ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 7
ABỤ NKE 15 Too Ọkpara Jehova
Uru Mgbaghara Jehova Na-abara Gị
“Ị na-agbaghara ndị mmadụ mmehie ha n’eziokwu.”—ỌMA 130:4.
IHE A GA-AMỤ
Baịbụl ji ihe atụ ụfọdụ kọwaa otú Jehova si agbaghara anyị. Ka anyị na-amụ banyere ha, obi ga-adịkwu anyị ụtọ maka otú Jehova si agbaghara onye ọ bụla n’ime anyị.
1. Gịnị mere ọ na-eji esi ike ịmata ihe mmadụ bu n’obi ma ọ sị na ọ gbagharala anyị?
“AGBAGHARALA M GỊ.” Mmadụ gwa gị ihe a, ọ na-eme ka obi ruo gị ala, karịchaa ma ọ bụrụ na onye gwara gị ya bụ onye i kwuru ma ọ bụ mee ihe wutere ya. Ma, mgbe ụfọdụ, ọ na-esi ike ịma ihe mmadụ bu n’obi mgbe ọ sịrị na ọ gbagharala gị. Ihe onye ahụ na-ekwu ọ̀ bụ na gị na ya abụrụkwala enyi otú unu bụbu, ka ọ̀ na-ekwu na ọ chọghị ka gị na ya kpawa isiokwu? Ihe ndị mmadụ na-ebu n’obi ekwu na ha agbagharala nwere ike ịdị iche iche.
2. Olee otú e si kọwaa mgbaghara Jehova na Baịbụl? (Kwuokwa ihe e dere n’ala ala peeji.)
2 Otú Jehova si agbaghara anyị bụ́ ụmụ mmadụ na-ezughị okè dị ezigbo iche n’otú anyị si agbaghara ibe anyị. Nke Jehova pụrụ iche. Otu ọbụ abụ gwara Jehova, sị: “Ị na-agbaghara ndị mmadụ mmehie ha n’eziokwu, ka e wee na-akwanyere gị ùgwù.”a (Ọma 130:4) N’eziokwu, ọ bụ Jehova ‘na-agbaghara mmadụ mmehie ya n’eziokwu.’ Ọ bụ ya na-egosi anyị ihe ezigbo mgbaghara bụ. N’ebe ụfọdụ na Baịbụl, ndị so dee Baịbụl kwuwe gbasara otú Jehova si agbaghara anyị, okwu ha na-eji akọwa ya bụ okwu Hibru a na-anaghị eji akọwa otú mmadụ si agbaghara ibe ya.
3. Olee otú mgbaghara Jehova si dị iche na nke anyị? (Aịzaya 55:6, 7)
3 Jehova gbaghara mmadụ, ọ na-ehichapụ mmehie onye ahụ, ya na ya abụrụkwa ezigbo enyi otú ha bụbu. Obi dị anyị ụtọ na Jehova na-agbaghara anyị kpamkpam ọtụtụ ugboro.—Gụọ Aịzaya 55:6, 7.
4. Olee otú Jehova si enyere anyị aka ịghọta ihe ịgbaghara mmadụ n’eziokwu pụtara?
4 Ọ bụrụ na otú Jehova si agbaghara anyị dị iche n’otú anyị si agbaghara ndị ọzọ, olee otú anyị bụ́ ụmụ mmadụ na-ezughị okè ga-esi aghọta ihe ịgbaghara mmadụ n’eziokwu pụtara? Jehova ji ihe atụ ụfọdụ doro anya kọwaa otú o si agbaghara anyị. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ụfọdụ n’ime ha. Ha ga-egosi anyị otú Jehova si ewepụ mmehie anyị, anyị na ya adịrịkwa ná mma n’agbanyeghị na mmehie meburu ka anyị na ya ghara ịdị ná mma. Ka anyị na-eleba anya n’ihe atụ ndị ahụ, ọ ga-eme ka obi dịkwuo anyị ụtọ maka Nna anyị, onye dị obiọma ma dị obi ebere, onye na-esi n’ọtụtụ ụzọ agbaghara anyị.
