JỌJIA
Olee Ebe Unu Nọ Kemgbe?
Artur Gerekhelia
A MỤRỤ YA N’AFỌ 1956
E MERE YA BAPTIZIM N’AFỌ 1991
ONYE Ọ BỤ Mgbe ọnwa asatọ gachara e mere ya baptizim, ọ hapụrụ ụlọ ya na ezigbo ọrụ ọ na-arụ gaa n’ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma.
A KA mere m baptizim ọhụrụ mgbe ndị okenye jụrụ m ma m̀ ga-achọ ijikwu oge m jeere Jehova ozi. N’abalị anọ n’ọnwa Mee, afọ 1992, m gara nnọkọ pụrụ iche a haziri maka ndị chọrọ ịga ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma. N’echi ya, mụ na nwanna mụ na ya ga-eso akwaga ebe anyị ga na-ekwusa ozi ọma buuru ihe anyị gaa n’ọdụ ụgbọ mmiri Batumi, nke dị n’Ajarịa.
Ụbọchị mbụ m malitere ozi ọma na Batumi, ezigbo ụjọ nọ na-atụ m. M jụrụ onwe m, sị: ‘Olee otú m ga-esi ezi ndị mmadụ ozi ọma?’ Ma, o juru m anya mgbe nwaanyị mbụ m gara ka m zie ozi ọma jụrụ m, sị: “Olee ebe unu nọ kemgbe?” Ọ chọsiri ike ịmatakwu ndị Ndịàmà Jehova bụ. Nke a mere ka anyị na ya malite ịmụ Baịbụl n’echi ya.
Tupu anyị akwaga na Batumi, ụmụnna nyere anyị ọtụtụ aha na adres nke ndị chọrọ ka a bịa mụwara ha Baịbụl. Mgbe anyị rutere, anyị gara chọwa ha. Ebe ọ bụ na anyị amaghị obodo ahụ nke ọma, anyị na-ajụ ndị anyị hụrụ n’ụzọ otú anyị ga-esi aga ebe ndị ahụ bi. Ọtụtu amaghị ebe ndị ahụ n’ihi na o tebeghị aka a gụgharịrị ọtụtụ okporo ámá nọ ebe ahụ aha. Ma, ha nwere mmasị mgbe anyị ziri ha ozi ọma. Obere oge anyị kwatara na Batumi, anyị na-amụrụ ihe dị ka mmadụ iri ruo iri na ise ihe otu mgbe.
Mgbe ọnwa anọ gachara, ihe karịrị mmadụ iri anọ malitere ịbịachi ọmụmụ ihe anyị anya. N’ihi ya, anyị jụrụ onwe anyị, sị: ‘Ònye ga-enyere ndị ọhụrụ ndị a aka?’ N’ihi mgbọ ndị agha Jọjia na ndị Abkazịa chọrọ ịchịwa onwe ha na-akwa, ụmụnna niile mụ na ha nọbu n’ọgbakọ kwataziri na Batumi. Ihe a meziri ka e hiwe ọgbakọ na Batumi n’otu ụbọchị, e nwee ndị okenye na ndị ọsụ ụzọ jeerela Jehova ozi ọtụtụ afọ na ya.