Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwyp isiokwu 42
  • Ịkpọ Mmadụ Iyi Ọ̀ Dị Njọ nke Otú Ahụ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịkpọ Mmadụ Iyi Ọ̀ Dị Njọ nke Otú Ahụ?
  • Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ajụjụ
  • Ihe mere ịkpọ mmadụ iyi ma ọ bụ ikwu okwu ọjọọ ji dị njọ
  • Ihe i nwere ike ime
  • “Okwu Rere Ure Adịghị n’Asụsụ Anyị”
    Teta!—2005
  • Olee Ihe Ị Ga-eme Ka Ihe Ị Na-ekwu Na-atọ Jehova Ụtọ?
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Olee Oké Ihe Ọjọọ Dị n’Ịkpọ Iyi?
    Teta!—2008
  • Gịnị Ka M Ga-eme ma Ọ Bụrụ na Ihe M Anaghị Amasị Ndị Ọzọ?
    Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
ijwyp isiokwu 42
Ebe onye na-eto eto ji ihe rachie ọnụ ya ka ọ ghara ịkpọ mmadụ iyi

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

Ịkpọ Mmadụ Iyi Ọ̀ Dị Njọ nke Otú Ahụ?

“M na-anụkarị ka ndị mmadụ na-akpọ ibe ha iyi nke na o nweghịzi ihe m ji ya kpọrọ. Ọ dịzi m ka o nweghị ihe o mere.”​—Chibụike, ọ dị afọ iri na asaa.

“Mgbe m dị obere, m na-akpọkarị ndị mmadụ iyi. Ọ naghị ara ahụ́ mmadụ ịmụta ịkpọ ndị ọzọ iyi, ma ọ na-esi ike nkwụsị.”​—Ngọzi, ọ dị afọ iri na itoolu.

  • Chọpụta

  • Ihe mere ịkpọ mmadụ iyi ma ọ bụ ikwu okwu ọjọọ ji dị njọ

  • Ihe i nwere ike ime

  • Ihe ndị na-eto eto ibe gị kwuru

Ajụjụ

  • Olee otú obi na-adị gị ma ị nụ ka ndị mmadụ na-akpọ ibe ha iyi?

    • Anadịghị m ama nke bụ́ ịkpọ iyi ma ọ bụ okwu ọjọọ n’ihi na ọ naghị emetụ m n’ahụ́.

    • Ahụ́ anaghị erucha m ala, mana m na-ewere ya otú ahụ.

    • Obi na-ajọ m njọ, o nweghị ike ịmara m ahụ́.

  • Ugboro ole ka ị na-akpọ mmadụ iyi?

    • Anatụdịghị m akpọ mmadụ iyi

    • Mgbe ụfọdụ

    • Mgbe niile

  • Olee otú i si ele mmadụ ịkpọ ibe ya iyi anya?

    • Ọ bụghị oké ihe

    • Ọ jọka

Ihe mere ịkpọ mmadụ iyi ma ọ bụ ikwu okwu ọjọọ ji dị njọ

Ì lere mmadụ ịkpọ ibe ya iyi anya ka ihe jọgburu onwe ya? I nwere ike ịsị mba. ‘A sị ka e kwuwe, e nwere nsogbu ndị ka njọ na-echu anyị ụra. Ihe ọzọ bụ na onye ọ bụla na-eme ya.’ Ma, ọ̀ bụ eziokwu?

Ma ị̀ ma ma ọ bụ na ị maghị, e nwere ọtụtụ ndị na-anaghị akpọ ibe ha iyi. Ma, o nwere ezigbo ihe ndị ọzọ na-amaghị mere na ha anaghị akpọ ndị ọzọ iyi. Dị ka ihe atụ:

  • Ihe iyi ị na-akpọ mmadụ na-egosi. Ihe ị na-ekwu na-egosi ihe dị gị n’obi. Ịkpọ mmadụ iyi nwere ike igosi na ị naghị echebara ndị ọzọ echiche. Ọ̀ bụ ụdị mmadụ ahụ ka ị bụ n’eziokwu?

    Baịbụl sịrị: “Ihe ndị na-esi n’ọnụ apụta na-esi n’obi.”​—Matiu 15:18.

    Ebe ndị na-eto eto na-agbara onye na-eto eto ibe ha na-ekwu okwu ọjọọ ọsọ

    Okwu ọjọọ ma ọ bụ ịkpọ mmadụ iyi yiri ikuku ọjọọ. Ekwula ya

  • Ịkpọ mmadụ iyi nwere ike ime ka ndị ọzọ lewe gị anya ọjọọ. Otu akwụkwọ aha ya bụ Cuss Control kwuru, sị: “Ihe anyị na-ekwu nwere ike ikpebi ụdị enyi anyị ga-enwe, otú ndị ezinụlọ anyị na ndị ọrụ ibe anyị ga-esi na-akwanyere anyị ùgwù, otú anyị na ndị mmadụ ga-adịru ná mma, na otú a ga-esi jiri anyị kpọrọ ihe. O nwekwara ike ikpebi ma ànyị ga-enweta ọrụ ma ọ bụ na anyị agaghị enweta, ma à ga-ebuli anyị n’ọkwá ma ọ bụ na a gaghị ebuli anyị, kpebiekwa otú ndị anyị na-amaghị ga-esi akpaso anyị àgwà.” Akwụkwọ ahụ kwukwara, sị: “Jụọ onwe gị ma gị na ndị mmadụ agaghị adịkwu ná mma ma ọ bụrụ na ị naghị akpọ mmadụ iyi.”

    Baịbụl sịrị: “Wepụnụ . . . okwu mkparị.”​—Ndị Efesọs 4:31.

  • Echela na ịkpọ mmadụ iyi ga-eme ka ndị mmadụ chee na ị ma ihe. Otu nwoke aha ya bụ Alex Packer kwuru n’akwụkwọ ya bụ́ How Rude!, sị: “Ndị mmadụ anaghị achọ ige onye na-akpọkarị ndị ọzọ iyi ntị.” O kwukwara na mmadụ ịna-ekwukarị okwu ọjọọ “ga-eme ka onye ahụ na-ekwu okwu ka onye na-enweghị uche, ma ọ bụ onye ihe banyere ndị ọzọ na-anaghị emetụ n’ahụ́. Ọ bụrụ na ị naghị eche echiche ekwu okwu ma ọ bụ na ị naghị ekwu ihe doro anya, ọ ga-emetụta otú uche gị si arụ ọrụ.”

    Baịbụl sịrị: “Ka okwu rere ure ghara isi unu n’ọnụ pụta.”​—Ndị Efesọs 4:​29.

Ihe i nwere ike ime

  • Kwuo otú ị ga-esi akwụsị ya. Ọ́ gaghị adị mma ka i jiri otu ọnwa ma ọ bụ ihe na-erughị ya kwụsị ikwu okwu ọjọọ? N’ọnwa ahụ, kanye ihe n’ụbọchị ndị ị na-ekwughị okwu ọjọọ na kalenda ma ọ bụ na chaatị. Ka i nwee ike ịnọgide ná mkpebi i mere ịkwụsị ịna-ekwu okwu ọjọọ, o nwere ihe ọzọ ị ga-eme. Dị ka ihe atụ:

  • Zere ntụrụndụ ndị nwere ike ime ka okwu ọjọọ ju gị isi. Baịbụl kwuru, sị: “Mkpakọrịta ọjọọ na-emebi àgwà ọma.” (1 Ndị Kọrịnt 15:33) E wepụ mmadụ na ibe ya ịna-akpa, ihe ndị ọzọ so ná mkpakọrịta bụ ile fim, igwu egwuregwu vidio, na ige egwú. Otu nwa okorobịa dị afọ iri na asaa aha ya bụ Okeke, kwuru, sị: “Ọ dị mfe mmadụ ịna-agụ ihe ọ na-ege n’egwú na-amasị ya, ma leghara okwu ọjọọ ndị dị na ya anya naanị n’ihi na ụda ya na-atọ ya ụtọ.”

  • Kpaa àgwà ka onye ṅụjuru mmiri ara afọ. Ụfọdụ na-ekwu okwu ọjọọ n’ihi na ha chere na ọ ga-eme ka ndị mmadụ were ha ka ndị dimkpa. Ma, ọ bụghị eziokwu. Baịbụl kwuru na ‘ndị tozuru okè na-azụ ikike nghọta ha azụ, site n’iji ya eme ihe, ịmata ihe dị iche n’ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi.’ (Ndị Hibru 5:​14) Ha anaghị eme ihe ha maara na-adịghị mma naanị ka ndị ọzọ too ha.

N’eziokwu, mmadụ ikwu okwu ọjọọ na-eme ka onye ahụ na-eche ihe na-adịghị mma. Ndị na-ekwu okwu ọjọọ n’ụwa a ka nkụ. Akwụkwọ ahụ a na-akpọ Cuss Control kwuru, sị, “Esola ha. Gbalịa ka ị na-ekwu okwu dị mma. Ahụ́ ga-eru gị ala, ruokwa ndị ọzọ ala ma gị na ha nọrọ.”

IHE NDỊ NA-ETO ETO IBE GỊ KWURU

Ikenna

“Ikwu okwu ọjọọ ga-eme ka ndị mmadụ na-ele gị anya ọjọọ. Ọ bụrụ na ị gaghị ekwuli okwu n’akpọghị mmadụ iyi ma ọ bụ kwuo okwu ọjọọ, ọ pụtara na okwu ndị ị maara ehighị nne.”​—Ikenna.

Jennifer

“Ọ bụ mmadụ ga-eji aka ya kpebie otú ọ ga-esi ekwu okwu. Ọ naghị adịcha mfe. Ma, anyị kwesịrị iche echiche tupu anyị ekwuo okwu. Mmadụ ga-akwụsịli ịkpọ ndị ọzọ iyi.”​—Jennifer.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya