Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w25 Septemba p. 14-19
  • Na-akwanyere Ndị Ọzọ Ùgwù

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Na-akwanyere Ndị Ọzọ Ùgwù
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • GỊNỊ KA ỊKWANYERE NDỊ ỌZỌ ÙGWÙ PỤTARA?
  • NA-AKWANYERE NDỊ EZINỤLỌ UNU ÙGWÙ
  • NA-AKWANYERE ỤMỤNNA GỊ ÙGWÙ
  • NA-AKWANYERE NDỊ NA-ANỌGHỊ N’ỌGBAKỌ ÙGWÙ
  • Gịnị Mere Nkwanye Ùgwù Ji Ala n’Ike n’Ike?
    Teta!—2024
  • Ị̀ Na-ebute Ụzọ n’Inye Ndị Ọzọ Nsọpụrụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Otú Ị Ga-esi Na-akwanyere Di Gị ma Ọ Bụ Nwunye Gị Ùgwù
    Teta!—2016
  • Gịnị Mere Anyị Ji Kwesị Ịsọpụrụ Ndị Isi?
    “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke”
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
w25 Septemba p. 14-19

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 38

ABỤ NKE 120 Dịrị Umeala n’Obi Ka Jizọs

Na-akwanyere Ndị Ọzọ Ùgwù

“Ọ ka mma ịbụ onye a na-akwanyere ùgwù kama inwe ọlaọcha na ọlaedo.”​—ILU 22:1.

IHE A GA-AMỤ

Anyị ga-amụ ihe mere anyị ji kwesị ịna-akwanyere ndị ọzọ ùgwù nakwa otú anyị ga-esi eme ya ọ bụrụgodị na o siiri anyị ike.

1. Gịnị mere ndị mmadụ ji achọ ka a na-akwanyere ha ùgwù? (Ilu 22:1)

OBI ọ̀ na-adị gị ụtọ ma ndị ọzọ kwanyere gị ùgwù? O doro anya na obi na-adị gị ụtọ. Onye ọ bụla na-achọ ka a na-akwanyere ya ùgwù. Obi na-adị anyị ụtọ ma a kwanyere anyị ùgwù. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji kwuo, sị: “Ọ ka mma ịbụ onye a na-akwanyere ùgwù kama inwe ọlaọcha na ọlaedo.”​—Gụọ Ilu 22:1.

2-3. Gịnị mere na ọ naghị adị mfe mgbe niile ịkwanyere ndị ọzọ ùgwù? Oleekwa ndị anyị kwesịrị ịna-akwanyere ùgwù?

2 Ọ bụghị mgbe niile ka ọ na-adịcha mfe ịkwanyere ndị ọzọ ùgwù. Otu ihe mere o ji dị otú ahụ bụ na anyị na-ahụkarị ebe ndị ọzọ na-anaghị emetacha. Ihe ọzọ bụ na anyị bi n’oge ọtụtụ ndị na-anaghị akwanyere ndị ọzọ ùgwù. Ma, anyị ekwesịghị ịna-eme ka ha. Maka gịnị? Ọ bụ n’ihi na Jehova chọrọ ka anyị na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù ma ọ bụ ‘na-asọpụrụ ụdị mmadụ niile.’​—1 Pita 2:17.

3 N’isiokwu a, anyị ga-amụta ihe ịkwanyere ndị ọzọ ùgwù pụtara nakwa otú anyị ga-esi na-asọpụrụ (1) ndị ezinụlọ anyị, (2) ụmụnna anyị, nakwa (3) ndị na-anọghị n’ọgbakọ. Anyị ga-akacha eleba anya n’otú anyị ga-esi na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù mgbe o siiri anyị ike ime otú ahụ.

GỊNỊ KA ỊKWANYERE NDỊ ỌZỌ ÙGWÙ PỤTARA?

4. Gịnị ka ịkwanyere mmadụ ùgwù pụtara?

4 Olee otú ị ga-esi akọwa ịkwanyere mmadụ ùgwù? Ịkwanyere mmadụ ùgwù ma ọ bụ ịsọpụrụ mmadụ na-akọwa otú anyị si ele onye ahụ anya na otú anyị si emeso ya. Anyị hụ na mmadụ nwere àgwà ọma, ma ọ bụ na o mere ihe ndị dị mma, ma ọ bụkwanụ na e nyere ya ikike ịna-elekọta anyị, anyị ga na-emeso ya otú ga-egosi na anyị na-asọpụrụ ya ma ọ bụ na-akwanyere ya ùgwù. Ọ bụrụkwa na anyị chọrọ ịsọpụrụ mmadụ n’eziokwu, o kwesịrị isi anyị n’obi.​—Mat. 15:8.

5. Gịnị ga-enyere anyị aka ịna-akwanyere ndị mmadụ ùgwù?

5 Jehova chọrọ ka anyị na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù. Dị ka ihe atụ, ọ gwara anyị ka anyị na-akwanyere “ndị ọchịchị” ùgwù. (Rom 13:1, 7) Ma, ụfọdụ ndị nwere ike ịsị, “Obi na-adị m ụtọ ịkwanyere ndị mmadụ ùgwù ma ọ bụrụ na ha na-akpa ezigbo àgwà.” Mana, ọ̀ bụ otú anyị kwesịrị isi na-eche echiche? Ebe anyị bụ ndị na-efe Jehova, anyị ma na ihe mere anyị kwesịrị iji na-akwanyere ndị mmadụ ùgwù abụghị naanị otú ha si akpa àgwà, kama, isi ihe kpatara ya bụ na Jehova chọrọ ka anyị na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù, anyị chọkwara ime ya obi ụtọ.​—Josh. 4:14; 1 Pita 3:15.

6. Ọ bụrụ na mmadụ anaghị akwanyere gị ùgwù, ị̀ ga-akwanyeliri ya ùgwù? Kọwaa. (Kọwaakwa foto.)

6 Ụfọdụ nwere ike ịsị: ‘Ọ bụrụ na mmadụ anaghị akwanyere anyị ùgwù, ànyị ga-akwanyeliri ya ùgwù?’ Ee. Ka anyị legodị otu ihe atụ. Eze Sọl kparịrị nwa ya bụ́ Jonatan n’ihu ndị ọzọ. (1 Sam. 20:30-34) Ma, Jonatan kwanyeere nna ya ùgwù ma kwadoo ya n’agha ha lụrụ n’oge niile Sọl dị ndụ. (Ọpụ. 20:12; 2 Sam. 1:23) Nnukwu onye nchụàjà bụ́ Ịlaị boro Hana ebubo na ọ ṅụrụ oké mmanya. (1 Sam. 1:12-14) N’agbanyeghị ya, mgbe Hana na-agwa Ịlaị okwu, ọ kwanyeere ya ùgwù, ọ bụ eziokwu na mmadụ niile ma Ịlaị ama ka onye na-abụghị ezigbo nna na ezigbo nnukwu onye nchụàjà n’Izrel. (1 Sam. 1:15-18; 2:22-24) Ndị Atens kparịrị Pọl onyeozi, kpọọ ya “onye ekwurekwu.” (Ọrụ 17:18) N’agbanyeghị ya, ọ kwanyeere ha ùgwù mgbe ọ na-agwa ha okwu. (Ọrụ 17:22) Akụkọ ndị a na-egosi na ihe ga-eme ka anyị kwanyere ndị ọzọ ùgwù abụghị naanị na ọ dịịrị anyị mfe ime otú ahụ. Kama ọ bụ n’ihi na anyị na-atụ egwu Jehova, anyị achọghịkwa ime ihe ga-akpasu ya iwe. Ka anyị kwuzie ndị anyị kwesịrị ịkwanyere ùgwù na ihe mere anyị kwesịrị iji na-akwanyere ha ùgwù.

Ebe Jonatan, Sọl, na ndị agha Izrel ji mma agha ha, ube ha, na ọta ha na-alụ agha n’ihu agha.

Jonatan nọ na-akwanyere nna ya bụ́ eze ùgwù, na-akwadokwa ya n’agbanyeghị na nna ya kparịrị ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 6)


NA-AKWANYERE NDỊ EZINỤLỌ UNU ÙGWÙ

7. Gịnị nwere ike ime ka o siere anyị ike ịkwanyere ndị ezinụlọ anyị ùgwù?

7 Ihe mere o ji esi ike. Anyị na ndị ezinụlọ anyị na-anọkarị. N’ihi ya, anyị na-amata ebe ha na-emeta na ebe ha na-anaghị emeta. O nwere ike ịbụ na ụfọdụ n’ime ha na-arịa ọrịa mere ka ọ na-esiri anyị ike ilekọta ha, ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ha na-echegbukarị onwe ha. O nwekwara ndị nke nwere ike ịna-ekwu ma ọ bụ na-eme ihe na-ewute anyị. Ụfọdụ ndị anaghị akwanyere ndị ezinụlọ ha ùgwù, ya emee ka esemokwu dịrị n’ezinụlọ ha kama ime ka ọ bụrụ ebe ha ga-anọ obi eruo ha ala. Ihe a emeela ka ezinụlọ ha ghara ịdị n’otu. Otú ahụ ọrịa ogbu na nkwonkwo na-eme ka akụkụ ahụ́ dị iche iche ghara ịna-arụkọ ọrụ ọnụ ka akwanyereghị ndị ọzọ ùgwù na-eme ka ndị nọ n’ezinụlọ ghara ịna-emekọ ihe ọnụ. Mana, otú ahụ e nwere ike ịgwọ ọrịa ụfọdụ agwọ ka ndị nọ n’ezinụlọ ga-amụtali ịkwanyere ibe ha ùgwù.

8. Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-akwanyere ndị ezinụlọ anyị ùgwù? (1 Tim. 5:4, 8)

8 Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù? (Gụọ 1 Timoti 5:4, 8.) N’akwụkwọ ozi mbụ Pọl degaara Timoti, o kwuru otú ndị nọ n’ezinụlọ ga-esi na-egboro ibe ha mkpa ha. Ọ kọwara na ihe kwesịrị ime ka ndị nọ n’ezinụlọ na-asọpụrụ ibe ha abụghị naanị n’ihi na ọ bụ ihe ha kwesịrị ime, kama na o so n’otú ha si ‘efe Chineke.’ Ọ pụtara na anyị na-eme ya maka na anyị hụrụ Jehova n’anya. Ọ bụ ya malitere ezinụlọ. (Efe. 3:14, 15) N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị ana-asọpụrụ ndị ezinụlọ anyị, ọ pụtara na anyị na-asọpụrụ Jehova, Onye malitere ezinụlọ. (1 Tim. 5:4) Ihe a bụ ihe dị ezigbo mkpa mere anyị kwesịrị iji na-akwanyere ndị ezinụlọ anyị ùgwù.

9. Olee otú di na nwunye ga-esi na-akwanyere ibe ha ùgwù? (Kọwaakwa foto.)

9 Otú anyị ga-esi na-akwanyere ndị ezinụlọ anyị ùgwù. Otú di si egosi na ọ na-asọpụrụ nwunye ya bụ iji ya kpọrọ ezigbo ihe ma mgbe ha nọ naanị ha ma mgbe ha na ndị ọzọ nọ. (Ilu 31:28; 1 Pita 3:7) Ọ naghị akụ ya ihe. Ọ naghị akparị ya ma ọ bụkwanụ na-eme ka o chee na ọ baghị uru. Otu nwoke bi n’Ajentina aha ya bụ Ariela sịrị: “Ọrịa nwunye m na-arịa mere ka ọ na-ekwu ihe na-ewute m mgbe ụfọdụ. Ihe a mee, m na-echetara onwe m na ọ maghị ụma eme ihe ahụ ọ na-eme. Ihe sie ezigbo ike, m na-echetara onwe m ihe e dere ná 1 Ndị Kọrịnt 13:5, ebe gosiri na m kwesịrị ịna-akwanyere ya ùgwù kama ịna-akparị ya.” (Ilu 19:11) Nwaanyị na-asọpụrụ di ya ma ọ na-agwa ndị ọzọ okwu ọma gbasara ya. (Efe. 5:33) Ọ naghị akatọ di ya, jiri ya na-eme ihe ọchị, ma ọ bụkwanụ na-akọ ya ọnụ. Ọ ghọtara na o mee otú ahụ, ọ ga-eme ka ha gharazie ịdị ná mma. (Ilu 14:1) O nwere otu nwanna nwaanyị bi n’Ịtali di ya na-echegbukarị onwe ya. Ọ sịrị: “Mgbe ụfọdụ, m na-eche na otú di m si echegbu onwe ya akarịala. N’oge mbụ, otú m si agwa ya okwu na otú ihu m na-adị na-egosi na anaghị m akwanyere ya ùgwù. Ma, amụtala m ịkwanyekwuru di m ùgwù n’ihi na mụ na ndị na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù na-akpakọrịta.”

Foto ndị na-egosi: Ebe di na nwunye na-akwanyere ibe ha ùgwù. 1. Ebe di weturu obi na-agwa nwunye ya okwu mgbe ha na-esi nri n’usekwu. 2. Ebe nwunye ya na-eto di ya n’ihu ndị ọbịa mgbe di ya na-ebunye otu nwanna katarala ahụ́ nri.

Ọ bụrụ na anyị ana-asọpụrụ ndị ezinụlọ anyị, anyị na-asọpụrụ Onyeisi ezinụlọ anyị bụ́ Jehova (A ga-akọwa ya na paragraf nke 9)


10. Olee otú ndị na-eto eto ga-esi gosi na ha na-akwanyere ndị mụrụ ha ùgwù?

10 Ndị na-eto eto, na-erubenụ isi n’iwu nne na nna unu na-enye unu n’ụlọ. (Efe. 6:1-3) Unu gwawa ha okwu, na-akwanyerenụ ha ùgwù. (Ọpụ. 21:17) Ka nne na nna gị na-emekwu okenye, na-enyere ha aka, si otú ahụ na-egosi na ị na-akwanyere ha ùgwù. Gbalịa ike gị ilekọta ha. Chegodị gbasara María. Papa ya abụghị Onyeàmà Jehova. Mgbe ọ dara ọrịa, o siiri María ike ilekọta ya n’ihi otú o si akpa àgwà. María sịrị: “M kpere ekpere ka Jehova nyere m aka ka m na-akwanyere papa m ùgwù. M kwuru n’ime obi m na ebe ọ bụ na Jehova nyere m iwu ka m na-akwanyere ndị mụrụ m ùgwù, ọ pụtara na ọ ga-enyeli m ike ime ya. Ka oge na-aga, m bịara mata na agaghị m echewe ka papa m gbanwee tupu mụ akwanyewere ya ùgwù.” Ọ bụrụ na anyị ana-asọpụrụ ndị ezinụlọ anyị n’agbanyeghị ihe ha na-anaghị emeta, anyị na-egosi na anyị na-akwanyere Jehova ùgwù.

NA-AKWANYERE ỤMỤNNA GỊ ÙGWÙ

11. Gịnị nwere ike ime ka o siere anyị ike ịna-akwanyere ụmụnna anyị ùgwù?

11 Ihe mere o ji esi ike. Ụmụnna anyị na-agbalịsi ike ịna-eme ihe Baịbụl kwuru. Ma, mgbe ụfọdụ, ha nwere ike ime anyị ihe na-adịghị mma, chee ihe na-abụghị eziokwu gbasara anyị, ma ọ bụkwanụ kpasuo anyị iwe. Ọ bụrụ na nwanna ‘emejọọ’ anyị, o nwere ike isiri anyị ike ịna-akwanyere ya ùgwù. (Kọl. 3:13) Gịnị nwere ike inyere anyị aka?

12. Olee ihe mere anyị ji kwesị ịna-akwanyere ụmụnna anyị ùgwù? (2 Pita 2:9-12)

12 Gịnị mere anyị ga-eji na-akwanyere ha ùgwù? (Gụọ 2 Pita 2:9-12.) N’akwụkwọ ozi nke abụọ Pita dere, o kwuru na ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ n’oge ahụ na-akparị “ndị dị ebube,” ya bụ, ndị okenye ọgbakọ. Olee ihe ndị mmụọ ozi hụrụ ihe na-emenụ mere? ‘Ùgwù ha na-akwanyere Jehova’ mere ka ha ghara ịgwa ndị ahụ okwu ọjọọ. Chegodị ya. Ndị mmụọ ozi bụ́ ndị zuru okè ekweghị agwa ndị ahụ dị mpako okwu ọjọọ. Kama ha hapụụrụ ya Jehova ka o kpee ha ikpe ma baara ha mba. (Rom 14:10-12; i nwere ike ịtụle Jud 9.) Anyị nwere ike ịmụta ihe n’aka ndị mmụọ ozi. Ọ bụrụ na anyị ekwesịghị ịkparị ndị na-emegide anyị, o doro anya na anyị ekwesịghị ịna-akparị ụmụnna anyị. Kama ịkparị ha, anyị kwesịrị ‘ibu ụzọ’ na-asọpụrụ ha. (Rom 12:10) Anyị mee otú ahụ, ọ ga-egosi na anyị na-akwanyere Jehova ùgwù.

13-14. Olee otú anyị ga-esi na-akwanyere ndị nọ n’ọgbakọ ùgwù? Mee ihe atụ. (Kọwaakwa foto.)

13 Otú anyị ga-esi na-akwanyere ha ùgwù. Ndị okenye, gbalịanụ na-enye mmadụ ndụmọdụ otú gosiri na unu hụrụ ya n’anya. (Faị. 8, 9) Ọ bụrụ na i kwesịrị inye mmadụ ndụmọdụ, meda obi nye ya onye ahụ, ọ bụghị mgbe iwe ji gị. Ụmụnna nwaanyị, unu nwere ike ịna-enyere ndị nọ n’ọgbakọ aka ka ha na-akwanyere ibe ha ùgwù. Otú unu ga-esi eme ya bụ izere ịgba asịrị ma ọ bụ ikwutọ mmadụ. (Taị. 2:3-5) Anyị niile na-akwanyere ndị okenye ùgwù ma anyị na-erubere ha isi, na-ekelekwa ha maka ọrụ ha na-arụsi ike iduzi ọmụmụ ihe, ịhazi ikwusa ozi ọma, nakwa inyere ndị ‘zọhiere ụkwụ’ aka.​—Gal. 6:1; 1 Tim. 5:17.

14 O siiri otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Rocío ike ịkwanyere otu okenye nyere ya ndụmọdụ ùgwù. Ọ sịrị: “Iwe bịara m n’ihi na m chere na otú o si nye m ndụmọdụ ahụ adịghị mma. N’ụlọ, m nọ na-ekwu okwu ọjọọ gbasara ya. Anabataghị m ndụmọdụ ahụ, obi esighịkwa m ike na o bu ihe ọma n’obi nye m ndụmọdụ ahụ. N’agbanyeghị ya, m mere ka m̀ nabatara ya n’ihu ya.” Gịnị nyeere Nwanna Nwaanyị Rocío aka? Ọ sịrị: “Mgbe m na-agụ Baịbụl, m gụrụ 1 Ndị Tesalonaịka 5:12, 13. Mgbe m chọpụtara na anaghị m akwanyere nwanna ahụ ùgwù, akọnuche m bidoro inye m nsogbu. M kpere ekpere ka Jehova nyere m aka, meekwa nchọnchọ n’akwụkwọ anyị ka m chọta ihe ga-enyere m aka. M mechara chọpụta na ihe bụ́ nsogbu abụghị nwanna ahụ, kama ọ bụ na m dị mpako. M bịaziri chọpụta na m kwesịrị ịdị umeala n’obi ka m nwee ike ịna-akwanyere ndị ọzọ ùgwù. M kwesịrị ịgbakwu mbọ ka m na-emekwu nke ọma. Ma obi dị Jehova ụtọ maka mbọ m na-agba.”

Foto ndị na-egosi: Ebe otu nwanna nwaanyị katarala ahụ́ na-agụ Baịbụl ma na-eche ụzọ dị iche iche ndị okenye si arụsi ọrụ ike. 1. Ebe otu okenye na-ekwu okwu n’ọmụmụ ihe. 2. Ebe ọ na-enyere otu nwanna nọ n’ígwè ndị ngwọrọ aka. 3. Ebe o ji shọvel na-ekupụ snoo gburugburu Ụlọ Nzukọ Alaeze.

Anyị niile nwere ike igosi na anyị na-asọpụrụ ndị okenye ma ọ bụrụ na anyị ana-erubere ha isi, na-egosikwa na obi dị anyị ụtọ maka ọrụ ha na-arụsi ike (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13 na nke 14)


NA-AKWANYERE NDỊ NA-ANỌGHỊ N’ỌGBAKỌ ÙGWÙ

15. Gịnị mere o nwere ike iji esiri anyị ike ịna-akwanyere ndị na-anọghị n’ọgbakọ ùgwù?

15 Ihe mere o ji esi ike. N’ozi ọma, anyị na-ahụkarị ndị na-ejighị eziokwu Baịbụl kpọrọ ihe. (Efe. 4:18) Ụfọdụ n’ime ha anaghị ekwe ege anyị ntị n’ihi ihe a kụziiri ha kemgbe ha bụ nwata. Ụfọdụ n’ime ndị anyị na ha na-arụkọ ọrụ ma ọ bụ ndị klas anyị anaghị akwanyere ndị ọzọ ùgwù. O nwekwara ike ịbụ na onye anyị na-arụrụ ọrụ ma ọ bụ onye nkụzi anyị ejighị ihe anyị na-eme kpọrọ ihe. Ka oge na-aga, anyị nwere ike iji nwayọọ nwayọọ kwụsị ịna-akwanyere ndị ahụ ùgwù ma ọ bụ ịna-emeso ha otú dị mma.

16. Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-akwanyere ndị na-anọghị n’ọgbakọ ùgwù? (1 Pita 2:12; 3:15)

16 Gịnị mere anyị ga-eji na-akwanyere ha ùgwù? Cheta na Jehova na-ahụ otú anyị si emeso ndị na-anọghị n’ọgbakọ. Pita onyeozi chetaara Ndị Kraịst na àgwà ọma ha nwere ike ime ka ndị ọzọ “too Chineke.” N’ihi ya, ọ gwara ha ka ha ‘meda obi’ ma ha na-akọwara ndị ọzọ ihe ha kweere, ‘na-akwanyekwara ha ezigbo ùgwù.’ (Gụọ 1 Pita 2:12; 3:15.) Ma ànyị na-ekwu gbasara ihe anyị kweere mgbe anyị nọ n’ụlọikpe ma ọ bụ mgbe anyị na ndị agbata obi anyị na-akparịta ụka, anyị kwesịrị ịna-agwa ha okwu ka à ga-asị na anyị nọ n’ihu Chineke. A sị ka e kwuwe, Jehova na-ahụ anyị, na-anụkwa ihe anyị na-ekwu na otú anyị si ekwu ya. Ihe a bụ ezigbo ihe mere anyị kwesịrị iji na-akwanyere ndị na-anọghị n’ọgbakọ ùgwù.

17. Olee otú ị ga-esi na-akwanyere ndị na-anọghị n’ọgbakọ ùgwù?

17 Otú anyị ga-esi na-akwanyere ha ùgwù. Anyị nọrọ n’ozi ọma, anyị ekwesịghị ime ka ndị ọzọ chee na e nweghị ihe ha ma maka na ha amachaghị Baịbụl. Kama, anyị kwesịrị icheta na Jehova weere ha ka ndị bara ezigbo uru nakwa na ha ka anyị. (Hag. 2:7; Fil. 2:3) Ọ bụrụ na mmadụ akparịa gị maka ihe i kweere, gbalịsie ike ka ị ghara ịkparịgwara. (1 Pita 2:23) Ọ bụrụ na i kwuo ihe na-adịghị mma, rịọ mgbaghara ozugbo. Olee otú ị ga-esi na-akwanyere ndị gị na ha na-arụkọ ọrụ ùgwù? Na-arụsi ọrụ ike, na-agbalịkwa ịna-emeso onye were gị n’ọrụ na ndị gị na ha na-arụkọ ọrụ otú dị mma. (Taị. 2:9, 10) Ọ bụrụ na ị na-ekwu eziokwu, na-arụsikwa ọrụ ike, obi ga-adị Jehova mma, ọ bụ eziokwu na o nwere ike ọ gaghị adị mmadụ niile mma.​—Kọl. 3:22, 23.

18. Gịnị mere o ji dị mma ka anyị na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù?

18 E nwere ọtụtụ ihe magburu onwe ha mere anyị kwesịrị iji na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù. Anyị ahụla na ọ bụrụ na anyị na-akwanyere ndị ezinụlọ anyị ùgwù, anyị na-akwanyere Onyeisi ezinụlọ anyị bụ́ Jehova ùgwù. Ọ bụrụ na anyị ana-asọpụrụ ụmụnna anyị, anyị na-asọpụrụ Nna anyị nke eluigwe. Ọ bụrụkwa na anyị ana-akwanyere ndị na-anọghị n’ọgbakọ ùgwù, anyị na-eme ka ọ dịrị ha mfe ịbịa soro anyị fewe Jehova. Ọ bụrụgodị na ụfọdụ ndị anyị kwanyeere ùgwù akwanyereghị anyị ùgwù, anyị ka kwesịrị ịna-akwanyere ha ùgwù. N’ihi gịnị? N’ihi na Jehova ga-agọzi anyị. O kwuru, sị: “Ọ bụ ndị na-akwanyere m ùgwù ka m ga-akwanyere ùgwù.”​—1 Sam. 2:30.

GỊNỊ KA Ị GA-AZA?

  • Olee otú anyị ga-esi na-akwanyere ndị ezinụlọ anyị ùgwù?

  • Olee otú anyị ga-esi na-akwanyere ụmụnna anyị ùgwù?

  • Olee otú anyị ga-esi na-akwanyere ndị na-anọghị n’ọgbakọ ùgwù?

ABỤ NKE 129 Anyị Ga Na-atachi Obi

a Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya