Marek M. Berezowski/Anadolu Agency via Getty Images
NA-ECHENỤ NCHE!
Agha Rọshịa na Yukren Na-alụ Akarịala Otu Afọ—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?
Fraịdee, abalị iri abụọ na anọ n’ọnwa Febụwarị afọ 2023, mere ya otu afọ ihe dị oké egwu mere. Ọ bụ n’ụbọchị ahụ ka Yukren na Rọshịa malitere ịlụ agha. Akụkọ e nwetara na-egosi na ndị amị Yukren na ndị nke Rọshịa agha ahụ tarala isi ha ma ọ bụ merụọ ahụ́ dị ihe dị ka narị puku atọ. Ihe dị ka iri puku mmadụ atọ bụ́ ndị nkịtị anwụọkwala n’agha ahụ. Ma, ndị nwụrụla n’agha ahụ nwedịrị ike ịkarị ole ahụ.
Ọ dị mwute na e nweghịdị ihe na-egosi na agha ahụ ga-ebi ngwa ngwa.
N’abalị iri na itoolu n’ọnwa Febụwarị afọ 2023, otu ụlọ ọrụ redio aha ya bụ NPR (National Public Radio) kwuru na kemgbe otu afọ ndị agha Rọshịa na ndị nke Yukren kwawara mgbọ, o nweghị ihe na-egosi na agha ahụ ga-ebi ngwa ngwa. O nweghịkwa ihe na-egosi na e nwere onye ga-emeri n’agha ahụ. O yikwara ka ha achọghị ikwu otú ha ga-esi nwee udo.
O doro anya na obi adịghị ọtụtụ ndị mma n’ihi ahụhụ na ihe isi ike agha a na agha ndị ọzọ a na-alụ n’ụwa na-akpatara ndị aka ha dị ọcha. Olee ihe Baịbụl kwuru ga-emenụ? Ò nwere mgbe agha ga-akwụsị?
Agha nke ga-ebi agha niile
Baịbụl kwuru gbasara otu agha ga-eme ka ụmụ mmadụ nwere onwe ha. Agha ahụ agaghị egbu ndị aka ha dị ọcha. Baịbụl kpọrọ ya Amagedọn. O kwukwara na ọ bụ “agha a ga-alụ n’oké ụbọchị Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.” (Mkpughe 16:14, 16) Chineke ga-eji agha Amagedọn bibie ọchịchị ụmụ mmadụ, bụ́ nke kpatarala ọtụtụ agha ndị kpara mkpamkpa n’ụwa. Ị chọọ ịma otú Amagedọn ga-esi mee ka udo dị n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi, gụọ isiokwu ndị a: