AKỤKỌ NDỤ
“E Nweghị Mgbe M Nọ Naanị M”
E NWERE ọtụtụ oge o nwere ike ịdị anyị ka ànyị nọ naanị anyị. O nwere ike ịbụ mgbe mmadụ nwụnahụrụ anyị, mgbe anyị gara ebe ọhụrụ, ma ọ bụkwanụ mgbe naanị anyị nọ. Ihe ndị a niile emechaala m. N’agbanyeghị ya, m cheta ihe ndị mere ná ndụ m, m na-aghọta ugbu a na e nwebeghị mgbe ọ bụla m nọrọ naanị m. Ka m kọọrọ gị ihe mere m ji kwuo otú ahụ.
IHE M MỤTARA N’AKA NNE NA NNA M
Mama m na papa m bu Chọọchị Katọlik n’isi. Ma, mgbe ha si na Baịbụl mụta na aha Chineke bụ Jehova, ha abụọ ghọrọ Ndịàmà Jehova na-anụ ọkụ n’obi. Papa m kwụsịrị iji osisi apị Jizọs. O jizi ihe ọ mụtara n’ọrụ ịkwa nkà ya rụgharịa okpukpu nke dị n’ala ụlọ elu anyị ka ọ bụrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze mbụ e nwere na San Juan del Mọnte nke dị n’ebe mpụta Manila, bụ́ isi obodo Filipinz.
Mụ na papa m na mama m na ndị ezinụlọ anyị
Mgbe a mụchara m n’afọ 1952, nne na nna m malitere ịkụziri m gbasara Jehova otú ha sikwa na-akụziri ụmụnne m ndị tọrọ m. Ha dị ndị nwoke anọ na ndị nwaanyị atọ. Ka m na-etolite, papa m gbara m ume ka m na-agụ otu isi na Baịbụl n’ụbọchị ọ bụla. Ọ mụkwaara m ọtụtụ akwụkwọ nzukọ a bipụtara. Papa m na mama m na-akpọkarị ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na ndị na-anọchite anya alaka ụlọ ọrụ ka ha bịa n’ụlọ anyị. Akụkọ ụmụnna ndị a na-akọrọ anyị na-eme anyị obi ụtọ, na-agbakwa anyị ume. O mekwara ka anyị niile were ozi Jehova ka ihe kacha mkpa ná ndụ anyị.
M mụtara ọtụtụ ihe n’aka nne na nna m. Ha ji obi ha niile na-efe Jehova. Mgbe ọrịa gburu mama m, mụ na papa m malitere ịsụ ụzọ n’afọ 1971. Ma n’afọ 1973, mgbe m dị afọ iri abụọ, papa m nwụrụ. Ọnwụ papa m na mama m mere ka ọ dị m ka nke m ọ̀ gwụla nakwa ka m̀ nọ naanị m. Ma, olileanya ‘siri ike, e jikwa n’aka’ dị na Baịbụl nyeere m aka ịnọsi ike n’ofufe Jehova, meekwa ka m ghara ịna-ada mbà. (Hib. 6:19) Obere oge papa m nwụchara, a kpọrọ m ka m bịa bụrụ ọsụ ụzọ pụrụ iche n’agwaetiti Kọrọn dịpụrụ adịpụ nke dị na Palawan.
MGBE M NỌ NAANỊ M N’OGE M NA-EJE OZI TARA AKPỤ
Adị m afọ iri abụọ na otu mgbe m rutere Kọrọn. Ebe m toro bụ n’obodo mepere emepe. N’ihi ya, o juru m anya ịhụ na n’agwaetiti a, a naghị enwecha ọkụ ma ọ bụ mmiri pọmpụ. Ụgbọala na ọgba tumtum adịghịkwa ọtụtụ. Ọ bụ eziokwu na e nwere ụmụnna ole na ole na ya, e nweghị onye mụ na ya so na-asụ ụzọ. Mgbe ụfọdụkwa, ọ bụ naanị m na-aga ozi ọma. N’ọnwa mbụ m nọrọ ebe ahụ, ọ gụsiri m agụụ ike ịhụ ndị ezinụlọ m na ndị enyi m. N’abalị, m na-eleli anya elu na-ele kpakpando, anya mmiri ana-agba m. Ọ dị m ka m kwụsị ozi m na-eje laghachi ụlọ.
N’oge ndị ahụ m nọ naanị m, m na-akọrọ Jehova otú ọ dị m n’obi. M na-echeta ihe ndị na-agba ume m gụtara na Baịbụl nakwa n’akwụkwọ anyị. M na-echetakarị Abụ Ọma 19:14. M ghọtara na Jehova ga-abụ “Oké Nkume m na Onye Mgbapụta m” ma ọ bụrụ na mụ ana-echebara ihe ndị na-adị ya mma echiche, dị ka àgwà ya na ihe ndị ọ na-eme. Otu isiokwu gbara n’Ụlọ Nche kwuru na anyị anọghị naanị anyị nyeere m ezigbo aka.a M gụrụ ya ọtụtụ ugboro. M nọrọ naanị m, ọ na-adị m ka ọ̀ bụ mụ na Jehova nọ. Oge ndị ahụ bụ oge pụrụ iche m na-eji ekpe ekpere, na-amụ ihe, ma na-atụgharị uche.
N’oge na-adịghị anya m rutere Kọrọn, a họpụtara m ịbụ okenye. Ebe ọ bụ naanị m bụ okenye n’ọgbakọ ahụ, m malitere ịna-eduzi Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, Nzukọ Ije Ozi, Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ, na Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche kwa izu. M na-ekwukwa okwu ihu ọha n’izu ọ bụla. Ihe ndị a m na-eme mere ka m na-eji ọrụ n’aka mgbe niile nke na ọ naghị adị m ka m̀ nọ naanị m.
Ozi m jere na Kọrọn rụpụtara ọtụtụ ihe ọma. Ụfọdụ n’ime ndị m mụụrụ Baịbụl mechara mee baptizim. Ma, e nwekwara ihe ndị siiri m ike. Mgbe ụfọdụ, m na-esi n’ụtụtụ gagide ije ruo n’ehihie tupu mụ eruo ebe m ga-ekwusa ozi ọma. M rute, anaghị m ama ebe m ga-emecha hie ụra n’abalị. Ebe ndị so n’ebe ọgbakọ anyị na-ekwusa ozi ọma bụ ọtụtụ obere agwaetiti. Ọtụtụ mgbe, ọ bụ ụgbọ mmiri na-ebu m aga ebe m na-aga n’agbanyeghị na amaghị m otú e si egwu mmiri. Ebili mmiri na-emekwa n’osimiri ahụ. N’oge ndị a niile ihe siiri m ike, Jehova chebere m ma kwado m. M mechara chọpụta na Jehova na-akwadebe m maka nsogbu ndị ka taa akpụ ga-abịara m n’ebe ọzọ a ga-eziga m.
PAPỤA NIU GINI
N’afọ 1978, e zigara m Papụa Niu Gini nke dị n’ebe ugwu ma e si Ọstrelia gawa ya. Obodo Papụa Niu Gini bụ ugwu ugwu. Ọ fọrọ obere ka ya na Spen hara. O juru m anya na ihe dị ka nde mmadụ atọ (3,000,000) bi n’obodo ahụ na-asụ ihe karịrị narị asụsụ asatọ (800). Obi dị m ụtọ na ọtụtụ ndị bi ebe ahụ na-asụ Pijin ndị Melanesia, nke a na-akpọ Tọk Pisin.
E zigara m ka m nọrọgodị n’ọgbakọ Bekee n’isi obodo ahụ bụ́ Pọt Moresbi. Ma, m mechara gafee n’ọgbakọ na-eji asụsụ Tọk Pisin amụ ihe, na-agakwa n’ebe a na-akụzi asụsụ ahụ. M na-eji ihe m na-amụta na-ezi ozi ọma. Ihe a nyeere m aka ịmụta asụsụ ahụ ngwa ngwa. N’oge na-adịghị anya, m na-ejizi asụsụ Tọk Pisin ekwu okwu ihu ọha. Chegodị otú o si ju m anya na ihe na-erubeghị otu afọ m rutere Papụa Niu Gini, a họpụtara m ka m bụrụ onye nlekọta sekit ga na-eleta ọgbakọ ndị na-eji asụsụ Tọk Pisin amụ ihe. Sekit ahụ buru ezigbo ibu.
Ebe ọ bụ na ọgbakọ ndị ahụ dị anya n’ibe ha, m na-ahazi ọtụtụ mgbakọ sekit, na-emekwa njem ọtụtụ ugboro. Ná mmalite, ọ dị m ka m̀ nọ naanị m n’ihi na m nọ n’obodo ọhụrụ, ebe ndị mmadụ na-asụ asụsụ dị iche, nweekwa omenala dị iche. Agaghị m ejili ụgbọala aga eleta ọgbakọ dị iche iche n’ihi na obodo ahụ bụ ugwu ugwu, ụzọ ya adịghịkwa larịị. N’ihi ya, m na-eji ụgbọelu eme njem n’ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ izu ọ bụla. Mgbe ụfọdụ, ọ bụ naanị m na-anọ n’ụgbọelu bụ́ a gba e kpere chi. Obi na-awụnye m n’afọ ma m na-eme ụdị njem ahụ, otú ahụ ọ na-adị m ma m nọrọ n’ụgbọ mmiri.
Ọtụtụ ndị enweghị telefon. N’ihi ya, m na-eji akwụkwọ ozi ezi ọgbakọ dị iche iche ozi. Ọtụtụ mgbe, mụnwa na-ebu akwụkwọ ozi m ụzọ erute ọgbakọ m na-aga ileta. M na-ajụkwa ajụjụ ka e gosi m ụlọ ụmụnna. Ma, mgbe ọ bụla m hụrụ ụmụnna, ha na-eji obi ha niile anabata m. Ọ na-eme ka m mata na mbọ m na-agba abụghị na nkịtị. Achọpụtara m na Jehova si n’ọtụtụ ụzọ kwado m, ya emee ka mụ na ya dịkwuo ná mma.
Mgbe mbụ m so otu ọgbakọ dị n’otu agwaetiti aha ya bụ Bugenvil mụọ ihe, otu di na nwunye ihu ha bụ sọ ọchị bịakwutere m ma jụọ m, sị, “Ì chetara anyị?” M chetara na m ziri di na nwunye a ozi ọma n’oge mbụ m rutere Pọt Moresbi. M maliteere ha ọmụmụ Baịbụl, nyefezie ha otu nwanna bi n’ebe ahụ ka ọ na-amụrụ ha Baịbụl. Ugbu a, ha abụọ emeela baptizim. Ihe a bụ otu n’ime ọtụtụ ngọzi m nwetara n’ime afọ atọ m jere ozi na Papụa Niu Gini.
OTU OBERE EZINỤLỌ NA-EJIKARỊ ỌRỤ N’AKA
Mụ na nwunye m Adel
Tupu mụ ahapụ Kọrọn n’afọ 1978, m matara otu nwanna nwaanyị bụ́ asampete aha ya bụ Adel. O jikwa ofufe Jehova kpọrọ ihe. Ọ bụ ọsụ ụzọ oge niile, na-azụkwa ụmụ ya abụọ bụ́ Samuel na Shirley. N’otu oge ahụkwa, ọ na-elekọta mama ya mere agadi. N’ọnwa Mee afọ 1981, m laghachiri Filipinz ka m lụọ Adel. Mgbe anyị lụchara, anyị abụọ sụkọrọ ụzọ ọnụ, na-elekọtakwa ezinụlọ ọhụrụ anyị.
Mgbe m mụ na nwunye m Adel na ụmụ anyị bụ́ Samuel na Shirley na-eje ozi na Palawan
N’afọ 1983, n’agbanyeghị na mụ enweela ezinụlọ, a họpụtakwara m ọzọ ka m bụrụ ọsụ ụzọ pụrụ iche, e zigakwa m na Linapakan Aịland nke dị na Palawan. Ezinụlọ anyị niile kwafere ebe a dịpụrụ adịpụ, ebe a na-enweghị Onyeàmà Jehova ọ bụla. Mama Adel nwụrụ mgbe ihe dị ka otu afọ gachara. Ma, anyị na-ejechi ozi anyị anya, nke mere ka anyị nwee ike idi ọnwụ ya. Anyị malitere ọtụtụ ọmụmụ Baịbụl na-aga nke ọma na Linapakan nke na n’oge na-adịghị anya, anyị chọwara ịrụ obere Ụlọ Nzukọ Alaeze. N’ihi ya, anyị rụrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze n’onwe anyị. Naanị afọ atọ anyị rutere ebe a, obi tọrọ anyị ụtọ ịhụ otu narị mmadụ na iri (110) bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs. Ọtụtụ n’ime ha mekwara baptizim mgbe anyị pụrụ n’obodo ahụ.
N’afọ 1986, e zigara m n’agwaetiti Kuliọn, bụ́ ebe nwere ebe a na-elekọta ndị ekpenta. Mgbe nke ahụ gachara, a họpụtara nwunye m Adel ka ọ bụrụkwa ọsụ ụzọ pụrụ iche. Na mbụ, obi erughị anyị ala ikwusara ndị ekpenta ozi ọma. Ma, ndị nkwusa nọ ebe ahụ mere ka obi sie anyị ike na ọrịa ahụ agaghị efe anyị n’ihi na a na-enye ndị na-arịa ọrịa ahụ ọgwụ. Ụfọdụ n’ime ha na-abịa ọmụmụ ihe anyị n’ụlọ otu nwanna nwaanyị. N’oge na-adịghị anya, ikwusara ha ozi ọma bịara mara anyị ahụ́. Ọ magbukwara onwe ya ime ka ndị a chere na Chineke na ndị mmadụ ajụla ha nụ ozi dị na Baịbụl ga-eme ka ha nwee olileanya. Obi tọgbukwara anyị atọgbu ịhụ ka ndị na-arịa ezigbo ọrịa nwere obi ụtọ n’ihi na ha nwere olileanya na otu ụbọchị, ha agaghịzi arịa ọrịa ọ bụla.—Luk 5:12, 13.
Gịnị mere ka ozi anyị na-eje na Kuliọn mara ụmụ anyị ahụ́? Mụ na nwunye m Adel kpọrọ ụmụnna nwaanyị abụọ nọ na Kọrọn ka ha bịa soro anyị jewe ozi na Kuliọn, ka ụmụ anyị nwee ndị bụ́ ezigbo mmadụ ha na ha ga na-akpakọrịta. Ọ na-atọgbu Samuel, Shirley, na ụmụnna nwaanyị abụọ ndị a na-eto eto atọgbu ịmụrụ ọtụtụ ụmụaka ihe, mụ na Adel ana-amụrụ nne na nna ụmụaka ndị ahụ ihe. N’eziokwu, e nwere oge o ruru, anyị ana-amụrụ ezinụlọ iri na otu ihe. N’oge na-adịghị anya, anyị na-eduzi ọtụtụ ọmụmụ Baịbụl na-aga nke ọma nke na e hiwere ọgbakọ ọhụrụ ebe ahụ.
Ná mmalite, ọ bụ naanị m bụ okenye nọ ebe ahụ. N’ihi ya, alaka ụlọ ọrụ gwara m ka m na-eduzi ọmụmụ ihe kwa izu na Kuliọn, ebe e nwere ndị nkwusa asatọ, na-eduzikwa ọmụmụ ihe n’ebe a na-akpọ Marili, ebe e nwere ndị nkwusa itoolu. Iji ụgbọ mmiri agaru ebe ahụ na-ewe awa atọ. A gbasaa ọmụmụ ihe, ezinụlọ anyị niile na-eji ụkwụ aga ọtụtụ awa n’ebe bụ́ ugwu ugwu, garuo obodo a na-akpọ Halse ịga mụọrọ ndị mmadụ Baịbụl.
Ọtụtụ ndị mechara bata n’ọgbakọ na Marili nakwa na Halse nke na anyị rụrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze n’obodo abụọ ndị a. Dịkwa ka e mere na Linapakan, ụmụnna na ndị nwere mmasị wetara ọtụtụ n’ime ihe ndị e ji rụọ ụlọ ndị ahụ, rụọkwa ha. Ụlọ Nzukọ Alaeze a rụrụ na Marili na-aba narị mmadụ abụọ (200). E nwekwara ike ime ka o bukwuo ibu nke na anyị na-anọ na ya eme mgbakọ sekit.
OGE M RURU UJU, NỌRỌ NAANỊ M, MA NWEGHACHI ỌṄỤ
N’afọ 1993, mgbe ụmụ anyị tochara, mụ na nwunye m Adel malitekwara ileta sekit na Filipinz. N’afọ 2000, m gara Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi ka a zụọ m ịbụ onye nkuzi n’ụlọ akwụkwọ ahụ. Ọ dị m ka mụ erughị eru ịrụ ọrụ ahụ. Mana, nwunye m gbara m ume. Ọ gwara m na Jehova ga-enye m ike m ga-eji rụọ ọrụ ọhụrụ ahụ. (Fil. 4:13) Ọ ma na ihe ọ na-ekwu bụ eziokwu n’ihi na yanwa rụliri ọrụ nke ya n’agbanyeghị ọrịa na-arịa ya.
N’afọ 2006, mgbe m na-akụzi ihe n’Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi, a chọpụtara na nwunye m Adel na-arịa ọrịa na-eme ka ahụ́ na-ama mmadụ jijiji. Ihe a juru anyị anya. Mgbe m tụụrụ ya aro ka anyị kwụsị ozi ahụ anyị na-eje ka m nwee ike ịna-elekọta ya, ọ sịrị m: “Biko, chọta dọkịta ga-enyere m aka n’ọrịa m. Amakwa m na Jehova ga-enyere anyị aka ịna-eje ozi anyị.” Ruo afọ isii na-eso ya, nwunye m Adel ka nọ na-eje ozi ya n’emeghị mkpesa ọ bụla. Mgbe ọ na-enweghịzi ike ịga ije, ọ na-anọ n’ígwè ndị ngwọrọ na-ekwusa ozi ọma. Mgbe ikwu okwu siiri ya ezigbo ike, ọ na-eji otu okwu ma ọ bụ abụọ aza ajụjụ n’ọmụmụ ihe. Ọtụtụ ụmụnna na-ezitere nwunye m Adel ozi iji kelee ya maka otú o si na-atachi obi ruokwa mgbe ọ nwụrụ n’afọ 2013. Mụ na nwunye m hụrụ m n’anya ma jiri obi ya niile na-akwado m lụrụ ihe karịrị afọ iri atọ. N’ihi ya, mgbe ọ nwụrụ, m ruru ezigbo uju, ya adịkwa m ka m̀ nọ naanị m ọzọ.
Nwunye m chọrọ ka m ghara ịkwụsị ozi m. N’ihi ya, akwụsịghị m. M na-eji ọrụ n’aka. Ọ na-enyekwara m aka ka owu ghara ịma m. Malite n’afọ 2014 ruo 2017, e zigara m ileta ọgbakọ ndị na-eji asụsụ Tagalọg amụ ihe n’obodo a machiri ọrụ anyị. Mgbe nke ahụ gachara, m gara leta ọgbakọ ndị na-eji Tagalọg amụ ihe na Taịwan, Amerịka, na Kanada. N’afọ 2019, m kụziri ihe n’Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze e ji Bekee kụzie n’India nakwa na Taịland. Ọrụ ndị a niile e nyere m tọrọ m ezigbo ụtọ. Mgbe obi na-akacha atọ m ụtọ bụ mgbe m na-arụsi ọrụ Jehova ike.
JEHOVA NA-ENYERE ANYỊ AKA MGBE NIILE
N’ebe ọ bụla e zigara m, mụ na ụmụnna ndị nọ ebe ahụ na-adị n’ezigbo mma. N’ihi ya, ọ naghị adịrị m mfe ma m hapụwa ha. N’oge ndị ahụ, amụtara m ịtụkwasị Jehova obi kpamkpam. Achọpụtala m na Jehova na-enyere m aka mgbe niile. Ihe a enyerela m aka iji obi m niile nabata ihe ọ bụla gbanwerenụ. Taa, abụ m ọsụ ụzọ pụrụ iche na Filipinz. Ọgbakọ ọhụrụ m amarala m ahụ́. Ha aghọọrọla m ezinụlọ hụrụ m n’anya ma na-akwado m. Obi dị m ezigbo ụtọ ịhụ na Samuel na Shirley nwere okwukwe ka mama ha.—3 Jọn 4.
Ọgbakọ m aghọọrọla m ezinụlọ hụrụ m n’anya
N’eziokwu, ọtụtụ ọnwụnwa abịarala m. Otu n’ime ha bụ ịhụ ka nwunye ọma m rịara ọrịa ọjọọ ma nwụọ. E nweekwala ọtụtụ oge ihe gbanwere ná ndụ m. Ma, ahụla m na Jehova “nọ onye ọ bụla n’ime anyị nso.” (Ọrụ 17:27) ‘Ọ nyịghị Jehova’ ịkwado ndị ohu ya na ime ka ha dị ike, ọ bụrụgodị na ha nọ n’ebe dịpụrụ adịpụ. (Aịza. 59:1) Jehova, bụ́ Oké Nkume m, nọnyeere m ná ndụ m niile. Obi dịkwa m ụtọ maka ya. E nweghị mgbe m nọ naanị m.