Ihe Ndị E Mere n’Afọ Gara Aga
N’ọhụụ, Jehova mere ka Ezikiel hụ nnukwu ụgbọ ịnyịnya na-agba n’eluigwe. Ụgbọ ịnyịnya ahụ nọchiri anya ndị ohu Jehova nọ n’eluigwe. N’agbanyeghị na o buru ezigbo ibu, ọ na-agba oké ọsọ, na-agbanwekwa ebe ọ na-aga n’egbughị oge. (Ezik. 1:15-28) Ihe ndị magburu onwe ha ndị ohu Jehova megasịrị n’afọ gara aga na-egosi na ha so ụgbọ ịnyịnya ahụ na-aga ụkwụ na ụkwụ.