JEHOVA NA-EWEPỤ MMEHIE
5. Gịnị na-eme ma Jehova gbaghara anyị mmehie anyị?
5 Na Baịbụl, a na-ejikarị mmehie atụnyere ibu dị arọ. Eze Devid kwuru banyere mmehie ya, sị: “Mmehie ndị m mere erikpuola isi m. Ha dị ka ibu na-anyị arọ. Agaghị m ebuli ha.” (Ọma 38:4) Ma, Jehova na-agbaghara ndị mmehie chegharịrị echegharị mmehie ha. (Ọma 25:18; 32:5) Okwu Hibru a sụgharịrị “na-agbaghara” pụtara “ibuli ihe” ma ọ bụ “ibupụ ihe.” Anyị nwere ike iwere Jehova ka nwoke siri ezigbo ike bupụrụ mmehie na-anyịgbu anyị.
“Ị gbaghaara m” (Ọma 32:5)
6. Olee ebe Jehova na-ebuga mmehie anyị ọ gbaghaara?
6 E nwere ihe atụ ọzọ na-egosi otú Jehova si eburu mmehie anyị buga n’ebe dị ezigbo anya. Abụ Ọma 103:12 sịrị: “Otú ọwụwa anyanwụ si dị ezigbo anya n’ọdịda anyanwụ bụkwa otú o wepụrụ mmehie anyị ka ọ dị ezigbo anya n’ebe anyị nọ.” Ọ bụ ọdịda anyanwụ kacha dịrị anya ma e si n’ọwụwa anyanwụ gawa ya. Ha abụọ emekataghị dịrị n’otu ebe. Ọ pụtara na Jehova na-ebuga mmehie anyị n’ebe dị anya anyị na-enwedịghị ike ichetụ n’echiche. Ihe a na-eme ka obi sie anyị ike na Jehova na-agbaghara anyị kpamkpam.
“Otú ọwụwa anyanwụ si dị ezigbo anya n’ọdịda anyanwụ” (Ọma 103:12)
7. Olee otú Baịbụl si kọwaa ihe Jehova na-eme mmehie anyị? (Maịka 7:18, 19)
7 Ọ bụ eziokwu na Baịbụl kwuru na Jehova na-ebuga mmehie anyị n’ebe dị ezigbo anya, ma ọ̀ ka ga-eburu anyị iwe n’obi? Mba. Eze Hezekaya dere banyere Jehova, sị: “Ị naghịzi echeta mmehie m niile,” ma ọ bụ dị ka e si kwuo ya n’ihe e dere n’ala ala peeji amaokwu ahụ, “i wepụrụ mmehie m niile n’ihu gị.” (Aịza. 38:9, 17; na ihe e dere n’ala ala peeji ya.) Ihe atụ a na-egosi na Jehova na-ewepụ mmehie ndị chegharịrị echegharị. Ọ naghịkwa ele ya anya ọzọ. Otú ọzọ e nwere ike isi kwuo ya bụ: “I meela ka [mmehie m] yie ka ọ̀ bụ na e nweghị mgbe m mere ya.” Baịbụl kwukwara ihe yiri ya n’ihe atụ ọzọ e dere na Maịka 7:18, 19. (Gụọ ya.) Ebe ahụ kwuru na Jehova na-atụba mmehie anyị n’ala ala oké osimiri. N’oge ochie, e nweghị otú e si achọta ihe a tụbara n’ala ala oké osimiri.
“Ị naghịzi echeta mmehie m niile” (Aịza. 38:17)
‘Ị ga-atụba mmehie anyị niile n’ala ala oké osimiri’ (Maị. 7:19)
8. Gịnị ka anyị mụtarala?
8 Ihe atụ ndị a emeela ka anyị ghọta na ọ bụrụ na Jehova agbaghara mmehie anyị, ọ na-ewepụ ya kpamkpam n’ebe anyị nọ nke na akọnuche anyị ekwesịghịzi ịna-enye anyị nsogbu maka ya. N’eziokwu, dị ka Devid kwuru, “ndị a gbaghaara ihe ọjọọ ha mere na ndị e kpuchiri mmehie ha na-enwe obi ụtọ. Onye Jehova na-agaghị agụkọrọ mmehie ya na-enwe obi ụtọ.” (Rom 4:7, 8) Ọ bụ ya bụ ịgbaghara mmadụ n’eziokwu.
JEHOVA NA-EHICHAPỤ MMEHIE ANYỊ
9. Olee ihe atụ Jehova ji kọwaa otú o si agbaghara anyị?
9 Jehova jikwa ihe atụ ndị ọzọ nyere anyị aka ịghọta otú o si eji àjà Ọkpara ya chụrụ ehicha mmehie ndị chegharịrị echegharị. E kwuru na Jehova na-asachapụ mmehie ndị ahụ, nke na-eme ka onye ahụ mere mmehie dị ọcha. (Ọma 51:7; Aịza. 4:4; Jere. 33:8) Jehova kwuru ihe na-eme ma ọ sachaa mmehie mmadụ. Ọ sịrị: “Ọ bụrụgodị na mmehie unu na-acha uhie uhie, m ga-eme ka ọ na-acha ezigbo ọcha. Ọ bụrụgodị na ọ na-acha ọbara ọbara ka ákwà uhie, ọ ga-adị ka ajị ọcha.” (Aịza. 1:18) Ọ bụrụ na ihe na-acha ọbara ọbara etesa n’uwe, ọ na-esi ezigbo ike ịsachapụ ya. Ma, Jehova ji ihe atụ a na-eme ka obi sie anyị ike na ọ ga-asacha mmehie anyị nke ọma nke na a gaghịzi na-ahụ ya.
“Ọ bụrụgodị na mmehie unu na-acha uhie uhie, m ga-eme ka ọ na-acha ezigbo ọcha” (Aịza. 1:18)
10. Olee ihe atụ ọzọ Jehova ji gosi otú o si agbaghara anyị ugboro ugboro?
10 Dị ka anyị kwuru n’isiokwu bu nke a ụzọ, a na-eji mmehie atụnyere “ụgwọ” e ji eji. (Mat. 6:12; Luk 11:4) N’ihi ya, mgbe ọ bụla anyị mehiere Jehova, ọ dị ka à ga-asị na ụgwọ anyị ji ya na-ehikwu nne. Ụgwọ anyị ji ya buru ezigbo ibu. Ma ọ bụrụ na Jehova agbaghara anyị, ọ na-adị ka ọ̀ kagbuola ụgwọ ahụ anyị ji ya. Ọ naghịzi achọ ịta anyị ahụhụ maka mmehie ọ gbaghaara anyị. Otú ahụ obi na-atọ mmadụ ụtọ ma a kagbuo ụgwọ o ji, obi na-atọ anyị ezigbo ụtọ ma Jehova gbaghara anyị mmehie anyị.
“Gbaghara anyị ụgwọ anyị ji” (Mat. 6:12)
11. Baịbụl kwuo na ‘e hichapụla’ mmehie anyị, gịnị ka ọ pụtara? (Ọrụ Ndịozi 3:19)
11 Ihe Jehova na-eme abụghị naanị ịkagbu ụgwọ anyị ji ya. Ọ na-ehichapụ ya. (Gụọ Ọrụ Ndịozi 3:19.) Otú e si akagbu ụgwọ e dere n’akwụkwọ bụ ịka ihe n’ebe ahụ e dere ya. Ma, a ka nwere ike ịna-ahụ ihe ahụ e dere a kagburu akagbu. Mana, ihe e hichara ehicha anaghị adị otú ahụ. Iji ghọta ihe atụ a, n’oge ochie, ọ bụrụ na e jiri ịnk dee ihe, e nwere ike iji mmiri sachapụ ya. Mmadụ nwere ike itinye ákwà ná mmiri, were ya hichapụ ihe e ji ịnk dee. N’ihi ya, e ‘hichapụ’ ụgwọ mmadụ ji, ọ na-apụ n’anya kpamkpam. A gaghịzi ahụ ihe e deburu n’ebe ahụ. Ọ ga-adịzi ka e nweghị mgbe ọ bụla e ji ụgwọ ahụ. Obi dị anyị ụtọ ịmata na ihe Jehova na-eme abụghị naanị ịkagbu ụgwọ anyị ji, kama ọ na-ehichapụ ya kpamkpam.—Ọma 51:9.
“Ka o wee hichapụ mmehie unu” (Ọrụ 3:19)
12. Gịnị ka ihe atụ banyere “ígwé ojii” na-akụziri anyị?
12 Jehova jikwa ihe atụ yiri ya kọwaa otú o si agbaghara mmehie anyị kpamkpam. Ọ sịrị: “M ga-ekpuchi ajọ omume gị ka à ga-asị na e ji ígwé ojii kpuchie ya, kpuchiekwa mmehie gị ka à ga-asị na e ji ígwé ojii kpuchie ya.” (Aịza. 44:22) Ọ bụrụ na Jehova agbaghara anyị, ọ na-adị ka ò ji ígwé ojii gbara ezigbo ọchịchịrị zoo mmehie anyị nke na a gaghịzi na-ahụ ya anya.
