Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w25 Febụwarị p. 14-19
  • Olee Otú Ị Ga-esi Na-agbaghara Ka Jehova?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Otú Ị Ga-esi Na-agbaghara Ka Jehova?
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • ELEGHARALA OTÚ OBI DỊ GỊ ANYA
  • OTÚ Ị GA-ESI KWỤSỊ IWE IWE
  • OTÚ Ị GA-ESI NA-ENWE OBI ỤTỌ
  • NA-ECHE GBASARA URU DỊ N’ỊGBAGHARA NDỊ ỌZỌ
  • ‘Werenụ Amara Na-agbaghara Onwe Unu’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Na-agbagharanụ Ibe Unu Kpamkpam
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Jehova “Na-akasi Ndị Obi Gbawara Obi”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
  • Anyị na Ụmụnna Anyị Ịbụ Ezigbo Enyi Na-abara Anyị Uru
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
w25 Febụwarị p. 14-19

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 8

ABỤ NKE 130 Na-agbaghara Ndị Ọzọ

Olee Otú Ị Ga-esi Na-agbaghara Ka Jehova?

“Jehova gbaghaara unu kpamkpam, unu kwesịkwara ịna-emere ibe unu otú ahụ.”​—KỌL. 3:13.

IHE A GA-AMỤ

N’isiokwu a, anyị ga-ekwu gbasara ihe ụfọdụ anyị nwere ike ime ga-enyere anyị aka ịgbaghara onye mere ihe wutere anyị.

1-2. (a) Olee mgbe o nwere ike ịkacha siere anyị ike ịgbaghara mmadụ? (b) Olee otú Nwanna Nwaanyị Denise si gbaghara onye mejọrọ ya?

Ọ̀ NA-ESIRI gị ike ịgbaghara ndị ọzọ? Ọ na-esiri ọtụtụ n’ime anyị ike, karịchaa ma mmadụ kwuo ma ọ bụ mee ihe gbawara anyị obi. Ma, anyị nwere ike ịkwụsị iwe iwe maka ihe ndị ọzọ mere anyị ma gbaghara ha. Dị ka ihe atụ, legodị ihe mere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Denise.a Otú o si gbaghara pụrụ iche. N’afọ 2017, ya na ezinụlọ ya gara legharịa anya n’isi ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova mgbe e mepere ya ọhụrụ. Mgbe ha na-ala, otu ọkwọ ụgbọala ji ụgbọala ya kụọ nke ha. Nwanna Nwaanyị Denise amaghịzi onwe ya. Mgbe o tetara, a gwara ya na ụmụ ya merụrụ ezigbo ahụ́ nakwa na di ya bụ́ Brian nwụrụ. Mgbe Nwanna Nwaanyị Denise chetara oge ahụ, ọ sịrị: “Obi gbawara m, amaghịkwa m ihe m ga-eme eme.” Nwanna nwaanyị ahụ mechara mata na ọkwọ ụgbọala ahụ aṅụghị mmanya, e nweghịkwa ihe megharịrị ya anya. N’ihi ya, o kpere ekpere rịọ Jehova ka o mee ka obi ruo ya ala.

2 A nwụchiri ọkwọ ụgbọala ahụ ma kpọpụ ya n’ụlọikpe maka na o gburu di nwanna nwaanyị ahụ n’ihe mberede. Ọ bụrụ na a ma ya ikpe, e nwere ike ịtụ ya mkpọrọ. Ma, ụlọikpe ahụ gwara Nwanna Nwaanyị Denise na ọ bụ ihe o kwuru ka a ga-eji ekpebi ma à ga-atụ nwoke ahụ mkpọrọ ma ọ bụ na a gaghị atụ ya. Nwanna Nwaanyị Denise sịrị: “Ọ dị m nnọọ ka è nwere onye bịara mepee ọnyá m, were nnukwu nnu wụba n’ime ya n’ihi na m ga-abịa kọwa ihe kacha gbawaa m obi mere m.” Mgbe izu ole na ole gara, Nwanna Nwaanyị Denise gara n’ụlọikpe ka o kwuo okwu n’ihu nwoke ahụ kpataara ya na ndị ezinụlọ ya ezigbo nsogbu. Gịnị ka o kwuru? Nwanna Nwaanyị Denise rịọrọ ọkàikpe ka o meere nwoke ahụ ebere.b Mgbe o kwuchara, ọkàikpe malitere ibe ákwá. Ọ sịrị: “Kemgbe afọ iri abụọ na ise m ghọrọ ọkàikpe, anụtụbeghị m ụdị ihe a n’ụlọikpe. Anụtụbeghị m ebe onye ihe mere ezinụlọ ya na-arịọ ka a gbaghara onye kpataara ha nsogbu. Anụtụbeghị m ụdị okwu a gosiri ịhụnanya na mgbaghara.”

3. Gịnị mere ka Nwanna Nwaanyị Denise gbaghara onye mejọrọ ya?

3 Gịnị nyeere Nwanna Nwaanyị Denise aka ịgbaghara? Ọ tụgharịrị uche n’otú Jehova si agbaghara. (Maị. 7:18) Ọ bụrụ na obi dị anyị ụtọ maka otú Jehova si agbaghara anyị, ọ ga-eme ka anyị chọọ ịna-agbaghara ndị ọzọ.

4. Gịnị ka Jehova chọrọ ka anyị mee? (Ndị Efesọs 4:32)

4 Jehova chọrọ ka anyị na-agbaghara ndị ọzọ kpamkpam otú yanwa na-agbaghara anyị. (Gụọ Ndị Efesọs 4:32.) Ọ chọrọ ka anyị dị njikere ịgbaghara ndị mere anyị ihe ọjọọ. (Ọma 86:5; Luk 17:4) N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe atọ ga-enyere anyị aka ịna-agbagharakwu ndị ọzọ.

ELEGHARALA OTÚ OBI DỊ GỊ ANYA

5. Dị ka e kwuru n’Ilu 12:18, olee otú obi nwere ike ịdị anyị ma mmadụ mee ihe wutere anyị?

5 Ihe mmadụ gwara anyị ma ọ bụ mee anyị nwere ike ịgbawa anyị obi, karịchaa ma ọ bụrụ na onye ahụ bụ ezigbo enyi anyị ma ọ bụ onye ezinụlọ anyị. (Ọma 55:12-14) Mgbe ụfọdụ, otú o si wute anyị na-adị ka à mara anyị mma. (Gụọ Ilu 12:18.) Anyị nwere ike ịgbalị ileghara otú obi dị anyị anya. Ma, ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, o nwere ike ịdị ka ebe a mara anyị mma, anyị ahapụkwa mma ahụ n’ebe ahụ. Ọ bụrụ na anyị eleghara otú obi dị anyị anya, anyị agaghị atụwa anya na anyị ga-echefu ihe ahụ mere anyị.

6. Gịnị ka anyị nwere ike ime ma mmadụ mee ihe wutere anyị?

6 Mmadụ mejọọ anyị, ihe mbụ anyị nwere ike ime bụ iwe iwe. Baịbụl kwuru na anyị nwere ike iwe iwe. Ma, ọ dọrọ anyị aka ná ntị na anyị ekwesịghị ibu iwe n’obi. (Ọma 4:4; Efe. 4:26) N’ihi gịnị? N’ihi na otú obi dị anyị nwere ike ime ka anyị mee ihe ụfọdụ. Ọtụtụ mgbe, iwe na-eme ka mmadụ mee ihe na-adịghị mma. (Jems 1:20) Cheta na mmadụ nwere ike iwe iwe maka na a kpasuru ya iwe. Ma ọ bụ ya ga-ekpebi ma ọ̀ ga-ewere iwe ahụ na-aga, ka ọ̀ ga-akwụsị.

Mmadụ nwere ike iwe iwe maka na a kpasuru ya iwe. Ma ọ bụ ya ga-ekpebi ma ọ̀ ga-ewere iwe ahụ na-aga, ka ọ̀ ga-akwụsị

7. Olee otú ọzọ obi nwere ike ịdị anyị ma mmadụ mee ihe wutere anyị?

7 E mee anyị ihe ọjọọ, ihe ndị ọzọ nwere ike ịbata anyị n’obi. Dị ka ihe atụ, otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Ann sịrị: “Mgbe m dị obere, papa m hapụrụ mama m lụọ onye na-elekọta m. Ọ dị m ka à jụrụ m ajụ. Mgbe ha mụtara ụmụ, ọ bịara dị m ka ụmụ ahụ anọchiela m. Mgbe m toro, m yiziri onye a jụrụ ajụ.” Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Georgette kwuru otú obi dị ya mgbe di ya kwara iko. Ọ sịrị: “Mụ na ya bụ enyi kemgbe anyị bụ ụmụaka. Mụ na ya sụkọkwara ụzọ. Obi gbawara m.” Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Naomi sịrị: “O nwetụdịghị mgbe m tụrụ anya na di m ga-emewa m obi. N’ihi ya, mgbe o kwuru na ọ nọ na-ele ndị gba ọtọ, na-ezochikwara m ya, obi gbawara m, mụ adịzie ka onye a ghọgburu aghọgbu.”

8. (a) Olee ihe ụfọdụ mere anyị kwesịrị iji na-agbaghara ndị ọzọ? (b) Olee uru ụfọdụ ọ na-abara anyị ma anyị gbaghara ha? (Kwuo ihe dị n’igbe isiokwu ya bụ “Gịnị Ka Anyị Ga-eme ma Mmadụ Mee Ihe Gbawara Anyị Obi?”)

8 Ọ bụghị anyị ga-ekwu ihe ndị ọzọ nwere ike ịgwa anyị ma ọ bụ mee anyị. Ma anyị nwere ike ịgbalị kpebie ihe anyị ga-eme. Ọtụtụ mgbe, ihe na-akacha mma ime bụ ịgbaghara. N’ihi gịnị? N’ihi na anyị hụrụ Jehova n’anya. Ọ chọkwara ka anyị na-agbaghara ndị mejọrọ anyị. Ọ bụrụ na anyị ana-ewere onye ahụ iwe ghara ịgbaghara ya, o nwere ike ime ka anyị mee ihe na-adịghị mma, kpatakwara onwe anyị nsogbu. (Ilu 14:17, 29, 30) Legodị ihe mere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Christine. Ọ sịrị: “Mgbe ọ bụla ezigbo iwe na-ewe m, anaghị m amụmụcha ọnụ ọchị, anaghị m eri ezigbo nri, anaghịkwa m ehi ụra nke ọma. Ọ na-esikwuru m ike ijide onwe m, nke na-eme ka m ghara ịna-akpaso ma di m ma ndị enyi m àgwà ọma.”

Gịnị Ka Anyị Ga-eme ma Mmadụ Mee Ihe Gbawara Anyị Obi?

Anyị kwesịrị icheta na ọ bụrụ na anyị agbaghara mmadụ, ihe ọ pụtara abụghị na ihe ahụ o mere dị anyị mma ma ọ bụ na anyị na-ahapụ ya ka ọ na-emegbu anyị. Kama, ọ pụtara na anyị kpebiri na anyị agaghị eburu ya iwe n’obi ma ọ bụ na-ewere ya iwe. Anyị ga-esi otú ahụ gosi na anyị ekweghị ka ihe onye ahụ mere ka na-akpasu anyị iwe. Anyị kwụsị iburu mmadụ iwe n’obi, anyị na-emere onwe anyị ezigbo ihe ọma. Ọ na-eme ka anyị chefuo ihe onye ahụ mere, obi adịwakwa anyị mma. N’eziokwu, ọ bụrụgodị na anyị ekpebie ịkwụsị iwere mmadụ iwe ma ọ bụ iburu ya iwe n’obi maka ihe o mere anyị, anyị ekwesịghị ichefu na onye ahụ ka ga-aza Jehova ajụjụ ihe o mere. Ihe ọ pụtara bụ na ọ bụrụ na anyị akwụsị iburu mmadụ iwe n’obi, ọ bụkwa ụzọ ọzọ anyị si eme ihe otu ọbụ abụ si n’ike mmụọ nsọ kwuo. Ọ sịrị: “Bunye Jehova ibu na-anyịgbu gị.” (Ọma 55:22) Anyị na-ahapụrụ Jehova okwu ahụ, obi esie anyị ike na ọ ga-ekpe onye ahụ mewara anyị obi ikpe. Jehova na-ekpe ikpe ziri ezi karịa otú anyị nwere ike isi kpee ya. N’ihi ya, ikpe ọ bụla o kpere ga-arụpụta ihe dị mma karịa nke anyịnwa kpere.

9. Gịnị mere anyị ji kwesị ịkwụsị ibu iwe n’obi?

9 Ọ bụrụgodị na onye ahụ mejọrọ anyị arịọghị anyị mgbaghara maka ihe o mere anyị, anyị ga-emeli ka iwe na-ewe anyị belata. Olee otú anyị nwere ike isi eme ya? Nwanna Nwaanyị Georgette anyị kwuburu okwu ya sịrị: “O were m oge, ma m mechara kwụsị iburu onye ahụ lụburu m iwe n’obi. O mere ka obi ruo m ala.” Ọ bụrụ na anyị akwụsị iburu mmadụ iwe n’obi, anyị agaghị eji obi ọjọọ na-emeso ndị ọzọ ihe. Ọ ga-abakwara anyịnwa uru n’ihi na anyị ga-akwụsị iche gbasara ihe ahụ o mere anyị, nwewekwa obi ụtọ. (Ilu 11:17) Ma, gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na anyị achọbeghịkwa ịgbaghara onye mejọrọ anyị?

OTÚ Ị GA-ESI KWỤSỊ IWE IWE

10. Gịnị mere anyị ji kwesị inye onwe anyị oge ka anyị kwụsị iwe iwe? (Kọwaakwa ihe e sere na foto ndị e ji kọwaa paragraf a.)

10 Olee otú i nwere ike isi kwụsị iwe iwe? Otu ihe ị ga-eme bụ ikwe ka oge ụfọdụ gaa. Mmadụ merụọ ezigbo ahụ́ ma gaa ụlọ ọgwụ ka a gwọọ ya, ọ ga-ewe oge tupu ahụ́ ahụ o merụrụ alaa. Otú ahụ ka ọ dịkwa ma mmadụ mejọọ anyị. O nwere ike iwe oge tupu anyị adị njikere iji obi anyị niile gbaghara ya.​—Ekli. 3:3; 1 Pita 1:22.

Foto ndị na-egosi: Ebe otu nwanna merụrụ ahụ́ ji nwayọọ nwayọọ na-agbake. 1. Ebe ndị ụlọ ọgwụ na-ebuba ya n’ụgbọala e ji ebu ndị ọrịa. 2. Ebe ọ na-amụ ịga ije ọzọ. 3. Ebe ọ na-agaziri onwe ya ije.

Mmadụ merụọ ahụ́, e kwesịrị ịgwọ ya nke ọma, nyekwa oge ka ahụ́ ahụ o merụrụ laa. Anyị kwesịkwara ime ụdị ihe ahụ ma mmadụ mewaa anyị obi (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10)


11. Olee otú ekpere ga-esi nyere gị aka ịgbaghara?

11 Kpee ekpere rịọ Jehova ka o nyere gị aka ịgbaghara ndị ọzọ.c Nwanna Nwaanyị Ann anyị kwuburu okwu ya kọwara otú ekpere si nyere ya aka. Ọ sịrị: “M rịọrọ Jehova ka ọ gbaghara onye ọ bụla n’ezinụlọ anyị maka ihe ndị anyị na-emetaghị. M degaziiri papa m na nwunye ọhụrụ ya akwụkwọ ozi, gwa ha na mụ agbagharala ha.” O kwuru na ihe ahụ o mere adịghị mfe. Ma ọ sịrị: “Ama m na m gbalịa gbaghara papa m na nwunye ya ka Jehova, o nwere ike ime ka ha chọọ ịmụtakwa gbasara ya.”

12. Gịnị mere anyị ji kwesị ịtụkwasị Jehova obi kama ịtụkwasị obi n’otú obi dị anyị? (Ilu 3:5, 6)

12 Tụkwasị Jehova obi, ọ bụghị otú obi dị gị. (Gụọ Ilu 3:5, 6.) Jehova ma ihe ga-akacha baara anyị uru mgbe niile. (Aịza. 55:8, 9) O nweghịkwanụ ike ịgwa anyị mee ihe ga-akpatara anyị nsogbu. N’ihi ya, ebe ọ bụ na ọ gwara anyị ka anyị na-agbaghara, obi kwesịrị isi anyị ike na ime otú ahụ ga-abara anyị uru. (Ọma 40:4; Aịza. 48:17, 18) Ma, ọ bụrụ na ihe ka anyị mkpa abụrụ otú obi dị anyị, o nwere ike anyị agaghị agbagharali ndị mejọrọ anyị. (Ilu 14:12; Jere. 17:9) Nwanna Nwaanyị Naomi anyị kwuburu okwu ya sịrị: “Na mbụ, obi m gwara m na ekwesịghị m ịgbaghara di m maka na o lere ndị gba ọtọ. Ụjọ nọ na-atụ m na ọ bụrụ na mụ agbaghara ya, ọ ga-emewakwa m obi ọzọ ma ọ bụ ya echefuo otú ihe ahụ o mere si wute m. M bịakwara na-eche na Jehova ghọtara otú obi dị m. Ma, m mechara chọpụta na Jehova ịghọta otú obi dị m apụtaghị na otú ahụ obi dị m dị ya mma. Ọ ma otú obi dị m nakwa na ọ ga-ewe oge tupu mụ akwụsị iwe iwe, ma ọ chọkwara ka m gbaghara ya.”d

OTÚ Ị GA-ESI NA-ENWE OBI ỤTỌ

13. Dị ka e kwuru ná Ndị Rom 12:18-21, gịnị ka anyị kwesịrị ime?

13 Ọ bụrụ na anyị agbaghara onye mewara anyị obi, ihe anyị ga-eme abụghị naanị ikpebi na anyị agaghị ekwu gbasara ihe ahụ merenụ. Ọ bụrụ na onye ahụ mejọrọ anyị bụ nwanna, mkpa anyị ga-abụ ka anyị na ya mee udo. (Mat. 5:23, 24) Kama ịna-ewesa onye ahụ iwe, anyị ga na-emetara ya ebere, gbagharakwa ya kama iburu ya iwe n’obi. (Gụọ Ndị Rom 12:18-21; 1 Pita 3:9) Gịnị nwere ike inyere anyị aka ime ya?

14. Gịnị ka anyị kwesịrị ịgbalịsi ike mee? Maka gịnị?

14 Anyị kwesịrị ịgbalị na-ele onye ahụ mejọrọ anyị anya otú Jehova si ele ya. Jehova kpebiri ịna-achọ ebe mmadụ na-emeta. (2 Ihe 16:9; Ọma 130:3) Anyị na-ahụkarị ihe ọ bụla anyị na-achọ ịhụ n’ebe mmadụ nọ, ma ọ̀ bụ ihe ọma ma ọ̀ bụ ihe ọjọọ. Ọ bụrụ na anyị ana-achọ ịhụ àgwà ọma mmadụ nwere, ọ ga-adịrị anyị mfe ịgbaghara ya. Dị ka ihe atụ, otu nwanna aha ya bụ Jarrod sịrị: “Ọ na-adịrị m mfe ịgbaghara nwanna ma m chee gbasara ọtụtụ ihe ọma ọ na-eme na-amasị m kama ịna-eche gbasara ihe ahụ o mejọrọ.”

15. Olee uru o nwere ike ịba ma anyị gwa mmadụ na anyị agbagharala ya?

15 Ihe ọzọ dị mkpa ọ ga-adị mma ka anyị mee bụ ịgwa onye ahụ na anyị agbagharala ya. Maka gịnị? Legodị ihe Nwanna Nwaanyị Naomi anyị kwuburu okwu ya kwuru. Ọ sịrị: “Di m jụrụ m ma m̀ gbagharala ya. Mgbe m mepere ọnụ ka m sị ya, ‘Agbagharala m gị,’ o kweghị m okwukwu. Ọ bụ mgbe ahụ ka m chọpụtara na esibeghị m n’obi m gbaghara ya. Ma, ka oge na-aga, m gwaziri ya mkpụrụ okwu atọ ahụ na-akpa ike, ya bụ, ‘Agbagharala m gị.’ Mgbe m gbaghaara ya, anya mmiri juru ya anya. O juru m anya ịhụ ụdị obi ụtọ o nwere nakwa otú obi si ruo m ala. Kemgbe ahụ, m tụkwasịwakwala ya obi, mụ na ya aghọọkwa ezigbo enyi.”

16. Gịnị ka ị mụtarala gbasara mgbaghara?

16 Jehova chọrọ ka anyị na-agbaghara. (Kọl. 3:13) N’agbanyeghị ya, ọ ka nwere ike ịna-esiri anyị ike ịgbaghara ndị mejọrọ anyị. Ma, anyị ga-emeli ya ma ọ bụrụ na anyị anaghị eleghara otú obi dị anyị anya, na-agbalịkwa ka anyị kwụsị iwesa ha iwe. Anyị ga-enwewezi obi ụtọ.​—Gụọ igbe isiokwu ya bụ “Ihe Atọ Ga-enyere Gị Aka Ịgbaghara Ndị Ọzọ.”

