Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwyp isiokwu 83
  • Olee Otú M Ga-esi Na-emeri Ọnwụnwa?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Otú M Ga-esi Na-emeri Ọnwụnwa?
  • Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe i kwesịrị ịma
  • Ihe i nwere ike ime
  • Otú Ị Ga-esi Na-ezere Ọnwụnwa
    Teta!—2014
  • Imeri Adịghị Ike Mmadụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Olee Otú M Nwere Ike Isi Merie Ọnwụnwa?
    Teta!—2008
  • Olee Otú M Ga-esi Merie Ọnwụnwa?
    Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 1
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
ijwyp isiokwu 83
Ebe otu nwa okorobịa hụrụ nwoke na nwaanyị na-anwụrụ ibe ha, ya agụwa ya agụụ ịdị ka ha, ụmụ okorobịa abụọ na-ele anya n’ekwentị ha, otu nwa agbọghọ na-agafekwa ebe ahụ

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

Olee Otú M Ga-esi Na-emeri Ọnwụnwa?

Pọl onyeozi kwuru, sị: “Mgbe m chọrọ ime ihe dị mma, ihe ọjọọ na-abata m n’obi.” (Ndị Rom 7:21) Ọ̀ dịtụla gị otú ahụ ọ dị Pọl? Ọ bụrụ otú ahụ, isiokwu a ga-enyere gị aka imeri ọnwụnwa ndị na-abịara gị ka i mee ihe ọjọọ.

  • Ihe i kwesịrị ịma

  • Ihe i nwere ike ime

  • Ihe ndị na-eto eto ibe gị kwuru

Ihe i kwesịrị ịma

Ndị ọzọ nyewe anyị nsogbu ka anyị mee ihe ọjọọ, ọnwụnwa abịarala anyị. Baịbụl kwudịrị na “mkpakọrịta ọjọọ na-emebi àgwà ọma.” (1 Ndị Kọrịnt 15:33) Ụlọ ọrụ mgbasa ozi ma ọ bụ ndị ọzọ nwere ike ime ka i chewe ihe ndị nwere ike ime ka ime ihe ọjọọ gụwa gị agụụ ma ọ bụdị mee ka ‘isoro ìgwè mmadụ mee ihe ọjọọ.’​—Ọpụpụ 23:2.

“Otú o si agụ anyị agụụ ka ihe anyị masị ndị ọzọ nakwa ka ha nabata anyị nwere ike ime ka i soro ha mewe ihe ọ bụla ha na-eme, naanị ka ihe gị nwee ike ịdị ha mma.”​—Jeremy.

Ihe ị ga-echebara echiche: Gịnị mere imeri ọnwụnwa ji esi ike karịa ma ọ bụrụ na ị na-echegbubiga onwe gị ókè gbasara ihe ndị ọzọ na-eche banyere gị?​—Ilu 29:25.

Nke bụ́ eziokwu: Ekwela ka ihe ndị ọzọ na-eche banyere gị mee ka ị kwụsị ime ihe ndị dị mma ị na-eme.

Ihe i nwere ike ime

Jidesie ihe ndị i kweere aka ike. Ọ bụrụ na ị maghị ebe ị kwụ akwụ, i nwere ike ịdị ka nwa bebi ndị ọzọ ji eme ihe masịrị ha. O nweghị ihe a ga-eji tụnyere ime ihe Baịbụl kwuru. Ọ sịrị: “Na-achọpụtanụ nke bụ́ eziokwu n’ihe niile; jidesienụ ihe dị mma aka ike.” (1 Ndị Tesalonaịka 5:21) Ka ihe ndị i kweere na-edokwu gị anya, ọ ga na-adịkwuru gị mfe ijidesi ha aka ike na imeri ọnwụnwa ọ bụla ga-abịara gị ka i mee ihe dị iche n’ihe ndị ahụ i kweere.

Ihe ị ga-echebara echiche: Gịnị mere obi ji sie gị ike na ihe ndị Chineke gwara anyị na-eme bụ maka ọdịmma gị?

“Achọpụtala m na mgbe ọ bụla m kwụsiri ike n’ihe m kweere ma ghara ime ihe ndị ọzọ na-anwa m ka m mee, ndị mmadụ na-akwanyere m ùgwù karịa.”​—Kimberly.

Onye Baịbụl kọrọ akụkọ ya ị ga-eme ka ya: Daniel. Daniel “kpebisiri ike n’obi ya” na ya agaghị emebi iwu Chineke. Ọ ga-abụ na o kpebiri ihe a mgbe ọ ka nọ n’afọ iri na ụma.​—Daniel 1:8.

Ebe e kere otu nwa okorobịa eriri n’aka na n’ụkwụ, ya adị ka nwa bebi onye ọ bụla ji eme ihe masịrị ya

Ọ bụrụ na ị maghị ebe ị kwụ akwụ, i nwere ike ịdị ka nwa bebi ndị ọzọ ji eme ihe masịrị ha

Mara ihe ndị ị na-anaghị emeta. Baịbụl kwuru na e nwere “ihe na-agụ ndị na-eto eto agụụ,” ya bụ, ihe ndị na-akacha agụ mmadụ agụụ mgbe ọ ka na-eto eto. (2 Timoti 2:22) Ụfọdụ n’ime ha bụ agụụ mmekọahụ, ịchọ ịdị ka ibe, na mmadụ ịchọ ịna-ekpebiri onwe ya ihe ọ ga-eme mgbe ọ na-etorubeghị imewa otú ahụ.

Ihe ị ga-echebara echiche: Baịbụl kwuru na “ọ bụ ihe na-agụ mmadụ agụụ na-anwa onye ahụ, nwata ya.” (Jems 1:14) Olee ihe na-agụ gịnwa agụụ kacha abụrụ gị ọnwụnwa?

“Gwa onwe gị eziokwu gbasara ihe ọjọọ kacha agụ gị agụụ ime. Mee nchọnchọ gbasara otú ị ga-esi emeri ọnwụnwa ahụ, deekwa ihe ndị ị chọtara ị ga-eme ede. Ọnwụnwa ahụ bịaziere gị n’oge ọzọ, ị ga-ama otú ị ga-esi emeri ya.”​—Sylvia.

Onye Baịbụl kọrọ akụkọ ya ị ga-eme ka ya: Devid. Oge ụfọdụ, o mere ihe ndị ọzọ chọrọ ka o mee nakwa ihe na-agụ yanwa agụụ. Ma ọ mụtara ihe n’ihe ndị o mejọrọ ma gbaa mbọ ime ihe dị mma. Ọ rịọrọ Jehova n’ekpere, sị: “Biko, mee ka m nwee obi dị ọcha, meekwa ka ọ na-agụ m agụụ ime ihe dị mma mgbe niile.”​—Abụ Ọma 51:10.

Kwụrụ n’ụkwụ gị. Baịbụl kwuru, sị: “Ekwela ka ihe ọjọọ merie gị.” (Ndị Rom 12:21) Ihe a pụtara na i kwesịghị ịbụrụ ọnwụnwa anụ oriri. I nwere ike ikpebi ime ihe dị mma.

Ihe ị ga-echebara echiche: A nwaa gị ka i mee ihe ọjọọ, olee otú i nwere ike isi kwụrụ n’ụkwu gị ma mee ihe dị mma?

“M na-eche otú obi ga-adị m ma m mee ihe ọ bụla a nwara m ka m mee. Ọ̀ ga-eme ka obi dị m mma? O nwere ike ime ka obi dị m mma obere oge. Obi ọ̀ ka ga-adị m mma ka oge na-aga? Mba, naanị obi ọjọọ ka ọ ga na-eme m. Ọ̀ baranụ uru na m mere ihe ọjọọ ahụ? Mba.”​—Sophia

Onye Baịbụl kọrọ akụkọ ya ị ga-eme ka ya: Pọl. Ọ bụ eziokwu na Pọl kwuru na e nwere oge ndị ihe ọjọọ na-agụ ya agụụ, ma ọ kwụụrụ n’ụkwụ ya. O kwuru, sị: “M na-ejidesi onwe m ike, na-eme ka ahụ́ m bụrụ ohu m.”​—1 Ndị Kọrịnt 9:27.

Nke bụ́ eziokwu: Ọ bụ gị ga-ekpebi ihe ị ga-eme mgbe ọ bụla ọnwụnwa bịaara gị.

Cheta na ọnwụnwa anaghị adịte aka. Melissa, onye dị afọ iri abụọ, kwuru, sị: “Ọtụtụ ihe ndị bụụrụ m ezigbo ọnwụnwa n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị enweghịzi ihe ha bụụrụ m ugbu a. Ihe a na-eme ka obi sie m ike na ọnwụnwa ndị na-abịara m ugbu a ga-emecha laa ka naị nakwa na otu ụbọchị, m ga-aghọta na m na-enwe ezigbo obi ụtọ maka na m meriri ọnwụnwa ndị a ugbu a.”

Ihe ndị na-eto eto ibe gị kwuru

Olivia

“Ikpebi ihe m ga-eme na ịkata obi mee ihe m kpebiri na-enyere m aka imeri ọnwụnwa. Dị ka ihe atụ, m kpebie ihe m na-agaghị eme, anaghị m emecha mee ihe ahụ. Anaghị m abịa chewe ma ihe ahụ m kpebiri ọ̀ dịkwa mma, anaghịkwa m ekwe ka ihe onye ọzọ kpebiri kpaa ihe ahụ m kpebiri aka.”​—Olivia.

Jared

“Ọ na-adị ndị na-eto eto ka ọ̀ bụ ha gaa oriri na nkwarị ọ bụla, sorokwa mee ihe ọ bụla a na-eme ebe ahụ, ma ịṅụ mmanya na-aba n’anya, ma ịṅụ ọgwụ ike, ma inwe mmekọahụ. Ihe na-enyere m aka bụ ịgwa papa m na mama m ihe niile gbasara ihe ndị a na-agụ m agụụ. Ihe ọzọ na-enyekwara m aka bụ ịna-eme otu ihe ma ọ bụ ọzọ n’oge m na-ejighị ọrụ n’aka.”​—Jared.

Mayan

“Otu n’ime ọnwụnwa ndị kacha esiri m ike imeri bụ mgbe a na-anwa m ka m mee ihe o nwere ike ịbụ na ndị ọzọ anaghị ele ya anya ka ihe na-adịghị mma, ma mụnwa na-ele ya anya ka ihe na-adịghị mma, dị ka ihe atụ, ihe gbasara ikpebi ihe mmadụ ga-eji na-atụrụ ndụ. Ihe ndị i kweere kwesịrị ido gị anya ka i nwee ike ịma ihe ị ga-eme n’ụdị ihe a. Ka oge na-aga, gị ana-amụtakwu ihe, ọ gaghịzi na-esiri gị ike ịma ihe ị ga-eme.”​—Mayan.

Julian

“A bịa n’ihe gbasara ọnwụnwa, i kwesịrị ịna-agwa onwe gị eziokwu. I kwesịrị ịma ebe ga-aka eme ka ihe ọjọọ gụwa gị agụụ n’Ịntanet na ebe ị ga-aka ahụ ihe rụrụ arụ, i kwesịkwara ịma ihe ị ga-eme ma ọ daba na ị gara ebe ndị ahụ. I kwesịrị ibu ụzọ kpebie ihe ị ga-eme ga-enyere gị aka imeri ọnwụnwa ga-abịara gị.”​—Julian.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya