ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 26
ABỤ NKE 123 Ka Anyị Na-erubere Chineke Isi
Dịrị Umeala n’Obi ma E Nwee Ihe Ị Na-amaghị
“Anyị enweghị ike ịghọta ihe niile banyere Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.”—JOB 37:23.
IHE A GA-AMỤ
Ọ bụrụgodị na anyị amaghị ihe niile ga-emenụ, anyị ga-edili nsogbu ndị na-abịara anyị ma anyị chee gbasara ihe ndị anyị ma, tụkwasịkwa Jehova obi.
1. Olee otú Jehova si kee anyị? Maka gịnị?
JEHOVA kere anyị ka anyị nwee ike ịna-eche echiche, na-amatakwu ihe, na-aghọta ihe, ma na-egosi na anyị ma ihe. Gịnị mere o ji si otú a kee anyị? Ọ chọrọ ka anyị ‘mụta banyere ya,’ jirikwa echiche anyị na-ejere ya ozi.—Ilu 2:1-5; Rom 12:1.
2. (a) Gịnị ka anyị kwesịrị ịmata gbasara onwe anyị? (Job 37:23, 24) (Kọwaakwa foto.) (b) Olee uru ọ na-abara anyị ma anyị dịrị umeala n’obi ma mata na anyị amaghị ihe niile?
2 Ọ bụ eziokwu na anyị nwere ike ịmụta ihe, mana ọ bụghị ihe niile ka anyị ma. (Gụọ Job 37:23, 24.) Chegodị gbasara Job. Jehova jụrụ ya ọtụtụ ajụjụ nyeere ya aka ịghọta na e nwere ọtụtụ ihe ọ na-amaghị. Ihe a nyeere Job aka ịdị umeala n’obi, meekwa ka ọ gbanwee otú o si eche echiche. (Job 42:3-6) Anyịnwa kwa na-erite uru ma ọ bụrụ na anyị adịrị umeala n’obi, mata na anyị amaghị ihe niile. Ịdị umeala n’obi na-enyere anyị aka ịtụkwasị Jehova obi na ọ ga-eme ka anyị mata ihe ọ dị mkpa ka anyị mata iji mee ezigbo mkpebi.—Ilu 2:6.
Ikweta na e nwere ihe anyị na-amaghị ga-abara anyị uru otú ahụ ọ baara Job (A ga-akọwa ya na paragraf nke 2)
3. Gịnị ka anyị ga-amụ n’isiokwu a?
3 N’isiokwu a, anyị ga-ekwu gbasara ụfọdụ ihe anyị na-amaghị nakwa otú o nwere ike isi kpaa anyị aka. Anyị ga-elebakwa anya n’ihe mere o ji dị mma na e nwere ihe ndị anyị na-amaghị. Ileba anya n’ihe ndị a ga-eme ka obi sikwuo anyị ike na Jehova, “Onye ma ihe niile,” na-agwa anyị ihe niile ọ dị mkpa ka anyị mara.—Job 37:16.
ANYỊ AMAGHỊ MGBE ỌGWỤGWỤ GA-ABỊA
4. Dị ka e kwuru na Matiu 24:36, olee otu ihe anyị na-amaghị?
4 Gụọ Matiu 24:36. Anyị amaghị mgbe ọgwụgwụ ụwa ochie a ga-abịa. Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọ madịghị “ụbọchị na awa ọ ga-abụ.”a O mechara gwa ndịozi ya na e nwere ụfọdụ ihe ọ bụ naanị Jehova, bụ́ Onye Ukwu Na-edebe Oge, “nwere ikike ikpebi oge na mgbe” ha ga-eme. (Ọrụ 1:6, 7) Jehova ekpebiela mgbe ọ ga-ebibi ụwa ochie a. Mana, anyị agaghị amatali oge ọ ga-abụ.
5. Ebe ọ bụ na anyị amaghị ụbọchị ọgwụgwụ ga-abịa, olee otú o nwere ike isi akpa anyị aka?
5 N’ihi ihe Jizọs kwuru, anyị amaghị mgbe anyị ga-echeru tupu ọgwụgwụ abịa. Ihe a nwere ike ime ka anyị ghara inwe ndidi ma ọ bụkwanụ ka anyị daa mbà, karịchaa ma ọ bụrụ na o teela anyị chewere ka ụbọchị Jehova ruo. O nwekwara ike isiri anyị ike idi emo ndị ezinụlọ anyị na ndị ọzọ na-akwa anyị. (2 Pita 3:3, 4) Anyị nwere ike iche na ọ bụrụ na anyị amata kpọmkwem ụbọchị ọgwụgwụ ga-abịa, ọ ga-adịkwuru anyị mfe inwe ndidi chere ụbọchị Jehova, ya adịkwuokwara anyị mfe idi emo a na-akwa anyị.
6. Gịnị mere o ji dị mma na anyị amaghị mgbe Chineke ga-ebibi ụwa ochie a?
6 Nke bụ́ eziokwu bụ na ebe ọ bụ na Jehova agwaghị anyị ụbọchị ọ ga-ebibi ụwa ochie a, o nyere anyị ohere igosi na ihe mere anyị ji na-efe ya bụ na anyị hụrụ ya n’anya ma tụkwasị ya obi. Anyị anaghị efe Jehova n’ihi na e nwere ụbọchị anyị bu n’obi, dị ka à ga-asị na e nwere oge ọ ga-eru anyị akwụsị inwe okwukwe na ya. Kama ịna-eche naanị gbasara oge “ụbọchị Jehova” ga-abịa, anyị kwesịrị ilekwasị anya n’ihe ga-eme ma ụbọchị ahụ gachaa. Anyị mee otú ahụ, ọ ga-eme ka anyị bịarukwuo Jehova nso, tụkwasịkwuo ya obi ma mee ihe niile anyị ga-emeli iji mee ihe dị ya mma.—2 Pita 3:11, 12.
7. Gịnị ka anyị ma?
7 Ọ dị mkpa ka anyị lekwasị anya n’ihe anyị ma. Anyị ma na oge ikpeazụ a malitere n’afọ 1914. Jehova mekwara ka e buo amụma ndị dị na Baịbụl ndị mere ka anyị mata afọ oge ọgwụgwụ malitere nakwa ihe ndị ga-eme n’ụwa ma afọ ahụ gachaa. Ihe a mere ka obi sie anyị ike na “oké ụbọchị Jehova dị nso.” (Zef. 1:14) Anyị makwa ọrụ Jehova chọrọ ka anyị rụọ, ya bụ, izi ọtụtụ ndị “ozi ọma Alaeze Chineke.” (Mat. 24:14) A na-ekwusa ozi ọma a n’ihe dị ka narị mba abụọ na iri anọ (240) nakwa n’ihe karịrị otu puku (1,000) asụsụ. Ọ dịghị mkpa ka anyị mata “ụbọchị na awa ọ ga-abụ” tupu anyị ejiri ịnụ ọkụ n’obi na-arụ ọrụ a dị mkpa.
ANYỊ AMAGHỊ OTÚ JEHOVA GA-ESI ENYERE ANYỊ AKA
8. Gịnị bụ “ọrụ ezi Chineke”? (Ekliziastis 11:5)
8 Ọ bụghị mgbe niile ka anyị na-ama “ọrụ ezi Chineke.” (Gụọ Ekliziastis 11:5.) “Ọrụ ezi Chineke” bụ ihe Jehova na-eme ma ọ bụ ihe o kwere ka o mee ka uche ya nwee ike imezu. Anyị agaghị amatali kpọmkwem ihe mere Jehova ji kwe ka ihe mee ma ọ bụ otú ọ ga-esi enyere anyị aka. (Ọma 37:5) Anyị agaghị aghọtachali ihe a otú ahụ a na-enweghị ike ịghọtacha otú nwa nọ n’afọ si eto. Ndị sayensị aghọtachabedịghị ya ruo taa.
9. Ebe ọ bụ na anyị amaghị kpọmkwem ihe Jehova ga-eme iji nyere anyị aka, olee ihe o nwere ike ime ka anyị na-eche?
9 Ebe ọ bụ na anyị amaghị kpọmkwem ihe Jehova ga-eme iji nyere anyị aka, o nwere ike isiri anyị ike ime ụfọdụ mkpebi. O nwere ike isiri anyị ike ịhapụ ihe ụfọdụ iji jekwuoro Jehova ozi, dị ka iselata aka n’oge anyị ji arụ ọrụ ego ma ọ bụ ịkwaga n’ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma. Anyị nwekwara ike ịna-eche ma ihe anyị ọ̀ dịkwa Jehova mma ma ọ bụrụ na e nwere ihe anyị bu n’obi ime n’ofufe ya anyị na-emelighị. O nwekwara ike ịbụ na anyị na-agachi ozi ọma anya, mana e nweghị ndị anyị na-amụrụ Baịbụl, ma ọ bụkwanụ na e nwere ihe pụrụ iche anyị so na-arụ ná nzukọ Jehova ma ihe ana-esiri anyị ike. Ihe ndị a nwere ike ime ka anyị chee na ihe anyị adịghị Jehova mma.
10. Olee àgwà ụfọdụ dị mkpa anyị na-amụta n’ihi na anyị amaghị kpọmkwem ihe Jehova ga-eme iji nyere anyị aka?
10 Ebe ọ bụ na anyị amaghị kpọmkwem ihe Jehova ga-eme iji nyere anyị aka, anyị ga-enwe ike ịmụta àgwà ndị dị mkpa, dị ka ịdị umeala n’obi na ịma ebe ike anyị ruru. Ọ na-eme ka anyị ghọta na echiche Jehova na ụzọ ya dị ezigbo elu karịa nke anyị. (Aịza. 55:8, 9) Anyị na-amụtakwa ịtụkwasịkwu Jehova obi, obi esie anyị ike na ọ ma ihe ga-akachara anyị mma. Ọ bụrụ na ihe agaziere anyị n’ozi anyị gara ma ọ bụ n’ọrụ anyị rụrụ ná nzukọ Jehova, anyị na-eto Jehova n’ihi na ọ bụ ya ka o ruuru. (Ọma 127:1; 1 Kọr. 3:7) Ọ bụrụ na ihe agaghị otú anyị tụrụ anya ya, anyị kwesịrị icheta na Jehova ma ihe niile. (Aịza. 26:12) Anyị ga-eme ihe anyị ga-emeli, tụkwasị Jehova obi na ọ ga-eme ihe o kwesịrị ime. Obi siri anyị ike na ọ ga-enye anyị ntụziaka dị anyị mkpa, ọ bụrụgodị na ọ rụghị ọrụ ebube otú ahụ o mere mgbe ụfọdụ n’oge gara aga.—Ọrụ 16:6-10.
11. Olee ihe anyị ma ga-enyere anyị aka?
11 Anyị ma na Jehova hụrụ anyị n’anya mgbe niile, na-ekpe ikpe ziri ezi, marakwa ihe. Anyị makwa na o ji ihe ndị anyị na-emere ya na ụmụnna anyị kpọrọ ezigbo ihe. Anyị makwa na Jehova na-akwụ ndị jisiri ya aka ike ụgwọ.—Hib. 11:6.
ANYỊ AMAGHỊ IHE GA-EME ECHI
12. Dị ka e kwuru na Jems 4:13, 14, gịnị ka anyị na-amaghị?
12 Gụọ Jems 4:13, 14. Otu eziokwu doro anya bụ na anyị amaghị ihe ndụ anyị ga-abụ echi. N’ụwa ochie a, anyị ma na ‘ọdachi na-abịara anyị niile n’oge anyị na-atụghị anya ya.’ (Ekli. 9:11) Ọ bụ ya mere na anyị amaghị ma ihe anyị mere atụmatụ ime ọ̀ ga-agaziri anyị ma ọ bụkwanụ ma ànyị ga-anọdị ndụ mechaa ihe anyị chọrọ ime.
13. Olee otú obi nwere ike ịdị anyị n’ihi na anyị amaghị ihe ga-eme echi?
13 O nwere ike isiri anyị ike ịtachi obi ebe ọ bụ na anyị amaghị kpọmkwem ihe ga-eme echi. Maka gịnị? Anyị nwere ike ịna-echegbu onwe anyị gbasara ihe ndị nwere ike ime, ya emee ka anyị ghara ịna-enwe ọṅụ. Ọdachi na ihe ndị anyị na-atụghị anya ha nwere ike ime ka anyị na-eru uju, gbawaakwa anyị obi. Ọ bụrụkwa na ihe anyị tụrụ anya ya emeghị, obi nwere ike ịjọ anyị njọ, anyị adaa mbà n’obi.—Ilu 13:12.
14. Olee ihe ga-eme ka anyị na-enwe ezigbo obi ụtọ? (Kọwaakwa foto.)
14 Ọ bụrụ na anyị edie nsogbu ndị na-abịara anyị, anyị na-egosi na n’agbanyeghị ihe ọ bụla merenụ, anyị na-efe Nna anyị nke eluigwe n’ihi na anyị hụrụ ya n’anya, ọ bụghị n’ihi uru ndị anyị ga-erite. Akụkọ ndị e dere na Baịbụl gosiri na anyị ekwesịghị ịtụ anya ka Jehova chebe anyị ka nsogbu ọ bụla ghara ịbịara anyị nakwa na ọ naghị ebu ụzọ ekpebi ihe niile ga-eme ná ndụ anyị. Ọ ma na ihe ga-eme ka anyị na-enwe obi ụtọ abụghị ịmara ihe niile ga-eme anyị n’ọdịnihu, kama ọ bụ ma anyị na-achọ ntụziaka ya ma na-erubere ya isi. (Jere. 10:23) Ọ bụrụ na anyị ana-achọ nduzi Jehova mgbe anyị na-eme mkpebi, ọ pụtara na anyị na-asị: “Ọ bụrụ uche Jehova, anyị ga-adị ndụ mee nke a ma ọ bụ nke ọzọ.”—Jems 4:15.
Ịchọ nduzi Jehova na irubere ya isi na-echebe anyị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14 na nke 15)b
15. Gịnị ka anyị ma gbasara ọdịnihu?
15 Ọ bụ eziokwu na anyị amaghị ihe ga-eme echi, anyị ma na Jehova kwere anyị nkwa ndụ ebighị ebi, ma ọ̀ bụ n’eluigwe ma ọ bụ n’ụwa. Anyị ma na ọ gaghị agha ụgha, nakwa na e nweghị ihe ọ bụla ga-egbochi ya imezu nkwa ya niile. (Taị. 1:2) “Tupu ihe ga-eme emee,” ọ bụ naanị ya ‘na-ekwu na ọ ga-eme. Ọtụtụ afọ tupu e mee ihe a na-emebeghị, ọ na-ekwu na a ga-eme ya.’ Amụma niile o buru ga-eme n’oge e dere Baịbụl mezuru. Ihe niile o kwuru ga-eme n’ọdịnihu ga-emekwa. (Aịza. 46:10) Obi siri anyị ike na o nweghị ihe ọ bụla ga-egbochi Jehova ịhụ anyị n’anya. (Rom 8:35-39) Ọ ga-enye anyị amamihe, kasie anyị obi, nyekwa anyị ike anyị ga-eji die nsogbu ọ bụla bịaara anyị. Ka obi sie anyị ike na Jehova ga-enyere anyị aka ma gọzie anyị.—Jere. 17:7, 8.
ANYỊ AGAGHỊ AGHỌTACHALI OTÚ JEHOVA MARURU ANYỊ
16. Dị ka e kwuru n’Abụ Ọma 139:1-6, olee ihe Jehova ma gbasara anyị, oleekwa otú ihe a mere ka obi dịrị gị?
16 Gụọ Abụ Ọma 139:1-6. Onye kere anyị ma otú e si kee anyị nakwa ihe mere ka anyị dịrị otú anyị dị, obi ana-adị anyị otú ọ na-adị anyị, anyị ana-echekwa echiche otú anyị si eche. Ọ naghị agbanwe otú o si hụ anyị n’anya. Ọ ma ihe anyị na-ekwu na ihe anyị bu n’obi ekwu ya, ihe anyị na-eme na ihe mere anyị ji eme ya. Eze Devid kwuru na Jehova dị njikere mgbe niile inyere anyị aka nakwa na ọ ga-enyeliri anyị aka. Olee otú obi dị gị ịmara na Ọkaakaa Onyenwe anyị, bụ́ Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile, na-eche banyere gị otú a? Devid kwuru, sị: “Enweghị m ike ịghọta ihe niile ị ma gbasara m. Ha karịrị m.”—Ọma 139:6.
17. Olee ihe ndị nwere ike ime ka o siere anyị ike ikweta na Jehova ma anyị nke ọma?
17 O nwere ike ịbụ na otú e si zụlite anyị, omenala anyị, ma ọ bụ ihe ndị anyị kweere n’oge gara aga mere ka o siere anyị ike iwere Jehova ka Nna hụrụ anyị n’anya, onye ihe gbasara anyị na-emetụ n’obi. O nwekwara ike ịbụ na anyị na-eche na mmehie ndị anyị mere n’oge gara aga dị oké njọ nke na Jehova agaghị achọ ịma gbasara anyị, nakwa na ọ nọ anyị n’ebe dị anya. O nwedịrị mgbe ụfọdụ ọ dị Devid otú ahụ. (Ọma 38:18, 21) Onye ji obi ya niile na-agba mbọ ịgbanwe otú o si ebi ndụ ma biwe ndụ otú Chineke chọrọ nwekwara ike ịna-eche, sị: ‘Ọ bụrụ na Chineke ghọtara m, gịnị mere o ji chọọ ka m hapụ otú m si ebi ndụ maara m ahụ́?’
18. Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị mata na Jehova ma anyị nke ọma karịa ka anyị ma onwe anyị? (Kọwaakwa foto.)
18 Anyị nwere ike ịmụta na Jehova ma anyị nke ọma karịa otú anyị ma onwe anyị nakwa na ọ na-ahụ àgwà ọma ndị anyị nwere anyịnwa na-anaghị ahụ. N’agbanyeghị na ọ na-ahụ ihe ndị anyị na-emejọ, na-aghọtakwa ihe mere obi ji adị anyị otú ọ na-adị anyị nakwa ihe mere anyị ji eme ihe ndị anyị na-eme, ọ hụrụ anyị n’anya. (Rom 7:15) Ọ bụrụ na anyị aghọta n’eziokwu na Jehova na-ahụ ụdị mmadụ anyị nwere ike ịbụ, ọ na-eme ka anyị nwee ike iji obi anyị niile na-efe ya ma na-enwe ọṅụ.
Jehova na-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike n’ihe ndị magburu onwe ha o kwere anyị ná nkwa. Ihe ndị a na-enyere anyị aka idi nsogbu anyị na-atụghị anya ha na-abịara anyị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 18 na nke 19)c
19. Olee ihe anyị ma nke ọma gbasara Jehova?
19 Anyị ma na Jehova bụ ịhụnanya. A naghị enyo ya enyo. (1 Jọn 4:8) Anyị ma na iwu ya na-egosi na ọ hụrụ anyị n’anya. Ọ chọrọ ka anyị bie ndụ kacha mma. Anyị makwa na Jehova chọrọ ka anyị nweta ndụ ebighị ebi. O nyere anyị ihe mgbapụta ka o nwee ike ikwe omume. Ihe mgbapụta ahụ na-eme ka obi sie anyị ike na anyị ga-efeli Jehova otú ọ chọrọ n’agbanyeghị na anyị ezughị okè. (Rom 7:24, 25) Anyị ma na “Chineke karịrị obi anyị, marakwa ihe niile.” (1 Jọn 3:19, 20) Jehova na-ahụ ihe niile gbasara anyị. Obi sikwara ya ike na anyị ga-emeli uche ya.
20. Gịnị ga-enyere anyị aka ka anyị ghara ịna-echegbu onwe anyị?
20 Jehova na-agwa anyị ihe niile ọ dị anyị mkpa ka anyị mara. Ọ bụrụ na anyị aghọta ihe a, ọ ga-eme ka anyị ghara ịna-echegbu onwe anyị n’ihi ihe ndị anyị na-amaghị ma lekwasị anya n’ihe ndị ka mkpa. Anyị mee otú ahụ, anyị na-egosi na anyị tụkwasịrị Jehova obi anyị niile. Ọ bụ ya bụ “Onye ma ihe niile.” (Job 36:4) Ọ bụ eziokwu na e nwere ihe ụfọdụ anyị na-amachaghị ugbu a, anyị na-atụ anya mgbe anyị ga-adị ndụ ebighị ebi na-amụta ọtụtụ ihe ọhụrụ n’aka Chineke anyị dị ebube, na-amụtakwukwa gbasara ya.—Ekli. 3:11.
ABỤ NKE 104 Chineke Na-enye Anyị Mmụọ Nsọ Ya
a Ọ bụ Jizọs ga-ebute ụzọ n’ibibi ụwa Setan. N’ihi ya, o ziri ezi ikwu na ọ matala oge a ga-alụ agha Amagedọn nakwa oge ọ ‘ga-emeri ndị iro ya ruo n’isi.’—Mkpu. 6:2; 19:11-16.
b NKỌWA FOTO: Ebe otu nna na nwa ya na-etinye ihe n’akpa ezinụlọ ha ga-eji agbapụ ka ha nwee ike ijikere ejikere maka ọdachi.
c NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna nsogbu bịaara na-eche gbasara ihe ọma ndị ga-abịara ya n’ụwa ọhụrụ.