ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 9
ABỤ NKE 51 Anyị Nyefere Chineke Onwe Anyị
Mee Baptizim n’Egbughị Oge
“Gịnị mere i ji na-egbu oge? Bilie, ka e mee gị baptizim.”—ỌRỤ 22:16.
IHE A GA-AMỤ
Anyị ga-amụ banyere ndị Sameria, Sọl onye Tasọs, Kọnịliọs, na ndị Kọrịnt. Ọ ga-eme ka ị mụta ihe ndị ga-enyere gị aka iru eru ime baptizim.
1. Olee ihe ụfọdụ mere i ji kwesị ime baptizim?
Ị̀ HỤRỤ Jehova Chineke n’anya, onye nyere gị ihe ọma niile i nwere, ma ndụ ị dị? Ị̀ chọrọ igosi ya na ị hụrụ ya n’anya? Ụzọ kacha mma ị ga-esi eme ya bụ inyefe ya onwe gị ma mee baptizim n’ime mmiri. I mee otú ahụ, ị ga-eso n’ezinụlọ Jehova. Ọ ga-eme ka Jehova, bụ́ Nna gị na Enyi gị, na-eduzi gị ma na-elekọta gị n’ihi na ị bụzi nke ya. (Ọma 73:24; Aịza. 43:1, 2) Inyefe Jehova onwe gị na ime baptizim ga-emekwa ka i nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi.—1 Pita 3:21.
2. Gịnị ka anyị ga-amụ n’isiokwu a?
2 È nwere ihe na-egbochi gị ime baptizim? Ọ bụrụ na e nwere, ọ bụghị naanị gị ka ọ dị otú ahụ. Ọtụtụ nde mmadụ ndị bu gị ụzọ agbanweela otú ha si akpa àgwà nakwa otú ha si eche echiche ka ha nwee ike iru eru ime baptizim. Ha jizi ọṅụ na ịnụ ọkụ n’obi na-efe Jehova. Gịnị ka i nwere ike ịmụta n’aka ụfọdụ ndị mere baptizim n’oge ndịozi Jizọs? Ka anyị lee ihe ụfọdụ gaara egbochi ha ime baptizim na ihe anyị ga-amụta n’aka ha.
NDỊ SAMERIA MERE BAPTIZIM
3. Olee ihe ndị gaara egbochi ụfọdụ ndị Sameria ime baptizim?
3 E nwere okpukpe ndị Sameria na-ekpe mgbe Jizọs nọ n’ụwa. Ọtụtụ n’ime ha bi n’ebe dị nso n’obodo Shikem nakwa na Sameria nke dị n’ebe ugwu ma e si Juda gawa ya. Tupu ha emee baptizim, ha kwesịrị ịnabata ihe niile dị n’Okwu Chineke ma mụtakwuo ihe na ha. Naanị ihe ndị Sameria kweere bụ́ Okwu Chineke bụ akwụkwọ ise mbụ dị na Baịbụl, ya bụ, Jenesis ruo Diuterọnọmi, na ikekwe akwụkwọ Joshụa. Ma, ndị Sameria na-atụ anya na Mezaya ga-abịa n’ihi nkwa Chineke kwere na Diuterọnọmi 18:18, 19. (Jọn 4:25) Ọ bụrụ na ha chọrọ ime baptizim, ha kwesịrị ikwere na Jizọs bụ Mezaya ahụ e kwere ná nkwa. “Ọtụtụ n’ime ndị Sameria” mere otú ahụ. (Jọn 4:39) Ebe ọ bụkwa na ọtụtụ ndị mbụ ghọrọ Ndị Kraịst bụ ndị Juu, o nwere ike ịdị mkpa ka ụfọdụ ndị Sameria chọrọ ịghọ Ndị Kraịst kwụsị asị ha kpọrọ ndị Juu.—Luk 9:52-54.
4. Dị ka e kwuru n’Ọrụ Ndịozi 8:5, 6, 14, gịnị ka ụfọdụ ndị Sameria mere mgbe Filip ziri ha ozi ọma?
4 Gịnị nyeere ndị Sameria aka ime baptizim? Mgbe Filip bụ́ onye na-ekwusa ozi ọma ‘kwusaara ndị Sameria gbasara Kraịst,’ ụfọdụ n’ime ha ‘nabatara okwu Chineke.’ (Gụọ Ọrụ Ndịozi 8:5, 6, 14.) Filip bụ onye Juu. Ma, o meghị ka ha jụ ozi ya. O nwere ike ịbụ na ha chetara ụfọdụ ebe n’akwụkwọ ndị ahụ Mosis dere, ebe kwuru na Chineke anaghị ele mmadụ anya n’ihu. (Diut. 10:17-19) Ha ‘ṅara ntị n’ihe Filip na-ekwu’ banyere Kraịst, ghọtakwa ihe doro anya na-egosi na ọ bụ Chineke dunyere Filip. Ọ rụkwara ọtụtụ ọrụ ebube, dị ka ịgwọ ndị ọrịa na ịchụpụ ndị mmụọ ọjọọ.—Ọrụ 8:7.
5. Olee ihe ndị i nwere ike ịmụta n’aka ndị Sameria?
5 Ọ bụrụ na ndị Sameria ahụ chọrọ, ha gaara ajụ ige Filip ntị n’ihi na ọ bụ onye Juu ma ọ bụkwanụ n’ihi na ha anụtụbeghị ihe ọ na-akụziri ha. Mana, ha emeghị otú ahụ. Mgbe o doro ha anya na ihe Filip na-akụziri ha bụ eziokwu, ha egbughị oge ime baptizim. Baịbụl sịrị: “Mgbe Filip nọ na-ezisa ozi ọma gbasara Alaeze Chineke nakwa gbasara aha Jizọs Kraịst, ha nabatara ihe ọ nọ na-ekwu, e mee ha baptizim, ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị.” (Ọrụ 8:12) Obi ò siri gị ike na Okwu Chineke bụ eziokwu nakwa na Ndịàmà Jehova hụrụ ibe ha n’anya otú Jizọs kwuru na ndị na-eso ụzọ ya ga-eme? (Jọn 13:35) Ọ bụrụ otú ahụ, ụjọ atụla gị ime baptizim. Ka obi siekwa gị ike na Jehova ga-agọzi gị.
6. Olee otú akụkọ Nwanna Ruben ga-esi enyere gị aka?
6 E nwere otu nwoke si Jamanị aha ya bụ Ruben. Nne na nna ya bụ Ndịàmà Jehova. Ma, mgbe ọ na-eto, obi esichaghị ya ike na Jehova dị. Gịnị ka o mere ka ọ kwụsị iche otú ahụ? Ebe ọ chọpụtara na e nweghị oké ihe ọ ma gbasara okwu ahụ, o kpebiri ịmụkwu banyere ya. Ọ sịrị: “M mụwa ihe n’onwe m, m na-amụ ihe ndị ga-enyere m aka ịmata nke bụ́ eziokwu. Ọtụtụ ugboro, m mụrụ gbasara ma ihe niile hà nọkatara dịrị.” Ọ gụrụ akwụkwọ bụ́ Is There a Creator Who Cares About You? Akwụkwọ ahụ nyeere ya ezigbo aka. Ọ gwara onwe ya, sị, ‘N’eziokwu, Jehova dị adị.’ N’oge Ruben gara ileta isi ụlọ ọrụ anyị, obi tọgburu ya atọgbu mgbe ọ ghọtakwuru otú ụmụnna anyị n’ụwa niile si dịrị n’otu ma hụ ibe ha n’anya. Mgbe ọ lọtara Jamanị, o mere baptizim mgbe ọ dị afọ iri na asaa. E nwee ihe ndị ị mụtara na Baịbụl na-eme gị obi abụọ, mee nchọnchọ n’akwụkwọ anyị banyere ha. ‘Ịmata ihe ndị ahụ nke ọma’ ga-enyere gị aka ịkwụsị inwe obi abụọ. (Efe. 4:13, 14) Ka ị na-anụ akụkọ gbasara otú ndị Jehova si hụ ibe ha n’anya ma dịrị n’otu n’ebe ndị ọzọ n’ụwa, jirikwa anya gị na-ahụ ya n’ọgbakọ unu, ọ ga-eme ka ị hụkwuo ụmụnna anyị nọ n’ụwa niile n’anya.
SỌL ONYE TASỌS MERE BAPTIZIM
7. Olee echiche na-adịghị mma Sọl kwesịrị ịgbanwe?
7 Ka anyị kwuo banyere Sọl onye Tasọs. Ọ nọ na-eme nke ọma n’okpukpe ndị Juu, na-aghọkwukwa onye Juu a ma ama. (Gal. 1:13, 14; Fil. 3:5) N’oge ahụ, ọtụtụ ndị Juu weere Ndị Kraịst ka ndị kwụsịrị ife Chineke. N’ihi ya, Sọl ji iwe na-akpagbu ha. O chere na ihe ahụ ọ na-eme bụ uche Chineke. (Ọrụ 8:3; 9:1, 2; 26:9-11) Ọ bụrụ na Sọl chọrọ inwe okwukwe na Jizọs ma mee baptizim ghọọ Onye Kraịst, ọ ma na a ga-akpagbukwa yanwa.
8. (a) Gịnị nyeere Sọl aka ime baptizim? (b) Dị ka e kwuru n’Ọrụ Ndịozi 22:12-16, olee otú Ananayas si nyere Sọl aka? (Kọwaakwa foto.)
8 Gịnị nyeere Sọl aka ime baptizim? Mgbe Jizọs si n’eluigwe gwa ya okwu, ìhè na-achasi ike mere ka o kpuo ìsì. (Ọrụ 9:3-9) Ruo ụbọchị atọ, o buru ọnụ. O dokwara anya na ọ nọ na-echebara ihe ndị mere ya echiche. N’eziokwu, obi bịara sie ya ike na Jizọs bụ Mezaya nakwa na ndị na-eso ụzọ ya na-ekpe ezigbo okpukpe. Ọ ga-abụ na otú o si tinye aka n’ogbugbu e gburu Stivin bịara wute ya nke ukwuu. (Ọrụ 22:20) Mgbe ụbọchị atọ ahụ gachara, otu onye na-eso ụzọ Jizọs aha ya bụ Ananayas gakwuuru Sọl, mee ka ọ hụwa ụzọ, gbaakwa ya ume ka o mee baptizim n’egbughị oge. (Gụọ Ọrụ Ndịozi 22:12-16.) Sọl medara obi kwe ka Ananayas nyere ya aka ma mee baptizim.—Ọrụ 9:17, 18.
Ị̀ ga-ekwe ka e nyere gị aka ka i mee baptizim otú ahụ Sọl mere? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8)
9. Olee ihe ndị ị mụtara n’aka Sọl?
9 E nwere ihe ndị anyị nwere ike ịmụta n’aka Sọl. A sị na ọ chọrọ, ọ gaara adị mpako ma ọ bụ kwe ka egwu mmadụ gbochie ya ime baptizim. Mana, o meghị otú ahụ. O weturu onwe ya ala, meekwa mgbanwe ná ndụ ya ka o nwee ike ịghọ onye na-eso ụzọ Jizọs. (Ọrụ 26:14, 19) Sọl dị njikere ịghọ Onye Kraịst n’agbanyeghị na ọ ma na a ga-akpagbu ya. (Ọrụ 9:15, 16; 20:22, 23) Mgbe e mechara ya baptizim, ọ nọ na-atụkwasị Jehova obi ka o nyere ya aka imeri ọtụtụ ọnwụnwa bịaara ya. (2 Kọr. 4:7-10) I mee baptizim ma ghọọ Onyeàmà Jehova, o nwere ike ime ka ọnwụnwa ma ọ bụ nsogbu bịara gị. Mana, Jehova ga-enyere gị aka. Ka obi sie gị ike na Jehova na Jizọs Kraịst ga na-akwado gị mgbe niile.—Fil. 4:13.
10. Olee otú akụkọ Nwanna Nwaanyị Anna ga-esi baara gị uru?
10 E nwere otu nwaanyị aha ya bụ Anna. O toro n’otu ezinụlọ si n’agbụrụ a na-akpọ Kọd nke dị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Yurop. Anna bidoro ịmụ Baịbụl mgbe ọ dị afọ itoolu. Papa ya kwetakwara. N’oge ahụ, mama ya emeela baptizim. Mana, mgbe ndị ikwu ha ha na ha bi n’otu ụlọ nụrụ na o bidola ịmụ Baịbụl, ha malitere imegide ya. Ha weere ya na mmadụ ịhapụ okpukpe ndị nna nna ha bụ ihe ihere. Mgbe Anna dị afọ iri na abụọ, ọ jụrụ papa ya ma ọ̀ ga-ekwe ya ka o mee baptizim. Papa ya chọrọ ịma ma ọ̀ bụ ya ji aka ya kpebie ime baptizim, ka è nwere onye na-akwanye ya ime ya. Anna zara papa ya, sị, “Ahụrụ m Jehova n’anya.” Papa ya kwetara ka o mee baptizim. Mgbe nke ahụ gachara, ndị ikwu ya nọ na-akwa ya emo ma na-emeso ya otú na-adịghị mma. Otu n’ime ndị ikwu ya sịrị ya, “Ọ ga-akara gị mma ma ị gaa mewe omume rụrụ arụ ma ọ bụ ṅụwa sịga kama ịbụ Onyeàmà Jehova.” Gịnị nyeere Anna aka? Ọ sịrị, “Jehova nyeere m aka ịdị ike. Mama m na papa m kwadoro m nke ukwuu.” Anna na-ede oge ndị Jehova nyeere ya aka. Ọ na-echebakwara ya echiche mgbe ụfọdụ ka o nwee ike icheta ụzọ ndị Jehova sirila nyere ya aka. Ọ bụrụ na ụjọ na-atụ gị na e nwere ike imegidewe gị, cheta na Jehova ga-enyekwara gị aka.—Hib. 13:6.
KỌNỊLIỌS MERE BAPTIZIM
11. Olee ihe ndị nwere ike igbochi Kọnịliọs ime baptizim?
11 Baịbụl kọkwaara anyị banyere Kọnịliọs. Ọ bụ “onyeisi otu ìgwè ná ndị agha” Rom dị otu narị (100). (Ọrụ 10:1, na ihe e dere n’ala ala peeji ya.) N’ihi ya, ọ ga-abụ na ndị obodo ya na ndị agha ibe ya ma ya ama. “Ọ na-enye ndị ogbenye onyinye.” (Ọrụ 10:2) Jehova zigara Pita onyeozi ka ọ gaa zie ya ozi ọma. Ọkwá Kọnịliọs ò gbochiri ya ime baptizim ozugbo?
12. Gịnị nyeere Kọnịliọs aka ime baptizim?
12 Gịnị nyeere Kọnịliọs aka ime baptizim? Baịbụl kwuru na ‘ya na ndị ezinụlọ ya na-atụ egwu Chineke.’ Kọnịliọs na-arịọkwa Chineke arịrịọ mgbe niile. (Ọrụ 10:2) Mgbe Pita ziri Kọnịliọs ozi ọma, ya na ndị ezinụlọ ya nwere okwukwe na Kraịst ma mee baptizim ozugbo. (Ọrụ 10:47, 48) O doro anya na Kọnịliọs dị njikere ịgbanwe ihe ọ bụla ná ndụ ya ka ya na ndị ezinụlọ ya nwee ike ife Jehova.—Josh. 24:15; Ọrụ 10:24, 33.
13. Olee ihe ndị i nwere ike ịmụta n’aka Kọnịliọs?
13 Dịkwa ka Sọl, a sị na Kọnịliọs chọrọ, ọ gaara ekwe ka ọkwá ya gbochie ya ịghọ Onye Kraịst. Mana, o meghị otú ahụ. È nwere ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ i kwesịrị ịgbanwe ná ndụ gị ka i nwee ike ime baptizim? Ọ bụrụ na e nwere, Jehova ga-enyere gị aka. Ọ ga-agọzi mbọ ị na-agba ife ya otú o kwuru na Baịbụl.
14. Olee otú akụkọ Tsuyoshi ga-esi baara gị uru?
14 E nwere otu nwoke si Japan aha ya bụ Tsuyoshi. O kwesịrị ịgbanwe ihe ụfọdụ n’ọrụ ya ka o nwee ike iru eru ime baptizim. Ọ bụ ya na-enyere onyeisi ụlọ akwụkwọ ha aka n’otu ụlọ akwụkwọ a ma ama na-akụzi otú e si ahazi okooko osisi. Mgbe ọ bụla onyeisi ha na-agaghị agali olili ozu, ọ bụ Tsuyoshi na-aga anọchite anya ya, meekwa ihe ndị okpukpe Buda na-eme ma mmadụ nwụọ. Ma mgbe Tsuyoshi mụtara nke bụ́ eziokwu banyere ọnwụ, ọ ma na ọ gaghị emeli baptizim ma ọ bụrụ na ọ kwụsịghị ime ihe ndị ahụ. O kpebiri na ya agaghịzi na-eme ihe ndị ahụ ndị okpukpe Buda na-eme. (2 Kọr. 6:15, 16) Tsuyoshi gwara onyeisi ụlọ akwụkwọ ahụ gbasara ihe a. Gịnị mechara mee? A chụghị ya n’ọrụ. Ọ naghịkwanụ eme ihe ọ bụla gbasara okpukpe Buda. O mere baptizim ihe dị ka otu afọ ọ malitechara ịmụ Baịbụl.a Ọ bụrụ na e nwere ihe ndị i kwesịrị ịgbanwe n’ọrụ gị ka i nwee ike ime Chineke obi ụtọ, ka obi sie gị ike na ọ ga na-enye gị na ndị ezinụlọ gị ihe ndị dị unu mkpa.—Ọma 127:2; Mat. 6:33.
NDỊ KỌRỊNT MERE BAPTIZIM
15. Olee ihe ndị nwere ike igbochi ndị bi na Kọrịnt ime baptizim?
15 Ihe e ji mara Kọrịnt oge ochie bụ ịchụ ego ọnwụ ọnwụ na ime omume rụrụ arụ. Ọtụtụ ndị bi n’obodo ahụ na-ebi ndụ otú Chineke na-achọghị. O doro anya na ọ ga-esiri onye ọ bụla bi n’obodo ahụ ike ịmalite ife Jehova. N’agbanyeghị ya, mgbe Pọl onyeozi bịara n’obodo ahụ zie ha ozi ọma banyere Kraịst, “ọtụtụ n’ime ndị Kọrịnt, ndị nụrụ okwu Chineke, kwekwaara, e mee ha baptizim.” (Ọrụ 18:7-11) Onyenwe anyị Jizọs Kraịst mere ka Pọl hụ ya n’ọhụụ ma sị ya: “E nwere ọtụtụ ndị n’obodo a ga-ekwere na m.” N’ihi ya, Pọl ziri ozi ọma n’ebe ahụ ruo otu afọ na ọkara.
16. Gịnị nyeere ụfọdụ ndị Kọrịnt aka ịkwụsị àgwà ndị gaara egbochi ha ime baptizim? (2 Ndị Kọrịnt 10:4, 5)
16 Gịnị nyeere ndị Kọrịnt aka ime baptizim? (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 10:4, 5.) Okwu Chineke na mmụọ nsọ ya dị ike nyeere ha aka ime ezigbo mgbanwe ná ndụ ha. (Hib. 4:12) Ndị bi na Kọrịnt, ndị nabatara ozi ọma gbasara Jizọs Kraịst, kwụsịrị omume ọjọọ ndị dị ka ịṅụfe mmanya ókè, izu ohi, na nwoke idina nwoke na nwaanyị idina nwaanyị.—1 Kọr. 6:9-11.b
17. Gịnị ka i nwere ike ịmụta n’aka ndị Kọrịnt?
17 Cheta na n’agbanyeghị na ụfọdụ ndị Kọrịnt nwere àgwà ndị riri ha ahụ́ ha kwesịrị ịkwụsị, ha echeghị na ha agaghị akwụsịli ịkpa àgwà ndị ahụ ma ghọọ Ndị Kraịst. Ha gbalịsiri ike ịbanye n’ụzọ ahụ dị mkpagide nke na-eduba ná ndụ ebighị ebi. (Mat. 7:13, 14) È nwere àgwà na-adịghị mma ị na-agbalị ịkwụsị ka i nwee ike ime baptizim? Ike agwụkwala gị. Rịọ Jehova ka o nye gị mmụọ nsọ nke ga-enyere gị aka ka ị ghara ime ihe ọjọọ na-agụ gị.
18. Olee otú akụkọ Monika nwere ike isi baara gị uru?
18 E nwere otu nwaanyị si Jọjịa aha ya bụ Monika. Ebe ọ bụ na ọ chọrọ ime baptizim, ọ gbalịsiri ike ka ọ kwụsị ikwu okwu rụrụ arụ na ile ma ọ bụ ige ihe ndị na-adịghị mma o ji eme onwe ya obi ụtọ. Ọ sịrị: “N’oge m na-erubeghị afọ iri abụọ, ihe kacha nyere m aka bụ ikpe ekpere. Jehova ma na m chọrọ ime ihe ziri ezi. Ọ na-enyekwara m aka mgbe niile ma na-eduzi m.” Monika mere baptizim mgbe ọ dị afọ iri na isii. È nwere àgwà ndị i kwesịrị ịkwụsị ka i nwee ike ife Jehova otú ọ ga-anabata? Akwụsịla ịrịọ ya ka o nye gị ike ịkwụsị àgwà ndị ahụ. Jehova na-enye onye ọ bụla chọrọnụ mmụọ nsọ ya.—Jọn 3:34.
OKWUKWE GỊ GA-EBUPỤLI UGWU
19. Gịnị ga-enyere gị aka imeri nsogbu ndị yiri ugwu? (Kọwaakwa foto.)
19 Ka obi sie gị ike na Jehova hụrụ gị n’anya, chọọkwa ka i soro n’ezinụlọ ya. Ihe a bụ eziokwu n’agbanyeghị nsogbu ọ bụla yiri ihe ga-egbochi gị ime baptizim. Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ọ bụrụ na unu enwee okwukwe há ka mkpụrụ osisi mọstad, unu ga-asị ugwu a, ‘Si ebe a gafee ebe nke ọzọ,’ ọ ga-agafe, ọ dịghịkwa ihe na-agaghị ekwe unu omume.” (Mat. 17:20) Ndị nụrụ ihe ahụ Jizọs kwuru bụ ndị ha na ya nọrọla naanị afọ ole na ole. Ọ pụtara na okwukwe ha kwesịkwara isikwu ike. Mana, Jizọs mere ka obi sie ha ike na ọ bụrụ na ha enwee ezigbo okwukwe, Jehova ga-enyere ha aka ibupụ nsogbu ndị yiri ugwu. Jehova ga-enyekwara gị aka ime otú ahụ.
Ka obi sie gị ike na Jehova hụrụ gị n’anya, chọọkwa ka i soro n’ezinụlọ ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 19)c
20. Olee otú akụkọ Ndị Kraịst n’oge ndịozi Jizọs nakwa n’oge anyị a a kọrọ n’isiokwu a si gbaa gị ume?
20 Ọ bụrụ na ị chọpụta ihe ndị na-egbochi gị ime baptizim, gbaa mbọ ka i merie ha n’egbughị oge. Ka ihe a kọrọ banyere Ndị Kraịst n’oge ndịozi Jizọs nakwa n’oge anyị a gbaa gị ume ma mee ka ị dị ike. Ka akụkọ ha nyekwara gị aka inyefe Jehova onwe gị ma mee baptizim. Ọ bụ mkpebi kacha mma ị ga-eme.
ABỤ NKE 38 Ọ Ga-eme Ka I Sie Ike
a Akụkọ ndụ Nwanna Tsuyoshi Fujii gbara na Teta! Bekee nke August 8, 2005, peeji nke 20 ruo na nke 23.
b Gaa na jw.org lee vidio bụ́ ‘Gịnị Na-adọla Gị Azụ Ime Baptizim?’
c NKỌWA FOTO: Ebe ụmụnna ndị nwoke na ndị nwaanyị ji obi ụtọ na-anabata ndị ka mere baptizim ọhụrụ.