“M ga-ekpuchi ajọ omume gị ka à ga-asị na e ji ígwé ojii kpuchie ya” (Aịza. 44:22)
13. Ọ bụrụ na Jehova agbaghara anyị, gịnị ka anyị kwesịrị ịghọta?
13 Gịnị ka ihe a na-akụziri anyị? Ọ bụrụ na Jehova agbaghara anyị, anyị ekwesịghị iche na obi ga na-ama anyị ikpe maka mmehie ahụ ná ndụ anyị niile. Jehova ji ọbara Ọkpara ya bụ́ Jizọs Kraịst kagbuo mmehie anyị kpamkpam. O yiziri ka e nweghị mgbe ọ bụla anyị mere mmehie ahụ. Ọ bụ otú a ka Jehova na-esi agbaghara anyị ma anyị chegharịa ná mmehie anyị.
JEHOVA NA-EME KA ANYỊ NA YA DỊWAKWA NÁ MMA
Ọ bụrụ na Nna anyị nke eluigwe agbaghara anyị, obi na-esi anyị ike na anyị na ya abụrụkwala enyi (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14)
14. Gịnị mere obi ji kwesị isi anyị ike na Jehova na-agbaghara anyị kpamkpam? (Kọwaakwa ihe e sere na foto ndị e ji kọwaa paragraf a.)
14 Ọ bụrụ na Jehova agbaghara anyị, obi na-esi anyị ike na anyị na ya abụrụkwala enyi. Ọ na-eme ka obi anyị ghara ịna-ama anyị ikpe maka mmehie ahụ. Ụjọ ekwesịghị ịtụ anyị ma Jehova ọ̀ ka bu ihe ahụ anyị mere n’obi, na-achọ otú ọ ga-esi taa anyị ahụhụ. Jehova agatụdịghị eme otú ahụ. Gịnị mere anyị ji kwesị ịtụkwasị Jehova obi ma o kwuo na ọ gbagharala anyị? Jehova gwara Jeremaya onye amụma, sị: “M ga-agbaghara ha ajọ omume ha. Agaghịzi m echeta mmehie ha.” (Jere. 31:34) Mgbe Pọl na-ekwu banyere ihe a, o kwuru otu ihe ahụ. Ọ sịrị na ‘Jehova agaghịzi echeta mmehie ha.’ (Hib. 8:12) Ma, gịnị ka ọ pụtara?
“Agaghịzi m echeta mmehie ha” (Jere. 31:34)
15. E kwuo na Jehova anaghịzi echeta mmehie anyị, gịnị ka ọ pụtara?
15 Na Baịbụl, ọ bụghị mgbe niile ka okwu ahụ bụ́ ‘icheta’ na-apụta mmadụ icheta ihe ma ọ bụ iche banyere ihe. Kama, o nwere ike ịpụta mmadụ ime ihe. Onye omekome ahụ e gburu n’akụkụ Jizọs rịọrọ ya, sị: “Jizọs, cheta m ma ị banye n’Alaeze gị.” (Luk 23:42, 43) Ihe ọ na-ekwu abụghị ka Jizọs chee gbasara ya n’oge ahụ. Ihe Jizọs zara nwoke ahụ gosiri na ọ ga-akpọlite ya n’ọnwụ. N’ihi ya, mgbe Jehova kwuru na ọ gaghị echeta mmehie anyị, ihe ọ na-ekwu bụ na ọ gaghịzi ata anyị ahụhụ maka ya. Ọ gaghị ata anyị ahụhụ n’ọdịnihu maka mmehie ọ gbaghaara anyị.
16. Olee otú Baịbụl si kọwaa otú anyị si enwere onwe anyị ma Jehova gbaghara anyị?
16 Baịbụl jikwa ihe atụ ọzọ nyere anyị aka ịghọta otú anyị si enwere onwe anyị ma Chineke gbaghara anyị mmehie anyị. Ebe anyị bụ ndị na-ezughị okè, e ji anyị tụnyere ndị ‘na-agbara mmehie ohu.’ Ma, ọ bụrụ na Jehova agbaghara anyị, anyị ga-adịzi ka ndị ohu e mere ka ha “kwụsị ịgbara mmehie ohu.” (Rom 6:17, 18; Mkpu. 1:5) N’eziokwu, anyị ghọta na Jehova agbagharala anyị, obi na-adị anyị ụtọ otú ahụ o si adị ohu a hapụrụ ka o nwere onwe ya.
“E mere ka unu kwụsị ịgbara mmehie ohu” (Rom 6:18)
17. Olee otú ịgbaghara anyị mmehie anyị si agwọ anyị? (Aịzaya 53:5)
17 Gụọ Aịzaya 53:5. Ihe atụ nke ikpeazụ anyị ga-eleba anya na ya ji anyị tụnyere ndị bu ọrịa ọjọọ. N’ihi àjà Jehova ji Ọkpara ya bụ́ Jizọs chụọ, e nwere ike ikwu na a gwọọla anyị. (1 Pita 2:24) Ọ bụrụ na anyị emee mmehie, anyị na Jehova anaghịzi adị ná mma. Ma, n’ihi àjà Jizọs chụrụ, Jehova nwere ike ịgbaghara anyị, anyị na ya abụrụkwa enyi. Otú ahụ obi na-atọ mmadụ ezigbo ụtọ ma a gwọọ ya ajọ ọrịa na-arịa ya, obi na-atọkwa anyị ezigbo ụtọ ma anyị na Jehova dịrị ná mma n’ihi na ọ gbaghaara anyị mmehie anyị.
‘Ahụ́ e merụrụ ya mere ka a gwọọ anyị’ (Aịza. 53:5)
URU MGBAGHARA JEHOVA NA-ABARA ANYỊ
18. Gịnị ka anyị mụtara n’ihe atụ ndị e ji kọwaa otú Jehova si agbaghara anyị? (Kwuokwa ihe dị n’igbe isiokwu ya bụ “Otú Jehova Si Agbaghara Anyị.”)
18 Olee ihe ndị anyị mụtarala ugbu a anyị lebachara anya n’ihe atụ ndị dị na Baịbụl e ji kọwaa otú Jehova si agbaghara anyị? Jehova gbaghara anyị, ọ na-agbaghara anyị kpamkpam, ruokwa ebighị ebi. Ihe a na-eme ka anyị na Nna anyị nke eluigwe dịrị n’ezigbo mma. Anyị kwesịkwara icheta na ezigbo mgbaghara bụ onyinye. Ọ bụ Jehova na-enye anyị ya n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya ma na-emere anyị amara, ọ bụghị n’ihi na ọ bụ ihe anyị kwesịrị inweta.—Rom 3:24.
19. (a) Gịnị mere obi ji kwesị ịdị anyị ụtọ? (Ndị Rom 4:8) (b) Gịnị ka anyị ga-amụ n’isiokwu na-eso nke a?
19 Gụọ Ndị Rom 4:8. Obi kwesịrị ịdị onye ọ bụla n’ime anyị ụtọ n’ihi na Jehova bụ Chineke “na-agbaghara ndị mmadụ mmehie ha n’eziokwu.” (Ọma 130:4) Ma, e nwere ihe dị ezigbo mkpa ga-eme ka a gbaghara anyị. Jizọs sịrị: “Ọ bụrụ na unu anaghị agbaghara ndị mehiere unu, Nna unu agaghịkwa na-agbaghara unu mmehie unu.” (Mat. 6:14, 15) O doro anya na anyị kwesịrị ịna-agbaghara ndị ọzọ otú ahụ Jehova si agbaghara anyị. Olee otú anyị nwere ike isi eme ya? Isiokwu na-eso nke a ga-egosi anyị otú anyị ga-esi eme ya.
ABỤ NKE 46 Anyị Na-ekele Gị, Jehova
a Okwu Hibru e dere n’amaokwu a pụtara “mgbaghara ahụ,” nke gosiri na ọ na-ekwu banyere naanị otu ezigbo mgbaghara e nwere n’agbanyeghị na e nwere ụdị mgbaghara ndị ọzọ. Ọtụtụ Baịbụl ekwughị ihe a dị mkpa e kwuru n’Abụ Ọma 130:4. Ma, e kwuru ya ná Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ. Ọ bụ ihe mere o ji pụọ iche n’otú e si sụgharịa amaokwu ahụ.