Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwbq isiokwu 119
  • Gịnị bụ Okwu Chineke?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị bụ Okwu Chineke?
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Baịbụl kwuru
  • Jọn 1:1—“Okwu Ahụ Nọ ná Mmalite”
    Amaokwu Baịbụl Ndị A Kọwara
  • “Ndị A Na-akpọ ‘Chi’”
    Teta!—2005
  • Gịnị Ka Akwụkwọ Nsọ Na-ekwu Banyere “Ịbụ Chineke nke Kraịst”?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Gịnị Mere E Ji Kpọọ Jizọs Ọkpara Chineke?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
ijwbq isiokwu 119
Jizọs ji akwụkwọ mpịakọta na-ekwu okwu

Gịnị bụ Okwu Chineke?

Ihe Baịbụl kwuru

Okwu ahụ bụ́ “Okwu Chineke” na-apụtakarị ozi ma ọ bụ ebe e dekọrọ ihe ndị si n’aka Chineke. (Luk 11:28) N’ebe ụfọdụ, “Okwu Chineke” ma ọ bụ “Okwu ahụ” bụ utu aha.​—Mkpughe 19:13; Jọn 1:14.

Ozi si n’aka Chineke. Ndị amụma na-ekwukarị na ihe ha gwara ndị mmadụ bụ okwu Chineke. Di ka ihe atụ, mgbe Jeremaya malitere ibu amụma ya, okwu o ji malite bụ́, “okwu Jehova wee malite iru m ntị.” (Jeremaya 1:​4, 11, 13; 2:1) Tupu Samuel onye amụma agwa Sọl na Chineke ahọrọla ya ịbụ Eze, ọ sịrị ya, “Guzo n’ebe a ka m mee ka ị nụrụ okwu Chineke.”​—1 Samuel 9:27.

Utu aha. Na Baịbụl, a kpọrọ Jizọs Kraịst “Okwu ahụ” ma mgbe ọ bụ mmụọ n’eluigwe ma mgbe ahụ ọ bịara n’ụwa. Lee ihe ụfọdụ mere anyị ji kwuo otú ahụ:

  • Okwu ahụ adịwala ndụ tupu Chineke eke ihe ndị ọzọ. “Okwu ahụ nọ ná mmalite . . . Onye a na Chineke nọ ná mmalite.” (Jọn 1:​1, 2) Jizọs bụ “onye e bu ụzọ mụọ n’ime ihe niile e kere eke . . . Ọ dịkwa tupu ihe ndị ọzọ niile.”​—Ndị Kọlọsi 1:​13-15, 17.

  • Okwu ahụ bịara n’ụwa dị ka mmadụ. “Okwu ahụ ghọrọ anụ ahụ́ ma bie n’etiti anyị.” (Jọn 1:14) Jizọs Kraịst “mere onwe ya ihe efu ma were ọdịdị onye ohu, wee dịrị n’oyiyi mmadụ.”​—Ndị Filipaị 2:​5-7.

  • Okwu ahụ bụ Ọkpara Chineke. Mgbe Jọn onyeozi kwuchara na “Okwu ahụ” ghọrọ anụ ahụ́, o kwukwara sị: “Anyị hụkwara ebube ya, bụ́ ụdị ebube nke ọkpara a mụrụ naanị ya na-enweta n’aka nna ya.” (Jọn 1:14) Jọn dekwara sị: “Jizọs bụ Ọkpara Chineke.”​—1 Jọn 4:15.

  • Okwu ahụ nwere ọdịdị nke chi. “Okwu ahụ bụkwa chi” (Jọn 1:1) Jizọs bụ “onyinyo nke ebube ya [Chineke] o yikwara nnọọ Chineke nke ọma.”​—Ndị Hibru 1:​2, 3.

  • Okwu ahụ bụ eze na-achị achị. Baịbụl kwuru na Okwu ahụ kpu “ọtụtụ okpueze n’isi ya.” (Mkpughe 19:​12, 13) A kpọkwara Okwu ahụ “Eze nke ndị eze na Onyenwenụ kasị ndị nwenụ niile.” (Mkpughe 19:16) A na-akpọ Jizọs “Eze nke ndị na-achị achị dị ka ndị eze, na Onyenwenụ nke ndị na-achị achị dị ka ndị nwenụ.”​—1 Timoti 6:​14, 15.

  • Okwu ahụ bụ ọnụ na-ekwuchitere Chineke. Utu aha ahụ bụ́ “Okwu ahụ” mere ka o doo anya na onye nwe utu aha a ka Chineke si n’aka ya na-agwa ndị mmadụ ihe ọ chọrọ ka ha mee. Jizọs kwuru banyere ọrụ Chineke nyere ya, sị: “Nna m bụ onye zitere m nyere m iwu ihe m ga-akọ na ihe m ga-ekwu. . . . Ya mere ihe niile m na-ekwu, dị nnọọ ka Nna m si kọọrọ m ha, otú ahụ ka m si na-ekwu ha.” ​—Jọn 12:​49, 50.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya