IHE I NWERE IKE ỊMỤ
Si n’Ihe Ndị E Sere Ese Mụta Ihe
E nwere ọtụtụ ihe e sere n’akwụkwọ anyị dị iche iche na-akụzi ihe ndị dị ezigbo mkpa. Gịnị ka ị ga-eme ka ihe ndị ahụ e sere ese baara gị ezigbo uru?
Lee foto ndị dị n’ebe ị chọrọ ịgụ tupu gị amalite ịgụ ya. Ha nwere ike ime ka ị chọkwuo ịma ihe e kwuru ebe ahụ, meekwa ka ị gụọ ya. Naanị anya ị hụrụ nri e siri nke ọma nwere ike ime ka ọ gụwa gị agụụ iri ya. Ọ bụrụkwa na i buru ụzọ lee foto ndị e sere n’ebe ị chọrọ ịgụ, o nwere ike ime ka ịgụ isiokwu ahụ gụwa gị agụụ. N’ihi ya, tupu gị agụwa isiokwu ọ bụla, jụọ onwe gị, sị, ‘Gịnị ka e sere na ya?’—Emọs 7:7, 8.
Ị gụwa isiokwu ahụ, jụọ onwe gị ihe mere e ji see ihe ahụ e sere na ya. E nwee ihe e dere na foto ahụ, gụọ ya. Chee otú ihe ahụ e sere si gbasa isiokwu ahụ nakwa otú i nwere ike isi eme ihe ị mụtara na ya.
Ị gụchaa isiokwu ahụ, leekwa foto ahụ ka o nyere gị aka icheta isi ihe ị mụtara na ya. Mechie anya gị lee ma ị̀ ga-echeta foto ahụ nakwa ihe ị mụtara na ya.
Lee foto ndị e sere n’Ụlọ Nche a ka ị mara ma ị̀ ga-echeta ihe ọ na-akụziri gị.