Ebe e si nweta foto a bụ: Stringer/Getty Images
NA-ECHENỤ NCHE!
Agha A Na-alụ n’Izrel na Mba Ndị Gbara Ya Gburugburu—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?
Ndị nọ ebe dị iche iche n’ụwa chị obi n’aka maka okwu ndị Amerịka, Izrel, na Ịran na-ese. Ihe ọ̀ ga-aka njọ, mezie ka a lụwa agha n’ọtụtụ mba? Ndị ọchịchị hà ga-emeli ka esemokwu ghara ịkpata agha ma mee ka udo dịrị n’ụwa?
Ndị gụrụla ma ọ bụ nụ banyere amụma ndị e buru na Baịbụl nwere ike ịna-eche ma nsogbu a dị n’Izrel na mba ndị gbara ya gburugburu ọ̀ ga-eme ka agha Amagedọn e kwuru okwu ya n’akwụkwọ Mkpughe malite.
Gịnị ka Baịbụl kwuru?
Ndị ọchịchị hà ga-akwụsị agha a na-alụ n’Izrel na mba ndị gbara ya gburugburu?
Baịbụl kwuru, sị: “Unu atụkwasịla ndị isi obi, unu atụkwasịkwala nwa nke mmadụ obi, bụ́ onye na-enweghị ike ịzọpụta mmadụ.”—Abụ Ọma 146:3.
Anyị amaghị ma ndị ọchịchị hà ga-enwe ike ime ka udo dị n’Izrel na mba ndị gbara ya gburugburu. Ma, Baịbụl kwuru na e nweghị onyeisi ọchịchị ọ bụla ma ọ bụ ọchịchị mmadụ ma ọ bụ òtù ọ bụla nke ga-enwe ike ịkwụsị agha ma mee ka udo dịrị ruo mgbe ebighị ebi. Ọ bụ naanị Chineke ga-emeli “ka agha kwụsị n’ebe niile n’ụwa.”—Abụ Ọma 46:9.
Gụọ Ụlọ Nche isiokwu ya bụ “Gịnị Ga-eme Ka Agha Kwụsị?” ka ị matakwuo banyere ya.
Agha a na-alụ n’Izrel na mba ndị gbara ya gburugburu ọ̀ na-emezu amụma?
Baịbụl kwuru, sị: “Unu ga-anụ mkpọtụ agha na akụkọ agha. . . . Mba ga-alụso mba ọzọ agha, alaeze ga-alụsokwa alaeze ọzọ agha.”—Matiu 24:6, 7.
Ihe ndị na-eme n’Izrel na mba ndị gbara ya gburugburu bụ ihe ọzọ na-egosi na oge a anyị bi na ya bụ “ọgwụgwụ oge,” nke Baịbụl kpọkwara “oge ikpeazụ.” (Matiu 24:3; 2 Timoti 3:1) Agha ndị a na-alụ taa na-egosi na Chineke ga-akwụsị agha n’oge na-adịghị anya, wepụkwa nsogbu ndị ọzọ na-akpa ndị mmadụ aka ọjọọ.
Gụọ isiokwu bụ́ “Olee Ihe Na-egosi na Anyị Nọ n’Oge Ikpeazụ’?” ka ị matakwuo banyere ya.
Agha Amagedọn ọ̀ ga-amalite n’Izrel na mba ndị gbara ya gburugburu?
Baịbụl kwuru, sị: “Okwu ndị ahụ si n’aka ndị mmụọ ọjọọ kpọkọtakwara ndị eze ahụ n’ebe a na-akpọ Amagedọn n’asụsụ Hibru.”—Mkpughe 16:16.
Agha Amagedọn abụghị agha ndị ọchịchị na ndị ọchịchị ibe ha ga-alụ nke ga-ebido n’Izrel na mba ndị gbara ya gburugburu. Ọ bụ agha ga-akpa ụwa niile aka nke ọchịchị ụmụ mmadụ na Chineke ga-alụ.
Gụọ isiokwu bụ́ “Gịnị Bụ Agha Amagedọn?” ka ị matakwuo banyere ya.
Gịnị ga-enyere anyị aka ka obi ruo anyị ala n’oge nsogbu?
Baịbụl kwuru, sị: “Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọ bụla, kama n’ihe niile, na-ekpenụ ekpere, na-arịọsikwanụ Chineke arịrịọ ike ma na-ekele ya. Ọ bụ otú unu ga-esi mee ka ọ mara ihe unu na-arịọ.”—Ndị Filipaị 4:6.
Jehovaa Chineke chọrọ ka anyị na-agwa ya okwu n’ekpere. Ebe ọ bụ na ihe banyere anyị na-emetụ Chineke n’obi, ọ na-anụ ekpere anyị ma na-enyere anyị aka ma anyị chegbuwe onwe anyị. (1 Pita 5:7) Otu ụzọ o si eme ya bụ ime ka anyị ghọta ihe mere ndị mmadụ ji alụ agha, otú ọ ga-esi eme ka agha kwụsị, nakwa otú ọ ga-esi eme ka ahụhụ na nsogbu kwụsị.—Mkpughe 21:3, 4.
Gụọ isiokwu bụ́ “Can I Find Words of Comfort in the Bible” ka ị hụ otú Chineke si enyere anyị aka.
a Jehova bụ aha Chineke.—Abụ Ọma 83:18.