Gịnị ka ihe a na-akụziri anyị? N’eziokwu, anyị kwesịrị ikpebisi ike izere ihe niile gbasara okpukpe ụgha. Mana, anyị kwesịkwara ijisi ezigbo ofufe aka ike ma na-eme ihe ndị a na-eme na ya. Malakaị onye amụma mere ka ihe na-eme ka mmadụ bụrụ ezigbo mmadụ ma ọ bụ onye ọjọọ doo anya. Ọ sịrị: “Unu ga-ahụkwa ọzọ ihe dị iche n’onye ezi omume na onye ajọ omume, n’onye na-ejere Chineke ozi na onye na-anaghị ejere ya ozi.” (Mal. 3:18) N’ihi ya, anyị ekwesịghị ikwe ka ihe ọ bụla, ma ezughị okè anyị ma ihe ndị anyị na-emejọ, mee ka anyị daa mbà nke na anyị ga-akwụsị ife Chineke. Ịkwụsị ife Jehova bụdị mmehie dị oké njọ.
17. Gịnị mere anyị ji kwesị ịkpachara anya mgbe anyị na-ahọrọ onye anyị ga-alụ?
17 Ọ bụrụ na ị lụbeghị di ma ọ bụ nwunye, mana ị chọrọ ịlụ, ihe Malakaị kwuru nwere ike inyere gị aka ịchọta ezigbo onye ị ga-alụ. Mmadụ nwere ike ịna-akpa àgwà ọma ụfọdụ. Ma, ọ bụrụ na onye ahụ anaghị efe Chineke, Jehova ò weere ya ugbu a ka onye ezi omume? (2 Kọr. 6:14) Ọ bụrụ na gị na ya alụọ, ọ̀ ga-eme ka i jiri ofufe Jehova kpọrọ ihe? Chegodị echiche. Ọ ga-abụ na ndị nwunye Eze Solomọn, ndị na-ekpere arụsị, nwere àgwà ọma ụfọdụ ha na-akpa. Ma, ha anaghị efe Jehova. Ha jikwa nwayọọ nwayọọ mee ka Solomọn fewe arụsị.—1 Eze 11:1, 4.
18. Gịnị ka ndị nne na nna kwesịrị ịkụziri ụmụ ha?
18 Ndị nne na nna, unu nwere ike iji ihe Baịbụl kwuru gbasara ndị eze Izrel nyere ụmụ unu aka ka ọ na-agụ ha agụụ ife Jehova. Nyerenụ ha aka ịghọta na ihe na-eme ka Jehova were eze ka onye ọma ma ọ bụ onye ọjọọ na-abụkarị otú onye ahụ si were ofufe ya nakwa otú o si agba ndị ọ na-achị ume ka ha were ofufe ya. Jirinụ okwu na omume unu na-akụziri ụmụ unu na ihe ndị a na-eme n’ofufe Jehova, dị ka ịmụ Baịbụl, ịga ọmụmụ ihe, na ịga ozi ọma, dị mkpa karịa ihe ọ bụla ọzọ. (Mat. 6:33) Ma unu emeghị otú ahụ, ụmụ unu nwere ike iche na ihe mere ha ga-eji na-efe Jehova abụghị na hanwa chọrọ ife ya kama ọ bụ n’ihi na nne na nna ha bụ Ndịàmà Jehova. O nwere ike ime ka ha ghara iwere ife Jehova ka ihe kacha mkpa ná ndụ ha, ma ọ bụdị ha ahapụchaa ya kpamkpam.
19. Ọ bụrụ na mmadụ akwụsị ife Jehova, nke ya ọ̀ gaala? (Kwuokwa ihe dị n’igbe isiokwu ya bụ “I Nwere Ike Ịlọghachikwute Jehova.”)
19 Ọ bụrụ na mmadụ akwụsị ife Jehova, nke ya ọ̀ gaala? Mba. Ọ ka nwere ike ichegharị ma bidokwa ife Jehova. Ọ bụrụ na mmadụ chọrọ ịlọghachikwute Jehova, o nwere ike ịdị mkpa ka o wetuo onwe ya ala, kweta ka ndị okenye ọgbakọ nyere ya aka. (Jems 5:14) Mbọ ọ bụla onye ahụ ga-agba ka ya na Jehova bụrụghachi enyi agaghị efu ọhịa.
20. Ọ bụrụ na anyị emee ka ndị eze ji obi ha niile fee Jehova, olee otú Jehova ga-esi ewere anyị?
20 Olee ihe anyị mụtarala n’akụkọ gbasara ndị eze chịrị Izrel? Anyị ga-emeli ka ezigbo ndị eze ji obi ha niile fee Jehova ma ọ bụrụ na anyị ejiri obi anyị niile na-efe ya. Anyị kwesịrị ịmụta ihe n’ihe ndị anyị mejọrọ, chegharịa ma mezie ihe ndị anyị kwesịrị imezi. Ka anyị chetakwa na anyị kwesịrị ijisi ofufe onye naanị ya bụ ezi Chineke ike. Ọ bụrụ na i jisie Jehova aka ike, ọ ga-ewere gị ka onye na-eme ihe dị mma n’anya ya.
ABỤ NKE 45 Ihe M Na-atụgharị n’Uche
a N’isiokwu a, e kwuo “ndị eze Izrel,” ọ pụtara ndị eze niile chịrị ndị Jehova, ma hà chịrị n’ebo abụọ nke Juda ma ọ bụ n’ebo iri nke Izrel ma ọ bụkwanụ ha niile dị iri na abụọ.
b NKỌWAKWU: Ọtụtụ ugboro, Baịbụl na-eji okwu bụ́ “obi” akọwa ụdị onye mmadụ bụ, ma ihe ndị na-agụ onye ahụ agụụ, ihe ndị ọ na-eche, otú o si ele ihe anya, àgwà ya, ihe ndị o nwere ike ime, ihe ndị na-eme ka ọ na-eme ihe ndị ọ na-eme, na ihe ndị ọ na-achọ ime.
c Ọ ga-abụ na ndị eze na-ekpere arụsị na-efekarị chi ndị ha meriri n’agha.
d Eze Esa mere mmehie dị oké njọ. (2 Ihe 16:7, 10) N’agbanyeghị ya, Baịbụl kwuru okwu ọma banyere ya. Ọ bụ eziokwu na ọ nabatabughị aka ná ntị a dọrọ ya, ọ ga-abụ na o mechara chegharịa. Ihe ọma ndị o mere karịrị ihe ndị o mejọrọ. Esa fere naanị Jehova ma gbaakwa mbọ iwepụ ikpere arụsị n’ebe ọ na-achị.—1 Eze 15:11-13; 2 Ihe 14:2-5.
e Anyị ga-achọpụta na Jehova ejighị ofufe a na-efe ya egwu egwu n’ihi na iwu abụọ mbụ dị n’Iwu Mosis kwuru ka a ghara ife onye ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ ma e wepụ Jehova.—Ọpụ. 20:1-6.
f NKỌWA FOTO: Ebe otu okenye bụ́ nwa okorobịa na-agwa otu nwanna otú obi dị ya gbasara otú o si aṅụ mmanya. Nwanna ahụ nabatara ndụmọdụ e nyere ya, gbanwee, jirikwa obi ya niile na-efe Jehova.