Ihe Atọ Ga-enyere Gị Aka Ịgbaghara Ndị Ọzọ

Ebe otu nwanna nwaanyị na-echegbu onwe ya si na windo na-elepụ anya.

ELEGHARALA OTÚ OBI DỊ GỊ ANYA

  • Ọ bụrụ na anyị eleghara otú obi dị anyị anya, anyị agaghị atụ anya na anyị ga-akwụsị iwe iwe.

Ebe nwanna nwaanyị ahụ e gosiburu si n’obi ya na-ekpe ekpere.

MEE IHE NDỊ GA-EME KA Ị KWỤSỊ IWE IWE

  • Nye onwe gị oge ka ihe ahụ kwụsị iwe gị iwe.

  • Rịọ Jehova ka o nyere gị aka ịkwụsị ibu iwe n’obi.

  • Tụkwasị Jehova obi, ọ bụghị otú obi dị gị.

Ebe nwanna nwaanyị ahụ na di ya nọ. Ha na-enwezi obi ụtọ.

NA-ENWE OBI ỤTỌ

  • Gbalịa na-ele onye ahụ anya otú Jehova si ele ya.

  • Rịọ Jehova ka o nyere gị aka ka ị gbaghara.

  • Gwa onye ahụ na ị gbagharala ya.

NA-ECHE GBASARA URU DỊ N’ỊGBAGHARA NDỊ ỌZỌ

17. Olee uru ịgbaghara ndị ọzọ na-abara anyị?

17 E nwere ọtụtụ ihe mere anyị kwesịrị iji na-agbaghara ndị ọzọ. Legodị ụfọdụ n’ime ha. Nke mbụ, anyị na-eme ka Jehova bụ́ Nna anyị na-eme ebere, na-emekwa ya obi ụtọ. (Luk 6:36) Nke abụọ, anyị na-egosi na obi dị anyị ụtọ na Jehova ji obiọma na-agbaghara anyị. (Mat. 6:12) Nke atọ, ahụ́ na-adị anyị mma, anyị na ndị ọzọ abụrụkwa enyi.

18-19. Olee uru ịgbaghara ndị ọzọ nwere ike ịba?

18 Ọ bụrụ na anyị agbaghara ndị ọzọ, ngọzi anyị na-atụghị anya ya nwere ike ịbịara anyị. Dị ka ihe atụ, ọ̀ kwa i chetara Nwanna Nwaanyị Denise anyị kwuru okwu ya ná mmalite? Ọ bụ eziokwu na n’oge ahụ, ọ maghị na nwoke ahụ ọ gbaghaara kpebiri igbu onwe ya ma e kpechaa ya ikpe, ma, otú o si gbaghara nwoke ahụ metụrụ ya n’ahụ́, ya na Ndịàmà Jehova amalite ịmụ Baịbụl.

19 Anyị nwere ike iche na ịgbaghara mmadụ bụ otu n’ime ihe ndị ga-akacha siere anyị ike. Ma, o nwekwara ike ịbụ otu n’ime ihe ndị ga-akacha baara anyị uru. (Mat. 5:7) N’ihi ya, ka anyị mee ike anyị niile ịna-agbaghara ndị ọzọ ka Jehova.

Ọ BỤRỤ NA MMADỤ EMEE IHE WUTERE GỊ, . . .

  • gịnị mere na i kwesịghị ileghara otú obi dị gị anya?

  • gịnị nwere ike inyere gị aka ka ị kwụsị iwe iwe?

  • olee otú i nwere ike isi malitekwa ịna-enwe obi ụtọ?

ABỤ NKE 125 “Ndị Na-eme Ebere Na-enwe Obi Ụtọ”

a Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

b Ụdị ihe a mee, ọ bụ Onye Kraịst ọ bụla ga-ekpebi ihe ọ ga-eme.

c Gaa na jw.org lee vidio egwú ndị isiokwu ha bụ “Na-agbagharanụ,” “Na-agbaghara Kpamkpam,” na “Ka Anyị Kpezie, Bụrụkwa Enyi.”

d Mmadụ lee ndị gba ọtọ, ọ na-agbawa di ya ma ọ bụ nwunye ya obi. Ọ bụkwa mmehie. Ma, Baịbụl ekwughị na onye nke aka ya dị ọcha nwere ike iji maka ya gbaa ya alụkwaghịm.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya