Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • yb16 p. 28-p. 29 para. 1
  • Alaka Ụlọ Ọrụ Ndị E Nyefere Jehova

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Alaka Ụlọ Ọrụ Ndị E Nyefere Jehova
  • Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2016
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Alaka Ụlọ Ọrụ Ndị E Nyefere Jehova
    Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2014
  • Gịnị Ka A Na-eme n’Alaka Ụlọ Ọrụ?
    Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?
  • Alaka Ụlọ Ọrụ Anyị Ndị E Nyefere Jehova
    Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2017
  • Anyị Kpebisiri Ike Ijere Jehova Ozi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2016
yb16 p. 28-p. 29 para. 1
Ndị a bụ ndị bịara maka inyefe Jehova alaka ụlọ ọrụ anyị

IHE NDỊ E MERE N’AFỌ GARA AGA

Alaka Ụlọ Ọrụ Ndị E Nyefere Jehova

N’OGE a na-enyefe Jehova alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Madagaska, na Satọdee abalị iri abụọ na anọ n’ọnwa Jenụwarị afọ 2015, otu nwanna nwaanyị kwuru, sị: “Obi bụ m sọ aṅụrị.” Obi tọrọ nwanna nwaanyị a na narị mmadụ ise na iri asatọ na atọ ọzọ bịaranụ ụtọ ịhụ ụlọ obibi ọhụrụ nwere ọnụ ụlọ iri na itoolu na ebe a na-anọ eri nri a rụrụ ka o bukwuo ibu na ebe a na-esi nri a rụgharịrị arụgharị. E nyekwuru Ngalaba Ije Ozi, Ngalaba Na-ahụ Maka Ego nakwa Ngalaba Na-ahụ Maka Iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze ebe ndị ha ga-anọ na-arụ ọrụ. E nyekwara Ngalaba Na-ahụ Maka Vidio na Ihe Ndị A Na-egere Egere na Ngalaba Asụsụ Ndị Ogbi ebe ọhụrụ ha ga-anọ na-arụ ọrụ, hiwekwa Ngalaba Na-ahụ Maka Asụsụ Ndị Ìsì. Mgbe e kwuchara otú anyị si malite izi ozi ọma na Madagaska, Nwanna Mark Sanderson, bụ́ onye so n’Òtù Na-achị Isi, kwuru okwu e ji nyefee Jehova alaka ụlọ ọrụ a.

Ihe a bụ ụlọ ọhụrụ a rụrụ n’alaka ụlọ ọrụ anyị dị́ na Madagaska

Ihe a bụ ụlọ ọhụrụ a rụrụ n’alaka ụlọ ọrụ anyị dị́ na Madagaska. O nwere ọnụ ụlọ iri na itoolu

Obi ruru Ndịàmà Jehova nọ́ na Jakata, dị́ n’Indoneshia, ala mgbe mmiri tojuru n’ebe niile tara tupu e nyefee Jehova alaka ụlọ ọrụ anyị n’abalị iri na anọ n’ọnwa Febụwarị afọ 2015. Alaka ụlọ ọrụ anyị dịzi n’otu okpukpu nke ụlọ elu nwere okpukpu iri anọ na abụọ, dịrịkwa n’okpukpu nke mbụ ruo na nke iri na abụọ nke ụlọ elu ọzọ dị́ nso. Ngalaba dị iche iche e nwere n’alaka ụlọ ọrụ a dị n’obere ụlọ ndị ọzọ dị na gburugburu ebe ahụ. Nwanna Anthony Morris, bụ́ onye so n’Òtù Na-achị Isi, kwuru okwu e ji nyefee ya Jehova. N’echi ya, puku mmadụ iri na ise na narị mmadụ abụọ na iri ise na asaa bịara n’otu ámá egwuregwu gere okwu ya isiokwu ya bụ “Ike Agwụla Unu n’Ịrụ Ọrụ Ọma.” E gosikwara ihe omume a n’ebe dị iche iche dị iri anọ na otu. Puku mmadụ iri na otu na narị mmadụ na iri asatọ na itoolu nọ́ n’ebe ndị ahụ gekwara ya. Nke a bụ nnọkọ kachanụ Ndịàmà Jehova nwetụrụla n’Indoneshia. Nwanna Ronald Jacka, bụ́ otu n’ime ndị ozi ala ọzọ mbụ e zigara n’Indoneshia kwuru, sị: “Mgbe m rutere n’obodo a n’afọ 1951, e nwere naanị ndị nkwusa iri abụọ na isii. Ma taa, ihe karịrị puku mmadụ iri abụọ na isii bịara nnọkọ a pụrụ iche. N’eziokwu, Jehova agọziela ndị ya n’Indoneshia.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya