AKỤKỌ NDỤ
Jehova Nyeere Anyị Aka Ịna-eme Ka Osisi Na-eme Nke Ọma Ebe Ọ Bụla A Kụrụ Ya
A SỊ mmadụ, “Na-eme ka osisi na-eme nke ọma ebe ọ bụla a kụrụ ya,” o nwere ike iyi ndụmọdụ na-adabaghị adaba. Mana, otu di na nwunye bụ́ ndị Swidin, aha ha bụ Mats na Ann-Catrin, mere nke ọma mgbe e zigara ha ebe dị iche iche. Olee otú ha si mee ya, oleekwa otú ndụmọdụ ahụ si nyere ha aka?
Nwanna Mats na nwunye ya gara Ụlọ Akwụkwọ Gilied n’afọ 1979. Kemgbe ahụ, ha ejeela ozi n’Ịran, Mianmaa, Mọrishọs, Tanzania, Yuganda, na Zaire. Ọ bụ n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied ka ha nụrụ ka onye nkụzi ha aha ya bụ Jack Redford gwara ha ihe nyeere ha aka ịna-eme nke ọma n’agbanyeghị na e zigara ha ebe dị iche iche. Ka ha kọọrọ anyị.
Nwanna Mats, biko, kọọrọ anyị otú i si bata n’ọgbakọ.
Mats: Papa m biri na Poland n’oge Agha Ụwa nke Abụọ. Ọ hụrụ na ihu abụọ juru na Chọọchị Katọlik. Ma, ọ na-ekwukarị na a ga-enwerịrị ndị na-akụzi eziokwu. Ka oge na-aga, m chọpụtara n’eziokwu na e nwere. M zụrụ ọtụtụ akwụkwọ ndị nwe ha gụrụla. Otu n’ime ha bụ akwụkwọ na-acha anụnụ anụnụ aha ya bụ Ezi-Okwu Ahu Nke Nedubà ná Ndu Ebigh-Ebi. Aha ya masịrị m, mụ agụchaakwa ya n’abalị ahụ m nwetara ya. N’echi ya, m ma na mụ amatala ndị na-akụzi eziokwu.
Malite n’ọnwa Eprel afọ 1972, m gụrụ ọtụtụ akwụkwọ ndị ọzọ Ndịàmà Jehova bipụtara. M matakwara azịza ajụjụ ndị m nwere gbasara Baịbụl. Ọ dị m otú ọ dị onye ahịa ahụ Jizọs ji mee ihe atụ, onye hụrụ otu nkume pel dị oké ọnụ ma ree ihe niile o nwere zụta ya. M chọburu ịga mahadum ka m ghọọ dọkịta. Ma, m hapụrụ ya ka m nwee ike ijere Jehova ozi. (Mat. 13:45, 46) M mere baptizim n’abalị iri n’ọnwa Disemba afọ 1972.
N’ime otu afọ, nne na nna m na nwanne m nwoke m tọrọ batakwara n’ọgbakọ ma mee baptizim. N’ọnwa Julaị afọ 1973, m malitere ịsụ ụzọ oge niile. N’ọgbakọ anyị, e nwere ọtụtụ ndị ọsụ ụzọ na-anụ ọkụ n’obi. Otu n’ime ha bụ otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Ann-Catrin. Ọ mara mma, jirikwa ofufe Jehova kpọrọ ihe. Mụ na ya bidoro ịhụ ibe anyị n’anya ma lụọ n’afọ 1975, jiri afọ anọ na-eso ya gaa ozi n’obodo Strọmsọnd bụ́ ọmarịcha obodo ọtụtụ ndị chọrọ ịmụta gbasara Baịbụl. Ọ dị na Swidin.
Ann-Catrin: Papa m mụtara eziokwu mgbe ọ gụchawara akwụkwọ na mahadum dị na Stọkom. Adị m naanị ọnwa atọ n’oge ahụ. Ma, ọ na-eku m aga ọmụmụ ihe na ozi ọma. Ihe ahụ adịghị mama m mma, ya agbalịa igosi na Ndịàmà Jehova anaghị akụzi eziokwu. Ma, o melighị ya. N’ihi ya, ka oge na-aga, yanwa mere baptizim. Mgbe m dị afọ iri na atọ, m mere baptizim, malitekwa ịsụ ụzọ mgbe m dị afọ iri na isii. Mgbe m jechara ozi n’otu obodo a na-akpọ Umea, bụ́ ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma, m ghọrọ ọsụ ụzọ pụrụ iche.
Mgbe mụ na di m Mats lụchara, anyị nyeere ọtụtụ ndị aka ịmata eziokwu. Otu n’ime ha bụ Maivor, bụ́ nwata nwaanyị kwụsịrị asọmpi egwuregwu ka o jekwuoro Jehova ozi. Ya na nwanne m nwaanyị m tọrọ sụkọkwara ụzọ. Ha gara Ụlọ Akwụkwọ Gilied n’afọ 1984. Ha bụkwa ndị ozi ala ọzọ ugbu a n’Ekwedọ.
N’ebe niile unu jere ozi ala ọzọ, gịnị nyeere unu abụọ aka ịna-eme ka osisi na-eme nke ọma n’ebe a kụrụ ya?
Mats: E zigara anyị ọtụtụ ebe. Ma anyị gbalịsiri ike ịna-eme ka Jizọs, karịchaa, n’ịdị umeala n’obi. (Kọl. 2:6, 7) Dị ka ihe atụ, kama ịna-atụ anya ka ụmụnna nọ ebe ahụ gbanwee mewe ka anyị, anyị na-agbalị ịchọpụta ihe mere ha ji eme ihe ndị ha na-eme. Anyị gbalịrị ịna-aghọta otú ha si eche echiche na omenala ha. Ka anyị na-emekwu ka Jizọs, ka anyị na-adịkwu ka “osisi a kụrụ n’akụkụ iyi” n’ebe ọ bụla e zigara anyị.—Ọma 1:2, 3.
Ihe anyị na-eme mgbe niile bụ ịga na-eleta ọgbakọ dị iche iche
Ann-Catrin: Mmadụ gaa ebe ọhụrụ, ọ na-adị ka osisi a dọgharịrị kwesịrị ịna-enweta anwụ ka o nwee ike ime nke ọma. Jehova na-abụrụ anyị “anyanwụ” mgbe niile. (Ọma 84:11) O ji ọtụtụ ụmụnna hụrụ anyị n’anya gọzie anyị. Dị ka ihe atụ, n’obere ọgbakọ anyị dị na Teran, Ịran, ụmụnna mesapụụrụ anyị aka otú ahụ ụfọdụ ndị anyị gụrụ akụkọ ha na Baịbụl meere ibe ha. Ọ gaara amasị anyị ịnọrọ n’Ịran. Ma, n’ọnwa Julaị afọ 1980, a machiri ọrụ Ndịàmà Jehova n’obodo ahụ, gwakwa anyị ka anyị pụọ n’obodo ahụ tupu ụbọchị abụọ agafee. E zigaziri anyị Zaire (bụ́ nke a na-akpọzi Kongo) dị n’Afrịka.
Ebe ndị mere anyị obi ụtọ mgbe anyị na-eje ozi na Zaire, n’afọ 1982
Mgbe mbụ m nụrụ na e zigara anyị Afrịka, m bere ákwá. Ihe m nụrụ gbasara agwọ na ọrịa ndị juru n’Afrịka mere ka ụjọ bịa m. Mana, ụmụnna abụọ bụ́ ndị enyi anyị jerela ozi n’Afrịka gwara anyị, sị: “Unu agatụbeghị ebe ahụ. Gbalịanụ gaa. Unu ga-ahụ na Afrịka ga-amasị unu.” Ihe ha kwuru mere. Ụmụnna ndị nọ ebe ahụ hụrụ anyị n’anya, na-emesokwa anyị ka ndị enyi ha. Mgbe afọ isii gachara, a machiri ọrụ anyị iwu na Zaire ma gwa anyị ka anyị si ebe ahụ pụọ. M mụmụdịrị ọnụ ọchị mgbe m chọpụtara na m nọ na-ekpe ekpere ka Jehova ghara ikwe ka anyị hapụ Afrịka.
Olee ngọzi ndị unu nwetarala kemgbe ọtụtụ afọ unu na-ejere Jehova ozi?
Ụgbọala anyị ahụ anyị na-ehi n’ime ya na Tanzania, n’afọ 1988
Mats: Ozi anyị emeela ka anyị na ndị ozi ala ọzọ ndị si n’ebe dị iche iche bụrụ enyi. N’ụfọdụ ebe, anyị na-amụrụ ọtụtụ ndị Baịbụl. Mgbe ụfọdụ, a na-enwerudị mmadụ iri abụọ otu onye n’ime anyị na-amụrụ ihe. Ọ na-eme anyị ezigbo obi ụtọ. Agaghị m echefu otú ụmụnna anyị nọ n’Afrịka si hụ anyị n’anya ma mesapụrụ anyị aka. Mgbe anyị na-eleta ọgbakọ ndị dị na Tanzania, anyị na-ehi n’ụgbọala anyị. Ụmụnna na-enyekwa anyị ihe “karịa otú ike ha hà” n’agbanyeghị na ha dara ezigbo ogbenye. (2 Kọr. 8:3) Otu ihe na-atọgbu anyị atọgbu bụ oge anyị na-akpọ oge akụkọ. N’oge ahụ n’abalị ọ bụla, mụ na nwunye m na-anọrọ ọdụ ma kwuo gbasara otú ụbọchị ahụ si gaa, keleekwa Jehova maka ihe ndị o meere anyị.
Ann-Catrin: Otu ihe tọgburu m atọgbu bụ na m matara ọtụtụ ụmụnna anyị si n’ebe dị iche iche n’ụwa. Anyị mụtara asụsụ ọhụrụ dị iche iche, ma Fasi, French, Luganda, ma Swahili, matakwa gbasara omenala dị iche iche. Anyị nyere aka zụọ ụfọdụ ndị batara ọhụrụ n’ọgbakọ, metakwa ezigbo ndị enyi ndị anyị na ha ‘ji otu obi’ na-efe Jehova.—Zef. 3:9.
Anyị hụkwara ọtụtụ ihe mara mma Jehova kere. Mgbe ọ bụla e zigara anyị ebe ọhụrụ, ọ na-adị anyị ka Jehova ò du anyị, na-egosi anyị ebe anyị na-aga. Ọ kụzierela anyị ọtụtụ ihe anyị na-agaaraghị amụtali n’onwe anyị.
Ebe anyị na-ekwusa ozi ọma n’ebe dị iche iche na Tanzania
Olee ụfọdụ nsogbu bịaara unu, oleekwa otú unu si merie ha?
Mats: E nwere ụfọdụ ọrịa anyị rịara, ma ịba. E nwekwara oge ụfọdụ a wara nwunye m ahụ́ mgbe anyị na-atụghị anya ya. Anyị nọkwa na-echegbu onwe anyị maka nne na nna anyị merela agadi. N’ihi ya, obi dị anyị ụtọ na ụmụnne anyị nyeere anyị aka na-elekọta ha. Ha lekọtara nne na nna anyị nke ọma, na-enwere ha ndidi, hụ ha n’anya, ma jiri ọṅụ na-eme ya. (1 Tim. 5:4) N’agbanyeghị na anyị mere ike anyị niile ebe ọ bụ na anyị bi n’ebe dị anya, mgbe ụfọdụ, obi na-ama anyị ikpe, ya adị anyị ka ya bụrụ na e nwere ihe anyị ga-emekwuru ha.
Ann-Catrin: N’afọ 1983, mgbe anyị na-eje ozi na Zaire, ọrịa ọgbụgbọ na ọnyụnyụ bịara m. Dọkịta gwara di m ka ọ kpọpụ m na Zaire n’ụbọchị ahụ. N’echi ya, naanị ụgbọelu anyị nwetara bụ nke e ji ebu ibu. Anyị banyere ya gawa Swidin.
Mats: Anyị chere na ozi oge niile anyị na-aga ga-akwụsị n’oge ahụ. N’ihi ya, anyị bere ezigbo ákwá. Dọkịta kwuru na nwunye m agaghị agbake n’ọrịa ahụ. Ma, ọ gbakere. Mgbe otu afọ gachara, anyị laghachikwara Zaire, jewezie ozi n’obere ọgbakọ ji Swahili amụ ihe na Lubumbashi.
Ann-Catrin: N’oge anyị nọ na Lubumbashi, ime pụrụ m. Ọ bụ eziokwu na anyị ebughị n’obi ịmụwa ụmụ, ma, ime ahụ pụrụ m gbawara m obi. N’oge ahụ obi gbawara m, Jehova nyere anyị onyinye anyị na-atụghị anya ya. Anyị malitere ịmụrụ ọtụtụ ndị Baịbụl karịa otú anyị metụrụla. N’ihe na-erughị otu afọ, ọgbakọ nweburu ndị nkwusa iri atọ na ise ruziri ndị nkwusa iri asaa. Ndị na-abịa ọmụmụ ihe na-adịbu mmadụ iri anọ. Mana ha na-eruzi narị mmadụ abụọ na iri abụọ (220). Anyị nọ na-ekwusasi ozi ọma ike. Jehova gọzikwara mgbalị anyị mee ka anyị chefutụ ihe mere anyị. N’agbanyeghị ya, anyị na-echetakarị nwa ahụ anyị gaara amụ, na-ekwukwa gbasara ya. Obi na-adị anyị ụtọ ma anyị cheta na Jehova ga-eme ka ihe niile na-agbawa anyị obi kwụsị na Paradaịs.
Mats: E nwere oge o ruru, ezigbo ike ana-agwụ nwunye m. A chọpụtakwara na m nwere ọrịa kansa n’eriri afọ m nakwa na e kwesịrị ịwa m ahụ́. Ma, agbakeela m ugbu a, nwunye m na-emekwa ike ya niile n’ozi Jehova.
Anyị achọpụtala na ọ bụghị naanị anyị ka nsogbu na-abịara. Mgbe e gbukpọchara ndị mmadụ na Rụwanda n’afọ 1994, anyị gara leta ọtụtụ ụmụnna nọ n’ogige ndị gbara ọsọ ndụ. Mgbe anyị hụrụ otú ha si nwee okwukwe, na-atachi obi, ma na-emesapụ aka, ọ kụziiri anyị na Jehova na-eji ike ya enyere ndị ya aka n’agbanyeghị ụdị nsogbu bịaara ha.—Ọma 55:22.
Ann-Catrin: Nsogbu ọzọ bịaara anyị bụ mgbe anyị gara Yuganda mgbe a na-enyefe Jehova alaka ụlọ ọrụ dị ebe ahụ n’afọ 2007. Mgbe e mechara, anyị na ndị ozi ala ọzọ na ndị na-eje ozi na Betel dị ihe dị ka mmadụ iri abụọ na ise so si Yuganda na-ala Naịrobi dị na Kenya. Tupu anyị eruo n’ókè ndị Kenya, nnukwu ụgbọala na-abịa n’ihu hapụrụ ebe o kwesịrị ịgba, gbabata na nke anyị kụọ anyị. Onye kwọ ụgbọala anyị na ụmụnna anyị ise nwụrụ ozugbo. Otu nwanna nwaanyị mechakwara nwụọ n’ụlọ ọgwụ. Anyị na-atụsi anya ike ịhụ ụmụnna anyị ndị a nwụrụ anwụ ọzọ.—Job 14:13-15.
M mechara gbakee n’ahụ́ ndị m merụrụ. Mana ihe ahụ merenụ mere ka obi na-amapụkarị mụ na di m nakwa ụmụnna ụfọdụ nọkwa n’ụgbọala ahụ. Obi mmapụ nke m na-eme m n’abalị. Mgbe ụfọdụ, ihe na-eme ka m teta n’ime abalị bụ na ọ na-adị m ka obi ọ̀ chọrọ ịkụchi m. Ihe ahụ na-atụ m ezigbo ụjọ. Ma ikpesi ekpere ike na ịgụ amaokwu Baịbụl ụfọdụ na-amasị anyị na-eme ka obi ruo anyị ala. Anyị gakwara hụ ụfọdụ dọkịta ndị ma gbasara ọrịa ahụ. Ha nyekwaara anyị aka. Ugbu a, anyị ka na-arịọkwa Jehova ka o nyere anyị aka ịkasi ụmụnna ndị ọzọ ụdị ihe ahụ na-eme obi.
Mgbe unu na-akọwara anyị ihe nyeere unu aka n’oge ahụ unu nọ ná nsogbu, unu kwuru na Jehova buuru unu ka “àkwá ndụ.” Gịnị ka ọ pụtara?
Mats: Okwu ahụ si n’okwu Swahili pụtara “E buuru anyị otú e si ebu àkwá ndụ.” Otú ahụ mmadụ si akpachara anya ma o buru àkwá ndụ ka ọ ghara ịkụwa ka Jehova si kwado anyị n’ozi ọ bụla anyị gara. Anyị nọ na-enweta ihe niile dị anyị mkpa, mgbe ụfọdụ, karịadị ihe ndị dị anyị mkpa. Otu ụzọ Jehova si egosi na ọ hụrụ anyị n’anya ma na-akwado anyị bụ otú Òtù Na-achị Isi si emetara anyị ebere.
Ann-Catrin: M ga-achọ ịkọ gbasara otu ihe gosiri na Jehova na-akwado anyị. Otu ụbọchị, a kpọrọ anyị n’ekwentị gwa anyị na ezigbo ahụ́ adịghị papa m nọ na Swidin. Ọ nọkwa n’ụlọ ọgwụ. Ọ dịbekwanụghị anya di m rịara ịba gbakee. Anyị enweghịkwa ego anyị ga-eji gbaa ụgbọelu laa ụlọ. N’ihi ya, anyị kpebiri ire ụgbọala anyị. Ma, a kpọrọ anyị n’ekwentị ugboro abụọ ọzọ. Otu bụ di na nwunye nụrụ otú ihe si dịrị anyị, chọọkwa ịkwụrụ otu onye ụgwọ ụgbọelu. Onye nke ọzọ bụ otu nwanna nwaanyị mere agadi nọ na-edowe ego ụfọdụ n’igbe. Ihe o dere n’igbe ahụ bụ “Maka Onye Ihe Na-esiri Ike.” N’ime nkeji ole na ole, Jehova gbataara anyị ọsọ enyemaka.—Hib. 13:6.
Unu cheta afọ iri ise unu garala ozi oge niile, olee ihe unu mụtarala?
Ebe ọhụrụ anyị na-eje ozi na Mianmaa
Ann-Catrin: Amụtala m na anyị ‘ga-adị ike naanị ma anyị nọrọ jii ma tụkwasị Jehova obi.’ Ọ bụrụ na anyị atụkwasị Jehova obi, ọ na-alụrụ anyị ọgụ. (Aịza. 30:15; 2 Ihe 20:15, 17) Ebe ọ bụ na anyị ji ike anyị niile jeere Jehova ozi n’ọrụ ọ bụla e nyere anyị, anyị enwetala ọtụtụ ngọzi anyị na-agaraghị enweta ebe ọzọ.
Mats: Ihe bụ́ isi m mụtara bụ ịna-atụkwasị Jehova obi n’agbanyeghị otú ihe si dịrị m ma hụzie otú o si enyere m aka. (Ọma 37:5) Ọ na-enyere m aka mgbe niile otú o kwere ná nkwa. Anyị ka na-ahụkwa otú Jehova si enyere anyị aka n’ozi Betel anyị na-eje na Mianmaa ebe a.
Ekpere anyị bụ ka Jehova si otú a o si gọzie anyị gọzie ọtụtụ ụmụnna na-eto eto chọrọ ijekwuru ya ozi. Obi siri anyị ike na ọ bụrụ na ha ekwe ka Jehova nyere ha aka, ha ga na-eme nke ọma ka osisi na-eme nke ọma n’ebe ọ bụla a kụrụ ya.