AKỤKỌ NDỤ
Anyị Amụtala Ọtụtụ Ihe n’Aka Onye Ozizi Kachanụ ná Ndụ Anyị Niile
N’OGE mụ na nwunye m na-asụ ụzọ oge niile nakwa n’oge anyị jere ozi ala ọzọ, anyị na-ahụkarị ebe ndị agha na-anọ eche nche n’ụzọ, ebe ndị mmadụ na-agba ihe ọkụ n’ụzọ ka a ghara isi na ya gafee, oké ifufe, na agha. E nwekwara oge ụfọdụ anyị si n’ebe anyị bi gbaa ọsọ ndụ. N’agbanyeghị ihe ndị a, e nweghị ihe ọzọ ka mkpa anyị gaara eji ndụ anyị eme. Jehova nọnyeere anyị na nke ọ bụla n’ime ha, gọziekwa anyị. Ebe ọ bụ ya bụ Onye Ozizi Kachanụ, ọ kụzielara anyị ọtụtụ ihe bara ezigbo uru.—Job 36:22; Aịza. 30:20.
IHE ỌMA NNE NA NNA M KỤZIIRI M
N’afọ 1957, nne na nna m si Ịtali kwaga Kindasli dị na Saskachewan, Kanada. Ọ dịghị anya, ha amụta eziokwu Baịbụl, nke bịara bụrụzie ihe kacha anyị mkpa ná ndụ. M na-echeta na mgbe m dị obere, mụ na ndị ezinụlọ anyị na-eji ọtụtụ awa ekwusa ozi ọma n’ụbọchị ụfọdụ. N’ihi ya, mgbe ụfọdụ, m na-eji egwuregwu asị na m “sụrụ ụzọ inyeaka” mgbe m dị afọ asatọ.
Mụ na ndị ezinụlọ anyị n’ihe dị ka n’afọ 1966
Nne na nna m dara ogbenye. Ma, ha gosiri anyị otú e si ahapụ ihe ụfọdụ maka ofufe Jehova. Dị ka ihe atụ, n’afọ 1963, ha rere ọtụtụ ihe ha nwere ka ha nweta ego ha ga-eji gaa mgbakọ mba niile e mere na Pasadena dị na Kalịfọnịa, Amerịka. N’afọ 1972, anyị kwagara Trel dị na British Kolombia, Kanada, ikwusara ndị na-asụ Ịtalian n’ebe ahụ ozi ọma. Ebe ahụ dị ihe dị ka otu puku (1,000) kilomita ma e si ebe anyị bi gawa ya. Papa m na-ehichara otu ụlọ ahịa ụlọ ahịa ha, na-arụzikwara ha ihe ndị mebiri emebi. E nwere mgbe a chọrọ inye ya ọrụ ga-enye ya ezigbo ego, mana o kweghị anara ya n’ihi na ọ chọrọ ilekwasị anya n’ozi ọ na-ejere Jehova.
Obi dị m ụtọ maka otú nne m na nna m si jiri àgwà ọma ha kụziere mụ na ụmụnne m atọ ezigbo ihe. Ọ bụ otú e si malite ịzụ m n’ozi m na-ejere Jehova. Ha kụziiri m ihe m na-agaghị echefu echefu ná ndụ m niile, ya bụ na Jehova ga-elekọta m ma m buru ụzọ na-achọ Alaeze ya.—Mat. 6:33.
OTÚ M SI MALITE OZI OGE NIILE
N’afọ 1980, m lụrụ otu ọmarịcha nwanna nwaanyị aha ya bụ Debbie. Mkpa ya bụ ijere Jehova ozi. Anyị chọrọ ịbanye n’ozi oge niile. N’ihi ya, mgbe anyị gbachara akwụkwọ, ọnwa atọ agaa, nwunye m malitere ịsụ ụzọ oge niile. Mgbe otu afọ anyị lụrụ gachara, anyị gafere n’otu obere ọgbakọ a chọkwuru ndị nkwusa, mụ esoro nwunye m sụwa ụzọ.
N’ụbọchị anyị gbara akwụkwọ n’afọ 1980
Ka oge na-aga, obi jọwara anyị njọ, anyị ekpebie na anyị ga-ahapụ ọgbakọ ahụ. Ma, anyị bu ụzọ gwa onye nlekọta sekit anyị banyere ya. O weturu obi gwa anyị hoo haa, sị: “Unu ji aka unu na-eme ka ihe na-esikwuru unu ike. Unu na-elekwasị anya naanị ná nsogbu unu. Kama ime otú ahụ, ọ bụrụ na unu achọwa ịhụ ihe ndị dị mma, unu ga-ahụ ha.” Ọ bụ ụdị ndụmọdụ ahụ ka e kwesịrị inye anyị. (Ọma 141:5) Anyị mere ihe ọ gwara anyị ozugbo. Ọ dịghị anya, anyị achọpụta na e nwere ọtụtụ ihe ọma na-eme n’ozi anyị. Ọtụtụ ndị n’ọgbakọ anyị chọrọ ijekwuru Jehova ozi, ma ndị na-eto eto ma ụfọdụ ndị di ha ma ọ bụ nwunye ha na-anọghị n’ọgbakọ. Ihe ahụ kụziiri anyị ezigbo ihe. Anyị mụtara ịna-achọ ebe ụmụnna anyị na-eme nke ọma ma chere Jehova ka o dozie nsogbu ọ bụla nwere ike iyi ihe siri ike. (Maị. 7:7) Anyị si otú ahụ nwewekwa ọṅụ, ihe akakwuo nnọọ mma.
Ụmụnna ndị kụziiri anyị ihe n’ụlọ akwụkwọ ndị ọsụ ụzọ mbụ anyị gara ejeela ozi ná mba ndị ọzọ. Ka ha na-egosi anyị foto ebe ndị ha jere ozi, na-akọkwara anyị nsogbu ndị ha nwere na otú Jehova si gọzie ha, ha mere ka anyị chọsikwuo ike ịbụ ndị ozi ala ọzọ. N’ihi ya, anyị kpebiri na anyị ga-aga ozi ala ọzọ.
Mgbe anyị nọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze dị na British Kolombia n’afọ 1983
Iji kwadebe maka ozi ala ọzọ, n’afọ 1984, anyị kwafere Kwebek, bụ́ ebe a na-asụ French, ihe karịrị puku kilomita anọ (4,000) ma e si British Kolombia gawa ya. Ọ pụtara na anyị ga-amụ omenala ndị obodo ọzọ na asụsụ ọzọ. Ihe ọzọ siiri anyị ike bụ na ọtụtụ mgbe, anyị anaghị enwecha ego. E nwere oge o ruru, naanị ihe anyị na-eri bụ poteto otu onye ọrụ ugbo wefọrọ n’ugbo ya o kwere ka anyị bịa na-ewere. Nwunye m mụtara otú e si eji poteto esi nri dị iche iche na-atọ ezigbo ụtọ. N’agbanyeghị ihe isi ike ndị a, anyị gbalịsiri ike na-enwe ọṅụ n’ozi anyị. Ihe ọzọ bụ na anyị hụrụ otú Jehova si na-elekọta anyị.—Ọma 64:10.
Otu ụbọchị, a kpọrọ anyị n’ekwentị, gwa anyị ka anyị bịa jewe ozi na Betel dị na Kanada. Anyị atụghị anya ya. E nweela mgbe anyị tinyere akwụkwọ ịga Ụlọ Akwụkwọ Gilied. N’ihi ya, ọ bụ eziokwu na obi dị anyị ụtọ na a kpọrọ anyị ka anyị bịa jewe ozi na Betel, mana, o wutere anyị na a kpọghị anyị ịga Ụlọ Akwụkwọ Gilied. Ma, anyị kwetara ịga. Mgbe anyị ruru, anyị jụrụ Nwanna Kenneth Little, onye so na Kọmitii Alaka, sị: “É mechaakwanụ kpọọ anyị ka anyị gaa Gilied?” Ọ zara anyị, sị: “Ọ bụnụ a hụ okwu, a hụ ọsịsa ya.”
Mgbe otu izu gachara, a kpọrọ mụ na nwunye m ka anyị gaa Gilied. N’ihi ya, e nwere ihe anyị kwesịrị ikpebi. Nwanna Little gwara anyị, sị: “N’agbanyeghị nke ọ bụla unu họọrọ, o nwere mgbe ọ ga-adị unu ka ya bụrụ na unu họọrọ nke ọzọ. E nweghị nke ka ibe ya mma n’ozi abụọ a. Jehova ga-agọzili nke ọ bụla n’ime ha.” Anyị kwetara ịga Ụlọ Akwụkwọ Gilied. Ihe ahụ Nwanna Little gwara anyị bụ eziokwu. Anyị ahụla ụfọdụ ndị ọ dị otú ahụ ọ dịbu anyị. Anyị na-agwakwa ha ihe ahụ Nwanna Little gwara anyị.
IJE OZI ALA ỌZỌ
(N’aka ekpe) Nwanna Ulysses Glass
(N’aka nri) Nwanna Jack Redford
Obi dị anyị ụtọ na anyị so n’ụmụ akwụkwọ iri abụọ na anọ a kpọrọ ka ha bịa klas nke iri asatọ na atọ na Gilied. Anyị gara ya na Bruklin dị na Niu Yọk n’ọnwa Eprel afọ 1987. Ndị nkụzi anyị bụ Nwanna Ulysses Glass na Nwanna Jack Redford. Ọ raghị ahụ́, ọnwa ise anyị ji gụọ akwụkwọ agwụ. Anyị gụchara akwụkwọ n’abalị isii n’ọnwa Septemba afọ 1987. E zigara anyị Heiti, anyị na Nwanna John Goode na nwunye ya Marie.
Mgbe anyị nọ na Heiti n’afọ 1988
Kemgbe afọ 1962 ndị ọchịchị chụpụrụ ndị ozi ala ọzọ nọbu na Heiti, e nwebeghị ndị ozi ala ọzọ gara Ụlọ Akwụkwọ Gilied e zigara ebe ahụ. Izu atọ anyị gụchara akwụkwọ, anyị bidoro ije ozi na Heiti, n’ime ime ebe bụ́ ugwu ugwu, n’obere ọgbakọ e nwere ndị nkwusa iri atọ na ise. Anyị ka bụ okoro na agbọghọ, o nwebeghịkwa oké ihe anyị ma. Ọ bụkwa naanị anyị bi n’ụlọ ndị ozi ala ọzọ. Ndị obodo ahụ dara ezigbo ogbenye. Ọtụtụ n’ime ha amaghịkwa agụ ihe. N’oge anyị bi ebe ahụ, ndị obodo ahụ mewere tigbuo zọgbuo n’ihi ndọrọ ndọrọ ọchịchị. E nwekwara ndị nọ na-achọ iweghara ọchịchị na ndị na-eme ngagharị iwe. Oké ifufe na-emebikwa ihe ebe ahụ.
Anyị mụtara ọtụtụ ihe n’aka ụmụnna nọ na Heiti ndị nwere obi ike ma na-enwe obi ụtọ. Ihe na-esiri ọtụtụ n’ime ha ike, ma ha hụrụ Jehova n’anya, jirikwa ikwusa ozi ọma kpọrọ ihe. E nwere otu nwanna nwaanyị mere agadi na-amaghị agụ ihe. N’agbanyeghị ya, o bu ihe dị ka amaokwu Baịbụl otu narị na iri ise (150) n’isi. Nsogbu ndị dị ebe ahụ mere ka anyị na-achọsikwu ike izi ndị mmadụ ozi ọma na ọ bụ naanị Alaeze Chineke ga-edozi nsogbu ụmụ mmadụ. Obi dị anyị ụtọ ịhụ ka ụfọdụ n’ime ndị mbụ anyị mụụrụ Baịbụl ghọrọ ndị ọsụ ụzọ oge niile, ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche, na ndị okenye.
Mgbe anyị nọ na Heiti, m hụrụ otu nwa okorobịa aha ya bụ Trevor. Ọ bụ onye ozi ala ọzọ na chọọchị ndị Mọmọn. Mụ na ya kwurịtara gbasara Baịbụl n’oge ụfọdụ. Mgbe ọtụtụ afọ gachara, m nwetara akwụkwọ ozi o detaara m. Atụghị m anya ya. O dere, sị: “M ga-eme baptizim ná mgbakọ na-abịa abịa. M chọkwara ịlaghachi Heiti ghọọ ọsụ ụzọ pụrụ iche n’ebe ahụ m bụbu onye ozi ala ọzọ ndị chọọchị Mọmọn.” Ya na nwunye ya mekwara ihe ahụ o kwuru ruo ọtụtụ afọ.
ANYỊ JERE OZI NA YUROP, MECHAZIE JEE N’AFRỊKA
Mgbe m na-arụ ọrụ na Slovinia n’afọ 1994
E zigara anyị ka anyị jewe ozi n’ebe e wepụrụ iwu a machiri anyị ikwusa ozi ọma na Yurop. N’afọ 1992, anyị rutere Liubliana dị na Slovinia, ebe dị nso n’ebe nne na nna m toro tupu ha akwaga Ịtali. Agha ka kpụkwa ọkụ n’ọnụ n’ụfọdụ ebe bụ́bu Yugoslavia. Ndị na-elekọta ọrụ a na-arụ n’ebe ahụ bụ ụmụnna nọ na Viena dị n’Ọstria, Zagreb dị na Kroeshia, nakwa Belgred dị na Sebia. Ma ugbu a, a ga-arụ Betel n’obodo nke ọ bụla nweere onwe ya.
Ihe a pụtara na anyị ga-amụta asụsụ na omenala ọhụrụ. Ndị obodo ahụ na-asị anyị, “Jezik je težek,” nke pụtara “Asụsụ anyị a siri ike.” N’eziokwu, o siri ike. Ọ na-atọgbu anyị atọgbu ịhụ otú ụmụnna anyị si jisie Jehova ike nakwa otú ha si anabata mgbanwe ọ bụla nzukọ Jehova mere. Anyị hụrụ otú Jehova si gọzie ha na otú o si edozi okwu n’oge kwesịrị ekwesị. Anyị mụtara ọtụtụ ihe n’oge anyị nọ na Slovinia. Ihe ndị anyị mụtakwara n’oge gara aga nyeere anyị aka idi nsogbu ndị bịaara anyị ebe ahụ.
Ma a ka nwere ihe ndị ga-agbanwenụ. N’afọ 2000, e zigara anyị Kot Devụa dị n’Ọdịda Anyanwụ Afrịka. Na Nọvemba afọ 2002, anyị si Kot Devụa gbapụ, gbaga Siera Lion n’ihi agha a na-alụ ebe ahụ. Agha a lụrụ afọ iri na otu na Siera Lion ka kwụsịrị akwụsị. O siiri anyị ike isi na Kot Devụa pụọ ozugbo. Ma, ihe ndị anyị mụtara nyeere anyị aka ịna-enwe ọṅụ.
Anyị lekwasịrị anya n’ọtụtụ ndị chọrọ ịmụta eziokwu Baịbụl ebe ahụ nakwa ụmụnna anyị hụrụ anyị n’anya, ndị dirila agha a lụrụ ebe ahụ ruo ọtụtụ afọ. Ha dara ogbenye, mana ha chọrọ inye ndị ọzọ ihe ha nwere. Otu nwanna nwaanyị nyere nwunye m uwe ụfọdụ. Mgbe nwunye m na-achọghị ịnara ya, nwanna nwaanyị ahụ sịrị ya: “N’oge a na-alụ agha, ụmụnna anyị nọ ná mba ndị ọzọ nyere anyị ihe dị iche iche. Ugbu a, o ruola anyị n’aka inyere ndị ọzọ aka.” Anyị gbasiri mbọ ike ịna-eme ka ụmụnna anyị ndị a.
Anyị mechara laghachikwa Kot Devụa. Ma, nsogbu e nwere na ndọrọ ndọrọ ọchịchị mere ka ọgba aghara malitekwa ebe ahụ. N’ihi ya, n’ọnwa Nọvemba afọ 2004, anyị ji helikọpta gbapụ ebe ahụ. Naanị ihe onye ọ bụla n’ime anyị bu gbapụ bụ otu akpa. N’abalị ya, anyị hiri n’ala nkịtị n’ebe ndị amị Frans bi, jirizie ụgbọelu gaa Swizaland n’echi ya. Anyị rutere n’alaka ụlọ ọrụ dị ebe ahụ n’ihe dị ka n’ime abalị. Ụmụnna ndị so na Kọmitii Alaka na ndị na-akụzi ihe n’Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi nabatara anyị nke ọma, ha na ndị nwunye ha. Ha makụrụ anyị, nye anyị nri dị ọkụ, nyekwa anyị chọkọlet ndị Swizaland. Ihe a ha mere mere anyị obi ụtọ.
Ebe m na-agwa ndị gbatara ọsọ ndụ na Kot Devụa okwu n’afọ 2005
E zigara anyị ka anyị nọọ obere oge na Gana, anyị emechazie laghachi Kot Devụa mgbe ọgba aghara ahụ belatara. Obiọma ụmụnna anyị gosiri anyị nyeere anyị aka n’oge ndị ahụ anyị na-agbapụ nakwa n’ebe ndị anyị jere ozi obere oge. Mụ na nwunye m Debbie kwekọrịtara na anyị agaghị eji ịhụnanya ụmụnna anyị na-egosi anyị gwuo egwu, ọ bụ eziokwu na e ji ịhụnanya mara ndị Jehova. N’eziokwu, oge ndị ahụ ihe siiri anyị ike zụrụ anyị nke ọma.
OZI ANYỊ JERE N’IZREL NA MBA NDỊ GBARA YA GBURUGBURU
Mgbe anyị na-eje ozi n’Izrel na obodo ndị gbara ya gburugburu n’afọ 2007
N’afọ 2006, anyị nwetara akwụkwọ ozi si n’isi ụlọ ọrụ anyị e ji gwa anyị na a na-ezigazi anyị n’Izrel na mba ndị gbara ya gburugburu. N’ebe a kwa, e nwere ihe ndị siiri anyị ike. Anyị mụkwara asụsụ ndị ọhụrụ na omenala ndị ọhụrụ. N’obodo ndị a, e nwere ọtụtụ nsogbu n’ihi ndọrọ ndọrọ ọchịchị na okpukpe. Otú e si nwee asụsụ dị iche iche n’ọgbakọ dị iche iche tọgburu anyị atọgbu. Anyị chọpụtakwara na ụmụnna anyị dị n’otu n’ihi na ha na-eso ntụziaka si n’ọgbakọ Jehova. Anyị ji ụmụnna anyị ndị a kpọrọ ihe n’ihi na ọtụtụ n’ime ha ji obi ike die mkpagbu si n’aka ndị ezinụlọ ha, ụmụ akwụkwọ ibe ha, ndị ọrụ ibe ha, na ndị agbata obi ha.
Anyị gara mgbakọ pụrụ iche na Tel Aviv dị n’Izrel n’afọ 2012. Mgbakọ a bụ nke mbụ ya ndị Jehova gbakọrọ n’ìgwè buru ibu otú a n’ebe ahụ kemgbe Pentikọst afọ 33 Oge Ndị Kraịst. Anyị anaghị echefu mgbakọ ahụ echefu.
N’afọ ndị ahụ, e zigara anyị ka anyị gaa leta otu mba a machiri ọrụ anyị iwu. Anyị ji akwụkwọ anyị ụfọdụ gaa ebe ahụ, soro kwusaa ozi ọma, gaakwa obere mgbakọ ndị e nwere n’ebe ahụ. Ndị amị ndị ji ngwá ọgụ juru ebe niile, nọchichaakwa n’ụzọ na-eche nche. Anyị na ndị nkwusa ole na ole ji akọ na-agagharị, ma obi ruru anyị ala.
ANYỊ LAGHACHIRI AFRỊKA
Mgbe m na-akwadebe okwu na Kongo n’afọ 2014
N’afọ 2013, e nyere anyị ọrụ ọzọ dị iche. A gwara anyị ka anyị jewe ozi n’alaka ụlọ ọrụ dị na Kịnshasa, Kongo. Obodo a buru ezigbo ibu, maakwa mma dị egwu. Ma, ha bụ ogbenye ọnụ ntụ. A na-alụkarịkwa agha na ya. Ná mmalite, anyị sịrị: “Anyị ma Afrịka. Anyị dị njikere.” Ma, e nwere ọtụtụ ihe anyị ka ga-amụta, karịchaa mgbe ọ dị mkpa ka anyị gaa n’ebe ndị na-emepechabeghị emepe. Anyị chọtara ọtụtụ ihe ọma ndị anyị ga-elekwasị anya, dị ka otú ụmụnna anyị si na-atachi obi ma na-enwe obi ụtọ n’agbanyeghị ihe isi ike, otú ha si jiri ikwusa ozi ọma kpọrọ ihe, na-agbakwa mbọ aga ọmụmụ ihe na mgbakọ. Anyị ji anya anyị hụ otú ọrụ Alaeze si na-aga n’ihu n’ebe ahụ naanị n’ihi na Jehova na-akwado ndị ya ma na-agọzi ha. Ozi oge niile anyị jere na Kongo mere ka e nwee ọtụtụ ihe anyị na-agaghị echefu echefu, meekwa ka anyị nwetakwuo ọtụtụ ndị enyi ndị dị ka ndị ezinụlọ anyị.
Mgbe anyị na-ekwusa ozi ọma na Saụt Afrịka n’afọ 2023
Ná ngwụcha afọ 2017, e zigara anyị ebe ọzọ, ya bụ, Saụt Afrịka. Ọ bụ alaka ụlọ ọrụ a kacha buo ibu n’ebe niile anyị jere ozi. Ọrụ e nyekwara anyị ka anyị na-arụ na Betel bụ ọrụ anyị na-arụtụbeghị. E nwekwara ọtụtụ ihe anyị ga-amụta. Mana ihe ndị anyị mụtara n’oge gara aga n’ozi ndị anyị jeburu nyeere anyị aka. Anyị hụrụ ọtụtụ ụmụnna anyị ndị na-atachi obi kemgbe ọtụtụ afọ n’anya. Ọ tụkwara anyị n’anya ịhụ otú ndị ezinụlọ Betel si na-arụkọ ọrụ ọnụ n’agbanyeghị na ha si n’agbụrụ dị iche iche, omenala ha adịrịkwa iche iche. Ọ dị mfe ịhụ na Jehova na-agọzi ndị ya, na-emekwa ka ha nwee udo n’ihi na ha eyirila àgwà ọhụrụ ma na-eme ihe Baịbụl kwuru.
Kemgbe ọtụtụ afọ, mụ na nwunye m Debbie enwetala ọtụtụ ọrụ mere anyị obi ụtọ, mụtakwa omenala dị iche iche na asụsụ dị iche iche. Ọ naghị adịrị anyị mfe mgbe niile, mana anyị na-ahụ na Jehova na-esi n’aka nzukọ ya nakwa n’aka ụmụnna anyị egosi anyị na ọ hụrụ anyị n’anya. (Ọma 144:2) Obi siri anyị ike na ọzụzụ ndị anyị nwetara n’ozi oge niile anyị na-eje emeela ka anyị bụrụkwuo ezigbo ndị ohu Jehova.
Obi na-atọ m ụtọ n’ihi otú nne na nna m si zụọ m, otú nwunye ọma m bụ́ Debbie si na-akwado m, nakwa àgwà ọma ụmụnna anyị nọ n’ụwa niile na-akpa. Ka mụ na nwunye m na-eche gbasara ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu, anyị kpebisiri ike ịna-amụtakwu ihe Onye Ozizi anyị kachanụ na-akụziri anyị.