ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 22
ABỤ NKE 15 Too Ọkpara Jehova
Otú Jizọs Jiruru Aha Jehova Kpọrọ Ihe
“Emeela m ka ha mara aha gị, m ga-emekwa ka a mara ya.”—JỌN 17:26.
IHE A GA-AMỤ
Otú Jizọs si mee ka a mara aha Jehova nakwa otú o si mee ka e doo aha Nna ya nsọ, meekwa ka a kwụsị ịkọcha aha ya.
1-2. (a) Gịnị ka Jizọs mere n’abalị bọtara ụbọchị e gburu ya? (b) Olee ajụjụ ndị a ga-aza n’isiokwu a?
NA Tọzdee, abalị iri na anọ n’ọnwa Naịsan, n’afọ 33, Jizọs na ndịozi ya kwesịrị ntụkwasị obi riri nri pụrụ iche n’ọnụ ụlọ dị n’elu n’abalị. Ọ ma na obere oge, Judas ga-arara ya nye n’aka ndị iro ya, ha emekpọọ ya ọnụ, gbuokwa ya. N’ihi ya, mgbe ha richara nri ahụ, ọ gwara ha ọtụtụ ihe gbara ha ume. Obere oge tupu ha apụọ, Jizọs kpere ekpere dị ezigbo mkpa. Jọn onyeozi dere ekpere ahụ. Ọ dị na Jọn isi 17.
2 Gịnị ka ekpere ahụ Jizọs kpere gosiri anyị gbasara ihe na-echegbu ya n’oge ahụ? Olee otú ekpere ahụ si gosi ihe dị ya mkpa n’oge niile o jere ozi ya n’ụwa? Ka anyị leba anya n’azịza ajụjụ ndị a.
“EMEELA M KA HA MARA AHA GỊ”
3. Gịnị ka Jizọs kwuru banyere aha Jehova? Gịnị ka ihe ahụ o kwuru pụtara? (Jọn 17:6, 26)
3 N’ekpere ahụ Jizọs kpere, ọ sịrị: “Emeela m ka ha mara aha gị.” Nke bụ́ eziokwu bụ na o kwuru ugboro abụọ na o meela ka ndị na-eso ụzọ ya mara aha Jehova. (Gụọ Jọn 17:6, 26.) Gịnị ka ihe ahụ o kwuru pụtara? Ò mere ka ha mara aha ha na-amabughị? Ndị na-eso ụzọ Jizọs bụ ndị Juu. N’ihi ya, ha ma na aha Chineke bụ Jehova. E dere aha ahụ ọtụtụ puku ugboro n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. N’ihi ya, ihe Jizọs na-ekwu abụghị na o mere ka ha mata na aha Chineke bụ Jehova. Kama, ọ na-ekwu banyere ụdị onye Jehova bụ. Jizọs mere ka ndị na-eso ụzọ ya mata ụdị onye Jehova bụ, ma ihe bụ́ nzube ya, ihe ndị ọ na-eme, na àgwà ya, karịa otú onye ọ bụla ọzọ ga-emeli.
4-5. (a) Olee ihe atụ na-egosi otú mmadụ nwere ike isi jiri aha mmadụ kpọrọkwuo ihe? (b) Olee otú ndị na-eso ụzọ Jizọs si mata aha Jehova?
4 Iji maa atụ, ka e were ya na e nwere otu okenye n’ọgbakọ unu aha ya bụ David. Ọ bụkwa dọkịta na-awa ahụ́. Ị ma nwanna ahụ kemgbe ọtụtụ afọ. Ma, otu ụbọchị, ezigbo ọrịa bịara gị na mberede, e buga gị n’ụlọ ọgwụ ebe nwanna ahụ na-arụ, ya ewerekwa ihe ọ mụtara n’ọrụ ya zọọ gị ndụ. Ị̀ ga-eji aha nwanna ahụ kpọrọkwuo ihe? Ee. Nwanna David agaghịzi abụ naanị okenye ahụ ị mabu. Ọ ga-abụzi dọkịta zọrọ gị ndụ.
5 Otú ahụ ka ọ dịkwa ndị na-eso ụzọ Jizọs. Ha ma na aha Chineke bụ Jehova. Ma, ha bịara jiri aha ahụ kpọrọkwuo ihe n’ihi na Jizọs nyeere ha aka ịmata Jehova. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Ọ bụ n’ihi na Jizọs kpara àgwà ka Nna ya n’ihe niile o kwuru na n’ihe niile o mere. N’ihi ya, ndị na-eso ụzọ ya bịara ‘mata’ Jehova nke ọma mgbe ha na-ege Jizọs ntị ka ọ na-akụzi ihe nakwa mgbe ha hụrụ otú o si emeso ndị mmadụ ihe.—Jọn 14:9; 17:3.
“AHA GỊ NKE I NYERE M”
6. Olee otú o si bụrụ na Jehova nyere Jizọs aha ya? (Jọn 17:11, 12)
6 N’ekpere Jizọs kpeere ndị na-eso ụzọ ya, ọ sịrị: “Chebe ha n’ihi aha gị nke i nyere m.” (Gụọ Jọn 17:11, 12.) Ọ̀ pụtara na Jizọs ga na-azazi Jehova? Mba. Mgbe Jizọs kwuru “aha gị” n’ekpere ahụ, ọ na-ekwu banyere aha ahụ bụ́ Jehova. N’ihi ya, aha Jehova aghọghị aha Jizọs Kraịst. Gịnịzi ka Jizọs bu n’obi kwuo na e nyela ya aha Chineke? Nke mbụ, Jizọs na-anọchite anya Chineke, bụrụkwa Onye na-ekwuchite ọnụ ya. Ọ bịara n’aha Nna ya ma rụọ ọrụ ebube ndị ọ rụrụ n’aha Nna ya. (Jọn 5:43; 10:25) Ihe ọzọ bụ na aha Jizọs pụtara “Jehova Bụ Nzọpụta.” N’eziokwu, aha Jehova dị n’ihe aha Jizọs pụtara.
7. Mee ihe atụ na-egosi otú Jizọs si kwuchite ọnụ Jehova.
7 Iji maa atụ, onye ọchịchị nwere ike idunye mmadụ ka ọ gaa nọchite anya ya. N’ihi ya, onye ahụ na-anọchite anya ya kwuo okwu, a na-ewere ya na ọ bụ onye ọchịchị ahụ kwuru ya. Otú ahụ ka Jizọs si kwuchite ọnụ Jehova n’ihi na ọ bụ Jehova zitere ya.—Mat. 21:9; Luk 13:35.
8. Olee otú Jizọs si bịa n’aha Jehova n’oge ụmụ Izrel? (Ọpụpụ 23:20, 21)
8 Baịbụl kpọrọ Jizọs “Okwu ahụ” n’ihi na Jehova na-eji ya agwa ma ndị mmụọ ozi ma ụmụ mmadụ ihe ọ chọrọ ka ha mara ma mee. (Jọn 1:1-3) Ọ ga-abụ Jizọs bụ mmụọ ozi ahụ Jehova zigara ka ọ na-echebe ndị Izrel n’oge ha nọ n’ala ịkpa. Mgbe Jehova na-agwa ndị Izrel ka ha rubere mmụọ ozi ahụ isi, ọ sịrị: “Maka na ọ ga-abịa n’aha m.”a (Gụọ Ọpụpụ 23:20, 21.) Jizọs bịara n’aha Jehova n’ihi na ọ nọchitere anya Jehova. Ọ bụkwa ya bụ onye bụ́ isi na-agbachitere aha Nna ya ma na-eme ka ọ dị nsọ.
“NNA, MEE KA AHA GỊ DỊ EBUBE”
9. Olee otú aha Jehova dịruru Jizọs mkpa? Kọwaa.
9 Dị ka anyị kwurula, tupudị Jizọs abịa n’ụwa, o weere aha Jehova ka ihe kacha ya mkpa. Ka a sịkwa ihe mere Jizọs ji si n’ihe niile o mere mgbe ọ nọ n’ụwa gosi na o ji aha Jehova kpọrọ ezigbo ihe. Mgbe ọ fọrọ obere ka o jechaa ozi ya, ọ sịrị: “Nna, mee ka aha gị dị ebube.” Ozugbo ahụ, Nna ya ji oké olu si n’eluigwe zaa ya, sị: “Emeela m ka ọ dị ebube, m ga-emekwa ka ọ dị ebube ọzọ.”—Jọn 12:28.
10-11. (a) Olee otú Jizọs si mee ka e doo aha Nna ya nsọ? (Kọwaakwa foto.) (b) Gịnị mere o ji dị mkpa ka e doo aha Jehova nsọ, meekwa ka a kwụsị ịkọcha ya?
10 Jizọs tokwara aha Nna ya. Olee otú o si mee ya? Otu ụzọ o si mee ya bụ ime ka ndị mmadụ mata àgwà ọma ndị magburu onwe ha Nna ya nwere na ihe ndị ọ na-eme. Ma, e nwere ihe ọzọ Jizọs mere. E kwesịrị ido aha Jehova nsọ, meekwa ka a kwụsị ịkọcha aha ya.b Jizọs gosiri otú ihe a dịruru mkpa mgbe ọ kụziiri ndị na-eso ụzọ ya otú e si ekpe ekpere. Ọ sịrị: “Nna anyị nke bi n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ.”—Mat. 6:9.
11 Gịnị mere e kwesịrị iji doo aha Jehova nsọ, meekwa ka a kwụsị ịkọcha ya? Ọ bụ n’ihi na n’ogige Iden, Setan bụ́ Ekwensu katọrọ Jehova Chineke ma ghagide ya ụgha. Setan kwuru na Jehova bụ onye ụgha nakwa na e nwere ihe ọma ọ na-egbochi Adam na Iv inweta. (Jen. 3:1-5) Setan kwukwara na otú Jehova si eme ihe adịghị mma. Ihe ndị a na-abụghị eziokwu Setan kwuru na-ewetara Jehova aha ọjọọ. Mgbe e mechara, n’oge Job, Setan kwukwara na ndị na-efe Jehova na-efe ya naanị n’ihi ihe ha ga-enweta n’aka Jehova. O kwukwara na e nweghị mmadụ ọ bụla ji obi ya niile hụ Jehova n’anya nke na ọ ga na-efe ya ma ọnwụnwa bịara ya. (Job 1:9-11; 2:4) Ọ dị mkpa ka oge ụfọdụ gafee iji gosi ma onye na-ekwu eziokwu ọ̀ bụ Jehova, ka ọ̀ bụ Setan.
Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya na ido aha Chineke nsọ dị ezigbo mkpa (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10)
“M NA-ENYE NDỤ M”
12. Gịnị ka Jizọs dị njikere ime n’ihi otú o si jiri aha Jehova kpọrọ ihe?
12 Ebe ọ bụ na Jizọs hụrụ Jehova n’anya, ọ chọrọ ime ihe niile ọ ga-emeli iji doo aha Jehova nsọ, meekwa ka a kwụsị ịkọcha ya. Jizọs sịrị: “M na-enye ndụ m.” (Jọn 10:17, 18 ) N’eziokwu, ọ dị njikere ịnwụ n’ihi aha Jehova.c Mmadụ abụọ mbụ zuru okè bụ́ Adam na Iv gbakụtara Jehova azụ ma dụnyere Setan úkwù. Ma, Jizọs dị njikere ịbịa n’ụwa gosi na ọ hụrụ Jehova n’anya. Otú o si mee ya bụ irubere Jehova isi n’ihe niile o kwuru na n’ihe niile o mere. (Hib. 4:15; 5:7-10) O rubeere ya isi n’oge niile ọ dị ndụ ruo mgbe ọ nwụrụ n’osisi ịta ahụhụ. (Hib. 12:2) O si otú ahụ gosi na ọ hụrụ Jehova n’anya, jirikwa aha ya kpọrọ ihe.
13. Gịnị mere Jizọs ji bụrụ onye kacha mma igosi na Setan bụ onye ụgha? (Kọwaakwa foto.)
13 Ihe niile Jizọs mere gosiri na ọ bụ Setan bụ onye ụgha, ọ bụghị Jehova. (Jọn 8:44) Jizọs ma Jehova nke ọma karịa onye ọ bụla ọzọ dịtụrụla ndụ. Ọ bụrụ na e nwere nke bụ́ eziokwu n’ime ihe ndị ahụ Ekwensu kwuru banyere Jehova, Jizọs ga-ama. Mana, Jizọs nọsiri ike gbachitere aha Jehova. Mgbe o yidịrị ka Jehova ọ̀ hapụrụ Jizọs, Jizọs dị njikere ịnwụ kama ịgbakụta Nna ya hụrụ ya n’anya azụ.—Mat. 27:46.d
Otú Jizọs si bie ndụ ya gosiri n’eziokwu na ọ bụ Setan bụ onye ụgha, ọ bụghị Jehova (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13)
“ARỤCHAALA M ỌRỤ I NYERE M KA M RỤỌ”
14. Olee otú Jehova si kwụọ Jizọs ụgwọ maka isi o rubeere ya?
14 N’ekpere ahụ Jizọs kpere n’abalị bọtara ụbọchị ọ nwụrụ, ọ sịrị: “Arụchaala m ọrụ i nyere m ka m rụọ.” Obi siri ya ike na Jehova ga-akwụ ya ụgwọ maka isi o rubeere ya. (Jọn 17:4, 5) Jehova agharịpụghị Jizọs. Ọ hapụghị ya ka ọ tọ n’ili. (Ọrụ 2:23, 24) Ọ kpọlitere Jizọs n’ọnwụ ma nye ya ọkwá dị elu n’eluigwe. (Fil. 2:8, 9) Jizọs mechara bido ịchị n’Alaeze Chineke. Gịnị ka Alaeze ahụ ga-eme? Jizọs zara ajụjụ a n’ihe nke abụọ o kwuru n’ekpere ahụ ọ kụziiri ndị na-eso ụzọ ya. Ọ sịrị Jehova: “Ka Alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.”—Mat. 6:10.
15. Gịnị bụ ihe ọzọ Jizọs ga-eme?
15 N’oge na-adịghị anya, Jizọs ga-alụso ndị iro Chineke ọgụ ma gbuo ndị ọjọọ n’agha Amagedọn. (Mkpu. 16:14, 16; 19:11-16) Nke ahụ gachaa, ọ ga-atụba Setan “n’abis,” ya bụ, ebe a ga-atụ ya mkpọrọ, ya anọrọ n’enweghị ihe ọ ga-emeli. (Mkpu. 20:1-3) N’otu puku (1,000) afọ ahụ Jizọs ga-achị, ọ ga-eme ka udo dịghachi n’ụwa, ụmụ mmadụ ezuokwa okè. Ọ ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ, meekwa ka ụwa niile ghọọ Paradaịs. A ga-emezu nzube Jehova.—Mkpu. 21:1-4.
16. Olee otú ihe ga-adị ma Jizọs chịchaa otu puku (1,000) afọ?
16 Gịnị ka anyị na-atụ anya ga-eme ma Jizọs chịchaa otu puku (1,000) afọ? Mmehie ụmụ mmadụ na ezughị okè ga-ala ka naị. Ọ gaghịzi adị mkpa ka ha na-arịọ ka a gbaghara ha mmehie n’ihi àjà ahụ Jizọs chụrụ. Ọ gaghịkwa adị mkpa ka e nwee onye ogbugbo ma ọ bụ ndị nchụàjà. Ihe ọzọ bụ na “a ga-emeri” “onye iro ikpeazụ,” ya bụ, ọnwụ anyị ketara n’aka Adam. E nweghịzi ndị ga-anọ n’ili. A ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. Onye ọ bụla nọ n’ụwa ga-ezu okè.—1 Kọr. 15:25, 26.
17-18. (a) Gịnị ga-edo anya ma Jizọs chịchaa otu puku afọ? (b) Gịnị ka Jizọs ga-eme ma ọ chịchaa? (1 Ndị Kọrịnt 15:24, 28) (Kọwaakwa foto.)
17 Olee ihe ọzọ ga-eme ma Jizọs chịchaa otu puku (1,000) afọ? N’oge ahụ, ihe pụrụ ezigbo iche ga-eme. E nweghịzi onye ga-enwewe obi abụọ ma Jehova ọ̀ dị nsọ nakwa ma ọ̀ na-ekpe ikpe ziri ezi. Maka gịnị? N’ogige Iden, Setan kwuru na Jehova bụ onye ụgha nakwa na ọchịchị ya anaghị egosi na ọ hụrụ ndị mmadụ n’anya. Kemgbe ahụ, ndị na-efe Chineke emeela ka aha Jehova dị nsọ ọtụtụ ugboro. N’ihi ya, Jizọs chịchaa otu puku afọ, ọ ga-edo anya na Jehova bụ onye eziokwu. Ọ pụtara na Jehova emeela ka o doo ewu na ọkụkọ anya na ya bụ Nna anyị nke eluigwe hụrụ anyị n’anya.
18 Jizọs chịchaa otu puku (1,000) afọ, ọ ga-edo onye ọ bụla anya na ihe niile Setan kwuru banyere Jehova bụ ụgha chara acha. Gịnị ka Jizọs ga-eme ma ọ chịchaa? Ọ̀ ga-eme ka Setan ma nupụrụ Jehova isi? Mbanụ. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 15:24, 28.) Jizọs ga-enyefe Nna ya Alaeze ahụ. Ọ ga na-erubere ọchịchị Jehova isi. N’eziokwu, Jizọs agaghị eme ka Setan. Ọ dị njikere ịhapụ ihe niile n’ihi otú o si hụ Nna ya n’anya.
Ebe Jizọs ji obi ya niile na-enyefe Jehova Alaeze ahụ mgbe ọ chịchara otu puku (1,000) afọ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 18)
19. Olee otú Jizọs jiruru aha Jehova kpọrọ ihe?
19 Ka a sịkwa ihe mere Jehova ji nye Jizọs aha ya. Jizọs egosila na ọ bụ ya kacha kwesị ịnọchite anya Nna ya. N’ihi ya, olee otú Jizọs jiruru aha Jehova kpọrọ ihe? O ji ya kpọrọ ihe karịa ihe ọ bụla ọzọ. Ọ dị njikere ịnwụ maka aha ahụ. Ọ ga-adịkwa njikere inyefe Jehova ihe niile ma ọ chịchaa otu puku (1,000) afọ. Olee otú anyị ga-esi eme ka Jizọs? Anyị ga-aza ajụjụ a n’isiokwu na-eso nke a?
ABỤ NKE 16 Toonụ Jaa n’Ihi Ọkpara Ya O Tere Mmanụ
a E nwekwara mgbe ụfọdụ ndị mmụọ ozi nọchitere anya Jehova mgbe ha na-ezi ozi o ziri ha. Ọ bụ ya mere na n’ebe ụfọdụ na Baịbụl, e kwuru na ọ bụ Jehova na-ekwu okwu, ebe ọ bụkwanụ mmụọ ozi na-ekwuchite ọnụ ya. (Jen. 18:1-33) Ọ bụ eziokwu na Baịbụl kwuru na Mosis natara Iwu n’aka Jehova, amaokwu ndị ọzọ na Baịbụl kwuru na Jehova ji ndị mmụọ ozi ya nye ya Iwu ahụ.—Lev. 27:34; Ọrụ 7:38, 53; Gal. 3:19; Hib. 2:2-4.
b NKỌWAKWU: ‘Ido nsọ’ pụtara ime ka a mata na ihe dị nsọ ma ọ bụ ịkwanyere ihe ezigbo ùgwù. ‘Ime ka a kwụsị ịkọcha aha mmadụ’ pụtara ime ka a mara na ebubo e boro onye ahụ bụ ụgha.
c Ọnwụ Jizọs mepere ụzọ ka ụmụ mmadụ nwee ike inweta ndụ ebighị ebi.
d Gụọ “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ” nke gbara n’Ụlọ Nche Eprel 2021, peeji nke 30 ruo 31.