Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w25 Septemba p. 2-7
  • “Kpọọ Ndị Okenye”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Kpọọ Ndị Okenye”
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • OLEE MGBE ANYỊ KWESỊRỊ ‘ỊKPỌ NDỊ OKENYE’?
  • GỊNỊ MERE ANYỊ JI KWESỊ ỊKPỌ NDỊ OKENYE?
  • OTÚ NDỊ OKENYE SI ENYERE ANYỊ AKA
  • IHE ANYỊNWA KWESỊRỊ IME
  • Otú Ndị Okenye Ga-esi Egosi Ndị Mere Mmehie na Ha Hụrụ Ha n’Anya ma Na-emere Ha Ebere
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
  • Otú E Si Hazie Ọgbakọ Ndị Kraịst
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Ụmụnna Nwoke, Ùnu Na-agbalịsi Ike Ka Unu Ruo Eruo Ịbụ Ndị Okenye?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
  • Ndị Ọzụzụ Atụrụ Ndị Na-arụ Ọrụ Na-abara Ndị Jehova Uru
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2023
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
w25 Septemba p. 2-7

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 36

ABỤ NKE 103 Ndị Ọzụzụ Atụrụ Bụ Onyinye Jehova Nyere Anyị

“Kpọọ Ndị Okenye”

“Ya kpọọ ndị okenye ọgbakọ.”​—JEMS 5:14.

IHE A GA-AMỤ

Ihe mere anyị kwesịrị iji gakwuru ndị okenye ọgbakọ ka ha nyere anyị aka mgbe ọ dị mkpa.

1. Olee otú Jehova si gosi na o ji atụrụ ya kpọrọ ihe?

JEHOVA ji atụrụ ya kpọrọ ihe. O ji ọbara Jizọs zụta ha, nyekwa ndị okenye ọgbakọ ọrụ ilekọta ha. (Ọrụ 20:28) Chineke họpụtara Jizọs ka ọ bụrụ onyeisi ọgbakọ. Ọ chọrọ ka ndị okenye jiri obiọma na-emeso atụrụ ya ihe. Ndị okenye na-eso ntụziaka Jizọs ma na-enyere atụrụ ndị ahụ aka ka ha na Jehova na-adị ná mma.​—Aịza. 32:1, 2.

2. Olee ndị Jehova kacha chọọ inyere aka? (Ezikiel 34:15, 16)

2 Ihe gbasara atụrụ Jehova niile na-emetụ ya n’obi. Ma ọ na-akacha achọ inyere ha aka mgbe ha na-ata ahụhụ. O si n’aka ndị okenye na-enyere ndị nke na-ata ahụhụ maka ihe ọjọọ ha mere aka ka okwukwe ha sie ike. (Gụọ Ezikiel 34:15, 16.) Ma ọ chọrọ ka anyị gbalịa ka e nyere anyị aka mgbe ọ bụla e kwesịrị inyere anyị aka. N’ụdị oge ahụ, ihe anyị ga-eme abụghị naanị ịrịọ Chineke ka o nyere anyị aka, kama anyị ga-agwa “ndị ọzụzụ atụrụ na ndị na-akụzi ihe” n’ọgbakọ ka ha nyere anyị aka.​—Efe. 4:11, 12.

3. Olee uru ịmụ banyere ọrụ ndị okenye na-arụ ga-abara anyị?

3 N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya ná nhazi Jehova mere isi n’aka ndị okenye na-enyere anyị aka ka anyị na ya dịrị ná mma. Anyị ga-aza ajụjụ ndị a: Olee mgbe anyị kwesịrị ịgwa ndị okenye ka ha nyere anyị aka? Gịnị mere anyị ji kwesị ime otú ahụ? Oleekwa otú ha si enyere anyị aka? Ọ bụrụgodị na anyị enweghị nsogbu ugbu a, azịza ajụjụ ndị a ga-enyere anyị aka ịghọta ndokwa a Jehova mere isi n’aka ndị okenye na-enyere anyị aka. O nwekwara ike ịzọ anyị ndụ n’ọdịnihu.

OLEE MGBE ANYỊ KWESỊRỊ ‘ỊKPỌ NDỊ OKENYE’?

4. Gịnị mere anyị ji kwuo na Jems 5:14-16, 19, 20 na-ekwu banyere otú mmadụ na Jehova ga-esi dịghachi ná mma? (Kọwaakwa foto.)

4 Jems bụ́ onye na-eso ụzọ Jizọs kọwara otú Jehova si eji ndị okenye enyere anyị aka. O dere, sị: “È nwere onye n’ime unu na-arịa ọrịa? Ya kpọọ ndị okenye ọgbakọ.” (Gụọ Jems 5:14-16, 19, 20.) Ihe Jems na-ekwu ebe a bụ banyere onye kwesịrị ịgba mbọ ka ya na Jehova dịghachi ná mma. Dị ka ihe atụ, a gwara onye ahụ na-arịa ọrịa ka ọ kpọọ ndị okenye, ọ bụghị dọkịta. Ihe ọzọ bụ na Jems kwuru na ahụ́ ga-adị onye ahụ mma ma a gbaghara ya mmehie ya. E nwere ike ikwu na ihe mmadụ kwesịrị ime ma ọ chọọ ka ya na Jehova dịghachi ná mma yiri ihe onye na-arịa ọrịa na-eme. Anyị rịawa ọrịa, anyị na-aga hụ dọkịta, kọwaara ya ihe na-eme anyị, meekwa ihe ọ gwara anyị. Anyị ga-emekwa ihe yiri ya ma e nwee ihe kpara adịm ná mma anyị na Chineke aka ọjọọ. Anyị kwesịrị ịgakwuru ndị okenye, kọọrọ ha nsogbu anyị, meekwa ihe ha si na Baịbụl gwa anyị.

Foto ndị na-egosi: 1. Ebe otu nwoke na-akọwara dọkịta ihe mere ya n’ubu. 2. Ebe otu nwanna na-akọwara otu okenye nsogbu o nwere mgbe ha nọ n’oche dị n’èzí.

Ọ bụrụ na anyị na-arịa ọrịa, anyị na-aga hụ dọkịta. Ọ bụrụkwa na anyị na Jehova adịghịzi ná mma, anyị kwesịrị ịgakwuru ndị okenye (A ga-akọwa ya na paragraf nke 4)


5. Olee otú anyị nwere ike isi chọpụta ma adịm ná mma anyị na Jehova ò nweela nsogbu?

5 Na Jems isi 5, Jems gwara anyị ka anyị gwa ndị okenye mgbe anyị chọpụtara na anyị na Jehova adịchaghịzi ná mma. Ma ọ kacha mma ka anyị gwa ndị okenye ka ha nyere anyị aka tupu anyị emee ihe ga-eme ka anyị na Jehova ghara ịdị ná mma. Anyị kwesịrị ịgwa onwe anyị eziokwu. Baịbụl gwara anyị na ọ bụrụ na anyị akpacharaghị anya, anyị nwere ike ịna-aghọgbu onwe anyị, na-eche na anyị na Jehova dị ná mma. (Jems 1:22) Ọ bụ ihe ụfọdụ Ndị Kraịst nọ na Sadis mere. Ma Jizọs gwara ha na ha anaghịzi eme ihe dị Jehova mma. (Mkpu. 3:1, 2) Otu ụzọ anyị nwere ike isi chọpụta ma anyị na Jehova ànyị ka dị ná mma bụ iji otú anyị si anụ ọkụ n’obi n’ofufe ya ugbu a tụnyere otú anyị na-emebu. (Mkpu. 2:4, 5) Anyị nwere ike ịjụ onwe anyị, sị: ‘Ịgụ Baịbụl na ịtụgharị uche n’ihe Baịbụl kwuru ọ̀ kwụsịla ịtọ m ụtọ otú ọ na-atọbu m? Ọ̀ bụ naanị ọmụmụ ihe ụfọdụ ka m na-aga? M̀ na-aga ụfọdụ ọmụmụ ihe n’akwadebeghị akwadebe? M̀ kwụsịla ịna-anụ ọkụ n’obi n’ozi ọma otú m na-emebu ma jiri oge m niile na-eme ihe ndị ọzọ? M̀ na-echekwu banyere ịchụ ego ugbu a karịa otú m na-emebu?’ Ọ bụrụ na anyị zara ee na nke ọ bụla n’ime ajụjụ ndị a, o nwere ike ịpụta na anyị na Jehova adịghịzi ná mma otú anyị dịbu. O nwere ike ịkakwu njọ ma ọ bụrụ na anyị agbachi nkịtị ghara ime ihe ọ bụla gbasara ya. Ọ bụrụ na anyị emelighị ka anyị na Jehova dị ná mma ma ọ bụ na anyị emeela ihe anyị ma na Jehova achọghị, anyị kwesịrị ịgakwuru ndị okenye ka ha nyere anyị aka.

6. Gịnị ka ndị mere mmehie dị oké njọ kwesịrị ime?

6 Nke bụ́ eziokwu bụ na ndị mere mmehie dị oké njọ, nke nwere ike ime ka e kewapụ ha n’ọgbakọ, kwesịrị ịga gwa ndị okenye ka e nyere ha aka. (1 Kọr. 5:11-13) E kwesịrị inyere onye ọ bụla mere mmehie dị oké njọ aka ka ya na Jehova dịghachi ná mma. Anyị chọọ ka Jehova gbaghara anyị n’ihi àjà ahụ Jizọs chụrụ, anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ‘mee ihe gosiri na anyị echegharịala.’ (Ọrụ 26:20) Ihe so na ya bụ ịgakwuru ndị okenye ma anyị mee mmehie dị oké njọ.

7. Olee ndị ọzọ kwesịrị ịgakwuru ndị okenye ka e nyere ha aka?

7 Ọ bụghị naanị ndị mere mmehie dị oké njọ ka ndị okenye na-enyere aka. Ha na-enyekwara ndị okwukwe ha ji nwayọọ nwayọọ na-anyụ ka ọkụ aka. (Ọrụ 20:35) Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịbụ na ọ na-esiri gị ezigbo ike imeri ihe ọjọọ na-agụ gị agụụ. O nwere ike ịkadị siere gị ike ma ọ bụrụ na ịṅụ ọgwụ ọjọọ riri gị ahụ́, ị na-ele ndị gba ọtọ, ma ọ bụ na-ebi ndụ rụrụ arụ tupu gị amụta eziokwu Baịbụl. I kwesịghị ịgbawa mbọ ịlụso ihe ndị a ọgụ naanị gị. I nwere ike ịga kọọrọ ya okenye ị ma na ọ ga-ege gị ntị nke ọma, nye gị ndụmọdụ ga-abara gị uru, ma mee ka obi sie gị ike na ị ga-emeli ihe dị Jehova mma ma ọ bụrụ na ị gbasie mbọ ike ka ị ghara ime ihe ọjọọ ahụ na-agụ gị agụụ. (Ekli. 4:12) Obi nwere ike ịjọwa gị njọ maka na ihe ọjọọ ka na-agụ gị agụụ. Okenye ahụ nwere ike ichetara gị na obi dị Jehova ụtọ na ị bịara ka e nyere gị aka. Ọ na-egosi na i ji adịm ná mma gị na Jehova kpọrọ ezigbo ihe nakwa na ị tụkwasịghị onwe gị obi.​—1 Kọr. 10:12.

8. Ọ̀ bụ ihe ọ bụla anyị mejọrọ ka anyị ga-aga kọọrọ ndị okenye? Kọwaa.

8 Ọ pụtaghị na anyị kwesịrị ịgakwuru ndị okenye maka ihe ọ bụla anyị mejọrọ. Dị ka ihe atụ, ka e were ya na anyị gwara nwanna okwu ọjọọ ma ọ bụ na anyị wesara ya iwe ọkụ. Kama ịgakwuru okenye, i kwesịrị ime ihe Jizọs kwuru, ya bụ, ịgakwuru nwanna ahụ ka gị na ya kpezie. (Mat. 5:23, 24) I nwere ike ime nchọnchọ n’akwụkwọ anyị gbasara ịdị nwayọọ, ndidi, na mmadụ ijide onwe ya ka i nwee ike ịkpakwu àgwà ọma ndị a n’oge ọzọ. Ma ọ bụrụ na nsogbu ahụ akwụsịghị n’agbanyeghị mbọ niile ị na-agba, i nwere ike ịgwa okenye ka o nyere gị aka. N’akwụkwọ ozi Pọl onyeozi degaara ndị Filipaị, ọ gwara otu nwanna ọ na-akpọghị aha ya ka o nyere Yuodia na Sintiki aka idozi nghọtahie ha nwere. Okenye nọ n’ọgbakọ unu nwekwara ike inyere gị aka.​—Fil. 4:2, 3.

GỊNỊ MERE ANYỊ JI KWESỊ ỊKPỌ NDỊ OKENYE?

9. Gịnị mere anyị ekwesịghị ikwe ka ihere gbochie anyị ịgwa ndị okenye ka ha nyere anyị aka? (Ilu 28:13)

9 Anyị kwesịrị inwe okwukwe na obi ike ka anyị nwee ike ịgwa ndị okenye ka ha nyere anyị aka ma anyị mee mmehie dị oké njọ ma ọ bụ ma anyị chọpụta na ọ na-esikwuru anyị ike ịlụso ihe ọjọọ na-agụ anyị agụụ ọgụ. Anyị ekwesịghị ikwe ka ihere gbochie anyị ịkpọ ndị okenye ka ha nyere anyị aka. Maka gịnị? Ọ bụ n’ihi na Jehova nyere anyị ndị okenye ka ha nyere anyị aka ka anyị na ya nwee ike ịna-adị ná mma. N’ihi ya, anyị gwa ha ka ha nyere anyị aka, ọ na-egosi na anyị tụkwasịrị Jehova obi ma na-erubere ya isi. Ọ na-egosikwa na anyị ghọtara na ọ bụ Jehova ga-enyere anyị aka ịna-eme ihe dị mma. (Ọma 94:18) Ọ bụrụkwa na anyị mere mmehie, Jehova ga-emere anyị ebere ma anyị kwupụta mmehie anyị ma kwụsị ime ya.​—Gụọ Ilu 28:13.

10. Gịnị nwere ike ime ma anyị gbalịa izochi mmehie anyị?

10 Ọ bụrụ na anyị agwa ndị okenye banyere mmehie anyị mere, Jehova nwere ike ịgbaghara anyị, meekwa ka anyị na ya dịghachi ná mma. Ma, ọ bụrụ na anyị agwaghị ha, nsogbu ahụ nwere ike ịkakwu njọ. Mgbe Eze Devid gbalịrị izochi mmehie ya, ọ dara ọrịa, obi agbawaakwa ya n’ihi na ọ ma na ihe o mere adịghị Jehova mma. (Ọma 32:3-5) Ọ bụrụ na anyị merụrụ ahụ́ ma ọ bụ na-arịa ọrịa, o nwere ike ịka njọ ma anyị gbachi nkịtị. Otú ahụ ka ọ dịkwa ma anyị mee mmehie dị oké njọ. Ịgbachi nkịtị ruo ogologo oge nwere ike ime ka ihe kakwuo njọ. Jehova ghọtara ihe a. Ọ bụ ya mere o ji na-agwa anyị ka anyị bịa ‘ka anyị na ya kpezie.’ Otú anyị ga-esi eme ya bụ ịgakwuru ndị okenye o nyere anyị ka ha nyere anyị aka ka anyị na ya dịghachi ná mma.​—Aịza. 1:5, 6, 18.

11. Olee nsogbu o nwere ike ịkpatara ndị ọzọ ma anyị gbalịa izochi mmehie dị oké njọ anyịnwa ma ọ bụ ndị ọzọ mere?

11 Anyị zochie mmehie dị oké njọ anyị mere, o nwere ike ịkpatara ndị ọzọ nsogbu. O nwere ike ime ka mmụọ nsọ Chineke ghara ịna-arụ ọrụ nke ọma n’ọgbakọ, meekwa ka udo ghara ịdị na ya. (Efe. 4:30) N’ihi ya, anyị chọpụta na e nwere onye nọ n’ọgbakọ mere mmehie dị oké njọ, anyị kwesịrị ịgwa ya ka ọ gaa kọọrọ ya ndị okenye.a Anyị zochie mmehie dị oké njọ onye ọzọ mere, anyị emehiekwala. (Lev. 5:1) Otú anyị si hụ Jehova n’anya kwesịrị ime ka anyị gakwuru ndị okenye ma gwa ha nke bụ́ eziokwu. Anyị ga-esi otú ahụ mee ka ọgbakọ dị ọcha, nyekwara onye ahụ mere mmehie dị oké njọ aka ka ya na Jehova dịghachi ná mma.

OTÚ NDỊ OKENYE SI ENYERE ANYỊ AKA

12. Olee otú ndị okenye si enyere ndị ha na Jehova na-adịghịzi ná mma aka?

12 Baịbụl gwara ndị okenye ka ha na-enyere ndị chọrọ ka ha na Jehova dịghachi ná mma aka. (1 Tesa. 5:14) Ọ bụrụ na i mere mmehie dị oké njọ, ha nwere ike ịjụ gị ajụjụ ụfọdụ ga-eme ka ha mata otú obi dị gị nakwa ihe ị na-eche. (Ilu 20:5) O nwere ike isiri gị ike ịgwa ndị okenye otú ọ dị gị n’obi n’ihi omenala obodo unu, na ị bụ onye ihere ma ọ bụkwanụ na ihere na-eme gị ikwu gbasara ihe ahụ merenụ. Ma, ị gwa ndị okenye otú ọ dị gị n’obi, ọ ga-enyere ha aka. Echela na ha ga-ewere ya na ị na-ekwu okwu “n’echeghị echiche.” (Job 6:3) Ndị okenye agaghị ama gị ikpe ozugbo. Kama ha ga-ege gị ntị nke ọma ka ha mata ihe niile merenụ tupu ha ejiri Baịbụl nye gị ndụmọdụ. (Ilu 18:13) Ha ghọtara na ịzụ atụrụ na-ewe oge. N’ihi ya, ha anaghị atụ anya na ha ga-anọ otu oge dozie nsogbu niile ị kọọrọ ha.

13. Ndị okenye kpeere anyị ekpere ma jiri Baịbụl nye anyị ndụmọdụ, olee uru ọ na-abara anyị? (Kọwaakwa foto.)

13 Ọ bụrụ na ị gakwuru ndị okenye ka ha nyere gị aka, ha ga-agbalị ka ha ghara ime ka obi na-amakwu gị ikpe. Kama, ha ga-ekpere gị ekpere. O nwere ike iju gị anya ma ị hụ otú ekpere ha si ‘kpaa ezigbo ike.’ Otu ụzọ ha nwere ike isi nyere gị aka bụ ‘ite gị mmanụ n’aha Jehova.’ (Jems 5:14-16) “Mmanụ” ahụ bụ eziokwu dị na Baịbụl. N’ihi otú ndị okenye si eji Baịbụl akụzi ihe nke ọma, ha ga-enwe ike ime ka obi ruo gị ala ma kasie gị obi, nyekwara gị aka ka gị na Jehova dịghachi ná mma. (Aịza. 57:18) Ndụmọdụ ha ga-esi na Baịbụl nye gị nwere ike inyere gị aka ikpebisikwu ike ime ihe dị mma. I nwere ike isi n’ọnụ ha nụ ka Jehova na-asị gị: ‘Lekwa ụzọ. Na-aga na ya.’​—Aịza. 30:21.

Foto ndị na-egosi: 1. Ebe dọkịta ahụ nọ na foto bu ụzọ na-eleru ubu nwoke ahụ anya. A mapawara ihe e letara n’ubu nwoke ahụ n’ahụ́ ụlọ ahụ. 2. Ebe okenye ahụ nọ na foto bu ụzọ na okenye ọzọ ji Baịbụl na-agba nwanna ahụ ume n’ụlọ ya. Nwanna ahụ ji obi ụtọ na-ege ndị okenye ahụ ntị.

Ndị okenye na-eji Baịbụl eme ka obi ruo onye mere mmehie ala ma na-akasi ya obi (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13 na nke 14)


14. Dị ka e kwuru ná Ndị Galeshia 6:1, olee otú ndị okenye si enyere onye ọ bụla ‘zọhiere ụkwụ’ aka? (Kọwaakwa foto.)

14 Gụọ Ndị Galeshia 6:1. Onye Kraịst ‘zọhiere ụkwụ’ anaghịzi eme ihe Jehova chọrọ ka ndị na-efe ya na-eme. ‘Ịzọhie ụkwụ’ ahụ nwere ike ịbụ ime mkpebi na-adịghị mma ma ọ bụ ime mmehie dị oké njọ. N’ihi ya, ịhụnanya na-eme ka ndị okenye ‘gbalịa jiri obi nwayọọ nyere ya aka.’ Okwu Grik a sụgharịrị ‘inyere aka’ nwekwara ike ịpụta ịgbazi ọkpụkpụ gbajiri agbaji ka ọ dịkwa mma otú ọ dịbu. Otú ahụ dọkịta ma nke a na-akọ na-agbalịsi ike ịgba ọkpụkpụ otú ọ na-agaghị afụcha onye ahụ ụfụ, ndị okenye na-agbalịsi ike inyere nwanna mere mmehie aka ka ya na Jehova dịghachi ná mma. Ha anaghị eme ya otú ọ ga-afụ onye ahụ ụfụ. Baịbụl gwakwara ndị okenye ka ha ‘na-eleru onwe ha anya.’ Ka ndị okenye na-enyere ndị ọzọ aka ime ihe dị mma, ha na-aghọtakwa na ha ezughị okè nakwa na ha nwere ike imejọ ihe. N’ihi ya, ha na-akpachara ezigbo anya ka ha ghara iche na ha ka ndị ha na-enyere aka mma. Kama ime otú ahụ, ha na-adị umeala n’obi, nweekwa ọmịiko.​—1 Pita 3:8.

15. Gịnị ka anyị nwere ike ime ma nsogbu bịara anyị?

15 Anyị kwesịrị ịtụkwasị ndị okenye ọgbakọ obi. A zụọla ha ka ha ghara ịkọrọ ndị ọzọ ihe a gwara ha ha na-ekwesịghị ịkọrọ ndị ọzọ, ka ha jiri Baịbụl na-enye ndị mmadụ ndụmọdụ kama iji echiche nke onwe ha, nakwa ka ha na-enyere anyị aka ibu ibu arọ anyị. (Ilu 11:13; Gal. 6:2) Otú otu okenye si akpa àgwà na-adị iche na nke ibe ya. Ụfọdụ n’ime ha abụrụkwala okenye ruo ọtụtụ afọ. N’agbanyeghị ya, anyị ga-agwali okenye ọ bụla ihe bụ́ nsogbu anyị. Ma, anyị ekwesịghị ịna-eme anyị kọọrọ otu okenye nsogbu anyị, anyị agaa kọọrọ ya okenye ọzọ ma gwa ya ka o nye anyị ndụmọdụ, buru n’obi na a ga-enwe onye nke ga-agwa anyị ihe anyị chọrọ ịnụ. Anyị mee otú ahụ, anyị ga-adị ka ndị ahụ Baịbụl kwuru na ha na-achọ “ndị ga na-akụziri ha ihe ha chọrọ ịnụ” kama ịmụta “eziokwu” e ji Okwu Chineke na-akụzi. (2 Tim. 4:3) Anyị nwee nsogbu ma gaa kọọrọ ya okenye, o nwere ike ịjụ anyị ma è nweela okenye anyị gwara gbasara ya nakwa ndụmọdụ o nyere anyị. Ịdị umeala n’obi nwere ike ime ka ọ jụọ okenye ọzọ ihe o chere ka o nwee ike inye anyị ndụmọdụ.​—Ilu 13:10.

IHE ANYỊNWA KWESỊRỊ IME

16. Gịnị ka anyị kwesịrị ime?

16 Ọ bụ eziokwu na ndị okenye na-elekọta anyịnwa bụ́ atụrụ Chineke, ma ọ bụghị ha na-ekpebiri anyị ihe anyị ga-eme. Anyị ga-agbasi mbọ ike n’onwe anyị ịna-ebi ndụ otú Chineke chọrọ. Anyị ga-aza Jehova ajụjụ maka ihe ndị anyị na-ekwu nakwa ihe ndị anyị na-eme. Jehova ga-enyekwara anyị aka ịna-erubere ya isi n’agbanyeghị nsogbu ndị na-abịara anyị. (Rom 14:12) N’ihi ya, ndị okenye anaghị ekpebiri anyị ihe anyị ga-eme. Kama, ha na-eji Baịbụl enyere anyị aka ịghọta ihe Jehova kwuru gbasara okwu ọ bụla, hapụzie anyị ka anyị jiri aka anyị kpebie ihe anyị ga-eme. Ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe ha na-eji Baịbụl agwa anyị, anyị na-azụ onwe anyị ka anyị mata otú anyị ga-esi na-ekpebi ihe ga-abara anyị uru.​—Hib. 5:14.

17. Gịnị ka anyị kwesịrị ikpebisi ike ime?

17 Obi dị anyị ezigbo ụtọ na anyị bụ atụrụ Jehova. O ziteere anyị Jizọs, bụ́ “ezigbo onye ọzụzụ atụrụ,” ka o jiri ndụ ya chụọ àjà ka anyị nwee ike inweta ndụ ebighị ebi. (Jọn 10:11) Jehova sikwa n’aka ndị okenye ọgbakọ na-emezu nkwa o kwere anyị, nke bụ́: “M ga-enye unu ndị ọzụzụ atụrụ na-eme ihe bụ́ uche m, ha ga na-akụziri unu ihe, na-enyekwara unu aka ịghọta ihe.” (Jere. 3:15) N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị achọpụta na okwukwe anyị esighịzi ike ma ọ bụ na anyị kwesịrị ime ka anyị na Jehova dịghachi ná mma, anyị ekwesịghị ikwe ka ụjọ gbochie anyị ịkpọ ndị okenye ka ha nyere anyị aka. Ka anyị kpebisie ike na anyị ga na-erite uru ná ndokwa a Jehova mere, ya bụ, ndị okenye ọgbakọ o nyere anyị.

GỊNỊ KA Ị GA-AZA?

  • Olee mgbe anyị kwesịrị ‘ịkpọ ndị okenye’ ka ha nyere anyị aka?

  • Gịnị mere anyị ji kwesị ịkpọ ndị okenye?

  • Olee otú ndị okenye si enyere anyị aka?

ABỤ NKE 31 Soro Chineke Na-eje Ije

a Ọ bụrụ na onye mere mmehie dị oké njọ ekweghị agwa ndị okenye mgbe anyị nyechara ya oge kwesịrị ekwesị, anyị ga-aga gwa ndị okenye ihe anyị ma n’ihi na anyị chọrọ irubere Jehova isi.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya