Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwyp isiokwu 64
  • M̀ Kwesịrị Imetakwu Ndị Enyi?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • M̀ Kwesịrị Imetakwu Ndị Enyi?
  • Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe ndị na-esi ná mmadụ na naanị otu ndị ịkpa apụta
  • Ihe i nwere ike ime
  • Ezi Ndị Enyi—Ajọ Ndị Enyi
    Teta!—2004
  • Saa Anya ná Mmiri ma A Bịa n’Ụdị Ndị Ị Na-emete Enyi
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Olee Otú M Ga-esi Emeta Ezigbo Ndị Enyi?
    Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 1
  • M̀ Kwesịrị Inwe Ezigbo Ndị Enyi?
    Teta!—2009
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
ijwyp isiokwu 64
Ebe ụmụ agbọghọ na-ese onwe ha foto

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

M̀ Kwesịrị Imetakwu Ndị Enyi?

Otu nwa okorobịa aha ya bụ Alan sịrị: “Ndị ihe na-adabara mụ na ha bụ ndị ọgbọ m. Ọ na-esiri m ezigbo ike imeta ndị ọzọ enyi.”

Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Sara sịrị: “Ndị enyi m dị ole na ole, ọ dịkwa m mma otú ahụ. Abụghị m ụdị onye na-aga emeta ndị ọ na-amaghị enyi.

Ọ̀ dị gị otú ahụ ọ dị Alan na Sara? È nwere ndị ọ bụ naanị ha ka gị na ha bụ enyi, nke na ị naghị emetali ndị ọzọ enyi?

Ọ bụrụ na ọ dị gị otú ahụ, isiokwu a bụ maka gị.

  • Ihe ndị na-esi ná mmadụ na naanị otu ndị ịkpa apụta

  • Ihe i nwere ike ime

  • Ihe ndị na-eto eto ibe gị kwuru

Ihe ndị na-esi ná mmadụ na naanị otu ndị ịkpa apụta

E nweghị ihe dị njọ ná mmadụ inwe ndị ya na ha bụ ezigbo enyi. Ọ na-eme ka ahụ́ ruo onye ahụ ala na ya na ndị ihe na-adabara ya na ha nọ.

Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Karen sịrị: “Obi na-adị mmadụ ụtọ ma o nwee ndị ihe ya na-amasị na otu ndị ihe na-adabara ya na ha. Ọ na-amasị ndị na-eto eto ka ha na ndị ha ma na-akpa.

Ị̀ Maara? Jizọs na ndịozi ya iri na abụọ bụcha enyi, mana ya na mmadụ atọ n’ime ha, ya bụ, Pita, Jems na Jọn kacha akpachi anya.​—Mak 9:2; Luk 8:51

Mana mmadụ ihọrọ naanị otu ndị ka ya na ha na-akpa, ma na-eze ndị ọzọ eze, nwere ike ịkpata nsogbu. Dị ka ihe atụ:

  • O nwere ike ime ka ị ghara inwetakwu ezigbo ndị enyi ga-enyere gị aka.

    Otu nwa okorobịa aha ya bụ Evan sịrị: “Ịna-emeta naanị ndị ọgbọ gị ma ọ bụ naanị ndị dị ka gị enyi ga-eme ka ị ghara ịmụta ihe n’aka ndị ọzọ.”

  • O nwere ike ime ka o yie ka onwe gị ò juru gị afọ.

    Otu onye na-eto eto aha ya bụ Sara sịrị: “Ọ bụrụ na ọ bụ naanị otu ndị ka gị na ha na-akpa, o nwere ike ime ka ndị ọzọ chewe na ị naghị achọ ịtụpụrụ onye ọ bụla ọzọ ọnụ.”

  • O nwere ike ime ka ị na-achọ ndị ọzọ okwu

    Otu nwa okorọbịa aha ya bụ James sịrị: “Mmadụ nwere ike ọ gaghị na-achọ okwu, ma ọ bụrụ na ndị ya na ha na-akpa na-achọ okwu, o nwere ike ị masiwa gị. O nwedịrị ike ịdị ya ka ihe egwuregwu.”

  • O nwere ike itinye gị ná nsogbu, karịchaa ma ọ bụrụ na ị chọrọ ka gị na ha kpawa, ma ọ̀ dị mma ma ọ̀ dị njọ.

    Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Martina sịrị: “Naanị otu onye na-akpa àgwà ọjọọ ezuola ime ka ndị òtù ya niile bido kpawa àgwà ọjọọ.”

Ihe i nwere ike ime

  • Chebara ụdị onye i kwesịrị ịbụ echiche.

    Jụọ onwe gi, sị: ‘Olee ụdị onye m kwesịrị ịbụ? Ndị mụ na ha na-akpa hà na-eme ka ọ dịrị m mfe ka ọ bụ ka o siere m ike ịbụ ụdị onye m kwesịrị ịbụ? M̀ ka ga-achọ ka mụ na ha na-akpa ma ọ̀ dị mma ma ọ̀ dị njọ?’

    Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “Mkpakọrịta ọjọọ na-emebi àgwà ọma.”​—1 Ndị Kọrịnt 15:33.

    Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Ellen sịrị: “Ọ bụrụ na ndị gị na ha na-akpa abụghị ụdị ndị na-akpa ụdị àgwà i kwesịrị ịna-akpa, ha nwere ike ime ka i mewe ihe ndị ị na-agaraghị eme.”

  • Chebara ihe ndị dị gị ezigbo mkpa echiche.

    Jụọ onwe gị sị: ‘M̀ nwere ike ime ihe m kpebiri na m gaghị eme iji mee ka mụ na ndị enyi m ka na-akpa? Gịnị ka m ga-eme ma ọ bụrụ na enyi m emee ihe na-adịghị mma?’

    Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “Ndị niile m hụrụ n’anya nke ukwuu ka m na-abara mba.”​—Mkpughe 3:19.

    Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Melanie sịrị: “Ọ bụrụ na otu n’ime ndị enyi gị emee ihe ọjọọ, ọ ga-adị gị ka ime ka mmadụ mata gbasara ihe ahụ o mere ga-egosi na ị bụghị ezigbo enyi.”

  • Metakwuo ndị ọzọ enyi.

    Jụọ onwe gị, sị: ‘Ò nwere uru m ga-erite ma m metakwuo ndị ọzọ m na-amaghị nke ọma enyi?’

    Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “Na-elekwasị anya, ọ bụghị naanị n’ọdịmma onwe unu, kamakwa n’ọdịmma nke ndị ọzọ.”​—Ndị Filipaị 2:4.

    Otu nwa okorobịa aha ya bụ Brian sịrị: “O nwere ike ịbụ na ihe na-esiri ụmụaka ndị a na-eche na o nweghị onye ma ha ike n’ụlọ. Mana i metahaala ha enyi, ị ga-amata na ha bụ ndị ezigbo mmadụ.”

Isi ihe dị mkpa: O nweghị ihe dị njọ ná mmadụ inwe ndị ya na ha na-akpachi anya. Mana, ọ ga-abakwara gị uru ma ọ bụrụ na i metakwuo ndị ọzọ enyi. Baịbụl sịrị: “Onye na-emekwa ka ndị ọzọ ṅụjuo mmiri afọ ka a ga-emekwa ka ọ ṅụjuo mmiri afọ”​—Ilu 11:25.

Ihe ndị na-eto eto ibe gị kwuru

Maryam

“Mgbe m nọ n’ụlọ akwụkwọ, e nwere ndị òtù mụ na ha na-akpa, ma m mechara chọpụta na ha na-akpaso ndị ọzọ àgwà ọjọọ, ya emee ka m kwụsị iso ha. Ọ bụ eziokwu na o mere ka m ghara inwe ndị enyi ruo nwa oge, mana obi dị m ụtọ na m mere ihe dị mma.”​—Maryam

Alex

“Ihe mere m ji eso ụfọdụ ndị m na-eso n’ụlọ akwụkwọ bụ ka a mara na m sokwa biri. Ma, m mechaara chọpụta na iso ndị ọjọọ na-akpọkọrịta ga-eme ka e were ya na onye ahụ bụ onye ọjọọ ma ọ bụ meedị ka o mewe ihe ndị ọ na-ekwesịghị ime.”​—Alex

Bethany

“Mgbe m nọ n’ụlọ akwụkwọ sekọndịrị, m ji ọtụtụ afọ gbalịa ime ka mụ na otu òtù ndị na-achọghị m bido kpawa. Mgbe m chọpụtara na mbọ m niile kụrụ afọ n’ala, mụ amalitezie iji ndị enyi m nwere kpọrọ ihe.”​—Bethany

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya