ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 37
ABỤ NKE 114 ‘Na-enwenụ Ndidi’
Ihe I Kwesịrị Ime ma E Megbuo Gị Ma Ọ Bụ Ndị Ọzọ
“Ọ nọ na-atụ anya ka ndị mmadụ na-ekpe ikpe ziri ezi, ma, ha nọ na-ekpe ikpe na-ezighị ezi.”—AỊZA. 5:7.
IHE A GA-AMỤ
Anyị ga-amụta ihe Jizọs mere mgbe ọ hụrụ ka a na-emegbu ndị mmadụ nakwa otú anyị ga-esi na-eme ka ya.
1-2. Olee otú obi na-adị ọtụtụ ndị maka mmegbu a na-emegbu ndị mmadụ? Gịnị ka anyị nwere ike ịna-eche?
ANYỊ bi n’ụwa ebe ndị mmadụ na-emegbu ibe ha. E nwere ike ime mmadụ ihe na-adịghị mma n’ihi ọtụtụ ihe, dị ka ma ọ̀ bụ ogbenye ma ọ̀ bụ ọgaranya, ma ọ̀ bụ nwoke ma ọ̀ bụ nwaanyị, agbụrụ ya, ma ọ bụ obodo ya. Ọtụtụ ndị na-atakwa ahụhụ n’ihi na ihe ka ụfọdụ ndị achụmnta ego bara ọgaranya ma ọ bụ ndị ọchịchị mkpa bụ inwekwu ego. Ihe ndị a na-emekwa ka anyịnwa ma ọ bụ ndị anyị ma na-ata ahụhụ.
2 Ọ naghị eju anyị anya na otú e si na-emegbu ndị mmadụ taa na-ewe ọtụtụ ndị iwe. Anyị niile chọrọ ibi n’ụwa ebe obi ga-eru anyị ala, a na-emetakwa anyị mma. Ụfọdụ ndị abanyela n’òtù ụfọdụ ka ha nwee ike idozi nsogbu ndị dị n’ụwa ma ọ bụ n’obodo ha. Ha na-eme ngagharị iwe n’ihi ndị ọchịchị na iwu ndị ha tiri ma ọ bụkwanụ na-atụnyere ndị kwere nkwa idozi nsogbu ụfọdụ vootu. Ma, ebe anyị bụ Ndị Kraịst, anyị mụtara na anyị ekwesịghị ‘ịbụ nke ụwa’ nakwa na anyị kwesịrị ichere ka Alaeze Chineke bịa wepụ ụdị mmegbu niile. (Jọn 17:16) N’agbanyeghị ya, anyị hụ ka a na-emegbu ndị mmadụ, ọ na-ewute anyị, na-ewekwa anyị iwe mgbe ụfọdụ. Anyị nwere ike ịna-eche, sị: ‘Gịnị ka m ga-eme ma ụdị ihe a mee? È nwere ihe m ga-emeli ugbu a gbasara mmegbu juru n’ụwa?’ Iji zaa ajụjụ ndị a, ka anyị leba anya n’otú obi na-adị Jehova na Jizọs maka otú e si emegbu ndị mmadụ.
JEHOVA NA JIZỌS KPỌRỌ MMEGBU ASỊ
3. Gịnị mere iwe na-eji ewe anyị ma e megbuo anyị ma ọ bụ ma anyị hụ ka a na-emegbu ndị ọzọ? (Aịzaya 5:7)
3 Baịbụl kwuru ihe mere na obi anaghị adị anyị mma ma e megbuwe anyị ma ọ bụkwanụ ma anyị hụ ka a na-emegbu ndị ọzọ. Ọ kọwara na Jehova kere anyị n’oyiyi ya nakwa na “ezi omume na ikpe ziri ezi na-amasị ya.” (Ọma 33:5; Jen. 1:26) Jehova anaghị emegbu ndị mmadụ. Ọ naghịkwanụ achọ ka onye ọ bụla megbuo ibe ya. (Diut. 32:3, 4; Maị. 6:8; Zek. 7:9) Dị ka ihe atụ, n’oge Aịzaya onye amụma, Jehova nụrụ “ákwá” ọtụtụ ndị Izrel ndị obodo ha “na-echi ọnụ n’ala” nọ na-ebe. (Gụọ Aịzaya 5:7.) Jehova tara ndị ahụ leghaara iwu ya anya ma na-emegbu ndị ọzọ ahụhụ.—Aịza. 5:5, 13.
4. Olee otú otu akụkọ a kọrọ na Baịbụl si mee ka a mata otú mmegbu na-adị Jizọs? (Kọwaakwa foto.)
4 Jizọs na-eme ka Nna ya. Ọ kpọrọ mmegbu asị, chọọkwa ka a na-emeso ndị mmadụ ihe otú dị mma. Mgbe ọ na-eje ozi ya n’ụwa, e nwere otu oge ọ hụrụ otu nwoke otu aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ. Jizọs nweere nwoke ahụ ọmịiko ma gwọọ ya. Ma mgbe ndị isi okpukpe obi tara mmiri hụrụ ya, ezigbo iwe were ha. Ihe ka ha mkpa bụ ime ihe ha weere ka idebe Iwu Mosis, ọ bụghị ka e nyere nwoke ahụ aka. Olee otú ihe a ha mere dị Jizọs? “O wutere ya nke ukwuu na obi kpọrọ ha nkụ.”—Mak 3:1-6.
Ndị isi okpukpe ndị Juu anaghị emetara ndị ihe na-esiri ike ebere. Ma Jizọs metaara ha ebere (A ga-akọwa ya na paragraf nke 4)
5. Gịnị ka anyị kwesịrị icheta ma iwe wewe anyị maka mmegbu a na-emegbu anyị ma ọ bụ ndị ọzọ?
5 Ebe ọ bụ na mmegbu na-ewe Jehova na Jizọs iwe, ọ dịghị njọ ma ọ bụrụ na ọ na-ewekwa anyịnwa iwe. (Efe. 4:26) N’agbanyeghị ya, anyị kwesịrị ịna-ejide onwe anyị, chetakwa na anyị agaghị akwụsịli mmegbu. Anyị wee iwe ruo ogologo oge, o nwere ike ịkpatara anyị ọrịa ma ọ bụ mee ka obi na-ajọ anyị njọ. (Ọma 37:1, 8; Jems 1:20) N’ihi ya, gịnị ka anyị kwesịrị ime ma e megbuo anyị ma ọ bụ ndị ọzọ? Anyị ga-amụta ihe n’aka Jizọs.
IHE JIZỌS MERE MGBE Ọ HỤRỤ KA A NA-EMEGBU NDỊ ỌZỌ
6. Olee otú e si na-emegbu ndị mmadụ n’oge Jizọs nọ n’ụwa? (Kọwaakwa foto.)
6 Jizọs hụrụ ka a na-emegbu ọtụtụ ndị mgbe ọ nọ n’ụwa. Ọ hụrụ otú ndị isi okpukpe si emegbu ndị ọ na-enweghị otú ọ hà ha. (Mat. 23:2-4) Ọ makwa na ndị ọchịchị Rom na-emekpọ ndị mmadụ ọnụ. Ọtụtụ ndị Juu chọsiri ike ka ha nwere onwe ha n’aka ndị Rom. Ụfọdụ ndị hiwere òtù ndị na-alụso ndị Rom ọgụ. Ma Jizọs ehiweghị òtù na-agbalị ịgbanwe ọchịchị ma ọ bụ kwado nke ndị ọzọ hiwere. Mgbe ọ hụrụ na ndị mmadụ chọrọ ime ya eze, ọ hapụrụ ha pụọ.—Jọn 6:15.
Mgbe ndị mmadụ chọrọ ime ka Jizọs tinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ọ hapụrụ ha pụọ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 6)
7-8. Gịnị mere Jizọs agbalịghị ime ka mmegbu kwụsị mgbe ọ nọ n’ụwa? (Jọn 18:36)
7 Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o tinyeghị aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ka o nwee ike idozi nsogbu ụmụ mmadụ. Gịnị mere na o meghị otú ahụ? Ọ ma na ụmụ mmadụ agaghị achịli onwe ha, e nyeghịkwa ha ikike ime otú ahụ. (Ọma 146:3; Jere. 10:23) Ha agaghị ewepụli isi ihe na-akpata mmegbu. Ọ bụ Setan bụ́ Ekwensu na-achị ụwa a. Obi tara ya mmiri. Ọtụtụ ndị nọ n’ụwa a na-emekwa ka ya. (Jọn 8:44; Efe. 2:2) Ndị bụ́dị ezigbo mmadụ agaghị edozili nsogbu ụmụ mmadụ n’ihi na ha ezughị okè.—Ekli. 7:20.
8 Jizọs ma na ọ bụ naanị Alaeze Chineke ga-ewepụ isi ihe na-akpata mmegbu. Ọ bụ ya mere o ji jiri oge ya na ike ya “na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke.” (Luk 8:1) O mere ka obi sie “ndị agụụ ezi omume na-agụ na ndị akpịrị ya na-akpọ nkụ” ike na mmegbu na ahụhụ niile ga-akwụsị. (Mat. 5:6; Luk 18:7, 8) Ma, ihe ga-eme ka ihe a kwe omume abụghị ọchịchị mmadụ ọ bụla, kama ọ bụ Alaeze Chineke nke dị n’eluigwe. Alaeze ahụ ‘abụghịkwa nke ụwa a.’—Gụọ Jọn 18:36.
NA-EME KA JIZỌS MA Ị HỤ KA A NA-EMEGBU NDỊ MMADỤ
9. Gịnị mere obi ji sie gị ike na ọ bụ naanị Alaeze Chineke ga-ewepụ mmegbu niile?
9 Taa, anyị na-ahụkwu ka a na-emegbu ndị mmadụ karịa otú Jizọs hụrụ mgbe ọ nọ n’ụwa. Mana, ndị na-akpata mmegbu ‘n’oge ikpeazụ’ a ka bụkwa Setan na ụmụ mmadụ na-ezughị okè, ndị na-eme ka ya. (2 Tim. 3:1-5; Mkpu. 12:12) Dịkwa ka Jizọs, anyị ma na ọ bụ naanị Alaeze Chineke ga-ewepụ isi ihe na-akpata mmegbu. Ebe ọ bụ na anyị ji obi anyị niile na-akwado Alaeze ahụ, anyị anaghị etinye aka ná ngagharị iwe ma ọ bụ tụkwasị ndị ọchịchị obi na ha ga-akwụsị mmegbu. Ka anyị kwugodị gbasara otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Stacy.a Tupu ya aghọọ Onyeàmà Jehova, ọ na-eso ndị na-eme ngagharị iwe ka ha kwụsị mmegbu. Ma, ọ malitere inwe obi abụọ ma ihe ahụ ọ na-eme ọ̀ dị mma. Ọ sịrị: “Anyị mewe ngagharị iwe, m na-ajụ onwe m ma ihe a m na-eme ọ̀ ga-akwụsịli mmegbu. Ma ugbu a m na-akwado Alaeze Chineke, obi siri m ike na ọ bụ Alaeze Chineke ga-edozi nsogbu niile. Ama m na Jehova ga-alụchitere onye ọ bụla a na-emegbu emegbu ọgụ karịa otú m nwere ike.”—Ọma 72:1, 4.
10. Dị ka e kwuru na Matiu 5:43-48, gịnị mere na anyị anaghị esonyere ndị na-agbalị ka a gbanwee ọchịchị ma ọ bụ iwu obodo? (Kọwaakwa foto.)
10 Ọtụtụ ndị na-esonyere òtù ndị na-agbalị ịgbanwe ọchịchị. Ma ọtụtụ n’ime ha na-ewe iwe, na-enupụrụ iwu isi, na-emerụkwa ndị ọzọ ahụ́. Ihe a abụghịkwanụ ihe Jizọs gwara anyị ka anyị mee. (Efe. 4:31) Otu nwanna aha ya bụ Jeffrey sịrị: “Ama m na ndị mmadụ mewe ngagharị iwe, iwe ha nwere ike ịka njọ n’egbughị oge, ha amalite imebisị ihe na izuru ihe ndị mmadụ, na-emerụkwa ndị ọzọ ahụ́.” Ma Jizọs kụziiri anyị ka anyị na-ahụ mmadụ niile n’anya, ma ndị anyị na ha na-ekweghị n’otu ihe ma ndị na-akpagbu anyị. (Gụọ Matiu 5:43-48.) Ebe anyị bụ Ndị Kraịst, anyị na-agbalịsi ike ka anyị ghara ime ihe ọ bụla na-adabaghị n’ihe Jizọs mere.
Anyị ga-enwe obi ike ka anyị ghara itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ n’esemokwu ụwa a (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10)
11. Olee ihe nwere ike ime ka o siere anyị ike mgbe ụfọdụ ime ka Jizọs?
11 Ọ bụ eziokwu na anyị ma na ọ bụ Alaeze Chineke ga-ewepụ mmegbu kpamkpam, ma o nwere ike isiri anyị ike ime ka Jizọs ma e megbuo anyị. Legodị ihe mere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Janiya. Ụfọdụ ndị nọ na-emegbu ya n’ihi otú ọ na-acha. Ọ sịrị: “Ezigbo iwe nọ na-ewe m. Obi anaghị adị mụ mma. M chọkwara ka a taa ndị ahụ ahụhụ. Ihe a mere ka m chewe gbasara isonyere ndị na-achọ ka a kwụsị mmegbu na ịkpa ókè. M chere na ime otú a bụ ụzọ kacha mma m ga-esi akwụsị iwe na-ewe m.” Ma ka oge na-aga, ọ ghọtara na o kwesịrị ịgbanwe. Ọ sịrị: “M ghọtara na kama ịtụkwasị Jehova obi, m malitere ikwere ihe ndị mmadụ kwuru ma na-atụkwasị ha obi. M kpebiri na mụ na ụdị ndị ahụ agaghịzi na-akpa.” Ọ bụrụgodị na iwe anyị na-ewe ziri ezi, anyị kwesịrị ịkpachara anya ka iwe ahụ ghara ime ka anyị tinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ soro mewe ngagharị iwe.—Jọn 15:19.
12. Gịnị mere anyị ji kwesị ịkpachara anya n’ihe anyị na-agụ, n’ihe anyị na-ege, nakwa n’ihe anyị na-ele?
12 Gịnị ga-enyere anyị aka ịnọrọ jụụ ma e megbuwe anyị ma ọ bụ ndị ọzọ? Ọ bụ ịkpachara anya n’ihe anyị na-agụ, n’ihe anyị na-ege, nakwa n’ihe anyị na-ele. Ihe na-eju n’ụfọdụ ebe a na-agbasa ozi n’Ịntanet bụ akụkọ ndị e tinyere nnu na ose gbasara mmegbu nakwa ịkatọ ndị ọchịchị. Ọtụtụ mgbe, ndị na-akọ akụkọ ụwa nwere ike ịna-ekwu ihe ha chere, nke na-abụkwanụghị otú o si mee. Ọ bụrụgodị na anyị anụ akụkọ a kọrọ gbasara mmegbu e megburu mmadụ, ya abụrụ eziokwu, iche gbasara ya mgbe niile ọ̀ ga-enyere anyị aka? Ọ bụrụ na anyị ejiri oge buru ibu na-agụ ma ọ bụ na-ege ụdị ihe ahụ, o nwere ike ime ka iwe na-ewe anyị, anyị ana-echegbukwa onwe anyị. (Ilu 24:10) Nke ka njọ bụ na o nwedịrị ike ime ka anyị chefuo na ọ bụ naanị Alaeze Chineke ga-akwụsịli nsogbu ụmụ mmadụ niile.
13. Olee otú ịgụ Baịbụl kwa ụbọchị si enyere anyị aka ma anyị hụ ka a na-emegbu ndị mmadụ?
13 Ịgụ Baịbụl kwa ụbọchị na ịna-echebara ihe anyị gụrụ echiche ga-enyere anyị aka idi mmegbu. Obi nọ na-agbawa otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Alia maka otú e si na-emegbu ndị mmadụ n’ebe o bi. Iwe nọ na-ewe ya na a naghị ata ndị na-emegbu ndị ọzọ ahụhụ. Ọ sịrị: “M ghọtara na ọ bụrụ na m kwetasiri ike na ọ bụ Jehova ga-ewepụ nsogbu ndị a, m kwesịrị ịgbanwe otú m si eche echiche. Ọ bụ n’oge ahụ ka m gụrụ Job 34:22-29. Amaokwu ndị ahụ chetaara m na Jehova na-ahụ ihe niile. Ọ bụ naanị ya na-ekpe ikpe ziri ezi otú kacha mma. Ọ bụkwa naanị ya ga-ewepụ nsogbu niile.” Ma, ka anyị na-eche ka Alaeze Chineke bịa wepụrụ anyị mmegbu, anyị ga na-edi mmegbu ugbu a. Olee otú anyị ga-esi eme ya?
GỊNỊ KA ANYỊ NWERE IKE IME UGBU A?
14. Gịnị ka anyị ga-eme ka anyị ghara iso na-emegbu ndị ọzọ? (Ndị Kọlọsi 3:10, 11)
14 Ọ bụ eziokwu na anyị agaghị agbanweli otú ndị mmadụ ga-esi na-emeso ibe ha, ma anyịnwa ga-emesoli ndị mmadụ ihe otú dị mma. Dị ka e kwuburu, anyị na-eme ka Jizọs ma anyị na-ahụ ndị mmadụ n’anya. Ụdị ịhụnanya ahụ ga-eme ka anyị na-asọpụrụ ndị mmadụ, ma ndị na-emegbu ndị ọzọ. (Mat. 7:12; Rom 12:17) Obi na-adị Jehova ụtọ ma anyị na-emere mmadụ niile ihe ọma, na-emesokwa ha otú dị mma.—Gụọ Ndị Kọlọsi 3:10, 11.
15. Olee uru eziokwu Baịbụl anyị na-akụziri ndị mmadụ na-abara ha?
15 Ihe kacha mma anyị ga-emere ndị mmadụ bụ ịkụziri ha gbasara Jehova. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Ọ bụ n’ihi na “amamihe gbasara Jehova” nwere ike ịgbanwe onye na-ewebu iwe ọkụ ma na-eme tigbuo zogbuo, ya adịrị obiọma ma na-eme udo. (Aịza. 11:6, 7, 9) Tupu otu nwanna aha ya bụ Jemal aghọọ Onyeàmà Jehova, o sonyeere otu òtù na-agba mbọ ka a gbanwee ọchịchị obodo ha n’ihi na ha chere na ọchịchị ahụ adịghị mma. Ọ sịrị: “Ị gaghị amanyeli ndị mmadụ ịgbanwe. Amanyeghị m amanye ịgbanwe. Ihe mere ka m gbanwee bụ eziokwu dị na Baịbụl m nọ na-amụ.” Ihe Jemal mụtara mere ka ọ kwụsị ịgbalị ka a gbanwee ọchịchị. Ọ bụrụ na anyị akụziere ndị mmadụ eziokwu dị na Baịbụl, anyị ga-enyere ha aka ịkwụsị imegbu ndị ọzọ.
16. Gịnị mere i ji achọ ịgwa ndị mmadụ gbasara Alaeze Chineke?
16 Dị ka Jizọs, ọ na-agụsi anyị agụụ ike ịgwa ndị mmadụ na ọ bụ naanị Alaeze Chineke ga-ewepụ mmegbu ruo mgbe ebighị ebi. Olileanya ahụ nwere ike ịgba ndị a na-emegbu emegbu ume. (Jere. 29:11) Nwanna Nwaanyị Stacy anyị kwuburu okwu ya sịrị: “Ịmụta eziokwu Baịbụl nyeere m aka idi mmegbu e megburu m na nke m hụrụ e megburu ndị ọzọ. Jehova na-eji ozi dị na Baịbụl akasi anyị obi.” Ị chọọ ịgwa ndị ọzọ banyere nkwa na-akasi obi Baịbụl kwere banyere mmegbu, i kwesịrị ịkwadebe nke ọma. Ọ bụrụ na obi esie gị ezigbo ike na ihe ndị si na Baịbụl e kwuru n’isiokwu a bụ eziokwu, ọ ga-enyere gị aka ịdị njikere iji akọ gwa ndị ọzọ banyere ha ma e kwute okwu ha n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ n’ebe ị na-arụ ọrụ.b
17. Olee otú Jehova si enyere anyị aka ma e megbuwe anyị?
17 Anyị ma na ebe ọ bụ Setan “na-achị ụwa a,” ndị mmadụ ka ga na-ata ahụhụ. Ma anyị na-atụ anya oge ka mma n’ihi na Jehova kwere nkwa iwepụ Setan na ihe ọjọọ niile nakwa ịna-enyere anyị aka ugbu a. (Jọn 12:31) Jehova si na Baịbụl mee ka anyị mata ihe mere ndị mmadụ ji emegbu ibe ha nakwa otú obi na-adị ya maka ya. (Ọma 34:17-19) O si n’aka Ọkpara ya kụziere anyị ihe anyị ga-eme ma e megbuwe anyị ma ọ bụ ndị ọzọ nakwa otú Alaeze ya ga-esi akwụsị mmegbu kpamkpam n’oge na-adịghị anya. (2 Pita 3:13) Ka anyị jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke, na-atụ anya mgbe ihe ga-eju n’ụwa ga-abụ “ikpe ziri ezi na ezi omume.”—Aịza. 9:7.
ABỤ NKE 158 Ọ Gaghị Egbu Oge
a Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.
b Gụọkwa ihe ndị ọzọ a kọwara nke A, nọmba nke 24-27, n’akwụkwọ Hụ Ndị Mmadụ n’Anya, Mee Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs.